Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2013

Rite Ezigbo Uru n’Ịgụ Baịbụl

Rite Ezigbo Uru n’Ịgụ Baịbụl

“N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ.”—ROM 7:22.

1-3. Olee uru ịgụ Baịbụl na ime ihe ọ na-akụzi ga-abara anyị?

OTU nwanna nwaanyị katarala ahụ́ kwuru, sị: “M na-ekele Jehova kwa ụtụtụ n’ihi na ọ na-enyere m aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru.” Ọ gụchaala Baịbụl ihe karịrị ugboro iri anọ, ma ọ kwụsịbeghị ịgụ ya. Nwanna nwaanyị ọzọ na-eto eto kwuru na ịgụ Baịbụl enyerela ya aka ịmata na Jehova bụ onye dị adị. N’ihi ya, ya na Jehova adịkwuola ná mma. O kwuru, sị, “Enwetụbeghị m ụdị obi ụtọ m nwere ugbu a!”

2 Pita onyeozi gbara anyị niile ume, sị: “Ka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dị n’okwu Chineke na-agụ unu agụụ.” (1 Pita 2:2) Ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl ma na-eme ihe ọ na-akụzi, anyị ga-enwe akọnuche dị ọcha, na-ebikwa ezigbo ndụ. Ọ ga-emekwa ka anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya bụrụ ezigbo enyi. Ihe ndị a niile bụ ezigbo ihe mere “iwu Chineke” ji kwesị ‘ịna-eme anyị obi ụtọ.’ (Rom 7:22) Ma, e nwere uru ndị ọzọ ịmụ Baịbụl ga-abara anyị. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

3 Ọ bụrụ na ị na-amụkwu banyere Jehova na Ọkpara ya, ị ga-ahụkwu ha na ndị mmadụ ibe gị n’anya. Ịmụ eziokwu Baịbụl ga-enyere gị aka ịmata otú Chineke ga-esi zọpụta ndị na-erubere ya isi mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a. Ị ga-amụtakwa ezigbo ihe ị ga na-ezi ndị mmadụ n’ozi ọma. Jehova ga-agọzi gị ka ị na-akụziri ndị ọzọ ihe ị mụtara mgbe ị na-agụ Okwu ya.

NA-AGỤ BAỊBỤL, NA-ECHEBAKWARA IHE Ị GỤRỤ ECHICHE

4. Gịnị ka ịgụ Baịbụl “n’olu dị ala” pụtara?

4 Jehova achọghị ka ndị ohu ya na-agụ Okwu ya ka onye a na-achụ ọsọ. Ọ gwara Jọshụa, sị: “Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị.” (Jọsh. 1:8; Ọma 1:2)  Ọ̀ pụtara na ị ga-ewetu olu na-agụpụta ihe niile e dere malite na Jenesis ruo ná Mkpughe? Mbanụ. Ihe ọ pụtara bụ na ị ga na-agụ ya otú ị ga-enwe ike ichebara ihe ị na-agụ echiche. Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl “n’olu dị ala,” ọ ga-enyere gị aka iche echiche banyere ihe ndị ga-akacha baara gị uru na ihe ndị ga-agba gị ume. Ị gụta ụdị okwu ahụ, amaokwu ahụ, ma ọ bụ akụkọ ahụ, wetuo obi gụọ ya. I nwedịrị ike iji nwayọọ na-agụpụta ya. Ime otú ahụ nwere ike ime ka ihe e kwuru na Baịbụl ruo gị n’obi. Gịnị mere ihe ị na-agụ ji kwesị iru gị n’obi? Ọ bụ n’ihi na ịghọta ndụmọdụ Chineke nyere ga-eme ka i nwee ike ime ya eme.

5-7. Nye ihe atụ gosiri otú iwetu obi gụọ Baịbụl ma tụgharịa uche na ya nwere ike isi nyere gị aka (a) izere omume rụrụ arụ; (b) ịna-enwere ndị ọzọ ndidi, na-emekwara ha obiọma; (ch) ịna-atụkwasị Jehova obi mgbe ihe siiri gị ike.

