Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2013

“Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”

“Lee! M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”

“Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—MAT. 28:20.

1. (a) Olee ihe atụ Jizọs mere gbasara ọka wit na ata? (b) Olee otú Jizọs si kọwaa ihe atụ a?

JIZỌS mere ọtụtụ ihe atụ banyere Alaeze Chineke. Otu n’ime ha bụ banyere nwoke ghara ezigbo ọka wit n’ubi ya nakwa onye iro nke gara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ. Ata ahụ pulitere kpuchie ọka wit ahụ, ma nwoke ahụ gwara ndị ohu ya ka ha ‘hapụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi.’ N’oge owuwe ihe ubi, a ga-achịkọta ọka wit ma suo ata ndị ahụ ọkụ. Jizọs kwuru ihe ihe atụ ahụ pụtara. (Gụọ Matiu 13:24-30, 37-43.) Gịnị ka ọ pụtara? (Gụọ chaatị bụ́ “Ọka Wit na Ata.”)

2. (a) Gịnị ka ihe ndị ahụ na-eme n’ubi nwoke ahụ na-egosi? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọka wit ahụ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya. Ihe a niile mere n’ubi nwoke ahụ na-egosi otú Jizọs ga-esi chịkọta ndị a e tere mmanụ nakwa mgbe ọ ga-achịkọta ha. Ọ bụ na Pentikọst afọ 33 ka a malitere ịkụ ọka wit ahụ. A ga-achịkọtacha ha mgbe a kachara ndị nke ka nọ n’ụwa n’ọgwụgwụ usoro ihe ochie a akara, e mechazie ha agaa eluigwe. (Mat. 24:31; Mkpu. 7:1-4) Mmadụ chọọ ịhụ otú ebe o bi dị, o nwere ike ịhụ ya nke ọma ma ọ rịgoro n’ebe dị elu. Ọ bụ otú ahụ ka ihe atụ a Jizọs mere ga-esi nyere anyị aka ịghọtakwu ihe ndị ga-eme n’ime ihe dị ka puku afọ abuọ. Olee ihe ụfọdụ gbasara Alaeze ahụ ndị anyị na-aghọta ugbu a? N’ihe atụ ahụ, Jizọs kwuru gbasara oge ịkụ ihe, oge ihe a kụrụ na-eto, na oge owuwe ihe ubi. Ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a bụ banyere oge owuwe ihe ubi. *

JIZỌS NA-ECHEBE NDỊ KRAỊST E TERE MMANỤ

3. (a) Olee ihe malitere ime n’ihe dị ka n’afọ 100 n’Oge Ndị Kraịst? (b) Olee ihe Matiu 13:28 kwuru na a jụrụ nna ukwu ahụ? Oleekwa ndị jụrụ ya ajụjụ ahụ? (Gụọkwa ihe nke abụọ e dere n’ala ala peeji nke 14.)

3 ‘Ata ndị ahụ pulitere’ n’ihe dị ka n’afọ 100 n’Oge Ndị Kraịst. Ha bụ Ndị Kraịst ụgha. (Mat. 13:26) N’ihe dị ka n’afọ 300, Ndị Kraịst yiri ata karịrị Ndị Kraịst e tere  mmanụ. Cheta na n’ihe atụ ahụ, ndị ohu nwoke ahụ jụrụ ya ma ọ̀ chọrọ ka ha gaa fopụsịa ata ndị ahụ. * (Mat. 13:28) Gịnị ka nna ha ukwu gwara ha?

4. (a) Gịnị ka ihe Jizọs kwuru banyere ọka wit na ata na-egosi? (b) Olee mgbe a malitere ịmata Ndị Kraịst yiri ọka wit ahụ?

