Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2013

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị Nri

“Mgbe [Jizọs] nyawasịrị achịcha ndị ahụ, o kesaara ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.”—MAT. 14:19.

1-3. Kọwaa otú Jizọs si nye ìgwè mmadụ nri n’ebe dị nso n’obodo Betseida. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

O NWERE otu ọrụ ebube Jizọs rụrụ mgbe ọ fọrọ obere ka e mee Ememme Ngabiga nke afọ 32. Weregodị ya na ị nọ ebe ahụ. (Gụọ Matiu 14:14-21.) Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise nọ, ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụaka. Ha nọ n’otu ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị. Ebe ahụ dị nso n’obodo Betseida, nke dị n’ebe ugwu Oké Osimiri Galili.

2 Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nweere ha ọmịiko. N’ihi ya, ọ gwọrọ ndị na-arịa ọrịa, kụziekwara ha ọtụtụ ihe gbasara Alaeze Chineke. Mgbe chi jiwere, ndị na-eso ụzọ ya gwara ya ka ọ gwa ìgwè mmadụ ahụ lawa, ka ha nwee ike ịga n’obodo ndị dị nso zụrụ ihe ha ga-eri. Ma Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nyenụ ha ihe ka ha rie.” Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ o kwuru juru ha anya, ebe ọ bụ na ihe oriri ha nwere dị obere. Naanị ihe ha nwere bụ ogbe achịcha ise na obere azụ̀ abụọ.

3 Jizọs nweere ha ọmịiko. N’ihi ya, ọ rụrụ otu ọrụ ebube. Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọchara gbasara ya. O nweghị ọrụ ebube ọzọ ha anọ kọchara gbasara ya. (Mak 6:35-44; Luk 9:10-17; Jọn 6:1-13) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ n’ìgwè n’ìgwè n’elu ahịhịa. Ụfọdụ dị iri mmadụ ise, ụfọdụ adịrị otu narị mmadụ. Jizọs kpere ekpere, nyawaa ogbe achịcha ndị ahụ, keekwa azụ̀ ndị ahụ. Kama iji aka ya nyewe ndị mmadụ nri ahụ, o nyere ya ‘ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya ekesaara ya ìgwè mmadụ ahụ.’ Ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ mere ka onye ọ bụla rijuo afọ, nri afọkwa. Chegodị echiche: Jizọs si n’aka mmadụ ole na ole bụ́ ndị na-eso ụzọ ya nye ọtụtụ puku mmadụ nri. *

4. (a) Olee ihe kacha Jizọs mkpa? Gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe kacha ya mkpa? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya?

 4 Ihe kacha Jizọs mkpa abụghị inye ndị na-eso ụzọ ya nri. Ọ bụ ịkụziri ha Okwu Chineke. Ọ ma na ịmụta eziokwu dị n’Okwu Chineke ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:26, 27; 17:3) Ọ bụ ọmịiko o nwere n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ mere ka o jiri achịcha na azụ̀ nyejuo ha afọ. Ọ bụkwa ọmịiko mere ka o jiri ọtụtụ awa na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe. (Mak 6:34) Ma, ọ ma na ya agaghị anọte aka n’ụwa nakwa na ya ga-alaghachi eluigwe. (Mat. 16:21; Jọn 14:12) Olee otú Jizọs ga-esi na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke mgbe ọ ga-anọzi n’eluigwe? Ọ ga-esi n’aka mmadụ ole na ole eme ya otú ahụ o si n’aka mmadụ ole na ole nye ìgwè mmadụ ahụ nri. Oleekwanụ ndị ga-abụ mmadụ ole na ole ahụ? Ka anyị tụlee otú Jizọs si si n’aka mmadụ ole na ole kụziere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ihe n’oge ndịozi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle otu ajụjụ dị anyị niile ezigbo mkpa. Ajụjụ ahụ bụ, Olee otú anyị ga-esi mata mmadụ ole na ole ahụ Kraịst ga-esi n’aka ha na-akụziri anyị ihe taa?

Jizọs si n’aka mmadụ ole na ole nye ọtụtụ puku mmadụ nri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

JIZỌS HỌỌRỌ MMADỤ OLE NA OLE

5, 6. (a) Olee ihe dị ezigbo mkpa Jizọs mere ka e nwee ike ịna-akụziri ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke ma ọ nwụọ? (b) Olee otú Jizọs si kwadebe ndịozi ya maka ọrụ dị ezigbo mkpa ha ga-arụ ma ọ nwụọ?

