Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2013

 AKỤKỌ NDỤ

Ozi Oge Niile Anyị Jere Iri Afọ Ise n’Ebe Ugwu Finland

Ozi Oge Niile Anyị Jere Iri Afọ Ise n’Ebe Ugwu Finland

Anyị gwara enyi anyị na-eje ozi oge niile, sị: “Ọ dịịrị gị mfe ịsụ ụzọ, n’ihi na nne gị na nna gị bụ Ndịàmà Jehova. Ha ga na-enyere gị aka.” Ọ zara anyị, sị: “Ka m gwa unu, anyị niile nwere otu Nna.” O ji ihe a ọ zara anyị na-echetara anyị ihe dị mkpa, ya bụ na Nna anyị nke eluigwe na-elekọta ndị na-efe ya, na-agbakwa ha ume. Ihe ndị anyị hụrụla ná ndụ emeela ka o doo anyị anya na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu.

 A MỤRỤ anyị n’ezinụlọ na-arụ ọrụ ugbo n’Ọstrọbọtnịa nke Ebe Ugwu, dị na Finland. Anyị dị ụmụaka iri n’ezinụlọ anyị. Agha Ụwa nke Abụọ nyere anyị nsogbu mgbe anyị bụ ụmụaka. Ọ bụ eziokwu na ebe anyị bi adịghị nso n’ọgbọ agha, anyị ma na agha ahụ mere ka ndị mmadụ taa ezigbo ahụhụ. Mgbe a tụrụ bọmbụ n’obodo ndị dị anyị nso, ya bụ, Aụlu na Kalajọki, anyị hụrụ ka eluigwe na-acha ọbara ọbara n’abalị. Nne anyị na nna anyị gwara anyị na mgbe ọ bụla anyị hụrụ ka ụgbọelu e ji alụ agha na-efefe, na anyị gaa zoo. N’ihi ya, mgbe diọkpara anyị aha ya bụ Tauno gwara anyị na ụwa ga-abụ paradaịs ebe ihe ọjọọ na-agaghị adị, o ruru anyị n’obi.

Tauno mụtara eziokwu Baịbụl n’akwụkwọ Ndị Mmụta Baịbụl mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere, ọ jụrụ ịga agha n’ihi ihe ọ mụtara na Baịbụl. N’ihi ya, a tụrụ ya mkpọrọ, taakwa ya ezigbo ahụhụ n’ebe ahụ. Ihe a niile e mere ya mere ka o kpebisikwuo ike ife Jehova. Mgbe e mechara hapụ ya, o wepụtakwuru oge na-eje ozi ọma. Àgwà ọma nwanne anyị nwoke mere ka anyị malite ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe n’otu obodo dị anyị nso. Anyị gakwara mgbakọ distrikti n’agbanyeghị na o siiri anyị ike ịrụta ego ga-ezuru anyị ịga. Anyị na-adụrụ ndị agbata obi anyị ákwà, na-akụ yabaasị, na-atụtụkwa mkpụrụ osisi. Ebe anyị abụọ nwere ọtụtụ ọrụ anyị na-arụ n’ugbo anyị, anyị anaghị aga mgbakọ otu mgbe. Ọ na-abụ, otu onye gachaa, onye nke ọzọ agaa.

Si n’aka ekpe: Matti (nna), Tauno, Saimi, Maria Emilia (nne), Väinö (nwa ọhụrụ), Aili, na Annikki n’afọ 1935

Eziokwu ndị anyị mụtara banyere Jehova na nzube ya mere ka anyị hụkwuo ya n’anya ma kpebie inyefe ya ndụ anyị. N’afọ 1947, e mere anyị abụọ baptizim iji gosi na anyị enyefeela Jehova onwe anyị. (Annikki dị afọ iri na ise mgbe ahụ, Aili adịrị afọ iri na asaa.) Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka e mere nwanne anyị nwaanyị aha ya bụ Saimi baptizim. Anyị mụkwaara nwanne anyị nwaanyị aha ya bụ Linnea Baịbụl. Ọ lụọla di mgbe ahụ. Ya na di ya na ụmụ ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova. Mgbe e mechara anyị baptizim, anyị kpebiri na anyị ga-abụ ndị ọsụ ụzọ, na anyị ga na-asụ ụzọ inyeaka mgbe ụfọdụ.

