Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2013

Na-ekpebi Ime Ihe Ziri Ezi Ka I Nwee Ike Ijidesi Ihe Nketa Gị Ike

Na-ekpebi Ime Ihe Ziri Ezi Ka I Nwee Ike Ijidesi Ihe Nketa Gị Ike

“Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.”—ROM 12:9.

1, 2. (a) Olee otú i si kpebie ijere Chineke ozi? (b) Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ banyere ihe nketa anyị?

ỌTỤTỤ nde mmadụ ekpebiela ime ihe ziri ezi, ya bụ, ijere Jehova Chineke ozi na isochi nzọụkwụ Jizọs Kraịst anya. (Mat. 16:24; 1 Pita 2:21) Anyị kwesịrị iji nkwa ahụ anyị kwere Chineke mgbe anyị na-enyefe ya onwe anyị kpọrọ ihe. Ihe mere anyị ji kpebie ife Chineke abụghị na anyị gụrụ naanị amaokwu Baịbụl ole na ole, kama ọ bụ n’ihi na anyị mụrụ Okwu Chineke nke ọma. N’ihi ya, anyị mụtara ọtụtụ ihe mere ka okwukwe anyị sie ike n’ihe nketa Jehova ga-enye ndị ‘matara ya nke ọma, matakwa onye o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’—Jọn 17:3; Rom 12:2.

2 Ihe ga-eme ka anyị na Jehova na-adị ná mma bụ ikpebi ịna-eme ihe ga-adị ya mma. N’ihi ya, ajụjụ ndị dị mkpa a ga-aza n’isiokwu a bụ: Gịnị bụ ihe nketa anyị? Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya? Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike inweta ihe nketa Chineke ga-enye anyị? Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ime ihe ziri ezi?

GỊNỊ BỤ IHE NKETA ANYỊ?

3. Olee ihe nketa Chineke ga-enye (a) ndị e tere mmanụ na (b) “atụrụ ọzọ”?

3 Ndị Kraịst ole na ole nwere olileanya inweta “ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi.” Ihe ùgwù pụrụ iche ha nwere bụ na ha ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. (1 Pita 1:3, 4) A ‘ga-amụrịrị ha ọzọ’ ka ha nwee ike inweta ihe nketa ahụ. (Jọn 3:1-3) Jizọs nwere ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” ndị ha na Ndị Kraịst e tere mmanụ so na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Olee ihe nketa ha ga-enweta? (Jọn 10:16) Atụrụ ọzọ ga-enweta ihe nketa ahụ Adam na Iv na-enwetaghị, ya bụ, ndụ  ebighị ebi mgbe ụwa ga-abụ paradaịs, mgbe ịta ahụhụ, ọnwụ, na iru uju na-agaghịkwa adị. (Mkpu. 21:1-4) Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwe onye omekome ahụ ya na ya nwụrụ n’otu ụbọchị nkwa, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:43.

4. Olee ngọzi ndị Chineke nyere anyị ugbu a?

4 Ma e nwere ngọzi ndị anyị nwere ugbu a, bụ́ ndị so n’ihe nketa Chineke nyere anyị. Okwukwe anyị nwere n’àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ emeela ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị na Chineke dị ná mma. (Rom 3:23-25) Nkwa ọma ndị Chineke kwere n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, edoola anyị anya nke ọma. Obi na-adịkwa anyị ezigbo ụtọ ịhụ na ụmụnna anyị hụrụ ibe ha n’anya n’ụwa niile. Ịbụ Onyeàmà Jehova bụkwa ihe ùgwù pụrụ iche. Ka a sịkwa ihe mere anyị ji jiri ihe nketa anyị kpọrọ ihe!

