Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JUN 2013

Ghọta Àgwà Jehova nke Ọma

Ghọta Àgwà Jehova nke Ọma

“Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.”—EFE. 5:1.

1. (a) Olee àgwà ụfọdụ Jehova nwere nke Onye Kraịst nwere ike ichebara echiche? (b) Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị amụọ banyere àgwà Chineke?

I CHEE banyere ụdị onye Jehova bụ, olee àgwà ya ndị ị ga-echeta? Ọtụtụ n’ime anyị na-echeta ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike. Ma, anyị ghọtara na Jehova nwere ọtụtụ àgwà magburu onwe ha. N’eziokwu, e nwere ike idepụta ihe karịrị àgwà iri anọ Jehova nwere. A tụleela nke ọ bụla n’ime ha n’akwụkwọ anyị. Chegodị ezigbo ihe ndị anyị ga-amụta ma ọ bụrụ na anyị amụọ banyere àgwà Jehova n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị ma ọ bụ mgbe naanị anyị na-amụ ihe. Olee uru ụdị ọmụmụ ihe ahụ ga-abara anyị? Ọ ga-eme ka anyị ghọtakwuo Nna anyị nke eluigwe. Anyị ga-esi otú ahụ ghọtakwuo àgwà Jehova, kpebisikwuo ike iṅomi ya, anyị na ya adịkwuo ná mma.—Jọsh. 23:8; Ọma 73:28.

2. (a) Nye ihe atụ otú anyị ga-esi ghọtakwuo àgwà Jehova. (b) Gịnị ka anyị ga-atụle?

2 Gịnị ka “ịghọta” ihe pụtara? N’isiokwu a, ịghọta ihe pụtara ịmata uru ihe bara. Mmadụ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ matakwuo uru ihe bara. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị chọrọ iri nri ị na-eritụbeghị. I nwere ike ibu ụzọ nụ ísì ọma ya. E bute ya, gị eritụ ya ma chọpụta na ọ na-atọ ezigbo ụtọ. I nwere ike imecha jiri aka gị sie ya. Ọ bụ otú ahụ ka anyị nwere ike isi matakwuo àgwà Jehova ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ mụọ banyere àgwà ahụ, chebara ya echiche ma na-agbalị ịkpa ụdị àgwà ahụ. (Efe. 5:1) Isiokwu a na isiokwu abụọ na-eso ya ga-enyere anyị aka ịghọtakwu àgwà Chineke ndị na-esoghị n’àgwà ya ndị bụ́ isi. Na nke ọ bụla anyị ga-atụle, ajụjụ ndị a ga-aza bụ: Gịnị ka àgwà ahụ pụtara? Olee otú Jehova si akpa àgwà ahụ? Oleekwa otú anyị ga-esi ṅomie Jehova?

Ọ NA-ADỊ MFE ỊBỊAKWUTE JEHOVA

3, 4. (a) Gịnị ka ịbụ onye dị mfe mbịakwute pụtara? (b) Olee otú Jehova si eme ka obi sie anyị ike na ya dị mfe mbịakwute?

3 Àgwà Jehova anyị ga-ebu ụzọ tụlee bụ na ọ na-adị mfe ịbịakwute ya. Olee otú ị ga-esi mata onye dị mfe  mbịakwute? I nwere ike ịsị na ‘ọ bụ onye dị obiọma, onye na-ewepụtara ndị ọzọ oge, na onye obi na-eru ndị mmadụ ala ịgwa okwu.’ I nwere ike ịmata onye ọ na-adị mfe ịbịakwute ma i gee ntị n’ihe onye ahụ na-ekwu, leruokwa àgwà ya anya, ma otú ihu na-adị ya ma ihe ndị ọ na-eme n’ekwughị okwu.

