Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2013

Jiri Okwu Chineke Nyere Onwe Gị Aka, Nyekwara Ndị Ọzọ Aka

Jiri Okwu Chineke Nyere Onwe Gị Aka, Nyekwara Ndị Ọzọ Aka

‘M weere iwu niile i nyere banyere ihe niile dị ka nke ziri ezi.’—ỌMA 119:128.

1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Okwu Chineke obi anyị niile?

MGBE ndị okenye na-atụle ma onye a na-amụrụ Baịbụl ò ruru eru iso gawa ozi ọma, ha na-ajụ onwe ha, sị, ‘Okwu onye ahụ ọ̀ na-egosi na o kwere na Baịbụl bụ Okwu Chineke nke si n’ike mmụọ nsọ?’ * Ndị ohu Chineke niile kwesịrị iji obi ha niile zaa ee, ma onye chọrọ ịghọ onye nkwusa Alaeze. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị Okwu Chineke obi, mụtakwa otú anyị ga-esi jiri ya na-akụzi ihe nke ọma n’ozi ọma, anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịmara Jehova, nke ga-eme ka a zọpụta ha.

2. Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịnọgide n’ihe ndị anyị mụtara’?

2 Pọl onyeozi mere ka o doo anya na Okwu Chineke dị mkpa. O degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” “Ihe ndị” ahụ Pọl kwuru banyere ha bụ eziokwu Baịbụl ndị mere ka Timoti nwee okwukwe n’ozi ọma. Eziokwu ndị ahụ na-eme ka okwukwe anyị sie ike taa, na-enyekwara anyị aka ‘ịmara ihe iji nweta nzọpụta.’ (2 Tim. 3:14, 15) Anyị na-eji ihe Pọl kwuru na 2 Timoti 3:16 egosi ndị ọzọ na Baịbụl si n’aka Chineke. Ma, ihe e kwuru n’amaokwu ahụ nwekwara ike ịbakwuru anyịnwa uru. (Gụọ ya.) Ka anyị tụlekwuo amaokwu ahụ. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe niile Jehova na-akụziri anyị “ziri ezi.”—Ọma 119:128.

“Ọ BARA URU IJI YA ZIE IHE”

3-5. (a) Gịnị ka ìgwè mmadụ mere mgbe Pita kwuchara okwu na Pentikọst, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị mere ọtụtụ ndị Tesalonaịka ji nata eziokwu? (ch) Olee ihe nwere ike ịmasị ndị mmadụ banyere ozi ọma anyị na-ekwusa?

3 Jizọs gwara mba Izrel, sị: “M na-ezitere unu ndị amụma na ndị maara ihe na ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.” (Mat.  23:34) Jizọs na-ekwu banyere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị ọ kụziiri otú ha ga-esi jiri Akwụkwọ Nsọ na-ezi ozi ọma. Otu n’ime ‘ndị ahụ na-ezi ihe n’ihu ọha’ bụ Pita onyeozi. Na Pentikọst afọ 33, ọ gwara oké ìgwè mmadụ okwu na Jeruselem. N’okwu ahụ, o kwuru ọtụtụ ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Mgbe ọtụtụ ndị nụrụ otú Pita si kọwaa amaokwu ndị ahụ, “ọ dụrụ ha adụ n’obi,” ha echegharịa ná mmehie ha. Ihe dị ka puku mmadụ atọ n’ime ha rịọrọ Chineke mgbaghara ma ghọọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 2:37-41.

4 Onye ọzọ so ná ndị ahụ na-ezi ihe n’ihu ọha bụ Pọl onyeozi. O kwusara ozi ọma n’obodo ndị ọzọ ma e wezụga Jeruselem. Dị ka ihe atụ, n’obodo Masedonia nke dị na Tesalonaịka, ọ gwara ndị na-efe Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu okwu. Ha na Pọl ‘nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ, ya ana-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ, ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’ Olee uru ihe ahụ Pọl mere bara? ‘Ụfọdụ n’ime ndị Juu ghọrọ ndị kwere ekwe, ìgwè ndị Grik bara ụba mekwara otú ahụ.’—Ọrụ 17:1-4.