5. Gịnị ka Setan na-agbalị ime ndị na-efe Chineke? Olee ihe ga-enyere anyị aka iguzogide aghụghọ ya?

5 Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ijidesi ihe nketa anyị pụrụ iche ike, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ọnyà Setan ghara ịma anyị. Setan na-agbalị mgbe niile ime ka ndị Chineke kpebie ime ihe ga-eme ka ha ghara inweta ihe nketa Chineke chọrọ inye ha. (Ọnụ Ọgụ. 25:1-3, 9) Ebe Setan ma na a ga-ebibi ya n’oge na-adịghị anya, ọ na-agbalịsikwu ike iduhie anyị. (Gụọ Mkpughe 12:12, 17.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ “iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu,” anyị kwesịrị iji ihe nketa anyị kpọrọ ihe nke ukwuu. (Efe. 6:11) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụta ihe dị mkpa n’otú Isọ, bụ́ ọkpara Aịzik, si lee ihe nketa ya anya.

EMELA KA ISỌ

6, 7. Ònye bụ Isọ? Gịnị bụ ihe nketa o kwesịrị inweta?

6 Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga, Aịzik na Ribeka mụrụ Isọ na ejima ya bụ́ Jekọb. Ka ụmụ ejima ahụ na-eto, ha dị iche ma n’ụdị obi ha nwere ma n’ụdị ihe ha kpebiri ịna-arụ. Baịbụl kwuru, sị: “Isọ wee bụrụ nwoke maara otú e si achụ nta, nwoke na-aga n’ọhịa, ma Jekọb bụ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye bi n’ụlọikwuu.” (Jen. 25:27) Otu nwoke aha ya bụ Robert Alter, bụ́ onye na-asụgharị Baịbụl, kwuru na okwu Hibru e si sụgharịta ‘onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta’ pụtara “onye ji obi ya niile na-eme ihe ziri ezi ma ọ bụ onye aka ya dị ọcha.”

7 Mgbe Isọ na Jekọb dị afọ iri na ise, nna nna ha bụ́ Ebreham nwụrụ, ma nkwa Jehova kwere Ebreham anwụghị. Jehova mechara kweghachi Aịzik nkwa ahụ ma kwuo na mba niile dị n’ụwa ga-esi ná mkpụrụ Ebreham gọzie onwe ha. (Gụọ Jenesis 26:3-5.) Chineke si otú ahụ mee ka a mata na onye si n’agbụrụ Ebreham ga-abụ “mkpụrụ” ahụ kwesịrị ntụkwasị obi o kwere nkwa ya na Jenesis 3:15, ya bụ, Mesaya. Ebe Isọ bụ ọkpara Aịzik, ọ bụ ya kwesịrị inweta ihe ahụ Chineke kwere ná nkwa. Ọ bụ ihe nketa pụrụ iche ọ ga-enweta. Ò ji ya kpọrọ ihe?

Emela ihe ọ bụla ga-eme ka ị ghara inweta ihe nketa Chineke ga-enye gị

8, 9. (a) Gịnị ka Isọ mere ihe nketa ya? (b) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, gịnị ka Isọ ghọtara banyere ihe ahụ o mere, gịnịkwa ka o mere?

8 Otu ụbọchị, mgbe Isọ si n’ọhịa lọta, ọ hụrụ ka Jekọb “na-esi ofe.” Isọ gwara ya, sị: “Ngwa, biko, kunyetụ m ofe—ofe ahụ nke na-acha ọbara ọbara, n’ihi na ike gwụrụ m!” Jekọb azaa Isọ, sị: “Buru ụzọ resị m ọnọdụ gị dị ka ọkpara!” Gịnị ka Isọ kpebiri ime? O siri ike ikweta na o kwuru, sị: “Olee uru ọnọdụ m dị ka ọkpara baara m?” N’eziokwu, Isọ kpebiri na ofe ga-abara ya uru karịa ihe nketa onye bụ́ ọkpara kwesịrị inweta. Jekọb chọrọ ime ka o doo anya na Isọ eresịla ya ihe ọkpara kwesịrị inweta. Ọ bụ ya mere o ji gwa Isọ, sị: “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi!” N’egbughị oge ọ bụla, Isọ resịrị ya ihe  ọkpara kwesịrị inweta. Jekọb mechara nye “Isọ achịcha ma kunye ya ofe lentil, o wee rie, ṅụọkwa. O wee bilie pụọ. Isọ wee leda ọnọdụ ya dị ka ọkpara anya.”—Jen. 25:29-34.