4 Olee otú Jehova si egosi na ya dị mfe mbịakwute? Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nke kere eluigwe na ụwa, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na ya chọrọ ịna-anụ ekpere anyị ma na-aza ya. (Gụọ Abụ Ọma 145:18; Aịzaya 30:18, 19.) Anyị nwere ike ịgwa Chineke okwu mgbe ọ bụla, n’ebe ọ bụla, ruokwa nkeji ole ọ bụla anyị chọrọ. Anyị nwere ike ịgwa ya otú ọ dị anyị n’obi n’ihi na anyị ma na ọ gaghị akọcha anyị ma anyị mee otú ahụ. (Ọma 65:2; Jems 1:5) Baịbụl kọwara Jehova otú ndị mmadụ ga-aghọta ya n’ihi na ọ chọrọ ka ha na-abịakwute ya. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid dere na “anya Jehova dị n’ebe” anyị nọ, nakwa na ‘aka nri ya jidesiri anyị ike.’ (Ọma 34:15; 63:8) Aịzaya onye amụma ji Jehova tụnyere onye na-azụ atụrụ. O kwuru, sị: “Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.” (Aịza. 40:11) Chegodị echiche! Jehova chọrọ ka anyị nọrọ ya nso dị ka nwa atụrụ onye na-azụ ya ku n’obi ya. N’eziokwu, ọ dị mfe ịbịakwute Nna anyị nke eluigwe! Olee otú anyị ga-esi ṅomie àgwà ọma a Jehova nwere?

ÀGWÀ BARA EZIGBO URU

5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị okenye mee ka ọ dịrị ụmụnna mfe ịbịakwute ha?

5 N’oge na-adịbeghị anya, a jụrụ ụmụnna si mba dị iche iche, sị, “Olee àgwà kacha mma unu chọrọ ka okenye nwee?” Ọtụtụ n’ime ha zara, sị, “Okenye kwesịrị ịdị obiọma ma na-enye mmadụ ihu.” N’eziokwu, Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịmụta àgwà ahụ nke ọma. Ma, ọ bụ ndị okenye kwesịrị ịkacha na-enye ndị mmadụ ihu. (Aịza. 32:1, 2) Otu nwanna nwaanyị kwuru ihe mere o ji chee na àgwà ahụ dị mkpa. Ọ sịrị: “Naanị ihe ga-eme ka àgwà ọma ọ bụla okenye nwere baara anyị uru bụ ma ọ bụrụ na ọ na-adịrị  ndị ọzọ mfe ịbịakwute ya.” Ì chere na ihe nwanna nwaanyị ahụ kwuru bụ eziokwu? Olee otú mmadụ ga-esi mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute ya?

6. Olee ihe ga-eme ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịna-abịakwute anyị?

6 Ihe ga-eme ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịna-abịakwute anyị bụ ma anyị na-egosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Ọ bụrụ na okenye na-eche banyere ụmụnna ya, chọọkwa ịna-enyere ha aka, o nwere ike ime ka ọ dịrị ndị na-eto eto na ụmụnna ndị ọzọ mfe ịna-abịakwute ya. (Mak 10:13-16) Otu nwata nwoke dị afọ iri na abụọ aha ya bụ Carlos kwuru, sị: “M na-ahụkarị ka ndị okenye na-amụmụrụ ụmụnna ọnụ ọchị, na-emekwara ha obiọma. Ọ na-eme m obi ụtọ.” Okenye ekwesịghị ikwu naanị n’ọnụ na ya na-enye ụmụnna ihu. Ọ bụ omume ya kwesịrị igosi na ọ na-eme otú ahụ. (1 Jọn 3:18) Olee otú ọ ga-esi eme ya?

7. Gịnị mere iyi baajị mgbakọ ji emekarị ka ndị mmadụ jụọ anyị ajụjụ? Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta na ya?