5 Mgbe ị na-agụ akwụkwọ Baịbụl i nwere ike iche na o siri ike nghọta, ọ ga-abara gị uru ma i wetuo obi gụọ ya ka i nwee ike ichebara ihe ị na-agụ echiche. Chegodị banyere mmadụ atọ e ji mee ihe atụ ebe a. Onye nke mbụ bụ nwanna nwoke na-eto eto nke na-agụ akwụkwọ Hosia. Mgbe ọ gụruru n’isi nke anọ, amaokwu nke iri na otu ruo nke iri na atọ, ọ kwụsịtụrụ, chebara ihe ọ gụrụ echiche. (Guọ Hosia 4:11-13.) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-agbalịsi ike izere omume rụrụ arụ ụmụ akwụkwọ ibe ya na-enye ya nsogbu ka o mee. Ọ tụgharịrị uche n’amaokwu ndị ahụ, chee, sị: ‘Jehova na-ahụ ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme, ma nke ha na-eme na nzuzo. Achọghị m ime ihe ga-ewe ya iwe.’ Nwanna ahụ kpebisiziri ike izere omume rụrụ arụ n’anya Chineke.

6 N’ihe atụ nke abụọ, chee banyere nwanna nwaanyị nke weturu obi na-agụ amụma e buru n’akwụkwọ Joel, gụrute n’isi nke abụọ, amaokwu nke iri na atọ. (Gụọ Joel 2:13.) Amaokwu a mere ka ọ ghọta na ya kwesịrị ịna-eṅomi Jehova, bụ́ onye “na-eme amara, na-emekwa ebere, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma ya dịkwa ukwuu.” O kpebiri na ya agaghịzi na-agwa di ya ma ọ bụ ndị ọzọ okwu ọjọọ otú ọ na-eme mgbe ụfọdụ, na ya agaghịkwa eji iwe na-agwa ha okwu.

7 N’ihe atụ nke atọ, chegodị banyere nwanna nwoke nwere ezinụlọ. A chụrụ ya n’ọrụ. Ihe na-echu ya ụra bụ otú ọ ga-esi na-egbo mkpa nwunye ya na ụmụ ya. Na Nehọm 1:7, o weturu obi gụọ na Jehova ‘maara ndị na-agbaba n’ime ya’ nakwa na ọ na-echebe ha n’ihi na “ọ bụ ebe e wusiri ike n’ụbọchị ahụhụ.” Ihe a ọ gụtara kasiri ya obi, mee ka ọ ghọta na Jehova hụrụ ya n’anya. N’ihi ya, ọ kwụsịrị ichegbu onwe ya. Ọ gụkwara amaokwu nke iri na ise n’olu dị ala. (Guọ Nehọm 1:15.) Nwanna a chọpụtara na ikwusa ozi ọma mgbe ihe siiri ya ike ga-egosi n’eziokwu na ya ji Jehova mere ebe mgbaba ya. N’ihi ya, ka nwanna a na-achọ ọrụ, ọ ga na-ewepụtakwa oge na-aga ozi ọma n’ime izu.

8. Ná nkenke, kọwaa ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl gị.

8 Ihe ndị a bara uru anyị tụlere si n’akwụkwọ Baịbụl ndị ụfọdụ nwere ike iche na ha siri ike nghọta. Ka ị na-agụ akwụkwọ Hosia, Joel, na Nehọm ka i nwee ike ịmụta ihe, i kwesịrị iwetu obi na-agụ ha, na-echebakwara ihe ị na-agụ echiche. Ihe ndị amụma ndị ahụ dere ga-eme ka ị mara ihe, kasiekwa gị obi. Akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl hà bara uru otú ahụ? Eenụ! Okwu Chineke dị ka ala ebe a na-egwute ọlaedo. Na-agbalịsi ike igwute ihe ga-abara gị uru! Mgbe ị na-agụ Baịbụl, gbaa mbọ ghọta ihe Chineke chọrọ ka i mee, na otú o si agba gị ume. Ọ ga-adị gị ka inweta akụ̀ bara uru.