9 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, e nwere mgbe Aịzik chere na ya ga-anwụ n’oge na-adịghị anya. Ribeka gbara mbọ ka Jekọb nweta ihe nketa ahụ Isọ resịrị ya. Mgbe Isọ mechara chọpụta na ya zuzuru nzuzu, ọ rịọrọ nna ya Aịzik, sị: “Nna m, gọzie m, ọbụna mụ onwe m! . . . Ọ̀ bụ na o nweghị ngọzi i debeere m?” Mgbe Aịzik kwuru na o nweghị otú ya ga-esi gbanwee ngọzi ahụ o nyere Jekọb, ‘Isọ bere ákwá n’olu dara ụda.’—Jen. 27:30-38.

10. Olee otú Jehova si lee Isọ na Jekọb anya? Gịnị mere o ji lee ha anya otú ahụ?

10 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Isọ? Ihe o mere gosiri na inweta ihe na-agụ anụ ahụ́ ya dị ya mkpa karịa inweta ngọzi Jehova ga-enye ya n’ọdịnihu n’ihi ihe nketa ya. Isọ ejighị ihe o kwesịrị inweta n’ihi ọkpara ọ bụ kpọrọ ihe. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ hụghị Chineke n’anya. Isọ echeghị echiche banyere nsogbu ihe o kpebiri ime ga-akpatara ụmụ ya n’ọdịnihu. Ma, Jekọb dị iche. O mere ihe gosiri na o ji ihe nketa o nwere kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, Jekọb mere ihe nne ya na nna ya gwara ya mgbe ọ na-achọ ịlụ nwaanyị. (Jen. 27:46–28:3) Jekọb ji ndidi mee otú ahụ, hapụkwa ihe ụfọdụ dị ya mkpa. Ọ bụ ya mere o ji mechaa ghọọ nna nna Mesaya. Olee otú Chineke si lee Isọ na Jekọb anya? Jehova si n’ọnụ Malakaị onye amụma kwuo, sị: “Ahụrụ m Jekọb n’anya, akpọrọ m Isọ asị.”—Mal. 1:2, 3.

11. (a) Gịnị mere ihe Baịbụl kọrọ banyere Isọ ji baara Ndị Kraịst uru taa? (b) Gịnị mere Pọl ji kwute okwu ịkwa iko mgbe ọ na-ekwu banyere ihe Isọ mere?

11 Ihe ahụ Baịbụl kọrọ banyere Isọ ọ̀ baara Ndị Kraịst uru taa? Eenụ. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ha lezie anya ka a “ghara inwe onye ọ bụla nke na-akwa iko ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe, dị ka Isọ, onye nyefere ihe ruuru ya dị ka ọkpara iji gbanweta otu efere nri.” (Hib. 12:16) Ihe ahụ Pọl gwara ha gbasara Ndị Kraịst taa. Anyị kwesịrị iji ihe dị nsọ kpọrọ ihe mgbe niile ka anyị nwee ike imeri ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị ma jidesie ihe nketa anyị ike. Gịnịkwanụ mere Pọl ji kwute okwu onye na-akwa iko mgbe o kwuru banyere ihe Isọ mere? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka ihe na-agụ anụ ahụ́ ya na-atụrụ ya ụka otú ahụ Isọ mere, ọ ga-adịrị ya mfe ime mmehie dị ka ịkwa iko, nke ga-eme ka ọ ghara inweta ihe nketa Chineke kwere ná nkwa.

 KWADEBE OBI GỊ UGBU A

12. (a) Olee otú Setan si anwa anyị ọnwụnwa? (b) Na Baịbụl, olee ndị ihe ha mere nwere ike ịbara anyị uru mgbe ọnwụnwa bịaara anyị?

