Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2013

Ndị Di na Nwunye, Na-ekwurịtanụ Okwu Nke Ọma Ka Unu Dịkwuo ná Mma

Ndị Di na Nwunye, Na-ekwurịtanụ Okwu Nke Ọma Ka Unu Dịkwuo ná Mma

“Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.”—ILU 25:11.

1. Olee otú ikwurịta okwu nke ọma si enyere di na nwunye aka?

OTU nwanna bi na Kanada kwuru, sị: “Ọ kaara m mma ka mụ na nwunye m nọrọ kama mụ na onye ọzọ ga-anọ.” O kwukwara na ihe ọma ọ bụla meere ya na-atọkwu ya ụtọ ma ya na nwunye ya nọrọ, nakwa na ọ na-adịrị ya mfe idi ihe ọ bụla na-ewute ya. N’Ọstrelia, otu nwoke kwuru, sị: “Mụ na nwunye m ebiela afọ iri na otu, ma e nwebeghị ụbọchị mụ na ya na-atụpụrụghị ibe anyị ọnụ. Anyị anaghị atụ egwu na anyị nwere ike itisa n’ihi na anyị abụọ na-ewetu obi akparịta ụka mgbe niile.” Otu nwanna nwaanyị bi na Kọsta Rika kwuru, sị: “Ikwurịta okwu nke ọma emeela ka mụ na di m na-ebikwu n’udo. O meela ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma, mee ka anyị na-ezere ọnwụnwa, na-emekọ ihe ọnụ ma hụkwuo ibe anyị n’anya.”

2. Olee ihe ndị nwere ike ime ka di na nwunye ghara ịna-ekwurịta okwu nke ọma?

2 Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ùnu na-ekwurịta okwu nke ọma, ka ọ̀ na-esiri unu ike ịkparịta ụka? O doro anya na e nwere ike inwe nsogbu mgbe ụfọdụ ebe ọ bụ na di na nwunye ezughị okè, àgwà ha abụọ abụghịkwa otu, otú e si zụọ ha dịkwa iche iche. O nwekwara ike ịbụ na ha esighị n’otu obodo. (Rom 3:23) N’ihi ya, otú di si ekwu ihe dị ya n’obi nwere ike ịdị iche n’otú nwunye ya si ekwu nke ya. Ka a sịkwa ihe mere John M. Gottman na Nan Silver, bụ́ ndị na-achọpụta ihe gbasara di na nwunye, ji kwuo, sị: “Ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara itisa bụ inwe obi ike, na-agbasi mbọ ike ma kpebisie ike imeri nsogbu ọ bụla bịaara ha.”

3. Gịnị nyeere ọtụtụ di na nwunye aka ịna-ebi n’udo?

3 Di na nwunye ndị chọrọ ịna-ebi n’udo kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike. Ma, otu n’ime uru ọ ga-abara ha bụ na ọ ga-eme ka ha nwee ezigbo obi ụtọ. Di na nwunye ndị hụrụ ibe ha n’anya ga-enwe ezigbo obi ụtọ. (Ekli. 9:9) Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Aịzik na nwunye ya ọ hụrụ  n’anya, bụ́ Ribeka. (Jen. 24:67) Mgbe ha abụọ birila ọtụtụ afọ, e nweghị ihe gosiri na ịhụnanya ha nyụrụ ka ọkụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ di na nwunye taa. Gịnị na-enyere ha aka? Ha amụtala iji obiọma na-agwa ibe ha ihe ha chere na otú obi dị ha, mụtakwa ịna-aghọta ibe ha, na-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyere ibe ha ezigbo ùgwù ma na-adị umeala n’obi. Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọta na ọ bụrụ na di na nwunye ana-agbalị ịkpa àgwà ọma ndị a, ha ga na-ekwurịta okwu nke ọma mgbe niile.

GOSI NA I NWERE NGHỌTA

4, 5. Olee otú inwe nghọta ga-esi nyere di na nwunye aka ịghọta ibe ha nke ọma? Nye ihe atụ.

