Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2013

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Izrel oge ochie hà na-akwụgbu ndị omekome n’osisi?

N’oge ochie, otú ọtụtụ mba si egbu ndị omekome bụ ịkwụgbu ha n’osisi. Ndị Rom na-ekedo ụdị onye ahụ n’osisi ma ọ bụ kpọgide ya n’osisi. Onye ahụ nwere ike ịnọ ebe ahụ ruo ụbọchị ole na ole tupu ahụ́ ụfụ, akpịrị ịkpọ nkụ, agụụ, anwụ ma ọ bụ mmiri ozuzo egbuo ya. Ndị Rom weere na ụdị ahụhụ na-emenye ihere e kwesịrị ịta onye kacha kpaa arụ bụ ịkwụgbu ya n’osisi.

Ndị Izrel oge ochie hà na-eme ụdị ihe ahụ? Jehova nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya, i wee kwụwa ya n’osisi, ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị dum; kama ị ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ.” (Diut. 21:22, 23) N’ihi ya, o doro anya na n’oge a na-ede Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ebu ụzọ gbuo onye a mara ikpe ọnwụ tupu a kwụwa ya n’osisi.

Ọ bụ ya mere Levitikọs 20:2 ji sị: “Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel nakwa onye ọ bụla n’ime ndị mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke nyere Molek nwa ya ọ bụla, a ghaghị igbu ya. Ndị ala unu ga-eji nkume tụgbuo ya.” A na-egbukwa ndị “nwere mmụọ ịgba afa ma ọ bụ mmụọ ịkọ ọdịnihu.” Olee otú e si egbu ha? ‘A na-eji nkume tụgbuo ha.’—Lev. 20:27.

Diuterọnọmi 22:23, 24 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwee nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke nwoke kwere nkwa ọlụlụ, nwoke ọzọ ewee hụ ya n’obodo, ya na ya ewee dinaa, unu ga-akpọpụta ha abụọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ ma were nkume tụgbuo ha. Nwa agbọghọ ahụ ga-anwụ n’ihi na o tighị mkpu n’obodo, nwoke ahụ ga-anwụkwa n’ihi na o wedara nwunye nwoke ibe ya n’ala. Ị ga-esi otú a kpochapụ ihe ọjọọ n’etiti unu.” Otú e si egbu ndị kacha kpaa arụ n’Izrel oge ochie bụ iji nkume tụgbuo ha. *

O doro anya na n’oge a na-ede Akwụkwọ Nsọ Hibru, a na-ebu ụzọ gbuo onye a mara ikpe ọnwụ tupu a kwụwa ya n’osisi

Diuterọnọmi 21:23 sịrị: “Ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ.” Onye omekome bụ onye “a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ.” Ihe mere ndị Izrel ji akwụwa ozu onye omekome n’osisi bụ iji dọọ ndị ọzọ aka ná ntị.

^ para. 6 Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na a na-ebu ụzọ gbuo onye omekome tupu a kwụwa ya n’osisi dị ka Iwu Mozis kwuru. Ma, e nwere ihe gosiri na n’oge Jizọs na ndị ozi ya, ndị Juu na-akpọgide ụfọdụ ndị omekome n’osisi, ha anọrọzie ebe ahụ nwụọ.