Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) ỌGỌST 2013

E Doro Unu Nsọ

E Doro Unu Nsọ

“A sachawo unu, . . . e dowo unu nsọ.”—1 KỌR. 6:11.

1. Olee ihe ndị na-adịghị mma Nehemaya chọpụtara mgbe ọ gara Jeruselem? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

MGBE Nehemaya gara Jeruselem mgbe afọ 443 Tupu Oge Ndị Kraịst gachara, obi adịghị ndị bi na Jeruselem mma. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na a hapụrụ onye ọjọọ ka o biri n’ụlọ nsọ. Nehemaya chọpụtara na ndị Livaị anaghị arụ ọrụ ha. Ndị okenye na-ejizi Ụbọchị Izu Ike achụ ego, kama iji ya na-efe Jehova. Ọtụtụ ndị Juu na-alụkwa ndị na-abụghị ndị Juu ibe ha.—Nehe. 13:6.

2. Olee otú mba Izrel si ghọọ ndị e doro nsọ?

2 Ndị Izrel bụ ndị nyefere Chineke onwe ha. Ihe dị ka otu puku afọ tupu Nehemaya agaa Jeruselem, ndị Izrel kpebiri na ha ga na-erubere Jehova isi. Ha kwuru, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.” (Ọpụ. 24:3) N’ihi ihe a ha kwuru, Chineke họọrọ ha ka ha bụrụ ndị ya. Ọ chọkwara ka ha dị nsọ ma ghara ịdị ka mba ndị ọzọ na-anaghị efe ya. Ọ bụ ihe ùgwù na ha bụ ndị Chineke. Mgbe afọ iri anọ gachara, Mozis chetaara ha ihe dị mkpa. Ọ gwara ha, sị: “Unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu. Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.”—Diut. 7:6.

3. Gịnị ka Nehemaya chọpụtara gbasara ofufe Jehova mgbe ọ laghachiri Jeruselem?

3 Ọ dị mwute na ndị Izrel emezughị nkwa ha kwere Jehova. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ n’ime ha fere ya. Ma, ọtụtụ n’ime ha achọghị irubere ya isi. Ha na-eme ka à ga-asị na ha dị nsọ. Ndị Juu nọ na Babịlọn mechara laghachi Jeruselem ka ha rụzie ya ma malite ife Jehova n’ebe ahụ. Mgbe ihe dị ka otu narị afọ gara, Nehemaya gaghachiri Jeruselem. Mgbe o ruru, ọ chọpụtara na ndị Juu ejighị ofufe Jehova kpọrọ ihe.

4. Olee ihe anọ anyị ga-atụle ndị ga-enyere anyị aka ịna-adị nsọ?

4 Jehova doro Ndịàmà ya nsọ taa otú ahụ o si doo ndị Izrel. Ma Ndị Kraịst e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ dịcha nsọ. Jehova họọrọ ha ka ha na-ejere ya ozi. (Mkpu. 7:9, 14, 15; 1 Kọr. 6:11) Jehova  jụrụ ndị Izrel n’ihi na ha hapụrụ ya. Anyị achọghị ka Jehova jụ anyị. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-adị nsọ, anyị na Jehova adịrịkwa ná mma? N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ e kwuru na Nehemaya isi nke iri na atọ. Ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịna-adị nsọ, anyị na Jehova adịrịkwa ná mma. Nke mbụ bụ, emetela ndị ọjọọ enyi, nke abụọ abụrụ, na-akwado ozi Jehova. Nke atọ bụ, jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe, nke anọ abụrụ, na-akpa àgwà gosiri na ị bụ Onye Kraịst. Ka anyị tụlee ihe ndị a.

EMETELA NDỊ ỌJỌỌ ENYI

Olee otú Nehemaya si gosi na ya na-erubere Jehova isi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6)

5, 6. Ole ndị bụ Elayashib na Tobaya? Olee ihe nwere ike ịbụ ya mere ha abụọ ji na-akpa?