7 Chegodị banyere ihe atụ a. N’oge na-adịbeghị anya, otu nwanna gara mgbakọ ná mba ọzọ. Mgbe ọ nọ n’ụgbọelu na-alaghachi n’obodo ya, o yi baajị mgbakọ ahụ. Ihe e dere na ya bụ “Ka Alaeze Chineke Bịa!” Mgbe otu onye na-eje ozi n’ụgbọelu ahụ hụrụ ihe e dere na baajị ahụ, ọ gwara nwanna ahụ, sị, “Eheenụ, ya bịawa. E mechaa, anyị ga-akparịtakwu banyere ya.” Ha abụọ kwurịtara banyere Alaeze ahụ, onye ahụ anata magazin anyị. Ọtụtụ n’ime anyị esitụla otú ahụ kwusaa ozi ọma. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ajụkarị anyị ajụjụ maka baajị mgbakọ anyị? Ọ bụ n’ihi na ọ dị ka à ga-asị na baajị anyị na-agwa ndị mmadụ, sị: “I nwere ike ịbịa gwa m okwu. Jụọ m ebe m na-aga.” Baajị mgbakọ na-eme ka ndị mmadụ mata na anyị chọrọ ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere. Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị iji omume ha gwa ụmụnna ha, sị: “I nwere ike ịbịa gwa m okwu.” Olee otú ha ga-esi eme ya?

8. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ihe banyere ụmụnna ha na-emetụ ha n’obi? Olee otú obi ga-adị ụmụnna ma ndị okenye na-eme otú a?

8 Ọ bụ eziokwu na omenala obodo niile abụghị otu, ma ọ bụrụ na anyị amụmụọrọ ụmụnna anyị ọnụ ọchị, kwee ha n’aka nke ọma ma kelee ha nke ọma, anyị na-agwa ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Ònye kwesịrị ibu ụzọ mee otú ahụ? Cheta ihe Jizọs mere. Matiu kwuru na mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ, ‘Jizọs bịakwutere ha, gwa ha okwu.’ (Mat. 28:18) Otú ahụ ka ndị okenye na-eme taa. Ọ bụ ha na-ebu ụzọ agakwuru ụmụnna ha ka ha na ha kparịta ụka. Olee otú obi ga-adị ụmụnna ma ndị okenye na-eme otú a? Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ, nke dị afọ iri asatọ na asatọ, kwuru, sị: “Otú ihu si abụ ndị okenye ọchị ọchị na ụdị okwu ọma ha na-agwa m mgbe m batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka m hụkwuo ha n’anya.” Nwanna nwaanyị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla okenye ji ihu ọchị nabata m n’ọmụmụ ihe, ọ na-atọ m ezigbo ụtọ n’agbanyeghị na ụfọdụ nwere ike iche na ọ bụghị oké ihe.”

WEPỤTA OGE KA GỊ NA ỤMỤNNA GỊ KWURỊTA OKWU

9, 10. (a) Olee àgwà ọma Jehova na-akụziri anyị? (b) Olee otú ndị okenye ga-esi ṅomie Jehova?

 9 O doro anya na ụmụnna anyị agaghị abịa anyị nso ma ọ bụrụ na ha anaghị ahụ anyị anya. Jehova gosiri anyị otú e si akpa àgwà ọma a. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Otu ụzọ ndị okenye ga-esi ṅomie Jehova bụ iwepụta oge ka ha na ụmụnna ha, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, na-ekwurịta okwu tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara. Otu nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ mgbe ọ bụla okenye jụrụ m otú m mere, ya akwụsịtụ gee ntị ka ọ mara ihe m chọrọ ikwu.” E nwere otu nwanna nwaanyị jeerela  Jehova ozi ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise. O kwuru, sị: “Ndị okenye ndị na-ewepụta oge agwa m okwu mgbe ọmụmụ ihe gbasara na-eme ka obi sie m ike na m bara uru.”

10 O doro anya na ndị okenye nwere ọtụtụ ọrụ ha na-arụ. Ma mgbe a bịara ọmụmụ ihe, ihe kwesịrị ịkacha ha mkpa bụ ilebara atụrụ Chineke anya.

JEHOVA ANAGHỊ ELE MMADỤ ANYA N’IHU

11, 12. (a) Gịnị ka eleghị mmadụ anya n’ihu pụtara? (b) Olee otú Jehova si gosi anyị na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu?