4 Ilu 16:20 kwuru, sị: “Onye na-egosi na ya nwere nghọta n’okwu ga-enweta ihe ọma.” Okwu a bụ eziokwu n’ihe gbasara alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ. (Gụọ Ilu 24:3.) Ebe kacha mma anyị ga-esi nweta nghọta na amamihe bụ n’Okwu Chineke. Jenesis 2:18 gwara anyị na Chineke kere nwaanyị ka ọ bụrụ onye ga-eme ka nwoke zuo ezuo, ọ bụghị ka ọ bụrụ nwoke ibe ya. Ọ bụ ya mere otú ụmụ nwaanyị si ekwu ihe dị ha n’obi ji dị iche. N’eziokwu, àgwà ndị mmadụ na-adị iche iche. Ma, ụmụ nwaanyị na-ekwukarị banyere otú obi dị ha, ihe gbasara ndị mmadụ nakwa ndị ha na ibe ha dị ná mma. Obi na-adị ha ụtọ ma mmadụ gee ha ntị, ha na ya ekwurịta okwu nke ọma, n’ihi na ọ na-eme ka obi sie ha ike na a hụrụ ha n’anya. Ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị ekwu otú obi dị ha. Ma, ha na-akọkarị ihe ndị ha na-eme, nsogbu ndị ha nwere, na otú ha ga-esi edozi ha. Ụmụ nwoke na-achọkwa ka a na-akwanyere ha ùgwù.

5 Otu nwanna nwaanyị bi na Briten kwuru, sị: “M nwee nsogbu, di m na-agbalịkarị ngwa ngwa ikwu ihe a ga-eme kama ibu ụzọ gee m ntị mara ihe m chọrọ ikwu. Ọ na-ewe m ezigbo iwe, n’ihi na naanị ihe m chọrọ bụ ka o gee m ntị ma ghọta otú obi dị m.” Otu nwoke kwuru, sị: “Mgbe anyị lụrụ ọhụrụ, ihe m na-emekarị ozugbo bụ ịgbalị idozi nsogbu ọ bụla nwunye m nwere. Ma, emechara m chọpụta na naanị ihe nwunye m chọrọ bụ ka m gee ntị nụ ihe ọ chọrọ ikwu.” (Ilu 18:13; Jems 1:19) Di nke nwere nghọta na-agbalị ịmata otú obi dị nwunye ya ma mee ka ọ mata na ya hụrụ ya n’anya. Ọ na-emekwa ka obi sie nwunye ya ike na ya anaghị eji ihe o chere na otú obi dị ya egwu egwu. (1 Pita 3:7) Nwunye ya ga-agbalịkwa ịghọta ihe di ya bu n’uche. Ọ bụrụ na di na nwunye ghọtara ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme ma na-eme ya, ha ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ha ga-ejikwa otu obi na-ekpebi ihe ndị ga-abara ha uru ma na-eme ha.

6, 7. (a) Olee otú ihe e kwuru n’Ekliziastis 3:7 ga-esi nyere di na nwunye aka igosi na ha nwere nghọta? (b) Olee otú nwaanyị lụrụ di ga-esi gosi na ya nwere nghọta? Gịnịkwa ka di kwesịrị ịgbalị na-eme?

6 Di na nwunye ndị nwere nghọta makwa na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:1, 7) Otu nwanna nwaanyị ya na di ya birila afọ iri kwuru, sị: “Aghọtala m na e nwere mgbe m na-ekwesịghị ịgwawa di m ihe ụfọdụ. Ọ bụrụ na ọrụ ọ na-arụ karịrị akarị ma ọ bụ na e nwere ihe ọzọ ọ na-eme, m na-echeretụ tupu mụ agwa ya ihe m chọrọ ịgwa ya. N’ihi ya, otú mụ na ya si ekwurịta okwu na-aka mma.” Ụmụ nwaanyị ndị ma ihe na-ekwu okwu ọma n’ihi na ha ma na ọ bụrụ na nwaanyị agwa di ya okwu dị mma “n’oge kwesịrị” ekwesị, obi ga-adị di ya ụtọ, ya egeekwa ya ntị.—Gụọ Ilu 25:11.

Obere ihe ọma di na nwunye na-emere ibe ha nwere ike ịbara ha ezigbo uru

7 Ihe Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị ime mgbe nwunye ya na-agwa ya okwu abụghị naanị ige ntị, kama o kwesịkwara ime ka nwunye ya mara otú obi dị ya. Otu okenye ọgbakọ nke ya na nwunye ya birila afọ iri abụọ na asaa kwuru, sị: “Ekwesịrị m ịmụta ịna-agwa nwunye m ihe m bu n’obi.” Otu nwanna nwoke nke lụrụla nwaanyị afọ iri abụọ na anọ kwuru, sị: “Enwere m ike ibu ihe merenụ n’obi, na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ ekwughị okwu, nsogbu ahụ ga-akwụsị.’ Ma, aghọtala m na ikwu otú obi dị m apụtaghị na mụ abụghị nwoke. Mgbe ọ bụla o siiri m ike ikwu ihe m bu n’obi, m na-ekpe ekpere ka m nwee ike ịma ihe m kwesịrị ikwu na otú m kwesịrị isi kwuo ya. M na-ekuda ume, kwuwezie ihe m chọrọ ikwu.” Ihe ọzọ ga-enyere di na  nwunye aka bụ ịma mgbe ha ga na-ekwurịta okwu. O nwere ike ịbụ mgbe ha nọ naanị ha na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ọ bụ na-agụkọ Baịbụl ọnụ.

8. Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ịna-ekwurịta okwu nke ọma?

8 O nwere ike isiri di na nwunye ike ịgbanwe otú ha si ekwu ihe dị ha n’obi. Ha abụọ kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova nye ha mmụọ nsọ ya ma kpebisie ike ịna-akparịta ụka nke ọma. Ha ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ha hụrụ Jehova n’anya, na-achọ ime ihe ga-adị ya mma, ghọtakwa na alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ. Otu nwanna nwaanyị nke ya na di ya birila afọ iri abụọ na isii kwuru, sị: “Mụ na di m anaghị eji ihe Jehova kwuru banyere alụmdi na nwunye egwu egwu. Anyị anaghịdị eche echiche ikewa. N’ihi ya, anyị nwee nghọtahie, anyị na-agbalịsi ike ikwurịta ya ka anyị nwee ike idozi ya.” Ọ bụrụ na di na nwunye esi otú a na-erubere Chineke isi ma na-asọpụrụ ya, Chineke ga-agọzi ha nke ukwuu.—Ọma 127:1.

NA-AHỤKWU DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ N’ANYA

9, 10. Gịnị na gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ka ha nwee ike ịna-ahụkwu ibe ha n’anya?

9 Ịhụnanya bụ àgwà kacha mkpa di na nwunye kwesịrị inwe, n’ihi na ọ bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Kọl. 3:14) Di na nwunye ga na-ahụkwu ibe ha n’anya ma ọ bụrụ na ha ejiri otu obi na-emekọ ihe ọnụ, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike. Ha ga-adịkwu ná mma, obi ga-adịkwa ha ụtọ ma ha abụọ nọrọ. Ihe na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo abụghị naanị imere ibe ha oké ihe ole na ole, dị ka ihe ndị a na-egosi na tiivi, kama ọ bụ imere ibe ha obere ihe ugboro ugboro, dị ka ịmakụ ibe ha ma ọ bụ imere ibe ha ihe ọzọ ga-eme ka obi dị ha mma, ịgwa ibe ha okwu ọma, ịmụmụ ọnụ ọchị, ma ọ bụ iji obi ha niile jụọ ibe ha, sị, “Olee otú i mere?” Obere ihe ndị a nwere ike ịbara di na nwunye ezigbo uru. E nwere otu di na nwunye na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha ebiela afọ iri na itoolu. Ọ na-abụ, ha nọtụ, ha akpọọ ibe ha n’ekwentị ma ọ bụ dee ozi n’ekwentị zigara ibe ha. Nke nwoke kwuru na ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ “ka ha mara otú ihe si na-aga.”

10 Di na nwunye ndị hụrụ ibe ha n’anya na-agbalị ịna-amatakwu ibe ha. (Fil. 2:4) Ime otú ahụ na-eme ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya n’agbanyeghị na ha abụọ ezughị okè. Ọ bụrụ na di na nwunye na-ebi n’udo, ha ga na-adịkwu ná mma ka oge na-aga. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ di ma ọ bụ nwunye, jụọ onwe gị, sị: ‘Àma m di m ma ọ bụ nwunye m nke ọma? M̀ na-aghọta otú obi dị ya nakwa ihe o chere? Ugboro ole ka m na-eche banyere di m ma ọ bụ nwunye m, ikekwe na-echeta àgwà ya ndị mere ka ihe ya masị m ná mmalite?’

 NA-AKWANYERENỤ IBE UNU ÙGWÙ

11. Ọ bụrụ na di na nwunye chọrọ ịna-ebi n’udo, gịnị mere ha ji kwesị ịna-akwanyere ibe ha ùgwù? Nye ihe atụ.

