Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JULAỊ 2013

“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”

“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”

“Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?”—MAT. 24:3.

1. Gịnị ka ndịozi Jizọs chọrọ ịmata, nke anyịnwa chọkwara ịmata?

MGBE ọ fọrọ obere ka Jizọs jechaa ozi ya n’ụwa, ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịmata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. N’ihi ya, mgbe ọ fọrọ naanị ụbọchị ole na ole ka ọ nwụọ, mmadụ anọ n’ime ha jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Mat. 24:3; Mak 13:3) Ihe Jizọs ji zaa ha ajụjụ ahụ bụ amụma e dere na Matiu isi iri abụọ na anọ na iri abụọ na ise. N’amụma ahụ, Jizọs kwuru ọtụtụ ihe dị mkpa ga-emenụ. Ihe ndị o kwuru ga-abara anyị ezigbo uru n’ihi na anyịnwa chọkwara ịma ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

2. (a) Kemgbe ọtụtụ afọ, olee amụma Jizọs buru nke anyị gbalịrịla ka anyị ghọtakwuo? (b) Olee ajụjụ atọ anyị ga-atụle?

2 Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị ohu Jehova amụọla amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ ma kpee ekpere ka ha ghọta ya. Ha agbalịsiela ike ka ha ghọtakwuo mgbe amụma ahụ Jizọs buru ga-emezu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ atọ gbasara mgbe amụma ahụ ga-emezu, ka anyị hụ otú anyị sirila ghọtakwuo amụma ahụ. Ajụjụ ndị ahụ bụ, Olee mgbe “oké mkpagbu” ahụ ga-amalite? Olee mgbe Jizọs ga-ekpe ndị bụ́ “atụrụ” na ndị bụ́ “ewu” ikpe? Olee mgbe Jizọs ‘ga-abịa’?—Mat. 24:21; 25:31-33.

OLEE MGBE OKÉ MKPAGBU AHỤ GA-AMALITE?

3. N’oge gara aga, gịnị ka anyị chere banyere mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite?

3 Ruo ọtụtụ afọ, anyị chere na oké mkpagbu ahụ malitere n’afọ 1914 mgbe Agha Ụwa Mbụ malitere. Anyị chekwara na Jehova mere ka “ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi” n’afọ 1918 mgbe agha ahụ biri. Anyị chere na ihe mere o ji mee ya bụ ka ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ nwee ike ikwusara mba niile ozi ọma. (Mat. 24:21, 22) Mgbe e kwusachara ozi ọma, a ga-ebibi ụwa Setan. N’ihi ya,  anyị chere mgbe ahụ na oké mkpagbu ahụ ga-enwe agba atọ. Nke mbụ bụ mbido ya (malite n’afọ 1914 ruo n’afọ 1918). Nke abụọ abụrụ mgbe oké mkpagbu ahụ ga-akwụsịtụ (malite n’afọ 1918 gawa). Nke atọ abụrụ mgbe ọ ga-ebi n’Amagedọn.

4. Olee ihe anyị ghọtara nke mere ka amụma Jizọs buru banyere oge ikpeazụ dokwuo anyị anya?

4 Ma, mgbe anyị lebakwuru anya n’amụma ahụ Jizọs buru, anyị ghọtara na ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ Jizọs buru n’amụma banyere oge ikpeazụ ga-emezu ugboro abụọ. (Mat. 24:4-22) Ebe mbụ o mezuru bụ na Judia n’oge ndịozi Jizọs. Mgbe ọzọ ọ ga-emezu bụ n’oge anyị a. Ọ ga-ezukwa ụwa ọnụ. Ihe a anyị ghọtara mere ka ọtụtụ ihe dokwuo anyị anya. *

5. (a) Olee oge ahụhụ nke malitere n’afọ 1914? (b) Olee oge ya na oge nhụjuanya ahụ yiri n’oge ndịozi Jizọs?