5 Gụọ Nehemaya 13:4-9. Ndị ọjọọ juru n’ụwa taa. Ha nwekwara ike ime ka anyị ghara ịdị nsọ. Baịbụl kọọrọ anyị gbasara Elayashib na otu nwoke aha ya bụ Tobaya. Elayashib bụ nnukwu onye nchụàjà, Tobaya abụrụ onye Amọn. O nwere ike ịbụ na Tobaya na-arụrụ eze ndị Peshịa ọrụ. Ya na ndị enyi ya gbasiri mbọ ike ka Nehemaya kwụsị ịrụzi mgbidi Jeruselem. (Nehe. 2:10) Jehova nyere ndị Izrel iwu na ndị Amọn ekwesịghị ịbata n’ụlọ nsọ. (Diut. 23:3) Gịnị mere Elayashib ji nye Tobaya ụlọ n’ebe a na-eri ihe n’ụlọ nsọ?

6 O nwere ihe atọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na Tobaya na Elayashib bụ enyi. Nke abụọ bụ na Tobaya na nwa ya nwoke aha ya bụ Jehohenan lụchara ndị Juu. Ọtụtụ ndị Juu na-ekwukwa okwu ọma banyere Tobaya. (Nehe. 6:17-19) Nke atọ abụrụ na nwa nwa Elayashib lụrụ ada Sanbalat, bụ́ gọvanọ na-achị Sameria. Sanbalat na Tobaya bụkwa ezigbo enyi. (Nehe. 13:28) Ọ ga-abụ ihe ndị a mere Elayashib ji kwe ka Tobaya na-agwa ya ihe ọ ga na-eme n’agbanyeghị na Tobaya abụghị onye Izrel, na-agbakwa ndị na-arụzi mgbidi Jeruselem mgba okpuru. Ma, Nehemaya tụpụsịrị ngwongwo niile dị n’ụlọ Tobaya n’èzí. O si otú ahụ gosi na ya na-erubere Jehova isi.

7. Gịnị ka ndị okenye na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-eme ka ha nwee ike ịna-adị nsọ n’anya Chineke?

7 Ebe ọ bụ na anyị nyefere Chineke onwe anyị, anyị kwesịrị ịna-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na anyị anaghị erubere ya isi, anyị agaghị adị nsọ n’anya ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ezinụlọ anyị mee ka anyị nupụrụ ya isi. Ihe ndị okenye ji ekpebi ihe ha chọrọ ime bụ ihe Jehova kwuru, ọ bụghị ihe hanwa chere. (1 Tim. 5:21) Ha na-elezi anya ka ha ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha na Chineke ghara ịdị ná mma.—1 Tim. 2:8.

8. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi banyere ndị anyị na ha na-akpa?

8 Anyị kwesịrị icheta na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Kọr. 15:33) O nwere ike ụfọdụ ndị ikwu anyị anaghị agba anyị ume ka anyị na-eme ihe dị mma. O nwere mgbe Elayashib mere ihe dị mma. N’oge ahụ, ọ kwadoro Nehemaya mgbe ọ na-arụzi mgbidi Jeruselem. (Nehe. 3:1) Ma, Tobaya na ndị ọzọ mere ka o mee ihe na-adịghị mma. Ihe ndị ahụ mekwara ka ọ ghara ịdị nsọ n’anya Jehova. Ndị anyị na ha kwesịrị ịna-akpa bụ ndị na-agba anyị ume ka anyị na-eme ihe dị mma, dị ka ịgụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma. Obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị na-agba anyị ume ka anyị na-eme ihe dị mma.

NA-AKWADO OZI JEHOVA

9. Olee ihe mere e ji kwụsị ọrụ a na-arụ n’ụlọ nsọ? Olee ndị Nehemaya sị na ọ bụ ha kpatara ya?

9 Gụọ Nehemaya 13:10-13. Mgbe Nehemaya ruru Jeruselem, ọ chọpụtara na ndị Livaị anaghịzi arụ ọrụ ha. Gịnị mere? Ndị Juu anaghịzi enye onyinye hiri nne maka ụlọ nsọ. N’ihi ya, ndị  Livaị gawara na-arụ ọrụ n’ubi ha ka ha nwee ike ịna-akpa afọ ezinụlọ ha. Nehemaya kwuru na ọ bụ ndị na-achị ndị Juu kpatara ya. O yiri ka ha anaghị arụ ọrụ ha. E nwere ike ha anaghị anata ndị Juu otu ụzọ n’ụzọ iri ha kwesịrị ịkwụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha natachaa ego, ha anaghị ewega ya n’ụlọ nsọ. (Nehe. 12:44) Nehemaya haziri otú a ga-esi na-anakọta onyinye ndị ahụ. Ọ họpụtakwara ụfọdụ ụmụ nwoke a tụkwasịrị obi ka ha na-enye ndị Livaị ihe e kwesịrị inye ha.

