Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2013

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jenesis 6:2, 4 kwuru banyere “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke,” ndị biri n’ụwa tupu Iju Mmiri. Ole ndị ka ha bụ?

E nwere ihe mere a ga-eji kwuo na ndị e kwuru okwu ha ebe ahụ bụ ndị mmụọ ozi. Ma, gịnị bụ ihe ahụ?

Jenesis 6:2 kwuru, sị: “Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.”

Jenesis 6:2, 4; Job 1:6; 2:1; 38:7; na Abụ Ọma 89:6 kwuru banyere “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke,” “ụmụ ezi Chineke,” na “ụmụ Chineke.” Gịnị ka amaokwu ndị a na-akọwara anyị gbasara “ụmụ Chineke” ndị a?

O doro anya na “ụmụ ezi Chineke” e kwuru okwu ha na Job 1:6 bụ ndị mmụọ ozi ndị gbakọrọ n’ihu Chineke. Setan nọkwa n’etiti ha. O ‘si n’ịwagharị n’ụwa.’ (Job 1:7; 2:1, 2) Na Job 38:4-7, e kwukwara banyere “ụmụ Chineke” ndị ‘tiri mkpu otuto’ mgbe Chineke “tọrọ ntọala ụwa.” Ebe ọ bụ na e kebeghị ụmụ mmadụ n’oge ahụ, ọ ga-abụrịrị na ndị e kwuru okwu ha bụ ndị mmụọ ozi. O doro anya na “ụmụ Chineke” e kwuru gbasara ha n’Abụ Ọma 89:6 bụ ndị mmụọ ozi ha na Chineke nọ n’eluigwe, ọ bụghị ụmụ mmadụ.

Oleezi ndị a kpọrọ “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke” na Jenesis 6:2, 4? Ihe ndị anyị kwurula gosiri na ndị a na-ekwu banyere ha bụ ndị mmụọ ozi ndị bịara n’ụwa.

Ọ na-esiri ụfọdụ ike ikweta na ndị mmụọ ozi nwere ike ịchọ inwe mmekọahụ. Ihe Jizọs kwuru na Matiu 22:30 gosiri na a naghị alụ di na nwunye n’eluigwe, na a naghịkwa enwe mmekọahụ n’ebe ahụ. Ma, e nweela mgbe ndị mmụọ ozi nwoghara ma yiri ahụ́ mmadụ, soro ụmụ mmadụ rie ma ṅụọ. (Jen. 18:1-8; 19:1-3) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ọ bụrụ na ndị mmụọ ozi enwoghaa ma dịrị ka mmadụ, ha na ụmụ nwaanyị nwere ike inwe mmekọahụ.

E nwere ihe ndị e kwuru na Baịbụl gosiri na e nwere ndị mmụọ ozi mere otú ahụ. Jud 6, 7 kwuru na ndị ikom Sọdọm mehiere n’ihi na ha nọ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. Jud ji ihe ọjọọ ahụ ndị Sọdọm mere tụnyere ihe “ndị mmụọ ozi ndị na-anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha” mere. Ndị mmụọ ozi ndị ahụ na ndị Sọdọm mere otu ihe. ‘Ha kwara iko gabiga ókè, nweekwa mmekọahụ rụrụ arụ.’ Ebe ọzọ kwuru ihe yiri ihe Jud dere bụ 1 Pita 3:19, 20. Ebe ahụ kwuru banyere ndị mmụọ ozi ndị nupụrụ isi “n’ụbọchị Noa.” (2 Pita 2:4, 5) N’ihi ya, e nwere ike iji ihe ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi mere tụnyere ihe ọjọọ ndị Sọdọm na Gọmọra mere.

Anyị nwere ike ikwu otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị aghọta na ndị a kpọrọ “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke” na Jenesis 6:2, 4 bụ ndị mmụọ ozi ndị yiiri ahụ́ mmadụ, ha na ụmụ nwaanyị ana-akwa iko.

 Baịbụl kwuru na Jizọs “kwusaara ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ okwu.” (1 Pita 3:19) Gịnị ka ihe a pụtara?

Pita onyeozi kwuru na ndị mmụọ ahụ bụ “ndị nupụrụ isi n’oge gara aga, mgbe Chineke ji ndidi na-echere n’ụbọchị Noa.” (1 Pita 3:20) O doro anya na Pita na-ekwu banyere ndị mmụọ ozi ndị so Setan nupụ isi. Jud kwuru banyere ndị mmụọ ozi “ndị na-anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha, kama ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị.” O kwukwara na Chineke kere ha “agbụ ebighị ebi wee debe ha n’oké ọchịchịrị maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.”—Jud 6.

Olee otú ndị mmụọ ozi si nupụ isi n’ụbọchị Noa? Tupu Iju Mmiri, ndị ajọ mmụọ a nwoghara, ghọọ mmadụ. Chineke ekeghị ha ka ha na-eme otú ahụ. (Jen. 6:2, 4) Ọ bụghịkwa naanị na ha nwoghara, kama ha na ndị inyom nwere mmekọahụ, nke bụ́kwanụ ihe rụrụ arụ. Chineke ekeghị ndị mmụọ ozi ka ha na ụmụ nwaanyị na-enwe mmekọahụ. (Jen. 5:2) Mgbe oge ruru, Chineke ga-ebibi ndị ajọ mmụọ a, bụ́ ndị nupụụrụ ya isi. Ma dị ka Jud kwuru, ha nọ “n’oké ọchịchịrị,” ya bụ, na ha dị ka ndị Chineke tụbara n’ụlọ mkpọrọ.

Olee mgbe Jizọs kwusaara “ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ” okwu? Oleekwa otú o si mee ya? Pita dere na ọ bụ mgbe e mechara ‘ka Jizọs dị ndụ na mmụọ,’ ya bụ, mgbe o si n’ọnwụ bilie. (1 Pita 3:18, 19) Buru n’obi na Pita kwukwara na Jizọs ‘kwusaara ha okwu.’ Ihe a Pita kwuru gosiri na Jizọs mere ya tupu Pita edee akwụkwọ ozi ya nke mbụ. N’ihi ya, ọ dị ka ọ̀ bụ obere oge Jizọs bilitechara n’ọnwụ ka ọ gwara ndị mmụọ ọjọọ banyere ahụhụ a ga-ata ha n’ihi isi ha nupụrụ. Ihe ọ gwara ha abụghị okwu ga-eme ka ha nwee olileanya. Ọ gwara ha na a ga-ala ha n’iyi. (Jona 1:1, 2) Jizọs gosiri na Ekwensu enweghị ike n’ebe ọ nọ n’ihi na o rubeere Jehova isi ruo ọnwụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. N’ihi ya, o ruru eru ịgwa ndị mmụọ ọjọọ na Chineke ga-ebibi ha.—Jọn 14:30; 16:8-11.

Jizọs ga-emecha kee Setan na ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi agbụ, tụnye ha n’abis. (Luk 8:30, 31; Mkpu. 20:1-3) Ka ọ dịgodị, ndị mmụọ ọjọọ a nọ n’oké ọchịchịrị, o dokwara anya na a ga-ebibi ha.—Mkpu. 20:7-10.