5 Anyị ghọtakwara na oké mkpagbu ahụ amaliteghị n’afọ 1914. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na amụma e buru na Baịbụl mere ka anyị mata na ihe mbụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ bụ mbibi a ga-ebibi okpukpe ụgha, ọ bụghị agha mba dị iche iche ga-alụso ibe ha. N’ihi ya, ihe ndị malitere ime n’afọ 1914 apụtaghị na oké mkpagbu ahụ ebidola, kama o gosiri na oge nhụjuanya amalitela. (Mat. 24:8) Oge nhụjuanya ahụ yiri ihe mere na Jeruselem nakwa na Judia malite n’afọ 33 ruo n’afọ 66 n’Oge Ndị Kraịst.

6. Olee ihe ga-egosi na oké mkpagbu ahụ amalitela?

6 Olee ihe ga-egosi na oké mkpagbu ahụ amalitela? Jizọs buru amụma, sị: “Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ, (onye na-agụ, ya jiri nghọta mee ihe,) mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.” (Mat. 24:15, 16) Mgbe mbụ amụma a mezuru bụ n’afọ 66 mgbe ndị agha Rom bịara ibibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ọ bụ ndị agha ahụ bụ “ihe  arụ” nke “guzo n’ebe nsọ,” ya bụ, n’ebe ndị Juu weere ka ebe dị nsọ. Amụma a ga-emezu ọzọ. Ma, otú ọ ga-esi emezu ga-aka nke mbụ ahụ. Ọ ga-emezu mgbe Òtù Mba Ụwa (nke bụ́ “ihe arụ” n’oge anyị a) ga-ebibi Krisendọm (nke dị nsọ n’anya Ndị Kraịst elu ọnụ) nakwa okpukpe ndị ọzọ so na Babịlọn Ukwu ahụ. A kọwara mbibi ahụ ná Mkpughe 17:16-18. Ọ bụ otú ahụ ka oké mkpagbu ahụ ga-esi malite.

7. (a) Olee otú e si zọpụta ‘anụ ahụ́’ ụfọdụ n’oge ndịozi Jizọs? (b) Gịnị ka anyị na-atụ anya ga-eme n’ọdịnihu?

7 Jizọs bukwara amụma, sị: “A ga-eme ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi.” Mgbe mbụ amụma a mezuru bụ n’afọ 66 n’Oge Ndị Kraịst mgbe ndị agha Rom mere ka ọgụ ha bịara ịlụso Jeruselem “dị mkpirikpi.” Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Jeruselem nakwa na Judia mgbe ahụ gbapụrụ. Ọ bụ ya mere e ji nwee ike ‘ịzọpụta anụ ahụ́’ ha, ya bụ, ndụ ha. (Gụọ Matiu 24:22; Mal. 3:17) N’ihi ya, gịnị ka anyị na-atụ anya ga-eme n’oké mkpagbu na-abịanụ? Jehova ga-eme ka mbibi Òtù Mba Ụwa ga-ebibi okpukpe ụgha “dị mkpirikpi.” Ọ gaghị ekwe ka e bibie ezi ofufe mgbe a na-ebibi okpukpe ụgha. Ọ bụ ya ga-eme ka a zọpụta ndị Chineke.

8. (a) Olee ihe ndị ga-eme ma ihe mbụ ahụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ mechaa? (b) Olee mgbe o nwere ike ịbụ na ndị fọdụrụ n’otu narị puku mmadụ na iri puku anọ na puku anọ ahụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe? (Gụọ ihe nke abụọ e dere n’ala ala peeji nke 8.)

 8 Olee ihe ga-eme ma ihe mbụ ahụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ mechaa? Ihe Jizọs kwuru gosiri na e nwere oge ga-agafe tupu Amagedọn amalite. Olee ihe ndị ga-eme n’oge ahụ? A zara ajụjụ a n’Ezikiel 38:14-16 nakwa na Matiu 24:29-31. (Gụọ ya.) * Ihe ahụ mechaa, agha Amagedọn ga-amalite. Ọ bụ ya bụ ihe ikpeazụ ga-eme n’oké mkpagbu ahụ. Ihe ya na ya yiri bụ mbibi e bibiri Jeruselem n’afọ 70 n’Oge Ndị Kraịst. (Mal. 4:1) Ebe ọ bụ na oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’agha Amagedọn, o gosiri  na oké mkpagbu ahụ ga-abụ ihe “a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere.” (Mat. 24:21) Ya gachaa, Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-amalite.