GBALỊA ỊGHỌTA IHE Ị NA-AGỤ

9. Olee otú anyị ga-esi ghọtakwuo ihe bụ́ uche Chineke?

9 Ọ bụ eziokwu na i kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, i kwesịkwara ịgbalị ka ị na-aghọta ihe ị na-agụ. N’ihi ya, jiri akwụkwọ  nzukọ Jehova bipụtara na-eme nchọnchọ iji matakwuo ndị ị gụrụ banyere ha, ebe ndị a kpọrọ aha, na ihe ndị merenụ. Ọ bụrụ na ị maghị otú ihe Baịbụl kụziri si gbasa ndụ gị, i nwere ike ịjụ okenye ọgbakọ ma ọ bụ nwanna ọzọ nke ma ihe n’ọgbakọ ka o nyere gị aka. N’oge ndịozi, e nwere otu Onye Kraịst e kwesịrị inyere aka ka ọ ghọtakwuo ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu. Aha ya bụ Apọlọs. Ka anyị tụlee ihe o mere ka anyị nwee ike ịghọta na anyị kwesịrị ịgbalị na-aghọtakwu eziokwu Baịbụl.

10, 11. (a) Olee otú e si nyere Apọlọs aka ịna-akụzi Okwu Chineke nke ọma? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Apọlọs? (Gụọ igbe bụ́ “Ị̀ Na-akụzi Ihe Nzukọ Jehova Na-akụzi Ugbu A?”)

10 Apọlọs bụ ma onye Juu ma Onye Kraịst. Ọ ‘maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, na-anụkwa ọkụ na mmụọ.’ Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru banyere ya, sị: “Ọ malitekwara na-ekwu okwu ma na-ezi ihe ndị metụtara Jizọs n’ụzọ ziri ezi, ma ọ bụ naanị banyere baptizim Jọn ka ọ maara.” Apọlọs amaghị na ihe ọ na-akụzi banyere baptizim bụ ihe oge ya gaferela. E nwere di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst aha ha bụ Prisila na Akwịla. Mgbe ha nụrụ ihe Apọlọs na-akụzi n’Efesọs, ha “kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” (Ọrụ 18:24-26) Olee otú o si baara Apọlọs uru?

11 Mgbe Apọlọs zichara ozi ọma n’Efesọs, ọ gawara Akeya. “Mgbe o rutere n’ebe ahụ, o nyeere ndị kwere ekwe n’ihi obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ aka nke ukwuu; n’ihi na o kwusiri okwu ike, gosi nke ọma n’ihu ọha na ihe ndị Juu na-ekwu ezighị ezi, ebe o si n’Akwụkwọ Nsọ gosi na Jizọs bụ Kraịst.” (Ọrụ 18:27, 28) N’oge ahụ, Apọlọs na-akọwazi ihe baptizim Ndị Kraịst pụtara nke ọma. N’ihi ihe ndị ọ ghọtakwuru, o nyeere ndị ọhụrụ aka “nke ukwuu” imekwu nke ọma n’ofufe Chineke. Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ịghọta ihe anyị gụrụ na Baịbụl  otú ahụ Apọlọs mere. Ma, ọ bụrụ na nwanna nke ma ihe n’ọgbakọ atụọrọ anyị aro otú anyị ga-esi na-ezikwu ihe nke ọma, anyị kwesịrị iwetu obi nabata ihe ọ gwara anyị, keleekwa ya. Anyị mee otú ahụ, ozi anyị na-ejere Chineke ga-aka mma.

JIRI IHE Ị MỤTARA NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

12, 13. Olee otú i nwere ike isi wetuo obi jiri ihe Baịbụl kwuru nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ikpebi ife Jehova?