12 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị ekwesịghị iji aka anyị gaa kote ọnwụnwa ga-eme ka anyị mee omume rụrụ arụ. Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere, na-arịọ Jehova Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị mee ihe ọjọọ ma a nwawa anyị ka anyị nupụrụ ya isi. (Mat. 6:13) Ka anyị na-agbalị ime ihe ziri ezi n’anya Chineke n’ụwa ọjọọ a, Setan na-agba mbọ ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (Efe. 6:12) Ebe ọ bụ na Ekwensu bụ chi nke ụwa ochie a, ọ ma otú ọ ga-esi jiri ihe ndị na-agụ anụ ahụ́ anyị nwaa anyị ọnwụnwa. (1 Kọr. 10:8, 13) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị nọ n’ebe e nwere ike iji ihe na-agụ gị agụụ nwaa gị ọnwụnwa ka i mee omume rụrụ arụ. Gịnị ka ị ga-ekpebi ime? Ị̀ ga-eme ka Isọ ma kwuo, sị: ‘Ngwa! Nye m ya!’ Ka ị̀ ga-emeri ọnwụnwa ahụ ma si ebe ahụ gbapụ otú ahụ Josef, bụ́ nwa Jekọb, mere mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya ọnwụnwa?—Gụọ Jenesis 39:10-12.

13. (a) Olee otú ọtụtụ ndị si mee ka Josef, ma olee otú ụfọdụ si mee ka Isọ? (b) Anyị chee banyere ndị na-akpa àgwà ka Isọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịghọta?

13 E nwere ọtụtụ ụmụnna ndị ọnwụnwa bịaara, ha ekpebie ma hà ga-akpa àgwà ka Isọ ka hà ga-eme ka Josef. Ọtụtụ ụmụnna emeela ihe gosiri na ha maara ihe, meekwa ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ma e nwere ụfọdụ ụmụnna ọnwụnwa bịaara, ha ekpebie ime ka Isọ ma leghara ihe nketa Jehova chọrọ inye ha anya. N’eziokwu, ọtụtụ ndị a na-ehiwere kọmitii ikpe na ndị a na-achụ n’ọgbakọ kwa afọ na-abụkarị n’ihi ịkwa iko. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị kwadebe obi anyị ugbu a tupu ọnwụnwa ọ bụla abịara anyị! (Ọma 78:8) Ka anyị tụlee ihe abụọ anyị ga-eme ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa na ikpebi ime ihe ziri ezi ma e mechaa.

CHEE ECHICHE MA JIKERE NKE ỌMA

Ịchọ amamihe Jehova ga-eme ka anyị jikere nke ọma imeri ọnwụnwa

14. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ ma ‘jidesie ezi ihe ike’?

14 Ihe mbụ anyị ga-eme bụ iche echiche banyere nsogbu ime mmehie ga-akpata. Ọ bụrụ na anyị na-ahụkwu Jehova n’anya n’eziokwu, anyị ga-ejikwu ihe nketa o nyere anyị kpọrọ ihe. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na anyị hụrụ mmadụ n’anya, anyị agaghị achọ ime ihe ga-agbawa ya obi. Kama ime otú ahụ, anyị ga-agbalịsi ike ime ihe ga-adị ya mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eche echiche banyere nsogbu ọ ga-akpatara anyị na ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka a nwata anyị ime mmehie. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ emee ihe ọjọọ, mụ na Jehova ànyị ka ga-adị ná mma? Olee otú obi ga-adị ndị ezinụlọ m? Oleekwa otú obi ga-adị ụmụnna ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ? Ò nwere ike ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ?’ (Fil. 1:10) Onye ọ bụla kwesịkwara ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee uru ọ ga-abara m ma mmehie tọchaa m ụtọ obere oge, e mechaa, obi agbawaa m? M̀ chọrọ imecha kwaa mmakwaara otú ahụ Isọ mere mgbe ọ ghọtara na o zuzuru nzuzu?’ (Hib. 12:17) Ichebara ajụjụ ndị dị otú a echiche ga-enyere anyị aka ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ ma ‘jidesie ezi ihe ike.’ (Rom 12:9) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị ga na-agbalị ijidesi ihe nketa anyị ike.—Ọma 73:28.