ANYỊ MALITERE OZI OGE NIILE

Si n’aka ekpe: Eeva Kallio, Saimi Mattila-Syrjälä, Aili, Annikki, na Saara Noponen n’afọ 1949

N’afọ 1955, anyị kwagara n’obodo Kemi, nke dị n’ime ime ebe ugwu Finland. N’agbanyeghị na ọrụ anyị na-arụ mere ka anyị ghara ịna-enwe efe, anyị ka chọrọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ. Ma, ihe bụ́ ụjọ anyị bụ ma ànyị ga-enwe ike ịna-akpata ego anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị. Anyị chere na anyị kwesịrị ibu ụzọ kpata ego ma dewe ya, a dịghị ama ama. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị na nwanna nwaanyị ahụ bụ́ ọsụ ụzọ kwurịtara ihe ahụ a kọrọ ná mmalite. Ihe ahụ anyị na ya kparịtara mere ka anyị ghọta na ihe ga-eme ka anyị jeere Jehova ozi oge niile abụghị naanị ịkpata ego ma ọ bụ inwe ndị ezinụlọ ga na-akwado anyị. Ihe kacha mkpa bụ ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi.

Mgbe anyị na-aga mgbakọ na Kuọpiọ n’afọ 1952. Si n’aka ekpe: Annikki, Aili, na Eeva Kallio

N’oge ahụ, anyị kpatara ego ga-ezuru anyị ịsụ ụzọ ọnwa abụọ. N’ihi ya, n’ọnwa ise n’afọ 1957, anyị ji ụjọ dejupụta akwụkwọ ịsụ ụzọ ọnwa abụọ na Pelo, bụ́ otu obodo mepere emepe, dị na Lapland. Mgbe  ọnwa abụọ gachara, ego niile ahụ anyị dewere ka dịkwa. N’ihi ya, anyị dejupụtakwara akwụkwọ ịsụ ụzọ ọnwa abụọ ọzọ. Mgbe ọnwa abụọ ahụ gachara, anyị akpabeghị ego ahụ aka. Ọ bụ mgbe ahụ ka obi siri anyị ike na Jehova ga na-elekọta anyị. Anyị asụọla ụzọ iri afọ ise, ma ego anyị ka dịkwa! Ọ na-abụ, anyị cheta oge gara aga, ọ na-adị anyị ka Jehova ò sekpụ anyị n’aka, na-asị anyị: “Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:13.

Anyị asụọla ụzọ iri afọ ise, ma ego anyị ka dịkwa!

Ebe Kaisu Reikko na Aili nọ n’ozi ọma

N’afọ 1958, onye nlekọta sekit anyị tụụrụ anyị aro ka anyị gaa bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo Sọdankuila, dị na Lapland. N’oge ahụ, ọ bụ naanị otu nwanna nwaanyị bụ Onyeàmà Jehova n’ebe ahụ. Otú o si nata eziokwu pụrụ iche. Nwa ya nwoke na ụmụ klas ha gara Helsịnki, bụ́ isi obodo Finland. Ka ha na-aga n’ime obodo ahụ, ọ bụ nwatakịrị ahụ nọ n’azụ. Otu nwanna nwaanyị merela agadi nyere ya Ụlọ Nche ma gwa ya ka o nye ya mama ya. Nwatakịrị ahụ mere otú ahụ. Mama ya ghọtara ozugbo na ihe ọ gụtara bụ eziokwu.

Anyị nwetara ụlọ n’otu ụlọ elu. Anyị bi n’elu, e nwee ebe a na-anọ akwọ osisi n’ala. Ọ bụ n’ụlọ anyị ka a na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ. Mgbe anyị gara ebe ahụ ọhụrụ, naanị ndị na-abịa ọmụmụ ihe bụ anyị abụọ na nwanna nwaanyị ahụ na nwa ya nwaanyị. Anyị na-anọkọ gụọ ihe e kwesịrị ịmụ n’izu. Ka oge na-aga, otu nwoke Ndịàmà Jehova mụbuuru ihe nwetara ọrụ n’ebe ahụ a na-akwọ osisi. Ya na ezinụlọ ya malitere ịbịa ọmụmụ ihe. E mechara mee ya na nwunye ya baptizim. Ọ bụzi ya na-eduzi ọmụmụ ihe. Ụfọdụ ụmụ nwoke ndị ọzọ, ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ a na-akwọ osisi, malitekwara ịbịa ọmụmụ ihe ma mechaa nata eziokwu. Mgbe afọ ole na ole gachara, ndị nkwusa ole na ole anyị nwere mụbara, anyị aghọzie ọgbakọ.

