Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2013

Ghọta na Jehova Na-eguzosi Ike n’Ihe, Na-agbagharakwa Mmehie

Ghọta na Jehova Na-eguzosi Ike n’Ihe, Na-agbagharakwa Mmehie

“Gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie; obiọma ị na-egosi ndị na-akpọku gị dị ukwuu.”—ỌMA 86:5.

1, 2. (a) Gịnị mere obi ji adị anyị ụtọ ma anyị nwee ndị enyi na-enyere anyị aka, na-agbagharakwa anyị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

OLEE otú ị ga-esi kọwaa onye bụ́ ezigbo enyi? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Ashley kwuru na ezigbo enyi mmadụ bụ onye na-adị njikere mgbe niile inyere ya aka, na-agbaghara ya ma o mejọọ. Obi na-adị anyị niile mma ma anyị nwee ndị enyi na-agbaghara anyị ma na-enyere anyị aka. Ha na-eme ka obi ruo anyị ala, anyị amatakwa na a hụrụ anyị n’anya.—Ilu 17:17.

2 Ọ bụ Jehova bụ Enyi kacha eguzosi ike n’ihe, nke na-agbagharakwa ndị mejọrọ ya. Ọbụ abụ kwuru banyere Jehova, sị: “N’ihi na gị onwe gị, Jehova, dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie; obiọma ị na-egosi ndị na-akpọku gị dị ukwuu.” (Ọma 86:5) Gịnị ka iguzosi ike n’ihe na ịgbaghara mmehie pụtara? Olee otú Jehova si egosi na ya nwere àgwà ndị a magburu onwe ha? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova? Azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka anyị hụkwuo Enyi anyị kachanụ, bụ́ Jehova, n’anya. Ọ ga-enyekwara anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma.—1 Jọn 4:7, 8.

JEHOVA NA-EGUZOSI IKE N’IHE

3. Gịnị ka iguzosi ike n’ihe pụtara?

3 Iguzosi ike n’ihe pụtara mmadụ iji obi ya niile na-akwado ndị ọ hụrụ n’anya, kwesịkwa ntụkwasị obi. Onye na-eguzosi ike n’ihe anaghị agbanwe kwa mgbe kwa mgbe. Kama ọ na-akwado onye ọ hụrụ n’anya mgbe niile, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike. N’eziokwu, ọ bụ Jehova kacha ‘eguzosi ike n’ihe.’—Mkpu. 16:5.

4, 5. (a) Olee otú Jehova si egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe? (b) Olee otú obi ga-esi sie anyị ike ma anyị cheta otú Chineke si eguzosi ike n’ihe?

 4 Olee otú Jehova si egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe? Jehova anaghị ahapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya. Onye so ná ndị ji obi ha niile fee Jehova bụ Eze Devid. O kwetara na Jehova na-eguzosi ike n’ihe. (Gụọ 2 Samuel 22:26.) N’ọnwụnwa niile bịaara Devid, Jehova ahapụghị ya, kama ọ nọ na-edu ya, na-echebe ya ma na-anapụta ya. (2 Sam. 22:1) Ihe Jehova meere Devid mere ka ọ mata na ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka Jehova ji eguzosi ike n’ihe. Gịnị mere Jehova ahapụghị Devid? Ọ bụ n’ihi na Devid “bụ onye na-eguzosi ike n’ihe.” Jehova anaghị eji ndị ji obi ha niile na-efe ya egwu egwu, ọ na-akwadokwa ha.—Ilu 2:6-8.

5 Obi na-esi anyị ike ma anyị cheta na Jehova na-eguzosi ike n’ihe. Otu nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Reed kwuru, sị: “Otú Jehova si mesoo Devid mgbe o nwere nsogbu na-enyere m ezigbo aka. Jehova nọnyeere Devid ma mgbe ọ na-agba ọsọ ndụ ma mgbe ọ na-ezo n’ime ọgba. Akụkọ ahụ na-agba m ezigbo ume. Ọ na-eme ka m ghọta na n’agbanyeghị otú ihe dịịrị m ma ọ bụ ụdị nsogbu m nwere, Jehova ga-anọnyere m ma ọ bụrụhaala na mụ ejiri obi m niile na-efe ya.” O doro anya na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị.—Rom 8:38, 39.