4 Mgbe Jizọs na-ekwu banyere ọka wit ahụ na ata ahụ, o kwuru, sị: “Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi.” Ihe a o kwuru gosiri na kemgbe oge ndịozi, o nwebeghị mgbe Ndị Kraịst e tere mmanụ kọrọ n’ụwa. Ihe Jizọs mechara gwa ndị na-eso ụzọ ya gosiri na nke a bụ eziokwu. Ọ gwara ha, sị: “M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) N’ihi ya, Jizọs ga na-echebe Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọtụtụ afọ ga-agafe ruo mgbe oge ikpeazụ ga-amalite. Ma, ebe ọ bụ na Ndị Kraịst yiri ata gbara Ndị Kraịst e tere mmanụ gburugburu, anyị amaghị ndị so n’ọka wit ahụ n’afọ ndị ahụ niile. Ma, n’ihe dị ka afọ iri atọ tupu oge owuwe ihe ubi, a malitere ịmata ndị so n’ọka wit ahụ. Olee otú e si mata ha?

ONYE OZI NKE ‘KWADEBERE ỤZỌ’

5. Olee otú amụma Malakaị buru si mezuo mgbe Jizọs nọ n’ụwa?

 5 Ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs emee ihe atụ ahụ o mere banyere ọka wit na ata, Jehova gwara Malakaị onye amụma ka o buo amụma. Amụma ahụ o buru yiri ihe atụ ahụ Jizọs mere. (Gụọ Malakaị 3:1-4.) Ọ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ ‘onye ozi nke kwadebere ụzọ.’ (Mat. 11:10, 11) Mgbe ọ malitere ozi ya n’afọ 29, oge a ga-ekpe ndị Izrel ikpe eruwela. Ọ bụ Jizọs bụ onye ozi nke abụọ. O mere ka ụlọ nsọ dị na Jeruselem dị ọcha ugboro abụọ. Nke mbụ bụ mgbe ọ malitere ozi ya, nke abụọ abụrụ mgbe ọ fọrọ obere ka  o jechaa ozi ya. (Mat. 21:12, 13; Jọn 2:14-17) N’ihi ya, o were Jizọs oge ime ka ụlọ nsọ ahụ dị ọcha.

6. (a) Olee otú amụma ahụ Malakaị buru si mezuo karịa otú o mezuburu? (b) Olee mgbe Jizọs bịara inyocha ụlọ nsọ ahụ? (Gụọ ihe nke atọ e dere n’ala ala peeji nke 14.)

 6 Olee otú amụma ahụ Malakaị buru si mezuo karịa otú o mezuburu? Ọtụtụ afọ tupu 1914, C. T. Russell na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ rụrụ ọrụ yiri nke ahụ Jọn Onye Na-eme Baptizim rụrụ. Ọrụ ahụ ha rụrụ bụ ime ka ndị mmadụ mata eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ha kụziri ihe àjà ahụ Kraịst chụrụ iji gbapụta ndị mmadụ pụtara. Ha mere ka a mata na ozizi ọkụ ala mmụọ abụghị eziokwu. Ha kwukwara banyere mgbe oge ndị Jentaịl ga-agwụ. Ma, a ka nwere ọtụtụ okpukpe na-ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. N’ihi ya, ajụjụ dị mkpa e kwesịrị ịza bụ: N’ime okpukpe a niile, ole ndị bụ ọka wit? Jizọs zara ajụjụ ahụ n’afọ 1914 mgbe ọ malitere inyocha ụlọ nsọ ahụ ma mee ka ọ dị ọcha. Ụlọ nsọ ahụ bụ ndokwa Chineke mere nke ga-enyere ndị mmadụ aka ife ya. Ọrụ ahụ Jizọs rụrụ were oge. Ọ malitere n’afọ 1914 ruo ná mmalite afọ 1919. *