IHE NDỊ SIIRI ANYỊ IKE

O siiri anyị ike iji ụkwụ na-aga ọtụtụ kilomita ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma. N’ọkọchị, anyị na-eji ụkwụ, ígwè, ma ọ bụ ụgbọ mmiri aga ebe anyị ga-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ígwè anyị baara anyị ezigbo uru. Anyị na-agbakwa ya aga mgbakọ distrikti. Ebe ndị mụrụ anyị bi dị ọtụtụ narị kilomita. Anyị na-agbakwa ígwè aga eleta ha. N’oge oyi, anyị na-aba bọs n’isi ụtụtụ gaa n’otu obodo, jirizie ụkwụ na-aga n’ụlọ n’ụlọ. Anyị rụchaa otu obodo, anyị agafee n’ọzọ. Mgbe ụfọdụ, snoo na-eju n’ụzọ. Ọtụtụ mgbe, e nweghị ndị na-ekupụ ya. Ọ bụrụ mgbe ụgbọ ịnyịnya gbafere n’ụzọ ahụ, ebe anyị na-esizi agafe snoo ahụ bụ ebe ụkwụ ụgbọ ahụ si gafee. Mgbe ụfọdụ, snoo na-ekpuchi ebe ndị ahụ. N’ihe dị ka ọnwa atọ n’afọ, snoo ndị ahụ na-amalite ịgbaze,  mee ka ebe niile dị ka pọtọpọtọ. N’ihi ya, ọ na-esiri onye ji ụkwụ ezigbo ike.

Mgbe anyị abụọ nọ n’ozi ọma n’oge oyi na-atụsi ike

N’oge ahụ snoo na-ada, ezigbo oyi na-atụ. O mere ka anyị mụta iyi uwe e ji achụ oyi. Anyị na-eyi sọks e ji ajị anụ kpaa, yirikwa sọks abụọ ma ọ bụ atọ na nnukwu buutu. N’agbanyeghị nke ahụ, snoo na-ejukarị buutu anyị yi. Ọ na-abụ, anyị ruo n’ụlọ ndị mmadụ, anyị eyipụ buutu anyị, wụpụkwa snoo dị n’ime ya. Snoo ndị juru n’ụzọ na-eme ka ala ala uwe anyị dị mmiri mmiri. Oyi tụsikwuo ike, mmiri dị n’uwe anyị na-akpụkọ, siekwa ike ka ígwè. Otu nwaanyị anyị banyere n’ụlọ ya kwuru, sị: “Ọ ga-abụrịrị na unu nwere ezigbo okwukwe, ebe ọ bụ na unu ji aka unu kpebie ibu ụdị oyi a na-atụnụ na-agagharị.” Anyị ji ụkwụ gaa ihe karịrị kilomita iri na otu tupu anyị eruo n’ụlọ nwaanyị ahụ.

N’ihi otú ebe ndị ahụ si dị anya, anyị na-arahụkarị n’ụlọ ndị anyị gara izi ozi ọma. Ọ na-abụ, chi jiwe, anyị achọwa ebe anyị ga-arahụ. Ọ na-abụkarị ụlọ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Ma, ndị na-enye anyị ụlọ na-adị obiọma, na-anabatakwa ndị ọbịa. Ihe ha na-enye anyị abụghị naanị ebe anyị ga-arahụ, ha na-enyekwa anyị nri. Ọtụtụ mgbe, ihe anyị na-eji emere ute bụ akpụkpọ anụ. Mgbe ụfọdụ, a na-enye anyị ebe mara mma. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị nke bi n’ụlọ elu kpọ anyị gbagoo n’ebe ndị ọbịa ya na-anọ. E nwere ezigbo ihe ndina na ya, na ọmarịcha ákwà ọcha e ji chọọ ya mma. Ọtụtụ mgbe, anyị na ndị nwe ụlọ na-ekwurịta ihe gbasara Baịbụl ruo n’ime abalị. N’otu ebe anyị rahụrụ, nwoke nwe ụlọ na nwunye ya rahụrụ n’otu akụkụ n’ụlọ ahụ, anyịnwa arahụ n’akụkụ ya nke ọzọ. Anyị na ha kwugidere ihe gbasara Baịbụl ruo mgbe chi bọwara. Ha ka nọkwa na-ajụ anyị ajụjụ. Nwoke ahụ jụchaa, nwunye ya ajụọ.

CHINEKE GỌZIRI OZI ANYỊ

Lapland bụ obodo mara mma. Otú o si ama mma na-agbanwe n’oge dị iche iche n’afọ. Ma, ndị kacha maa mma n’anya anyị bụ ndị mụtara banyere Jehova. Ụfọdụ n’ime ndị anyị ziri ozi ọma bụ ndị gara biri n’obere ụlọ ndị dị n’ime ọhịa na Lapland. Ihe ha na-arụ bụ igbu osisi. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ, anyị bata n’ebe ahụ, anyị ahụ ọtụtụ ụmụ nwoke gbara agba ndị bi n’otu obere ụlọ. Obi na-adị ha ụtọ ịnụ ozi si na Baịbụl. Ha na-anarakwa akwụkwọ anyị.