10, 11. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwado ofufe Jehova?

10 Gịnị ka anyị ga-amụta n’akụkọ a? Anyị kwesịrị iji ihe anyị dị oké ọnụ ahịa na-asọpụrụ Jehova. (Ilu 3:9) Ọ bụrụ na anyị ejiri ego anyị na-akwado ọrụ Jehova, anyị na-enyeghachi ya ihe o nyere anyị. (1 Ihe 29:14-16) Ọ bụrụ na ị baghị ọgaranya, i nwere ike ịna-eche na ị gaghị ejili obere ego i nwere sọpụrụ Jehova. Ma, Jehova ga-anabata onyinye anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile nye ya.—2 Kọr. 8:12.

11 O nwere di na nwunye mụrụ ụmụ asatọ. N’izu ọ bụla, ha na-ahọrọ otu ụbọchị ma kpọọ otu di na nwunye merela agadi, bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ka ha bịa soro ha rie nri. Ha mere ya ọtụtụ afọ. Nwaanyị ahụ ya na di ya mụrụ ụmụ asatọ kwuru na ebe ọ bụ na ya na-adị mbụ esi nri mmadụ iri ga-eri, o nweghị ihe ọ ga-ewepụ ya n’ahụ́ ma ya sie nke mmadụ iri na abụọ ga-eri. I nwere ike iche na ihe a ha na-eme abụghị oké ihe. Ma, o mere ka obi dị di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ ụtọ. Ha nyekwaara ezinụlọ ahụ aka. Otú ha si mee ya bụ ịkọrọ ha ihe ọma ndị mere mgbe ha gara ozi ọma. Ha gbakwara ụmụaka ndị ahụ ume ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ụmụaka ahụ niile mechara banye n’ozi oge niile.

12. Olee àgwà ọma ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-akpa n’ọgbakọ?

12 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ a bụ na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-akwado ihe a na-eme n’ọgbakọ. Àgwà ọma ha na-abara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ uru. Ndị okenye na-eme ka Pọl onyeozi. Pọl onyeozi kwadoro ofufe Jehova, tụọkwa aro ndị ga-abara Onye Kraịst ọ bụla uru. Dị ka ihe atụ, o kwuru ụzọ ụfọdụ anyị kwesịrị isi na-enye onyinye.—1 Kọr. 16:1-3; 2 Kọr. 9:5-7.

JIRI OFUFE JEHOVA KPỌRỌ IHE

13. N’oge Nehemaya, gịnị ka ụfọdụ ndị Juu na-eme n’Ụbọchị Izu Ike?

13 Gụọ Nehemaya 13:15-21. Ọ bụrụ na anyị na-achụ ego ọnwụ ọnwụ, o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Ọpụpụ 31:13 gosiri na ọ bụrụ  na ụmụ Izrel ana-edebe Ụbọchị Izu Ike, ọ ga-eme ka ha na-echeta na ha bụ ndị e doro nsọ. Ha na ezinụlọ ha kwesịrị iji ụbọchị ahụ na-amụ ihe, jirikwa ya na-ekpe ekpere ma na-echebara Iwu Chineke echiche. Ma, ụfọdụ ndị ha na Nehemaya dịkọrọ ndụ na-eji ụbọchị ahụ achụ ego otú ha na-eme n’ụbọchị ndị ọzọ. Ha anaghị eji ya efe Chineke. Mgbe Nehemaya chọpụtara ihe a ha na-eme, ọ chụpụrụ ndị obodo ọzọ bịara ịzụ ahịa na Jeruselem. O mechikwara ọnụ ụzọ ámá n’ụbọchị nke isii tupu Ụbọchị Izu Ike eruo.

14, 15. (a) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyi ana-achụ ego ọnwụ ọnwụ? (b) Olee otú anyị ga-esi banye n’izu ike Chineke?