AFỌ NDỊ E JI NYOCHAA NDỊ E TERE MMANỤ, MEEKWA KA HA DỊ ỌCHA

7. Gịnị ka Jizọs chọpụtara mgbe ọ bịara n’afọ 1914 ka ọ mara otú Ndị Kraịst si arụ ọrụ o nyere ha?

7 Gịnị ka Jizọs chọpụtara mgbe ọ bịara ịma otú Ndị Kraịst si arụ ọrụ o nyere ha? Ọ chọpụtara na Ndị Mmụta Baịbụl ndị dị ole na ole ji ike ha na ego ha na-arụ ọrụ ikwusa ozi ọma kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ. * Obi dị Jizọs na ndị mmụọ ozi ezigbo ụtọ mgbe ha chọpụtara na mmadụ ole na ole a yiri ọka wit ekweghị ka ata Setan  kpagbuo ha. Ma, e kwesịrị ime “ka ụmụ Livaị dị ọcha,” ya bụ, ndị e tere mmanụ. (Mal. 3:2, 3; 1 Pita 4:17) Olee ihe mere e kwesịrị iji mee ka ha dị ọcha?

8. Olee ihe ndị mere mgbe afọ 1914 gachara?

8 Ná ngwụcha afọ 1914, ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl dara mbà n’obi n’ihi na ha agaghị eluigwe. N’afọ 1915 na 1916, ha kwụsịrị ịgachi ozi ọma anya n’ihi nsogbu ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-enye ha. Mgbe Nwanna Russell nwụrụ n’ọnwa Ọktoba 1916, ihe ka njọ mere. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ malitere imegide ndị na-edu ndú. N’oge ahụ, e nwere mmadụ asaa na-elekọta ọrụ Ndị Mmụta Baịbụl. Mgbe a họpụtara Nwanna Rutherford ka ọ na-edu ndú, mmadụ anọ n’ime ha nupụrụ isi, na-agbalịkwa ịkpata nsogbu n’ọgbakọ. Ma, n’ọnwa Ọgọst 1917, ha si na Betel pụọ. Ọ bụ otu ụzọ e si mee ka ọgbakọ dị ọcha. Ihe ọzọ merenụ bụ na ụfọdụ Ndị Mmụta Baịbụl kwụsịrị ife Chineke n’ihi na ha tụrụ egwu mmadụ. Ma, mgbe Jizọs bịara ime ka ọgbakọ dị ọcha, ọtụtụ n’ime ha gbanwere àgwà ha ka ha nwee ike ịdị ọcha n’anya Chineke. N’ihi ya, Jizọs kpebiri na ọ bụ ha bụ ezigbo Ndị Kraịst yiri ọka wit ahụ. Ma, ọ mara Ndị Kraịst ụgha niile nọ n’ọgbakọ ikpe, ma ndị niile nọ na chọọchị Krisendọm. (Mal. 3:5; 2 Tim. 2:19) Gịnịzi mere? Ka anyị gaghachi n’ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere ọka wit na ata.

GỊNỊ GA-EME MGBE A MALITERE IWE IHE UBI?

9, 10. (a) Gịnị ka anyị ga-atụle banyere oge owuwe ihe ubi? (b) Olee ihe mbụ mere n’oge owuwe ihe ubi?

9 Jizọs kwuru na “owuwe ihe ubi ahụ bụ ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” (Mat. 13:39) Owuwe ihe ubi a malitere n’afọ 1914. Ka anyị tụlee ihe ise Jizọs kwuru ga-eme n’oge owuwe ihe ubi.

10 Ihe mbụ ga-emenụ bụ na a ga-achịkọta ata. Jizọs kwuru, sị: “N’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù.” Mgbe afọ 1914 gachara, ndị mmụọ ozi bidoro ‘ịchịkọta’ Ndị Kraịst yiri ata. Ha mere ka a ghara inwe ihe jikọrọ ndị a yiri ata na ndị e tere mmanụ, bụ́ “ụmụ nke alaeze.”—Mat. 13:30, 38, 41.