9. Olee uru amụma ahụ Jizọs buru banyere oké mkpagbu ahụ baara ndị Jehova?

9 Amụma a e buru banyere oké mkpagbu ahụ na-eme ka obi sie anyị ike. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-eme ka anyị mata na n’agbanyeghị ihe nwere ike ime n’oké mkpagbu ahụ, ndị Jehova ga-esi na ya pụta. (Mkpu. 7:9, 14) Ihe kacha eme anyị obi ụtọ gbasara Amagedọn bụ na ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova ga-eme ka o doo anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, meekwa ka e doo aha ya nsọ.—Ọma 83:18; Ezik. 38:23.

OLEE MGBE JIZỌS GA-EKPE NDỊ BỤ́ ATỤRỤ NA NDỊ BỤ́ EWU IKPE?

10. N’oge gara aga, gịnị ka anyị chere banyere mgbe a ga-ekpe ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu ikpe?

10 Ihe anyị ga-atụle ugbu a bụ mgbe ihe ọzọ Jizọs buru n’amụma ga-emezu, ya bụ, ilu ọ tụrụ banyere ikpe ọ ga-ekpe ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. (Mat. 25:31-46) N’oge gara aga, anyị chere na ọ bụ n’oge ikpeazụ a nke malitere n’afọ 1914 ka a na-ekpebi ma ndị mmadụ hà bụ atụrụ ka hà bụ ewu. Anyị chere na ndị jụrụ ozi ọma Alaeze Chineke ma nwụọ tupu oké mkpagbu ahụ amalite bụ ndị bụ́ ewu, nke pụtara na a gaghị akpọlite ha n’ọnwụ.

11. Gịnị mere na o nweghị ike ịbụ n’afọ 1914 ka Jizọs malitere ikpebi ma ndị mmadụ hà bụ atụrụ ka hà bụ ewu?

11 N’afọ 1995, Ụlọ Nche lebara anya ọzọ na Matiu 25:31. Amaokwu ahụ kwuru, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube.” Ụlọ Nche ahụ kwuru na Jizọs ghọrọ Eze n’afọ 1914, ma ọ bụghị mgbe ahụ ka ọ malitere ikpe “mba niile” ikpe. (Mat. 25:32; tụlee Daniel 7:13.) Ma, ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu mere ka a mata ihe Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-abụ Onyeikpe. (Gụọ Matiu 25:31-34, 41, 46.) Ebe ọ bụ na Jizọs amaliteghị ikpe mba niile ikpe n’afọ 1914, o nweghị ike ịbụ n’afọ ahụ ka ọ malitere ikpebi ma ndị mmadụ hà bụ atụrụ ka hà bụ ewu. * Oleekwanụ mgbe Jizọs ga-amalite ikpe mba niile ikpe?

12. (a) Olee mgbe Jizọs ga-amalite ikpe mba niile ikpe? (b) Na Matiu 24:30, 31 nakwa na Matiu 25:31-33, 46, olee ihe ndị Jizọs kwuru ga-emenụ?

 12 Amụma ahụ Jizọs buru banyere oge ikpeazụ gosiri na ọ bụ mgbe e bibichara okpukpe ụgha ka ọ ga-amalite ikpe mba niile ikpe. Dị ka e kwuru na  paragraf nke 8, e dere ụfọdụ n’ime ihe ndị ga-eme n’oge ahụ na Matiu 24:30, 31. I leruo amaokwu ndị ahụ anya, ị ga-achọpụta na ihe ndị Jizọs buru n’amụma ebe ahụ yiri ihe ndị o kwuru n’ilu ọ tụrụ banyere atụrụ na ewu. Dị ka ihe atụ, Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi; a ga-eme ka ebo niile na mba niile zukọta; ndị bụ́ atụrụ ‘ga-eweli isi ha elu’ n’ihi na ha ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” * Ndị bụ́ ewu “ga-eti aka n’obi, kwaa ákwá arịrị,” n’ihi na ha amatala na ha “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 25:31-33, 46.

13. (a) Olee mgbe Jizọs ga-ekpebi ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu? (b) Olee otú anyị ga-esi na-ele ozi ọma anyị na-ekwusa anya n’ihi ihe a anyị ghọtara?