5 Ezigbo onyeisi ezinụlọ na-ahazi otú a ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya ma ọ bụrụ na ọ nwụọ. Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụkwa otú ahụ ka o si hazie otú a ga-esi na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke ma ọ nwụọ. (Efe. 1:22) Dị ka ihe atụ, mgbe ọ fọrọ ihe dị ka afọ abụọ ka ọ nwụọ, o mere otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ họọrọ ndị ga-abụ ndị mbụ ná mmadụ ole na ole ọ ga-esi n’aka ha na-akụziri ọtụtụ ndị ihe. Ka anyị tụlee ihe merenụ.

6 Jizọs kpegidere ekpere chi abọọ. Mgbe o kpechara, ọ kpọkọtara ndị na-eso ụzọ ya ma họrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ha. Ọ kpọrọ ha ndịozi. (Luk 6:12-16) Ruo afọ abụọ, ọ bụ mmadụ iri na abụọ ahụ ka ya na ha kacha dị ná mma. O ji ma okwu ọnụ ya ma omume ya kụziere ha ihe. Ọ ma na e nwere ọtụtụ ihe ha ka kwesịrị ịmụta. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe a kwụsịrị ịkpọ ha “ndị na-eso ụzọ” ya, ya bụ, ndị ọ na-akụziri ihe. (Mat. 11:1; 20:17) Ọ gwara ha ọtụtụ ihe baara ha uru, kụziekwara ha otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma. (Mat. 10:1-42; 20:20-23; Luk 8:1; 9:52-55) Ihe mere o ji mee ihe a niile bụ ka ọ kwadebe ha maka ọrụ dị mkpa ha ga-arụ ma ọ nwụọ laghachi eluigwe.

7. Olee otú Jizọs si gosi ihe ga-akacha adị ndịozi ya mkpa?

7 Olee ihe ndịozi Jizọs ga na-arụ? Ka Pentikọst afọ 33 na-eru nso, o doro anya na ha ga ‘na-arụ ọrụ nlekọta.’ (Ọrụ 1:20) Ma, olee ihe ga-akacha ha mkpa? Mgbe Jizọs si n’ọnwụ bilie, o mere ka a mata ihe ga-akacha ha mkpa n’ihe ya na Pita onyeozi kwụrịtara. (Gụọ Jọn 21:1, 2, 15-17.) Jizọs nọ n’ihu ụfọdụ ndịozi ndị ọzọ gwa Pita, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” Ihe a ọ gwara Pita gosiri na ndịozi ya ga-eso ná mmadụ ole na ole ahụ ọ ga-esi n’aka ha na-akụziri ọtụtụ ndị okwu Chineke. Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ hụrụ “ụmụ atụrụ” ya n’anya. *

OTÚ E SI NA-AKỤZIRI ỌTỤTỤ NDỊ OKWU CHINEKE MALITE NA PENTIKỌST GAWA

8. Olee otú ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ si gosi na ha ghọtara ndị Jizọs si n’aka ha na-akụzi okwu Chineke?

8 Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, ọ bụ n’ụbọchị Pentikọst afọ 33 ka o bidoro isi n’aka ndịozi ya na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ e tere mmanụ okwu Chineke. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:41, 42.) E nwere ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata ghọrọ Ndị  Kraịst e tere mmanụ n’ụbọchị ahụ. Ha niile ghọtara na Jizọs si n’aka ndịozi ya na-akụziri ha okwu Chineke. “Ha nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “na-ege ntị n’ozizi ndịozi” pụtara na ha ji obi ha niile na-eme ihe ndịozi na-akụzi. Ọ gụsiri ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ agụụ ike ịnụ okwu Chineke. Ha makwa ebe ha ga-aga nụ ya. Ha ji obi ha niile na-ege ntị n’ihe ndịozi Jizọs na-akọwara ha banyere ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Ha na-egekwa ntị ka ha na-eme ka ha ghọtakwuo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara Jizọs. *Ọrụ 2:22-36.