14 Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ Nehemaya mere? Otu ihe anyị kwesịrị ịmụta bụ na anyị ekwesịghị ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ. Ọ bụrụ na anyị ana-achụ ego ọnwụ ọnwụ, ọ ga-eme ka anyị ghara iji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ma, cheta na Jizọs kwuru na anyị agaghị abụli ohu nke nna ukwu abụọ. (Gụọ Matiu 6:24.) A sị na Nehemaya chọrọ, ọ gaara enwe ezigbo ego. Ma, gịnị ka o ji oge ya mee mgbe ọ nọ na Jeruselem? (Nehe. 5:14-18) Kama ịga ka ya na ndị Taya na ndị ọzọ na-azụkọ ahịa, o wepụtara onwe ya nyere ndị Izrel ibe ya aka. O jikwa oge ya mee ihe ndị mere ka e doo aha Jehova nsọ. Ọ bụ ihe a ka ndị okenye ọgbakọ na ndị ohu na-eje ozi na-eme taa. Ha na-eji oge ha na ike ha eme ihe ga-abara ọgbakọ uru. Ụmụnna ha hụkwara ha n’anya n’ihi ọrụ a ha na-arụ. Otú ha si arụ ọrụ ha emeela ka ụmụnna na-ahụ ibe ha n’anya, udo adịrị n’ọgbakọ, obi eruokwa ndị niile nọ na ya ala.—Ezik. 34:25, 28.

15 Ndị Kraịst anaghị edebe Ụbọchị Izu Ike. Ma, Pọl kwuru na “a ka nwere ezumike nke ụbọchị izu ike maka ndị Chineke.” O kwukwara, sị: “Onye banyere n’izu ike nke Chineke ezuruwokwa ike n’ọrụ nke ya, dị nnọọ ka Chineke zuru na nke ya.” (Hib. 4:9, 10) Anyị nwere ike ịbanye n’izu ike Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-erubere ya isi ma na-eme uche ya. Ihe ka gị na ezinụlọ unu mkpa ọ̀ bụ ofufe ezinụlọ, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma? Onye anyị na-arụrụ ọrụ ma ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ nwere ike iche na ihe ndị a adịghị mkpa. N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka ọnụ sie anyị ike, anyị emee ka o doo ha anya na ozi Jehova bụ ihe kacha anyị mkpa. Ọ bụ ụdị ihe a ka Nehemaya mere mgbe ahụ ọ chụpụrụ ndị Taya, mechiekwa ọnụ ụzọ ámá Jeruselem. Ihe mere o ji mee ya bụ na o ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị e doro nsọ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Otú m si akpa àgwà ọ̀ na-egosi na m ji ofufe Jehova kpọrọ ihe?’—Mat. 6:33.

NA-AKPA ÀGWÀ GOSIRI NA Ị BỤ ONYE KRAỊST

16. Olee ihe gaara eme ka a gharazie ịma na ndị Izrel n’oge Nehemaya bụ ndị Chineke doro nsọ?

16 Gụọ Nehemaya 13:23-27. N’oge Nehemaya, ụfọdụ ndị Izrel lụrụ ụmụ nwaanyị bụ́ ndị mba ọzọ. Mgbe mbụ Nehemaya gara Jeruselem, o mere ka ndị okenye niile bịanye aka n’akwụkwọ na ha agaghị alụ ndị na-anaghị efe Chineke. (Nehe. 9:38; 10:30) Ma, mgbe ọ gara Jeruselem ọzọ, ọ chọpụtara na ndị Juu na-alụ ụmụ nwaanyị bụ́ ndị mba ọzọ, chọpụtakwa na ọ fọrọ obere ka a ghara ịma na ha bụ ndị Chineke doro nsọ. Ụmụ ndị ụmụ nwaanyị ndị ahụ bụ́ ndị mba ọzọ mụtara anaghị agụ Hibru, ha anaghịkwa asụ ya. Ọ bụrụ na ha etoo, hà ga-ekweta na ha bụ ndị Izrel? Ka hà ga-eche na ha bụ ndị mba ọzọ, ya bụ, ndị Ashdọd, ndị Amọn, ma ọ bụ ndị Moab? Olee otú ha ga-esi aghọta Iwu Chineke ebe ọ bụ na ha amaghị ka e si asụ Hibru? Oleekwa otú ha ga-esi mara Jehova ma kpebie ife ya kama ife chi ndị nne ha fere? Nehemaya mere ihe o kwesịrị  ime ozugbo. O meghị anya ụra n’okwu a.—Nehe. 13:28.