6. Olee ụzọ ndị ọzọ Jehova si egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe? Oleekwa uru ọ na-abara ndị na-efe ya?

6 Olee ụzọ ndị ọzọ Jehova si egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe? Ọ na-emezu ihe o kwuru. O kwuru, sị: “Ruo mgbe mmadụ mere agadi, abụ m otu Onye ahụ.” (Aịza. 46:4) Ọ bụ iwu ya na-anaghị agbanwe agbanwe ka o ji ekpebi ihe niile ọ na-eme. (Mal. 3:6) Ụzọ ọzọ Jehova si egosi na ya na-eguzosi ike n’ihe bụ imezu nkwa ọ bụla o kwere. (Aịza. 55:11) N’ihi ya, otú Jehova si eguzosi ike n’ihe na-abara ndị niile na-efe ya uru. Olee otú o si bụrụ eziokwu? Ka anyị na-agbalịsi ike irubere Jehova isi, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-emezu nkwa o kwere na ya ga-agọzi anyị.—Aịza. 48:17, 18.

NA-EGUZOSI IKE N’IHE KA JEHOVA

7. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị na-eguzosi ike n’ihe ka Chineke?

 7 Olee otú anyị ga-esi na-eguzosi ike n’ihe ka Jehova? Otu ụzọ bụ inyere ndị ihe na-esiri ike aka. (Ilu 3: 27) Dị ka ihe atụ, è nwere nwanna ị ma dara mbà n’obi n’ihi ọrịa ma ọ bụ na ndị ezinụlọ ya na-emegide ya ma ọ bụkwanụ n’ihi ihe ọ na-emejọ? Ọ ga-adị mma ka i jiri “okwu ndị dị mma, ndị na-enye nkasi obi” gbaa nwanna ahụ ume. (Zek. 1:13) * I mee otú ahụ, ị na-egosi na ị bụ ezigbo enyi “nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24.

8. Olee otú anyị ga-esi na-eguzosi ike n’ebe di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nọ nakwa n’ebe ụmụnna anyị nọ?

8 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi na-eguzosi ike n’ihe ka Jehova bụ ịnọ ndị anyị hụrụ n’anya nso mgbe niile. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị alụọla di ma ọ bụ nwunye, anyị ma na anyị ekwesịghị ịhapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị chụwa onye ọzọ. (Ilu 5:15-18) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị kwaa iko. (Mat. 5:28) Anyị ga-egosikwa na anyị na-eguzosi ike n’ebe ụmụnna anyị nọ ma ọ bụrụ na anyị na-ezere ịgba asịrị ma ọ bụ ikwutọ ndị ọzọ. Anyị ekwesịghịkwa ịna-ege ntị mgbe a na-ekwu ụdị okwu ahụ.—Ilu 12:18.

9, 10. (a) Ònye ka anyị kwesịrị iguzosi ike n’ebe ọ nọ karịchaa? (b) Gịnị mere o ji bụrụ na irubere Jehova isi anaghị adị mfe mgbe niile?

9 Nke kacha mkpa bụ na anyị kwesịrị iguzosi ike n’ebe Jehova nọ. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịgbalịsi ike na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, ya bụ, ịhụ ihe ọ hụrụ n’anya n’anya na ịkpọ ihe ọ kpọrọ asị asị, na-ebikwa ndụ otú Jehova chọrọ. (Gụọ Abụ Ọma  97:10.) Ọ bụrụ na anyị amụta iche echiche ka Jehova, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịna-erubere ya isi.—Ọma 119:104.