13 N’ihi ya, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta n’ihe a niile? Anyị kwesịrị ịghọta na mgbe Jizọs ga-ekpebi ma ndị mba niile hà bụ atụrụ ka hà bụ ewu bụ mgbe ọ ga-abịa n’oké mkpagbu ahụ. Oké mkpagbu ahụ ga-ebi n’Amagedọn. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị yiri ewu “ga-anwụ ọnwụ ebighị ebi.” Olee otú anyị ga-esi na-ele ozi ọma anyị na-ekwusa anya n’ihi ihe a anyị ghọtara? Ọ na-enyere anyị aka ịghọta na ozi ọma anyị na-ekwusa dị ezigbo mkpa. Tupu oké mkpagbu ahụ amalite, ndị mmadụ ka nwere ohere ịgbanwe otú ha si eche echiche ma malite ije  ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide “nke na-eduba ná ndụ.” (Mat. 7:13, 14) O doro anya na ndị mmadụ nwere ike ịna-akpa àgwà ugbu a ka atụrụ ma ọ bụ ewu. Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ bụ n’oké mkpagbu ahụ ka a ga-emecha kpebie ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbalị ka anyị zie mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke, ka ha nwee ike ịnụ ya ma nabata ya.

Tupu oké mkpagbu ahụ amalite, ndị mmadụ ka nwere ohere ịgbanwe otú ha si eche echiche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

OLEE MGBE JIZỌS GA-ABỊA?

14, 15. Olee amaokwu Baịbụl anọ kwuru na Kraịst ga-abịa ikpe ikpe?

 14 Ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’amụma ahụ Jizọs buru, ì chere na anyị kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtaburu banyere mgbe ihe ndị ọzọ dị mkpa o kwuru ga-emezu? Amụma ahụ Jizọs buru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Ka anyị tụlee ya.

15 N’amụma Jizọs buru na Matiu 24:29–25:46, ọ kacha kwuo banyere ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ a nakwa n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. N’ebe ahụ, Jizọs kwuru ugboro asatọ na ya ga-abịa, bịarute ma ọ bụ lọta. * O kwuru banyere oké mkpagbu ahụ, sị: “Ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii.” “Unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” “N’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” N’ilu Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu, o kwukwara, sị: “Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya.” (Mat. 24:30, 42, 44; 25:31) Amaokwu anọ ndị a kwuru banyere mgbe Kraịst ga-abịa ikpe ikpe n’ọdịnihu. N’amụma ahụ Jizọs buru, olee ebe anyị ga-ahụ amaokwu anọ ndị ọzọ fọdụrụnụ?

16. Olee amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ọbịbịa Jizọs?

16 Jizọs kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ.” N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, o kwuru, sị: “Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere.” N’ilu ọ tụrụ banyere talent, o kwuru, sị: “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara.” N’ilu ahụ, nna ukwu ahụ sịrị: “Mgbe m lọtara, m gaara anata ihe m.” (Mat. 24:46; 25:10, 19, 27) Gịnị ka ọbịbịa Jizọs e kwuru okwu ya n’amaokwu anọ ndị a pụtara?

17. Gịnị ka anyị kwuburu banyere mbịarute Jizọs e kwuru okwu ya na Matiu 24:46?

 17 N’oge gara aga, anyị kwuru n’akwụkwọ anyị na amaokwu anọ ndị ikpeazụ ahụ na-ekwu banyere mgbe Jizọs bịara n’afọ 1918. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe Jizọs kwuru banyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” (Gụọ Matiu 24:45-47.) Anyị ghọtaburu na ‘mbịarute’ ahụ e kwuru okwu ya n’amaokwu nke iri anọ na isii mezuru mgbe Jizọs bịara n’afọ 1918 ka ọ mata otú ndị e tere mmanụ si arụ ọrụ o nyere ha. Anyị cheburu na ọ bụ n’afọ 1919 ka Jizọs mere ohu ahụ onye na-elekọta ihe niile o nwere. (Mal. 3:1) Ma, ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’amụma ahụ Jizọs buru, anyị ga-achọpụta na e kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtara banyere mgbe ihe ụfọdụ Jizọs kwuru ga-emezu. Maka gịnị?

18. Ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’ihe niile Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru, olee ihe anyị ga-aghọta banyere ọbịbịa ya?

18 ‘Ọbịbịa’ e kwuru okwu ya n’amaokwu ndị bu Matiu 24:46 ụzọ na-ekwu banyere mgbe Jizọs ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe na ibibi ndị ajọ omume n’oké mkpagbu ahụ. (Mat. 24:30, 42, 44) Dị ka anyị tụlere na  paragraf nke iri na abụọ, ‘ọbịbịa’ Jizọs e kwuru okwu ya na Matiu 25:31 bụ mgbe ahụ Jizọs ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe n’ọdịnihu. N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 24:46, 47 na ya ga-abịa mee ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta ihe niile o nwere ga-eme n’ọdịnihu, ya bụ, n’oké mkpagbu ahụ. * Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe niile Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru, o doro anya na ugboro asatọ ndị ahụ o kwuru na ya ga-abịa bụ mgbe ọ ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’oké mkpagbu ahụ.

19. Olee ihe ọhụrụ ndị anyị ghọtara, bụ́ ndị anyị tụlere n’isiokwu a? Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu ndị na-eso nke a?

19 Gịnị ka anyị mụtara n’ihe a anyị tụlere? Ná mmalite isiokwu a, anyị jụrụ ajụjụ atọ gbasara mgbe amụma ahụ Jizọs buru ga-emezu. Ihe mbụ anyị tụlere bụ na oké mkpagbu ahụ amaliteghị n’afọ 1914, kama na ọ ga-amalite mgbe Òtù Mba Ụwa ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ. Anyị tụlekwara ihe mere na ọ bụghị n’afọ 1914 ka Jizọs malitere ikpebi ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu, kama na ọ ga-abụ n’oké mkpagbu ahụ. N’ikpeazụ, anyị tụlere ihe mere na ọ bụghị n’afọ 1919 ka Jizọs bịara ime ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta ihe niile o nwere, kama na ọ ga-abụ n’oké mkpagbu ahụ. N’ihi ya, anyị aghọtala na ihe atọ a anyị tụlere ga-emezucha n’ọdịnihu, ya bụ, n’oké mkpagbu ahụ. N’ihi ihe ọhụrụ a anyị ghọtara, olee otú anyị ga-esi ghọta ihe Jizọs kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Oleekwa ihe anyị ga-aghọta banyere ilu Jizọs ndị ọzọ na-emezu n’oge ikpeazụ a? Anyị ga-atụle ajụjụ ndị a dị mkpa n’isiokwu ndị na-eso nke a.

 

^ para. 4 Paragraf nke 4: Ị chọọ ịgụkwu banyere isiokwu a, gụọ Ụlọ Nche, February 15, 1994, peeji nke 8-21 na May 1, 1999, peeji nke 8-20.

^ para. 8 Paragraf nke 8: Otu n’ime ihe e kwuru n’amaokwu ndị a bụ ‘ịchịkọta ndị a họọrọ.’ (Mat. 24:31) N’ihi ya, ọ dị ka e bibichaa okpukpe ụgha n’oké mkpagbu ahụ, ndị niile e tere mmanụ ka nọ n’ụwa ga-aga eluigwe tupu agha Amagedọn amalite. A ga-eji ihe a e kwuru ebe a dochie ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche August 15, 1990, peeji nke 30.

^ para. 11 Paragraf nke 11: Gụọ Ụlọ Nche October 15, 1995, peeji nke 18-28.

^ para. 12 Paragraf nke 12: Gụọ ebe e kwuru ihe yiri ya na Luk 21:28.

^ para. 15 Paragraf nke 15: E si n’okwu Grik bụ́ er′kho·mai sụgharịta okwu ndị ahụ bụ́ ‘ọbịbịa’ na ‘ịbịarute.’

^ para. 18 Paragraf nke 18: Dị ka e kwuru, okwu Grik e si sụgharịta “abịarute” na Matiu 24:46 bụkwa otu okwu Grik ahụ e si sụgharịta “na-abịa” na “ga-abịa” na Matiu 24:30, 42, 44.