11 Ọ bụrụ na di na nwunye na-enwe obi ụtọ, ọ pụtaghị na ha zuru okè. Di na nwunye ndị hụrụ ibe ha n’anya nwekwara ike inwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. O nwere mgbe Ebreham na Sera nwere nghọtahie. (Jen. 21:9-11) Ma, ha ekweghị ka nghọtahie ndị ha nwere mee ka ha ghara ịdị ná mma. N’ihi gịnị? Ha na-akwanyere ibe ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, Ebreham sịrị Sera “biko” ugboro ugboro. (Jen. 12:11, 13) Sera rubekwaara Ebreham isi, na-akpọ ya “onyenwe m” n’obi ya. (Jen. 18:12) Otú di na nwunye si agwa ibe ha okwu ma ọ bụ ụdị olu ha ji agwa ibe ha okwu ga-eme ka a mata na ha anaghị akwanyere ibe ha ùgwù. (Ilu 12:18) Ọ bụrụ na ha agbanweghị àgwà ọjọọ ahụ, ha nwere ike itisa.—Gụọ Jems 3:7-10, 17, 18.

12. Gịnị mere ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ ji kwesị ịgbalịsi ike na-ekwu okwu otú gosiri na ha na-akwanyere ibe ha ùgwù?

12 Ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kwesịrị ịgbalịsi ike iji obiọma na-agwa ibe ha okwu, na-akwanyekwara ibe ha ùgwù. Ọ ga-eme ka ha nwee ike ịna-akparịta ụka nke ọma, ha abụọ ana-ekwu otú obi dị ha n’eziokwu. Otu di kwuru, sị: “Mgbe di na nwunye lụrụ ọhụrụ, ha nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’afọ ole na ole ndị mbụ, ma ha nwekwara ike ịna-akpasu ibe ha iwe mgbe ụfọdụ. Di ga na-amatakwu àgwà nwunye ya, otú obi na-adị ya, na ihe bụ́ mkpa ya, nwunye ya ana-amatakwa nke di ya. O nwere ike ịkpata nsogbu mgbe ụfọdụ. Ma, ihe ga-enyere ha abụọ aka bụ ịhapụ ịna-esi ọnwụ na ịbụ ndị ihu na-atọ ọchị. Ha kwesịkwara ịdị obi umeala, na-enwe ndidi, na-atụkwasịkwa Jehova obi.” Ndụmọdụ ahụ ga-abara anyị niile uru!

MỤTA EZIGBO ỊDỊ UMEALA N’OBI

13. Gịnị mere o ji bụrụ na ịdị umeala n’obi na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo, na-enwekwa obi ụtọ?

13 Ọ bụrụ na di na nwunye na-ekwurịta okwu nke ọma, ọ na-adị ka mmiri nke na-asọ nwayọọ nwayọọ n’ubi a gbara ogige. ‘Ịdị umeala n’obi’ ga-eme ka mmiri ahụ na-asọ n’akwụsịghị akwụsị. (1 Pita 3:8) Otu nwanna nke ya na nwunye ya birila afọ iri na otu kwuru, sị: “Ọ bụ ịdị umeala n’obi ga-eme ka di na nwunye dozie nghọtahie ha ngwa ngwa n’ihi na ọ ga-eme ka otu onye sị ibe ya, ‘Ewela iwe.’” E nwere otu okenye nke ya na nwunye ya na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ha ebiela iri afọ abụọ. O kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ịsị di gị ma ọ bụ nwunye gị ‘Ewela iwe’ na-adị mkpa karịa ịsị ya ‘Ahụrụ m gị n’anya.’”  O kwukwara, sị: “Ihe na-akacha enyere anyị abụọ aka ịdị umeala n’obi bụ ekpere. Mgbe mụ na nwunye m na-ekpegara Jehova ekpere, anyị na-echeta na anyị bụ ndị na-ezughị okè nakwa na Chineke na-emere anyị ezigbo obiọma. Ihe ahụ anyị na-echeta na-enyere m aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị.”

Mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwurịta okwu nke ọma

14. Olee nsogbu mpako nwere ike ịkpatara di na nwunye?

14 Ma, mpako na-eme ka o sie ike idozi nghọtahie. Ọ na-egbochi di na nwunye ikwurịta okwu n’ihi na ọ na-eme ka ha abụọ ghara ịchọ ịrịọ mgbaghara ma ọ bụ ịkata obi sị ‘Ewela iwe.’ Kama iwetu obi sị, “Ewela iwe; biko gbaghara m,” onye dị mpako ga na-ekwu na ihe o mere dị mma. Kama ịkata obi kweta na ya mejọrọ, ọ ga-ekwuwe ihe onye nke ọzọ na-emejọ. E mee onye dị mpako ihe ọjọọ, kama ịga ka ya na onye ahụ kpezie, ọ ga na-ewe iwe. O nwere ike ịna-agbalị imegwara onye ahụ, na-agwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ kwụsị ịtụpụrụ ya ọnụ. (Ekli. 7:9) O doro anya na mpako nwere ike ime ka di na nwunye tisaa. Anyị kwesịrị ịna-echeta na “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”—Jems 4:6.