11. Kemgbe ụwa, olee ihe mere ka ezigbo Ndị Kraịst dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja?

11 Ka a na-achịkọta ata ndị ahụ, a matakwuru ihe dị iche n’ọka wit na ata ahụ. (Mkpu. 18:1, 4) N’afọ 1919, o doro anya na Babịlọn Ukwu ahụ adaala. Olee ihe kacha mee ka ezigbo Ndị Kraịst dị iche ná Ndị Kraịst adịgboroja? Ọ bụ ozi ọma ha na-ekwusa. Ndị na-ahaziri Ndị Mmụta Baịbụl ọrụ malitere ikwusi okwu ike na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịga na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ha bipụtara otu akwụkwọ nta n’asụsụ Bekee n’afọ 1919. Isiokwu ya bụ “Ndị E Nyere Ọrụ Ahụ.” Ọ gbara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ume ka ha na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “Ọrụ a ga-arụ buru ibu, ma ọ bụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji rụọ ya. Unu so na-arụ ya n’ihi na ọ bụ ihe ùgwù.” Gịnịzi ka ụmụnna mere? Ụlọ Nche 1922 kwuru na malite mgbe ahụ gawa, ụmụnna gachiwere ozi ọma anya. Ọ dịghị anya, ịga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma aghọọ ihe e ji mara Ndị Kraịst ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụkwa ya ka e ji mara anyị taa.

12. Olee mgbe a malitere ịchịkọta ndị ahụ yiri ọka wit?

12 Ihe nke abụọ ga-emenụ bụ na a ga-achịkọta ọka wit. Jizọs nyere ndị mmụọ ozi ya iwu ka ha gaa ‘chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe ya.’ (Mat. 13:30) Kemgbe afọ 1919, a na-achịbata ndị e tere mmanụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. E nwere Ndị Kraịst e tere mmanụ ka ga-adị ndụ n’ọgwụgwụ usoro ihe ochie a. Mgbe a ga-emecha chịkọta ha bụ mgbe ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—Dan. 7:18, 22, 27.

13. Gịnị ka Mkpughe 18:7 kwuru na Krisendọm na okpukpe ndị ọzọ so na Babịlọn Ukwu ahụ na-eme ugbu a?

 13 Ihe nke atọ ga-emenụ bụ na ata ahụ ga-akwa ákwá, taakwa ikikere ezé. Ndị mmụọ ozi kekọtachaa ata ahụ, gịnịzi ga-eme? Jizọs kwuru ihe ndị ahụ bụ́ ata ga-eme. Ọ sịrị: “N’ebe ahụ ka ha ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.” (Mat. 13:42) Ihe a Jizọs kwuru ọ̀ malitela ime? Mba. Ị manụ na Krisendọm so na nwaanyị akwụna ahụ. Ọ ka na-ekwu, sị: “Anọ m ọdụ dị ka eze nwaanyị, abụghịkwa m nwaanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa mgbe m ga-ahụ iru uju.” (Mkpu. 18:7) Nke bụ́ eziokwu bụ na Krisendọm ka na-akpa ike. Ọ na-ekwudị na ya nọ “ọdụ dị ka eze nwaanyị” ndị ọchịchị. Ka ọ dị ugbu a, ndị bụ́ ata ahụ anaghị eru uju, kama ha na-etu ọnụ. Ma, egwú ga-adagharị n’oge na-adịghị anya.

Krisendọm na ndị ọchịchị ụwa bụ nnu na mmanụ ugbu a. Ma, egwú ga-adagharị n’oge na-adịghị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

14. (a) Olee mgbe Ndị Kraịst adịgboroja ‘ga-ata ikikere ezé’? Gịnịkwa mere ha ga-eji ata ya? (b) Olee otú Abụ Ọma 112:10 si kwado otú anyị si ghọta Matiu 13:42 ugbu a? (Gụọ ihe nke ise e dere n’ala ala peeji nke 14.)