11 Àgwà ọma ọzọ Jehova nwere bụ na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Gịnị ka eleghị mmadụ anya n’ihu pụtara? Ọ pụtara ime mmadụ otú e mere ibe ya, akpaghị ókè ma ọ bụ emenyereghị otu onye hapụ ibe ya. E nwere ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà a. Nke mbụ bụ otú anyị si ele ndị ọzọ anya, nke abụọ abụrụ otú anyị si emeso ha omume. Gịnị mere ha abụọ ji dị mkpa? Ọ bụ n’ihi na naanị ihe ga-eme ka mmadụ ghara ile onye ọ bụla anya n’ihu bụ ịghọta na ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu ahụ bụ́ ‘eleghị mmadụ anya n’ihu’ pụtara emenyereghị otu onye hapụ ibe ya. (Ọrụ 10:34) N’ihi ya, ihe mere onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu ji akwanyere mmadụ ùgwù abụghị n’ihi otú onye ahụ dị n’elu ahụ́ ma ọ bụ na ọ bụ onye a ma ama, kama ọ bụ n’ihi ụdị mmadụ onye ahụ bụ.

12 Jehova bụ onye kacha gosi na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Baịbụl kwuru na ‘ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35; Diuterọnọmi 10:17.) Ihe mere n’oge Mozis gosiri na ihe ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

Ụmụ nwaanyị Zelofehad mụrụ ghọtara na Chineke anaghị akpa ókè (Paragraf nke 13 na 14)

13, 14. (a) Olee nsogbu ụmụ nwaanyị ise Zelofehad mụrụ nwere? (b) Olee otú Jehova si gosi na ya anaghị akpa ókè?

 13 Mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel banye n’Ala Nkwa, e nwere nsogbu ụmụnne ise na-alụbeghị di nwere. Gịnị bụ nsogbu ahụ? Ha ma na ezinụlọ ha ga-enweta ala e kenyere nna ha otú ahụ ezinụlọ ndị ọzọ n’Izrel ga-enweta. (Ọnụ Ọgụ. 26:52-55) Nna ha bụ́ Zelofehad si n’ebo Manase. Ma, ọ nwụọla mgbe ahụ. Ọ bụ omenala ndị Izrel na ụmụ Zelofehad ndị nwoke kwesịrị inweta ala e kenyere ezinụlọ ha, ma Zelofehad mụrụ naanị ụmụ nwaanyị. (Ọnụ Ọgụ. 26:33) Ebe ọ bụ na e nweghị nwa nwoke n’ezinụlọ ha, à ga-enyefe ndị ikwu ha ala ha, ụmụ agbọghọ ndị ahụ aghara inweta ala ezinụlọ ha kwesịrị iketa?

14 Ụmụ nwaanyị ise a bụ́ ụmụnne bịakwutere Mozis, jụọ ya, sị: “Gịnị mere a ga-eji gụpụ aha nna anyị n’ezinụlọ ya maka na ọ mụtaghị nwa nwoke?” Ha rịọkwara ya, sị: “Biko, nye anyị ala n’etiti ụmụnne nna anyị.” Mozis ọ̀ zara ha, sị, ‘Ihe a bụ ihe iwu kwuru, o nweghị ihe m ga-eme iji nyere unu aka’? O meghị otú ahụ, kama o ‘weere okwu ha gaa n’ihu Jehova.’ (Ọnụ Ọgụ. 27:2-5) Gịnị ka  Jehova kwuru? Ọ gwara Mozis, sị: “Ihe ụmụ Zelofehad kwuru ziri ezi. Hụ na i nyere ha ala dị ka ihe nketa n’etiti ụmụnne nna ha, ị ga-emekwa ka ihe nketa nna ha laara ha.” O nwekwara ihe ọzọ Jehova mere. O mere ka ihe ahụ o kwuru ghọọ iwu. Ọ gwara Mozis, sị: “Ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, unu ga-eme ka ihe nketa ya laara nwa ya nwaanyị.” (Ọnụ Ọgụ. 27:6-8; Jọsh. 17:1-6) Malite mgbe ahụ gawa, a ga na-enye ụmụ nwaanyị niile nwere ụdị nsogbu ahụ n’Izrel ihe nketa.