15. Kọwaa otú ime ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:26, 27 nwere ike isi nyere di na nwunye aka idozi nghọtahie ha nwere.

15 N’eziokwu, anyị ekwesịghị iche na mpako enweghị ike ịkpatara anyị nsogbu. Anyị chọpụta na anyị dị mpako, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike gbanwee àgwà anyị ozugbo. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara, unu enyekwala Ekwensu ohere.” (Efe. 4:26, 27) Ọ bụrụ na di na nwunye anaghị eme ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-akpatara ha nsogbu. Otu nwanna nwaanyị kwara arịrị, sị: “E nwere mgbe mụ na di m na-emeghị ihe ahụ e kwuru ná Ndị Efesọs 4:26, 27. O mere ka m ghara ịna-arahụ ụra abalị nke ọma!” Ọ ka mma ka di na nwunye kwurịta nghọtahie ha n’egbughị oge ka ha nwee ike idozi ya. N’eziokwu, o nwere ike ịdị mkpa mgbe ụfọdụ ka mmadụ cheretụ ka obi dajụọ di ya ma ọ bụ nwunye ya. Ha abụọ kwesịkwara ikpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere ha aka ịdị obi umeala. Ụdị obi ahụ ga-enyere di ma ọ bụ nwunye aka ichewe otú a ga-esi dozie nsogbu ahụ, kama onye nke ọ bụla ichewe naanị banyere onwe ya na otú obi dị ya, nke ga-eme ka nsogbu ahụ ka njọ.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12, 13.

16. Olee otú ịdị umeala n’obi nwere ike isi nyere di na nwunye aka ịna-ele ihe ha ma eme anya otú kwesịrị ekwesị?

16 Ịdị obi umeala nwere ike inyere mmadụ aka ịna-echeta ebe di ya ma ọ bụ nwunye ya na-eme nke ọma. Dị ka ihe atụ, nwaanyị nwere ike inwe ihe pụrụ iche ọ ma eme, nke na-abara ezinụlọ uru. Ọ bụrụ na di ya dị umeala n’obi, ọ gaghị eche na nwunye ya na-ama ya aka, kama ọ ga na-agba ya ume iji amamihe ya na-eme ihe bara uru. Ọ ga-esi otú ahụ gosi na ya anaghị eji nwunye ya egwu egwu nakwa na ya hụrụ ya n’anya. (Ilu 31:10, 28; Efe. 5:28, 29) Ọ bụrụkwa na nwunye ya dị umeala n’obi, ọ gaghị eji ihe ọ ma eme na-anya isi ma ọ bụ na-eleda di ya anya. A sị ka e kwuwe, ha abụọ bụ “otu anụ ahụ́.” Ihe na-ewute otu n’ime ha ga na-ewutekwa onye nke ọzọ.—Mat. 19:4, 5.

17. Gịnị ga-enyere di na nwunye aka ịna-enwe obi ụtọ ma na-ewetara Chineke otuto?

17 O doro anya na ị chọrọ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ebi n’udo dị ka Ebreham na Sera ma ọ bụ Aịzik na Ribeka. Ị chọkwara ka unu na-enwe obi ụtọ, ghara itisa, na-ewetakwara Jehova otuto. Ọ bụrụ otú ahụ, na-ele alụmdi na nwunye anya otú Chineke si ele ya. Na-achọ amamihe na nghọta dị na Baịbụl, bụ́ Okwu ya. Mụta ezigbo ịhụnanya, nke bụ́ “ire ọkụ nke Jaa.” Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe obi ụtọ maka àgwà ọma ndị di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere. (Abụ Sọlọ. 8:6) Gbalịsie ike ịdị umeala n’obi. Na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù. I mee ihe ndị a, alụmdi na nwunye gị ga na-eme gị obi ụtọ, meekwa ka obi Nna gị nke eluigwe ṅụrịa. (Ilu 27:11) N’eziokwu, obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwanna ya na nwunye ya birila afọ iri abụọ na asaa. O kwuru, sị: “Amaghị m otú ihe ga-adịrị m ma a sị na nwunye m anọghị. Anyị abụọ na-adịkwu ná mma kwa ụbọchị n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya, na-ekwurịtakwa okwu mgbe niile.”