9. Olee otú ndịozi Jizọs si gosi na ha echefughị ọrụ Jizọs nyere ha, nke bụ́ ịkụziri atụrụ ya ihe?

9 Ndịozi Jizọs echefughị na ọrụ Jizọs nyere ha bụ ịna-akụziri atụrụ ya okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, chegodị otú ha si leba anya n’otu okwu gaara etisa ọgbakọ ọhụrụ ahụ. Okwu ahụ bụ banyere otú e si na-eke nri. A na-eleghara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na-asụ asụsụ Grik anya ná nri a na-ekesa. Ma a naghị eleghara ndị nke na-asụ asụsụ Hibru anya. Olee otú ndịozi si dozie okwu a siri ike? “Mmadụ iri na abụọ” ahụ bụ́ ndịozi họpụtara ndị ikom asaa ruru eru ka ha “na-ahụ maka ọrụ a dị mkpa,” ya bụ, ike nri. Mgbe ahụ Jizọs nyere ìgwè mmadụ nri, o nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ndịozi ndị ahụ so kesaara ndị ahụ nri. Ma, ugbu a, ha ghọtara na ihe ka mkpa bụ ịkụziri ọgbakọ dị iche iche okwu Chineke. Ọ bụ ya mere ha ji jiri oge ha niile ‘na-eje ozi banyere okwu Chineke.’—Ọrụ 6:1-6.

10. Olee ọrụ Kraịst ji ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem rụọ?

10 N’afọ 49, ndị so n’òtù na-achị isi bụ ndịozi ka dị ndụ na ụfọdụ ndị okenye ndị ọzọ ruru eru. Baịbụl kpọrọ ha “ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:1, 2.) Ebe ọ bụ na Kraịst bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst, o si n’aka ụmụ nwoke ndị a dị ole na ole mee ka eziokwu dokwuo anya. O sikwa n’aka ha hazie ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Ọrụ 15:6-29; 21:17-19; Kọl. 1:18.

11, 12. (a) Olee ihe gosiri na Jehova gọziri otú ahụ Ọkpara ya si na-akụziri ọgbakọ dị iche iche ihe n’oge ndịozi? (b) Gịnị mere o ji dịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mfe ịmata ndị o si n’aka ha na-akụziri ha ihe?

11 Obi ọ̀ dị Jehova ụtọ na Ọkpara ya haziri otú a ga-esi na-akụziri ọgbakọ ihe n’oge ndịozi? À na-ajụkwa ajụ? Olee ihe mere anyị ji kwuo na obi dị ya ụtọ? Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ma mgbe ha [ya bụ, Pọl onyeozi na ndị ha na ya so]  na-agafe obodo dị iche iche, ha na-enye ndị nọ n’ebe ahụ iwu ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiri ka ha debe. Ya mere, n’ezie, a nọgidere na-eme ka ọgbakọ dị iche iche dị ike n’okwukwe, ha na-amụbakwa n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.” (Ọrụ 16:4, 5) Cheta na ihe mere ọgbakọ ndị ahụ ji mụbaa bụ na ha mere ihe òtù na-achị isi ahụ nọ na Jeruselem gwara ha. Ihe a merenụ ó gosighị na obi dị Jehova ụtọ maka otú Ọkpara ya si hazie ka a na-akụziri ọgbakọ ihe? Ka anyị cheta na ọ bụ naanị ngọzi Jehova ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ, ọtụtụ ndị ana-abatakwa na ya.—Ilu 10:22; 1 Kọr. 3:6, 7.

12 Anyị achọpụtala na e nwere otu ụzọ Jizọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke. O si n’aka mmadụ ole na ole kụziere ọtụtụ ndị ihe. Ndị na-eso ụzọ ya ma ndị o si n’aka ha na-akụzi okwu Chineke n’oge ahụ. A sị ka e kwuwe, ndịozi ya mere ka ndị mmadụ hụ ihe gosiri na Chineke na-akwado ha. Ọ bụ ha bụ ndị mbụ so n’òtù na-achị isi. Ọrụ Ndịozi 5:12 kwuru, sị: “Ndịozi nọkwa na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama na ihe ebube n’etiti ndị mmadụ.” * N’ihi ya, ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-eche, sị, ‘Olee ndị Kraịst si n’aka ha na-akụziri atụrụ ya okwu Chineke?’ Ma mgbe ndịozi nwụchara, ihe gbanwere.