Nyere ụmụ gị aka ka ha na Jehova na-adị ná mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na 18)

17. Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma?

17 Taa, anyị kwesịrị ịgba mbọ na-enyere ụmụ anyị aka ka ha mụta ịna-akpa àgwà gosiri na ha bụ Ndị Kraịst. Ndị mụrụ ụmụ, ihe unu kwesịrị ịjụ onwe unu bụ, ‘Ụmụ m hà na-asụ asụsụ ahụ dị ọcha, ya bụ, hà ma ihe Baịbụl kwuru nke ọma, na-akọkwara ya ndị ọzọ? (Zef. 3:9) Ihe ụmụ m na-ekwu ọ̀ na-egosi na ha nwere mmụọ nsọ Chineke ka ọ̀ bụ mmụọ nke ụwa?’ Ike agwụla gị ma ị chọpụta na e nwere àgwà ụfọdụ ụmụ gị kwesịrị ịgbanwe. Ịmụta asụsụ na-ewe oge, nke ka nke, ma ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-emegharị mmadụ anya. Ụwa Setan na-agbalị ime ka ụmụ gị nupụrụ Chineke isi. N’ihi ya, nweere ha ndidi. Jiri oge Ofufe Ezinụlọ unu na oge ndị ọzọ na-enyere ha aka ka ha na Jehova dị ná mma. (Diut. 6:6-9) Chetara ha ihe mere o ji dị mma ka ha dịrị iche n’ụwa Setan. (Jọn 17:15-17) Gbalịakwa ka ihe ị na-agwa ha ruo ha n’obi.

18. Olee ihe mere ndị nne na nna kwesịrị iji na-enyere ụmụ ha aka ka ha nwee ike inyefe Jehova onwe ha?

18 Ọ bụ ụmụ gị ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-efe Chineke. Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi nyere ha aka. Ụfọdụ n’ime ụzọ ndị ahụ bụ ịna-akpa àgwà ọma, ịna-agwa ha hoo haa àgwà ị na-achọghị ka ha na-akpa, na ime ka ha ghọta nsogbu omume ọjọọ nwere ike ịkpatara ha. Ndị nne na nna, ọ bụ unu kwesịrị inyere ụmụ unu aka inyefe Jehova onwe ha. Ọ bụkwa unu ga-enyere ha aka ịghọta na ha kwesịrị ịna-akpa àgwà gosiri na ha bụ Ndị Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile kwesịrị ịna-akpa àgwà gosiri na anyị bụ Ndị Kraịst, ya bụ, anyị kwesịrị ịna-erubere Chineke isi ma na-akpa àgwà otú ọ chọrọ ka anyị si na-akpa.—Mkpu. 3:4, 5; 16:15.

JEHOVA GA-ECHETA ANYỊ, ‘MEERE ANYỊ IHE ỌMA’

19, 20. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova nwee ike icheta anyị, ‘meere anyị ihe ọma’?

19 Malakaị onye amụma so ná ndị ha na Nehemaya dịkọrọ ndụ. O kwuru na Jehova na-echeta ‘ndị na-atụ egwu ya nakwa ndị na-echebara aha ya echiche.’ O kwukwara na Jehova na-ede aha ha ‘n’akwụkwọ ncheta.’ (Mal. 3:16, 17) Chineke agaghị echefu ndị na-atụ egwu ya nakwa ndị hụrụ aha ya n’anya.—Hib. 6:10.

20 Nehemaya kpere ekpere, sị: “Chineke m, biko, cheta m, imere m ihe ọma.” (Nehe. 13:31) Chineke ga-echeta anyị otú ahụ o si cheta Nehemaya, deekwa aha anyị n’akwụkwọ ncheta ma ọ bụrụ na anyị na ndị ọjọọ anaghị akpa. Ọ ga-edekwa aha anyị n’akwụkwọ ahụ ma anyị na-akwado ozi ya, jiri ofufe ya kpọrọ ihe, ma na-echeta mgbe niile na anyị bụ Ndị Kraịst. Ka anyị ‘na-anwale ma ànyị nọ n’okwukwe.’ (2 Kọr. 13:5) Ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị bụrụ ndị e doro nsọ n’anya Jehova, ọ ga-echeta anyị, ‘meere anyị ihe ọma.’