10 N’eziokwu, ọ naghị adị mfe ịna-erubere Jehova isi mgbe niile. Ma anyị kwesịrị ijisi ike na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. Dị ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ma ha ahụbeghị onye dị ha mma ha ga-alụ n’ọgbakọ. (1 Kọr. 7:39) Nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nwere ike ịchọpụta na ndị ụwa ya na ha na-arụkọ ọrụ na-agbalị ịchọtara ya onye ga-alụ ya. Owu nwere ike ịna-ama nwanna nwaanyị ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi n’anya Jehova. Ọ̀ bụ na àgwà ọma ụmụnna ndị dị otú ahụ na-akpa anaghị eme anyị obi ụtọ? N’eziokwu, Jehova ga-agọzi ndị niile ji obi ha niile na-efe ya n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha.—Hib. 11:6.

“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24 (Paragraf nke 7)

“Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”—Efe. 4:32 (Paragraf nke 16)

JEHOVA NA-AGBAGHARA MMEHIE

11. Gịnị ka ịgbaghara mmehie pụtara?

11 Àgwà ọma ọzọ Jehova nwere bụ na ọ na-agbaghara mmehie. Gịnị ka ịgbaghara mmehie pụtara? Ọ pụtara mmadụ ịkwụsị iwesa onye ọzọ iwe n’ihi ihe ọjọọ o mere ya. Ọ pụtaghị ime ka o nweghị ihe onye ahụ mere ma ọ bụ na ihe ọjọọ onye ahụ mere dị mma. Kama, onye ahụ e mere ihe ọjọọ ga-ekpebi ịkwụsị ibu iwe n’obi. Baịbụl na-akụziri anyị na Jehova ‘dị njikere ịgbaghara’ ndị gosiri na ha ji obi ha niile chegharịa.—Ọma 86:5.

12. (a) Olee otú Jehova si agbaghara mmehie? (b) Gịnị ka ‘ihichapụ’ mmehie mmadụ pụtara?

12 Olee otú Jehova si agbaghara mmehie? Baịbụl kwuru na Jehova na-agbaghara mmadụ “n’ụzọ dị ukwuu”; ọ na-agbaghara kpamkpam, ọ gaghịkwa echeta ya. (Aịza. 55:7) Olee otú anyị si mara na Jehova na-agbaghara mmehie kpamkpam? Chegodị banyere nkwa Baịbụl kwere n’Ọrụ Ndịozi 3:19. (Gụọ ya.) Pita onyeozi gbara ndị ọ na-agwa okwu ume ka ha ‘chegharịa ma chigharịa.’ Ọ bụrụ na onye mere ihe ọjọọ ejiri obi ya niile chegharịa, ihe ahụ o mere ga-ewute ya nke ukwuu. Ọ ga-ekpebikwa na ya agaghị eme ihe ọjọọ ahụ ọzọ. (2 Kọr. 7:10, 11) Ezigbo  nchegharị ga-emekwa ka onye mere ihe ọjọọ ‘chigharịa,’ hapụ ihe ọjọọ ahụ ma mewe ihe ga-adị Chineke mma. Ọ bụrụ na ndị ahụ Pita gwara okwu echegharịa otú ahụ, olee uru ha ga-erite? Pita kwuru na ọ ga-eme ka ‘e hichapụ’ mmehie ha. Okwu Grik e si sụgharịta okwu ahụ bụ otú e si ehicha ihe e dere ede. N’ihi ya, mgbe Jehova gbaghaara mmehie, ọ na-adị ka à ga-asị na o hichara ihe e dere ede. Ọ na-agbaghara mmehie kpamkpam.—Hib. 10:22; 1 Jọn 1:7.

13. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “agakwaghị m echeta mmehie ha” na-akụziri anyị banyere Jehova?