N’oge ndịozi, ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọtara ndị Jizọs si n’aka ha na-akụziri ọgbakọ ya ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

MGBE ATA AHỤ MỤBARA, ỌKA WIT ADỊRỊ OLE NA OLE

13, 14. (a) Gịnị ka Jizọs kwuru banyere nsogbu a ga-enye ọgbakọ Ndị Kraịst? Oleekwa mgbe ihe ahụ o kwuru malitere ime? (b) Olee ụzọ ndị abụọ ga-enye ọgbakọ Ndị Kraịst nsogbu? (Gụọ ihe nke ise e dere n’ala ala peeji nke 19.)

13 Jizọs buru amụma na a ga-enye ọgbakọ Ndị Kraịst nsogbu. Cheta na, n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ọka wit na ata, o kwuru na a ga-akụ ata n’etiti ọka wit. Ọka wit ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ata ahụ abụrụ Ndị Kraịst adịgboroja. O kwuru na a ga-ahapụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi, ya bụ, “n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” (Mat. 13:24-30, 36-43) Ihe a Jizọs kwuru malitere ime n’oge na-adịghị anya. *

14 Ụfọdụ ndị pụrụ n’ọgbakọ n’oge ndịozi ma na-ezi ozizi ụgha. Ma, ndịozi Jizọs bụụrụ ha “ihe mgbochi.” Ha ekweghị ka ndị ahụ pụrụ n’ọgbakọ jiri ozizi ụgha ha na-ezi duhie ndị nọ n’ọgbakọ. (2 Tesa. 2:3, 6, 7) Ma, ozugbo onyeozi ikpeazụ nwụrụ, ndị ahụ si n’ọgbakọ pụọ bidoro duhiewe ndị mmadụ n’ike n’ike. Ha kpara ike ruo ọtụtụ narị afọ. Ihe ọzọ mere n’oge ahụ bụ na ata ahụ mụbara, ọka wit adịrị ole na ole. N’oge ahụ, e nweghịzi ndị doro anya Jizọs si n’aka ha na-akụziri atụrụ ya okwu Chineke. Ma, ihe ga-emecha gbanwee. Olee mgbe ọ ga-abụ?

OLEE NDỊ GA NA-AKỤZIRI NDỊ KRAỊST OKWU CHINEKE N’OGE OWUWE IHE UBI?

15, 16. Olee uru otú Ndị Mmụta Baịbụl si mụsie Akwụkwọ Nsọ ike bara? Olee ajụjụ e kwesịrị ịza?

15 Mgbe oge ọka wit na ata ahụ ga-etokọ fọrọ obere ka ọ gwụ, ọtụtụ ndị chọwara ịma ihe Baịbụl na-akụzi. Cheta na tupu afọ 1879, e nwere mmadụ ole na ole chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu. Ha bịakọtara ọnụ na-amụ Baịbụl. O nweghị ihe jikọrọ ha na ndị ahụ yiri ata, ya bụ, Ndị Kraịst adịgboroja nọ na chọọchị Krisendọm. Ihe ha kpọrọ onwe ha mgbe ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Ha dị obi umeala, jirikwa obi ọcha ha na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ha na-ekpekwa ekpere ka Chineke nyere ha aka.—Mat. 11:25.

16 Otú Ndị Mmụta Baịbụl si mụsie Akwụkwọ Nsọ ike bara ezigbo uru. Ha gbara ozizi ụgha n’anwụ ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ha bikwara ọtụtụ akwụkwọ e ji amụ Baịbụl, kesaa ha n’ebe niile. Otú ha si kwusaa ozi ọma ruru ndị mmadụ n’obi, meekwa ka o doo  ọtụtụ ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl anya na ihe ha nụrụ bụ eziokwu. N’ihi ya, ajụjụ dị mkpa bụ: Ọ̀ bụ Ndị Mmụta Baịbụl ndị nọ tupu afọ 1914 ka Kraịst ga-esi n’aka ha na-akụziri atụrụ ya ihe? Mba. Ata na ọka wit ka na-etokọ mgbe ahụ. A ka na-ahazikwa otú a ga-esi na-akụziri ezi Ndị Kraịst ihe ahazi mgbe ahụ. Mgbe a ga-amata ihe dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja yiri ata na ezigbo Ndị Kraịst yiri ọka wit erubeghị.