E nwere ọtụtụ ihe mere ebe ahụ tọrọ anyị ụtọ. Otu ụbọchị, bọs pụrụ nkeji ise tupu anyị erute n’ebe a na-aba bọs n’ihi na elekere dị n’ebe ahụ na-agba ọsọ. Ihe anyị meziri bụ ịba bọs nke na-aga obodo ọzọ anyị na-agatụbeghị kwusaa ozi ọma. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, n’ụlọ mbụ anyị banyere, anyị hụrụ otu nwaanyị, ya asị anyị, “Unu abịala. Atụrụ m anya na unu ga-abịa.” Anyị na-amụrụ nwanne ya nwaanyị Baịbụl. Nwaanyị ahụ gwara nwanne ya nwaanyị ka ọ gwa anyị ka anyị bịa leta ya n’ụbọchị ahụ anyị bịara. Ma, nwanne ya nwaanyị ezighị anyị ozi ahụ. Anyị malitere ịmụrụ nwaanyị ahụ na ndị ikwu ya ha na ya gbara agbata obi Baịbụl. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ịmụkọrọ ha Baịbụl ọnụ. Ndị na-abịa  na-eru ihe dị ka mmadụ iri na abụọ. Kemgbe ahụ, ọtụtụ ndị si n’ezinụlọ ahụ aghọọla Ndịàmà Jehova.

Ọ bụ n’afọ 1965 ka e zitere anyị n’ọgbakọ a anyị nọ ugbu a n’obodo Kusamọ. N’oge ahụ, e nwere naanị ndị nkwusa ole na ole n’ọgbakọ anyị. Mgbe mbụ anyị bịara ebe a, izi ozi ọma ebe a siiri anyị ike. Ndị mmadụ anaghị eji okpukpe ha egwu egwu. N’ihi ya, ha na-ele anyị anya ọjọọ. Ma, ọtụtụ ndị na-akwanyere Baịbụl ùgwù. Anyị na-ejikarị Baịbụl amalite mkparịta ụka anyị na ha. Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-agbalị ịmata ndị mmadụ. Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, ọ naghịzi esichara anyị ike ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.

ANYỊ KA NA-EJE OZI ỌMA

Ụfọdụ ndị anyị mụụrụ Baịbụl

Taa, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na anyị ka na-aga ozi ọma kwa ụbọchị. Ma, ike anaghịzi adị anyị ịgagide ozi ọma chi ejie. Ebe anyị na-ekwusa ozi ọma buru ezigbo ibu. Ma, ikwusa ozi ọma na ya dịtụụrụ anyị mfe ugbu a n’ihi na Aili amụọla ịnya ụgbọala. Ọ bụ nwa nwanne anyị gbara ya ume ka ọ gaa mụọ ịnya ụgbọala. O nwetara akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala n’afọ 1987, mgbe ọ dị afọ iri ise na isii. Ihe dịkwuuru anyị mfe mgbe a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, anyị akwaba n’ọnụ ụlọ dị n’akụkụ ya.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ọtụtụ ndị anatala eziokwu n’ebe ugwu Finland. Mgbe anyị malitere ozi oge niile n’ebe a, e nwere naanị ndị nkwusa ole na ole n’ebe dị iche iche n’obodo a. Ma, ugbu a, e nweela sekit, nweekwa ọtụtụ ọgbakọ. Ọtụtụ mgbe, anyị gaa mgbakọ, a na-enwe onye na-abịakwute anyị, gwa anyị aha ya ma jụọ anyị ma ànyị matara ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ na anyị mụụrụ ezinụlọ ha Baịbụl mgbe ọ ka bụ nwata. Mkpụrụ ahụ a kụrụ ọtụtụ afọ gara aga mechara mịa mkpụrụ!—1 Kọr. 3:6.

Ozi ọma na-atọ anyị ụtọ, ma n’udu mmiri

Afọ 2008 mere ya afọ iri ise anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Anyị na-ekele Jehova na anyị abụọ na-agbarịta ibe anyị ume ịna-atachi obi n’ọrụ a dị ezigbo mkpa. Anyị ebighị ndụ okomoko, ma o nweghị ihe kọrọ anyị. (Ọma 23:1) Anyị aghọtala na obi abụọ ahụ ozi oge niile mere anyị ná mmalite abaghị uru! Obi dị anyị ụtọ na kemgbe anyị jewere ozi oge niile, Jehova na-eme ka anyị dị ike otú ahụ o kwere ná nkwa n’Aịzaya 41:10, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.”