15. Gịnị ga-enyere anyị aka ijikere nke ọma imeri ọnwụnwa nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma?

15 Ihe ọzọ anyị ga-eme bụ ijikere nke ọma imeri ọnwụnwa. Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe ga-eme ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ime ka anyị na ya ghara ịdị ná mma. Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ o nyere anyị bụ ịmụ  Baịbụl, ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, ikwusa ozi ọma, na ikpe ekpere. (1 Kọr. 15:58) Mgbe ọ bụla anyị kpere ekpere ma kọọrọ Jehova otú obi dị anyị nakwa mgbe anyị wepụtara oge na-ekwusa ozi ọma, anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. (Gụọ 1 Timoti 6:12, 19.) Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike na-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ijikere nke ọma imeri ọnwụnwa. (Gal. 6:7) Ọ bụ ihe a kọwara n’isi nke abụọ n’akwụkwọ Ilu.

“NA-ACHỌ YA”

16, 17. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-ekpebi ime ihe ziri ezi?

16 Isi nke abụọ n’akwụkwọ Ilu na-agba anyị ume ka anyị nweta amamihe na ikike iche echiche. Ihe abụọ a Jehova na-enye anyị ga-enyere anyị aka ikpebi ime ihe ziri ezi ma jụ ihe ọjọọ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-ejide onwe anyị kama ikwe ka anụ ahụ́ anyị na-atụrụ anyị ụka. Ma anyị ga-emeli ya ma ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike. Baịbụl kwuru, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwu ma chekwaa ihe m nyere n’iwu n’obi gị, ka i wee gee amamihe ntị, ka i wee jiri obi gị chọọ nghọta; ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ ikike ịghọta ihe ka ị na-etiku, ọ bụrụ na ị na-achọ ya dị ka e si achọ ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-achọ ya, mgbe ahụ, ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na ọ bụ Jehova na-enye amamihe; ihe ọmụma na nghọta na-esi n’ọnụ ya apụta.”—Ilu 2:1-6.

17 N’ihi ya, o doro anya na ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị ahụ e kwuru n’akwụkwọ Ilu, anyị ga-enwe ike ịna-ekpebi ime ihe ziri ezi. Anyị ga na-emeri ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka okwu Jehova mee ka àgwà anyị na-aka mma, ma ọ bụrụ na anyị ana-ekpesi ekpere ike ka Chineke duzie anyị, ma ọ bụrụkwa na anyị ana-achọ amamihe Chineke otú ahụ e si achọ ọlaedo.

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ịna-eme? Gịnị mere i ji kpebie ime otú ahụ?

18 Jehova ga-enye anyị ihe ọmụma, nghọta, ezi uche, na amamihe ma ọ bụrụ na anyị na-agbalịsi ike inweta ha. Ọ bụrụ na anyị na-achọsi ha ike, jirikwa ha na-ekpebi ihe anyị ga-eme, anyị na Jehova Chineke ga na-adịkwu ná mma. N’ihi ya, adịm ná mma anyị na Jehova Chineke ga-echebe anyị mgbe ọnwụnwa bịaara anyị. Ọ bụrụ na anyị anọrọ Jehova nso ma na-atụ egwu ya, anyị ga-agbalịsi ike ka anyị ghara ime mmehie. (Ọma 25:14; Jems 4:8) Ka anyị niile gbalịsie ike ịbụ enyi Jehova mgbe niile na iji amamihe ya na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Anyị ga-esi otú ahụ mee ka obi ya ṅụrịa, anyị ejidesiekwa ihe nketa anyị ike.