17. Olee ihe ndị dị mkpa malitere ime n’afọ 1914?

17 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na oge owuwe ihe ubi malitere n’afọ 1914. Ọ bụ n’afọ ahụ ka ọtụtụ ihe dị mkpa malitere ime. Jizọs ghọrọ Eze n’afọ ahụ, oge ikpeazụ amalitekwa. (Mkpu. 11:15) Bido n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919, Jizọs so Nna ya bịa n’ụlọ nsọ ahụ, ya bụ, ndokwa Chineke mere nke ga-enyere ndị mmadụ aka ife ya. Ha bịara ka ha nyochaa ya ma mee ka ọ dị ọcha. * (Mal. 3:1-4) Ọ bụzi n’afọ 1919 ka a malitere ịchịkọta ndị ahụ bụ́ ọka wit. Ọ̀ bụ mgbe ahụ ka Kraịst ga-ahọpụta ndị ọ ga-esi n’aka ha na-akụziri atụrụ ya ihe? Ọ bụ ya!

18. Olee ndị Jizọs buru amụma na ya ga-ahọpụta? Olee ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịza mgbe oge ikpeazụ malitere?

18 N’amụma ahụ Jizọs buru banyere oge ikpeazụ, o kwuru na ya ga-ahọpụta ndị ọ ga-esi n’aka ha na-enye ndị na-eso ụzọ ya ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Mat. 24:45-47) Olee ndị ọ ga-abụ? Jizọs ga-emekwa ihe ahụ o mere n’oge ndịozi. Ọ ga-esi n’aka mmadụ ole na ole na-enye ọtụtụ ndị nri. Ma, mgbe oge ikpeazụ malitere, ajụjụ dị mkpa bụ, Ole ndị ga-abụ mmadụ ole na ole ahụ? A ga-aza ajụjụ a na ajụjụ ndị ọzọ gbasara amụma ahụ Jizọs buru n’isiokwu na-eso nke a.

 

^ para. 3 Paragraf nke 3: Mgbe Jizọs nyere puku ụmụ nwoke anọ nri n’oge ọzọ, ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụaka, ihe o mekwara bụ inye ndị na-eso ụzọ ya nri ahụ, ha ‘ekesaara ya ìgwè mmadụ ahụ.’—Mat. 15:32-38.

^ para. 7 Paragraf nke 7: Mgbe Pita dị ndụ, ndị niile bụ́ “ụmụ atụrụ” Jizọs a ga-akụziri okwu Chineke nwere olileanya ịga eluigwe.

^ para. 8 Paragraf nke 8: Ebe ọ bụ na e kwuru na ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ “nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi,” ọ pụtara na ndịozi na-akụziri ha ihe mgbe niile. E dere ụfọdụ n’ime ihe ndịozi kụziri n’akwụkwọ ndị e dere n’ike mmụọ nsọ. Ha mechara soro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

^ para. 12 Paragraf nke 12: Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị naanị ndịozi ka e nyere ike ịrụ ọrụ ebube, ọ dị ka à na-esikarị n’aka ha enye ndị ọzọ ike ahụ. Mgbe ụfọdụ, onyeozi na-anọ mgbe a na-enye mmadụ ikike ahụ.—Ọrụ 8:14-18; 10:44, 45.

^ para. 13 Paragraf nke 13: Ihe Pọl onyeozi kwuru n’Ọrụ Ndịozi 20:29, 30 gosiri na e nwere ụzọ ndị abụọ ga-enye ọgbakọ Ndị Kraịst nsogbu. Ndị nke mbụ ga-abụ Ndị Kraịst adịgboroja (bụ́ ndị yiri ata). Ha “ga-abata n’etiti” ezigbo Ndị Kraịst. Ndị nke abụọ ga-abụ ‘ndị si n’etiti’ ezigbo Ndị Kraịst pụọ ma malite ịkụzi ozizi ụgha, “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ.”

^ para. 17 Paragraf nke 17: Gụọ isiokwu bụ́ “Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile,” n’Ụlọ Nche a, peeji nke 11, paragraf nke 6.