12 Anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka otú ahụ Prisila, Akwịla, na Apọlọs mere. Olee otú obi na-adị gị ma i nyere onye nwere mmasị aka ịgbanwe ndụ ya ka o nwee ike ife Jehova? Ọ bụrụ na ị bụ okenye ọgbakọ, olee otú obi na-adị gị mgbe nwanna bịara kelee gị n’ihi na ndụmọdụ i nyere ya baara ya uru mgbe nsogbu bịaara ya? N’eziokwu, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị jiri Okwu Chineke nyere ndị ọzọ aka ịgbanwe ndụ ha. * Olee otú ị ga-esi mee ya?

13 N’oge Ịlaịja, ọtụtụ ndị Izrel amaghị ma hà ga-efe Jehova, ka hà ga-efe Bel. Ihe Ịlaịja gwara ha nwere ike inyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ya ike ikpebi ife Jehova. (Gụọ 1 Ndị Eze 18:21.) Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl na-atụ egwu ihe ndị enyi ya ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya ga-eme ya, i nwere ike iji ihe e kwuru n’Aịzaya 51:12, 13 nyere ya aka ikpebi ife Jehova.—Gụọ ya.

14. Gịnị ga-enyere gị aka ịna-echeta amaokwu Baịbụl ndị ị ga-eji nyere ndị ọzọ aka?

14 N’eziokwu, ọtụtụ ihe dị na Baịbụl na-agba anyị ume, na-agbazi anyị, na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike. Ma i nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee otú m ga-esi mara amaokwu Baịbụl ndị m kwesịrị iji nyere mmadụ aka?’ Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharịkwa uche n’ihe ị gụrụ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-amata ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl. Mmụọ nsọ Jehova ga-enyekwara gị aka icheta ihe ndị ahụ mgbe ị chọrọ iji ha nyere ndị ọzọ aka.—Mak 13:11; gụọ Jọn 14:26. *

15. Gịnị ga-enyere gị aka ịghọtakwu Okwu Chineke?

15 Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe ị ga-eji na-arụ ọrụ ndị o nyere gị otú ahụ Eze Sọlọmọn mere. (2 Ihe 1:7-10) ‘Jụọ ase nke ọma, jirikwa nlezianya mee nchọpụta’ n’Okwu Chineke ka ị mata eziokwu banyere Jehova na uche ya. Otú ahụ ka ndị amụma mere n’oge ochie. (1 Pita 1:10-12) Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka o ‘jiri okwu okwukwe na nke ezi ozizi na-azụ’ onwe ya. (1 Tim. 4:6) I mee otú ahụ, ị ga-enwe ike inyere ndị ọzọ aka ịmara Chineke. Okwukwe gị ga na-esikwa ike.

ỊGỤ BAỊBỤL NA-ECHEBE ANYỊ

16. (a) Olee otú ‘inyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị’ si baara ndi Beria uru? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị?

16 N’oge ndịozi, e nwere ndị Juu bi na Beria, nke dị na Masedonia. Ha “na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị.” Mgbe Pọl zichara ha ozi ọma, ha tụlere ma è nwere ihe dị iche n’ihe Pọl gwara ha na ihe ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Olee uru ọ baara ha? Ọtụtụ ghọtara na ihe ọ kụziiri ha bụ eziokwu, ha ‘aghọọ ndị kwere ekwe.’ (Ọrụ 17:10-12) Ihe a gosiri na ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị na-eme ka okwukwe anyị nwere na Jehova sikwuo ike. Ụdị okwukwe ahụ bụ “atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu.” Anyị kwesịrị inwe ya  ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbanye n’ụwa ọhụrụ Chineke.—Hib. 11:1.

17, 18. (a) Olee otú okwukwe siri ike na ịhụnanya si echebe obi Onye Kraịst? (b) Olee otú olileanya si echebe anyị?