14 Mgbe e bibichara okpukpe ụgha niile n’oké mkpagbu ahụ, ndị na-akwadobu ha ga-agba ọsọ, na-achọ ebe ha ga-ezo, ma ha agaghị ahụ ebe ọ bụla. (Luk 23:30; Mkpu. 6:15-17) Ebe ọ bụ na ha ma na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ibibi ha, ha ga-akwa ákwá arịrị, ‘taakwa ikikere ezé’ n’ihi na iwe jizi ha. Ha ga-eme ihe Jizọs buru amụma na ha ga-eme n’oké mkpagbu ahụ. Ha “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị.” *Mat. 24:30; Mkpu. 1:7.

15. Gịnị ka a ga-eme ata ndị ahụ? Olee mgbe ọ ga-abụ?

15 Ihe nke anọ ga-emenụ bụ na a ga-atụba ata ahụ n’oké ọkụ. Jizọs kwuru na e kekọtachaa ata ndị ahụ n’ùkwù n’ùkwù, ndị mmụọ ozi ‘ga-atụba ha n’oké ọkụ.’ (Mat. 13:42) Ọ pụtara na a ga-ebibi ha. N’ihi ya, ọ bụ n’agha Amagedọn ka a ga-ebibi ndị ahụ na-akwadobu okpukpe ụgha. Agha ahụ bụ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ.—Mal. 4:1.

16, 17. (a) N’ihe atụ ahụ Jizọs mere, gịnị bụ ihe ikpeazụ o kwuru ga-eme? (b) Gịnị mere anyị ji kwuo na ọ bụ n’ọdịnihu ka ihe ahụ o kwuru ga-eme?

16 Ihe nke ise ga-emenụ bụ na ndị ezi omume ga na-enwu gbaa. Ihe ikpeazụ Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru bụ: “N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ n’alaeze nke Nna ha.” (Mat. 13:43) Olee mgbe ọ ga-abụ? Ọ̀ bụkwa n’ebee? Ihe Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru ga-eme n’eluigwe n’ọdịnihu, ọ bụghị n’ụwa. * Ka anyị tụlee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú a.

17 Nke mbụ bụ mgbe Jizọs kwuru ihe ahụ ga-eme. O kwuru, sị: “N’oge ahụ, ndị ezi  omume ga-enwu gbaa.” O doro anya na okwu ahụ bụ́ “n’oge ahụ” na-ekwu banyere ihe ahụ Jizọs ka kwuchara, ya bụ, ‘ịtụba ata ndị ahụ n’oké ọkụ.’ Mgbe ọ ga-eme bụ n’agha Amagedọn. Ọ bụ n’agha ahụ ka oké mkpagbu ahụ ga-ebi. N’ihi ya, ndị e tere mmanụ ‘ga-enwukwa gbaa’ mgbe ahụ. Ihe nke abụọ bụ ebe Jizọs kwuru ihe ahụ ga-eme. Jizọs kwuru na ndị ezi omume ‘ga-enwu gbaa n’alaeze Nna ha.’ Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara na a ga-akacha ndị niile e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ka nọ n’ụwa akara ikpeazụ tupu agba nke mbụ nke oké mkpagbu ahụ agachaa. A ga-akpọgazi ha eluigwe otú ahụ Jizọs kwuru n’amụma o buru banyere oké mkpagbu ahụ. (Mat. 24:31) Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha ga-enwu gbaa ‘n’alaeze Nna ha.’ A lụchaa agha Amagedọn, ọ gaghị adị anya e nwee “ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ.” Obi ga-adị ha ụtọ iso bụrụ nwaanyị ahụ Jizọs na-alụ ọhụrụ.—Mkpu. 19:6-9.

URU NDỊ ANYỊ RITERE

18, 19. Olee uru ndị anyị ritere n’ihe anyị ghọtara n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ọka wit na ata?