13 Olee otú anyị si mara na Jehova anaghị echeta mmehie ọ gbaghaara? Chegodị banyere amụma Jeremaya buru banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke Chineke na Ndị Kraịst e tere mmanụ gbara, nke na-eme ka Chineke gbaghara ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. (Gụọ Jeremaya 31:34.) Jehova kwuru, sị: “M ga-agbaghara ha njehie ha, agakwaghị m echeta mmehie ha.” N’ihi ya, Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na mgbe ọ bụla ọ gbaghaara anyị mmehie, ọ gaghị ata anyị ahụhụ n’ọdịnihu n’ihi mmehie ahụ anyị mere. Ọ naghị echeta mmehie anyị mere n’oge gara aga ka o nwee ike ịta anyị ahụhụ ugboro ugboro ma ọ bụ kwuo na anyị bụ ndị ọjọọ. Kama ime otú ahụ, Jehova na-agbaghara mmehie ndị ahụ ma chefuo ha kpamkpam.—Rom 4:7, 8.

14. Ọ bụrụ na anyị echebara otú Jehova si agbaghara mmehie echiche, olee otú ọ ga-esi kasie anyị obi? Nye ihe atụ.

14 Ichebara otú Jehova si agbaghara mmehie echiche nwere ike ịkasi anyị obi. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee ihe mere otu nwanna nwaanyị anyị ga-akpọ Helen. Ọtụtụ afọ gara aga, a chụrụ ya n’ọgbakọ. A nabatara ya mgbe afọ ole na ole gachara. O kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na m na-agwa onwe m, na-agwakwa ndị ọzọ na m kwetara na Jehova agbagharala m, ọ na-adị m mgbe niile ka Jehova ọ̀ nọ m n’ebe dị anya ma ọ bụ na ọ nọ ndị ọzọ nso karịa m nakwa na ndị ọzọ nwere okwukwe karịa m.” Ma, ihe kasiri Helen obi bụ ịgụ ihe atụ ụfọdụ Baịbụl ji kọwaa otú Jehova si agbaghara mmehie nakwa ịtụgharị uche na ha. O kwukwara, sị: “Aghọtara m na Jehova hụrụ m n’anya ma na-emere m obiọma karịa otú m ghọtaburu ya.” Ihe ọ gụtara nke kacha ruo ya n’obi bụ: ‘Mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie, anyị ekwesịghị iche na mmehie ahụ agaghị apụ apụ n’ahụ́ anyị ruo mgbe anyị nwụrụ.’ * Helen kwuru, sị: “Achọpụtara m na ekwetaghị m na Jehova nwere ike ịgbaghara m kpamkpam. Echekwara m na obi kwesịrị ịna-ama m ikpe ruo mgbe m ga-anwụ. Ama m na ọ ga-ewe oge. Ma, aghọtawala m na m nwere ike ime ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. Ahụ́ eruola m ala ka onye e bupụrụ ibu na-anyịgbu ya.” O doro anya na Chineke anyị na-efe hụrụ anyị n’anya ma na-agbaghara mmehie.—Ọma 103:9.

MỤTA OTÚ JEHOVA SI AGBAGHARA MMEHIE

15. Olee otú anyị nwere ike isi na-agbaghara ndị ọzọ otú ahụ Jehova si agbaghara anyị?

15 Otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova bụ ịna-agbaghara ndị ọzọ mgbe ọ bụla e kwesịrị ịgbaghara ha. (Gụọ Luk 17:3, 4.) Cheta na mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie, ọ na-echefu mmehie ahụ, nke pụtara na ọ gaghị emecha taa anyị ahụhụ n’ihi ya. Mgbe anyị gbaghaara ndị ọzọ, anyị kwesịkwara ichefu ihe merenụ, gharakwa ichetara ya onye ahụ n’ọdịnihu.

16. (a) Ịgbaghara ndị ọzọ ọ̀ pụtara ịnabata ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ ikwe ka ha na-emegbu anyị? Kọwaa. (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị?