17 Ọ bụ ya mere Pọl ji dee, sị: “Anyị onwe anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị nwee uche ziri ezi ma yiri ihe mgbochi obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu agha.” (1 Tesa. 5:8) Onye agha kwesịrị iyiri ihe ga-eme ka mgbọ onye iro ghara ịtụ ya n’obi. Otú ahụ ka Onye Kraịst kwesịrị ichebe obi ihe atụ ya ka mmehie ghara ịkpa ya aka ọjọọ. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ohu Jehova emee ka okwukwe ya sie ike ná nkwa Chineke, jirikwa obi ya niile hụ Chineke na ndị mmadụ ibe ya n’anya? Onye na-eme otú ahụ ji ihe mgbochi obi nke kacha mma na-echebe obi ya. Ọ ga-esiri ya ike itinye aka n’ihe ọ bụla ga-eme ka ya na Chineke ghara ịdị ná mma.

18 Pọl kwukwara banyere okpu agha, nke bụ́ “olileanya nke nzọpụta.” N’oge ochie, ọ bụrụ na onye agha ekpughị okpu agha, e nwere ike igbu ya n’ọgbọ agha. Ma ọ bụrụ na o kpu ezigbo okpu agha, a gbagodị ya akụ́ n’isi, ọ gaghị emerụ ya ahụ́. Ịmụ Okwu Chineke ga-eme ka anyị nwee olileanya na Jehova ga-echebe anyị. Olileanya siri ike ga-eme ka anyị zere ndị si n’ezi ofufe dapụ, zerekwa “okwu ha” nke ‘na-agbasa dị ka ọnyá na-aba aba.’ (2 Tim. 2:16-19) Olileanya anyị nwere ga-emekwa ka anyị kpebisie ike na anyị na ndị na-eme ihe Jehova kpọrọ asị agaghị na-akpa.

ỊGỤ BAỊBỤL GA-ENYERE ANYỊ AKA KA CHINEKE GHARA IBIBI ANYỊ

19, 20. Gịnị mere anyị ji jiri Okwu Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu? Oleekwa otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ na Chineke nyere anyị Baịbụl? (Guọ igbe bụ́ “Jehova Na-enye M Ihe Dị M Mkpa.”)

19 Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso n’ike n’ike, anyị kwesịrị ịna-atụkwasịkwu Okwu Jehova obi. Ihe ndị anyị mụtara na ya na-enyere anyị aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ bụla anyị na-akpa, na-ejidekwa onwe anyị mgbe ihe ọjọọ na-agụ anyị. Otú o si agba anyị ume, na-akasikwa anyị obi ga-eme ka anyị merie ọnwụnwa ndị si n’aka Setan na ụwa ya. Ndụmọdụ Jehova si na Baịbụl enye anyị ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ụzọ na-eduga ná ndụ.

20 Cheta na Chineke chọrọ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile.” Ndị so ‘n’ụdị mmadụ niile’ a bụ ma ndị ohu Jehova ma ndị anyị nwere ike inyere aka mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, na-akụzikwa Okwu Chineke. Ma, ndị niile chọrọ ka a zọpụta ha ga-enwetarịrị “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke chebe anyị mgbe ọ ga-ebibi ụwa ochie a, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl, na-emekwa ihe anyị mụtara na ya. Okwu Jehova bụ eziokwu bara ezigbo uru. Otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ya kpọrọ ihe bụ ịgụ ya kwa ụbọchị.—Jọn 17:17.

^ para. 12 Anyị ekwesịghị iji Baịbụl amanye mmadụ ka ọ gbanwee ma ọ bụ jiri ya na-akatọ mmadụ. Otú ahụ Jehova na-enwere anyị ndidi, na-emekwara anyị obiọma ka anyị kwesịrị ịna-emere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl.—Ọma 103:8.

^ para. 14 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na i chetara okwu dị na Baịbụl, ma i chetaghị ebe ọ dị? I nwere ike ịhụ amaokwu ahụ ma i lee n’azụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ebe e depụtara okwu ndị dị na Baịbụl. I nwekwara ike iji Watchtower Library chọta amaokwu ahụ.