18 Olee uru anyị ritere n’otú a anyị si leruo ilu Jizọs ahụ anya? Ka anyị tụlee uru atọ anyị ritere. Nke mbụ bụ na o meela ka anyị ghọtakwuo ihe ụfọdụ. Ihe atụ ahụ mere ka a mata ihe dị mkpa mere Jehova ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme. Ọ ‘hapụrụ arịa ndị dịịrị ọnụma’ ka o nwee ike ịkwadebe “arịa ndị dịịrị ebere,” ya bụ, ndị ahụ yiri ọka wit. * (Rom 9:22-24) Uru nke abụọ anyị ritere bụ na o meela ka obi sie anyị ike. Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, ndị iro anyị ga-eji ike ha niile na-alụso anyị ọgụ, ‘ma ha agaghị emeri anyị.’ (Gụọ Jeremaya 1:19.) Kemgbe ụwa, Jehova bụ́ Nna anyị nke eluigwe na-echebe ndị ahụ bụ́ ọka wit. Otú ahụkwa ka ọ ga-esi n’aka Jizọs na ndị mmụọ ozi na-echebe anyị “ụbọchị niile.”Mat. 28:20.

19 Uru nke atọ anyị ritere bụ na ihe atụ ahụ emeela ka anyị mata ndị bụ́ ọka wit. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị amata ndị ahụ bụ́ ọka wit, anyị ga-enwe ike ịza ajụjụ Jizọs jụrụ n’amụma o buru gbasara oge ikpeazụ. Ọ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?” (Mat. 24:45) Isiokwu abụọ ndị na-eso nke a ga-aza ajụjụ ahụ nke ọma.

 

^ para. 2 Paragraf nke 2: Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Ezi Omume Ga-enwu Gbaa Dị Ka Anyanwụ” n’Ụlọ Nche Mach 15, 2010 ka i nwee ike icheta ihe ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru n’ilu a pụtara.

^ para. 3 Paragraf nke 3: Ndị ohu ndị a nọchiri anya ndị mmụọ ozi n’ihi na ndịozi Jizọs anwụchaala mgbe ahụ. Ihe ọzọ mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na ihe nọchiri anya ndị e tere mmanụ ka nọ n’ụwa bụ ọka wit, ọ bụghị ndị ohu. E mechara kwuo n’ihe atụ ahụ na ndị na-achịkọta ata ndị ahụ bụ ndị mmụọ ozi.—Mat. 13:39.

^ para. 6 Paragraf nke 6: Ihe a bụ ihe ọhụrụ anyị ghọtara. Anyị cheburu na ọ bụ n’afọ 1918 ka Jizọs nyochara ndị e tere mmanụ.

^ para. 7 Paragraf nke 7: Malite n’afọ 1910 ruo n’afọ 1914, Ndị Mmụta Baịbụl kesara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde akwụkwọ anọ. Traktị na akwụkwọ nta ha kesara karịrị narị nde abụọ.

^ para. 14 Paragraf nke 14: Ihe a bụ otú anyị si ghọta Matiu 13:42 ugbu a. Akwụkwọ anyị kwuburu na Ndị Kraịst adịgboroja ‘na-akwa ákwá, na-atakwa ikikere ezé’ kemgbe ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-ewute ha na “ụmụ nke alaeze” na-eme ka a mara na ha bụ “ụmụ ajọ onye ahụ.” (Mat. 13:38) Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ bụ mgbe a ga-ebibi ha ka ha ga-ata ikikere ezé.—Ọma 112:10.

^ para. 16 Paragraf nke 16: Daniel 12:3 kwuru na “ndị nwere nghọta [ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ] ga na-enwu dị ka ìhè mbara igwe.” Mgbe ha ka nọ n’ụwa, otú ha si eme ya bụ ikwusa ozi ọma. Ma, Matiu 13:43 na-ekwu banyere mgbe ha ga na-enwu gbaa n’Alaeze eluigwe. Anyị cheburu na amaokwu abụọ ahụ na-ekwu banyere otu ihe ahụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma.

^ para. 18 Paragraf nke 18: Gụọ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, peeji nke 288-289.