 16 Ịgbaghara ndị ọzọ apụtaghị ịnabata ihe ọjọọ ha mere ma ọ bụ ikwe ka ndị ọzọ na-emegbu anyị. Kama, ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-ekpebi ịkwụsị iwesa mmadụ iwe maka ihe o mere anyị. Ma, anyị kwesịrị icheta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara  anyị, anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ otú ahụ Jehova si agbaghara anyị. (Mat. 6:14, 15) A sị ka e kwuwe, Jehova na-enwere anyị ọmịiko n’ihi na “ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Ọma 103:14) N’ihi ya, ọ̀ bụ na ọmịiko ekwesịghị ime ka anyị na-eleghara ihe ndị ọzọ mejọrọ anya, jirikwa obi anyị niile na-agbaghara ha kpamkpam?—Efe. 4:32; Kọl. 3:13.

Ka anyị jiri obi anyị niile kpee ekpere ka Jehova gbaghara ndị mejọrọ anyị (Paragraf nke 17)

17. Ọ bụrụ na nwanna emejọọ anyị, olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịgbaghara ya?

 17 N’eziokwu, ịgbaghara ndị ọzọ anaghị adị mfe mgbe niile. N’oge ndịozi, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ o siiri ike idozi nghọtahie ha nwere. (Fil. 4:2) Ọ bụrụ na nwanna mere ihe were anyị iwe, olee ihe ga-enyere anyị aka ịgbaghara ya? Chegodị banyere ihe mere Job. Elifaz, Bildad, na Zofa sịrị na ha bụ ndị enyi Job. Ma, obi gbawara ya n’ihi na ha boro ya ọtụtụ ebubo ụgha. (Job 10:1; 19:2) Jehova mechara baara ha atọ mba, gwakwa ha ka ha gakwuru Job ma chụọ àjà maka mmehie ha. (Job 42:7-9) Ma, e nwere ihe Jehova gwara Job mee. Gịnị ka ọ bụ? Jehova gwara Job ka o kpeere ndị ahụ boro ya ebubo ekpere. Job mere ihe Jehova gwara ya. Jehova gọzikwara ya n’ihi na ọ gbaghaara ha. (Gụọ Job 42:10, 12, 16, 17.) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ ahụ? Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile kpee ekpere maka onye mejọrọ anyị, o nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị iwesa ya iwe.

NA-AMỤTAKWU BANYERE ÀGWÀ JEHOVA

18, 19. Olee otú anyị nwere ike isi na-aghọtakwu àgwà ọma Jehova?

18 O doro anya na ihe ndị anyị tụlere banyere àgwà dị iche iche Jehova nwere tọrọ anyị ezigbo ụtọ. Anyị amụtala na ọ na-adị mfe ịbịakwute Jehova, na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ na-emesapụ aka, nwee ezi uche, na-eguzosi ike n’ihe, na-agbagharakwa mmehie. N’eziokwu, ihe anyị tụlere bụ àgwà ole na ole n’ime ọtụtụ àgwà Jehova nwere. Obi ga-adị anyị ụtọ ịna-amụtakwu banyere Jehova ruo mgbe ebighị ebi. (Ekli. 3:11) Anyị kwetara ihe Pọl onyeozi kwuru. O dere, sị: “Lee otú ngọzi na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke si dị omimi.” Anyị nwekwara ike ikwu otu ihe ahụ banyere ịhụnanya Chineke na àgwà ya isii ndị anyị tụlere.—Rom 11:33.

19 Ka anyị niile na-agbalị ịghọtakwu àgwà ọma Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-amụkwu banyere àgwà ya ndị ahụ, na-echebara ha echiche, na-agbalịkwa ịkpa ụdị àgwà ndị a Chineke nwere. (Efe. 5:1) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-aghọtakwu na ihe ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.”—Ọma 73:28.

^ para. 7 Ị chọọ ịmatakwu otú i nwere ike isi mee ya, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ̀ Dịwo Onye Ị Gbara Ume na Nso Nso A?” n’Ụlọ Nche January 15, 1995 na “Ịkpasu Ịhụnanya na Ọrụ Ọma Dị Iche Iche—N’ụzọ Dị Aṅaa?” n’Ụlọ Nche April 1, 1995.

^ para. 14 Gụọ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, paragraf nke iri, n’isi nke 26.