15. (a) Olee otú Jehova si emeso ndị ya, karịchaa ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka? (b) Olee akụkọ ndị ọzọ a kọrọ na Baịbụl gosiri na Jehova anaghị akpa ókè?

15 Ihe ahụ Jehova mere gosiri na ọ dị obiọma nakwa na ọ naghị akpa ókè. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ enweghị onye ga-enyere ha aka, ma Jehova meere ha otú ọ na-emere ndị Izrel ndị ọzọ, kwanyekwara ha ùgwù. (Ọma 68:5) Akụkọ a bụ otu n’ime ọtụtụ akụkọ a kọrọ na Baịbụl na-egosi na Jehova na-emere ndị ohu ya niile ihe ọma n’akpaghị ókè.—1 Sam. 16:1-13; Ọrụ 10:30-35, 44-48.

ANYỊ NWERE IKE IṄOMI JEHOVA

16. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Jehova ma ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu?

16 Olee otú anyị ga-esi mụta eleghị mmadụ anya n’ihu otú Jehova na-eme? Cheta na e nwere ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà a. Nke mbụ bụ ịghọta na ile mmadụ anya n’ihu adịghị mma. Nke abụọ abụrụ imere ndị ọzọ ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu. N’eziokwu, anyị niile nwere ike iche na anyị na-ege ndị ọzọ ntị nakwa na anyị anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ma, i nwere ike ịghọta na ọ naghị adị mfe mgbe niile ịmata otú anyị si ele ndị ọzọ anya n’eziokwu. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi mata ma ndị ọzọ hà na-ele anyị anya ka ndị na-anaghị akpa ókè? Jizọs gosiri ihe anyị kwesịrị ime. Mgbe ọ chọrọ ịmata ihe ndị mmadu na-ekwu banyere ya, ọ jụrụ ndị enyi ya ọ tụkwasịrị obi, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?” (Mat. 16:13, 14) Ọ́ gaghị adị mma ka i mee otú ahụ Jizọs mere? I nwere ike ịjụ enyi gị ga-agwa gị eziokwu ma otú i si emeso ndị ọzọ ọ̀ na-egosi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ahụ agwa gị na e nwere ihe gosiri na ị na-ele ụfọdụ ndị anya n’ihu n’ihi agbụrụ ha ma ọ bụ na ha bụ ndị a ma ama ma ọ bụ n’ihi na ha ji ego? Kpesie ekpere ike gwa Jehova otú obi dị gị nakwa ka o nyere gị aka ịgbanwe àgwà gị ka i ṅomikwuo ya ma ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu.—Mat. 7:7; Kọl. 3:10, 11.

17. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi mesoo ndị mmadụ n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu?

 17 N’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ụmụnna niile ùgwù, na-emekwara ha obiọma, anyị ga-egosi na anyị na-eṅomi Jehova n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ile ụmụnna anyị ọbịa, anyị kwesịrị ịkpọ ndị dị iche iche, ma ndị si obodo ọzọ ma ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ma ndị nne ha na nna ha na-anọghị n’ọgbakọ ma ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ. (Gụọ Ndị Galeshia 2:10; Jems 1:27.) Mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke, anyị na-ezi mmadụ niile ozi ọma n’akpaghị ókè n’agbanyeghị ụdị ndị ha bụ ma ọ bụ obodo ha si. Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe dị ka narị asụsụ isii. Ihe a niile na-egosi na anyị anaghị ele mmadụ anya n’ihu.

18. Olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ na Jehova dị mfe mbịakwute nakwa na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu?

18 N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma banyere otú Jehova si dị mfe mbịakwute nakwa na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu, anyị ga-aghọtakwu ụdị onye ọ bụ. Ihe ahụ anyị ghọtara kwesịrị ime ka anyị ṅomie àgwà Jehova nke ọma, na-akpakwa ụdị àgwà ahụ mgbe anyị na ụmụnna anyị na-emekọ ihe nakwa mgbe anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.

“Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”—Ọma 145:18 (Paragraf nke 9)

“Jehova bụ́ Chineke unu . . . adịghị ele onye ọ bụla anya n’ihu.”—Diut. 10:17 (Paragraf nke 17)