5 Otú ndị ohu Chineke taa si eji Baịbụl akwado ihe ha na-akụzi na-amasị ọtụtụ ndị. Na Swizaland, otu nwanna nwaanyị gụụrụ otu nwoke otu amaokwu Baịbụl n’ozi ọma. Nwoke ahụ ajụọ ya, sị: “Olee chọọchị unu na-aga?” Nwanna nwaanyị ahụ zara ya, sị: “Anyị bụ Ndịàmà Jehova.” Nwoke ahụ kwuru, sị: “Asịkwa m! È nwekwaranụ ndị ọzọ ga-abịa n’ụlọ m gụọrọ m Baịbụl ma e wezụga Ndịàmà Jehova?”

6, 7. (a) Olee otú kacha mma anyị nwere ike isi jiri Baịbụl na-ezi ihe n’ọgbakọ? (b) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị jiri Baịbụl na-ezi ihe nke ọma mgbe anyị na-amụrụ mmadụ ihe?

6 Olee otú kacha mma anyị nwere ike isi jiri Baịbụl na-akụziri ndị ọzọ ihe? Ọ bụrụ na ị na-ezi ihe ma ọ bụ na-eme ihe omume n’ọgbakọ, gụọ amaokwu Baịbụl ụfọdụ. Kama ịgwa ndị ị na-agwa okwu ihe amaokwu Baịbụl kwuru ma ọ bụ ịgụpụta amaokwu Baịbụl e ji kọmputa bie, ma ọ bụkwanụ amaokwu ndị e gosiri n’ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya, mepee Baịbụl gụọ ihe e dere na ya, gbaakwa ndị ị na-agwa okwu ume ka ha mepee nke ha. Kọwaa amaokwu ndị ahụ nke ọma, gosikwa otú Baịbụl nwere ike isi nyere ha aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Kama inye ihe atụ ga-agba ndị mmadụ gharịị ma ọ bụ ịkọ akụkọ ndị e ji eme ka mmadụ chịa ọchị, jiri oge ahụ kọwaa Okwu Chineke.

7 Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-amụrụ ndị mmadụ ihe? Ka anyị ji akwụkwọ Ndị Kraịst na-akụziri mmadụ ihe, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịmafere amaokwu Baịbụl ndị e dere na paragraf. Anyị kwesịrị ịgba onye anyị na-amụrụ ihe ume ka ọ gụọ amaokwu ndị ahụ, nyekwara ya aka ịghọta ihe ebe ahụ kwuru. Olee otú anyị ga-esi eme ya mgbe anyị na-amụrụ mmadụ ihe? Anyị ekwesịghị ikwuwe ogologo okwu, kama anyị kwesịrị ịgba onye ahụ ume ka o kwuo ihe dị ya n’obi. Kama ịgwa onye ahụ ihe o kwesịrị ikweta ma ọ bụ otú ọ ga-esi na-akpa àgwà, anyị nwere ike ịjụ ya ezigbo ajụjụ ndị ga-enyere ya aka iji ọnụ ya kwuo ihe o kwesịrị ime. *

“Ọ BARA URU . . . IJI YA DỌỌ MMADỤ AKA NÁ NTỊ”

8. Gịnị ka Pọl lụsoro ọgụ n’obi ya?

8 Ọtụtụ mgbe, anyị nụ okwu ahụ bụ́ ‘ịdọ aka ná ntị,’ anyị nwere ike iche na ọ bụ ọrụ naanị ndị okenye kwesịrị ịna-arụ. Ọ bụ eziokwu na ‘ịdọ ndị na-eme mmehie aka ná ntị’ so n’ihe ndị okenye na-arụ. (1 Tim. 5:20; Taị. 1:13) Ma, anyị kwesịkwara ịna-adọ onwe anyị aka ná ntị. Pọl bụ ezigbo Onye Kraịst nke nwere akọnuche dị ọcha. (2 Tim. 1:3) N’agbanyeghị nke ahụ, o dere, sị: “Ana m  ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie.” Ọ bụrụ na anyị echebara ihe ndị ọzọ Pọl kwuru n’ebe ahụ echiche, anyị ga-aghọtakwu na ọ lụsiri ọgụ ike ka ọ ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ ya.—Gụọ Ndị Rom 7:21-25.

9, 10. (a) Olee adịghị ike o nwere ike ịbụ na Pọl gbalịsiri ike imeri? (b) Ma eleghị anya, olee otú Pọl si lụso mmehie ọgụ?

9 Olee adịghị ike Pọl gbalịsiri ike imeri? Ọ bụ eziokwu na ọ kpọghị ya aha, o degaara Timoti akwụkwọ na ya bụbu “onye na-akparị mmadụ.” (1 Tim. 1:13) Tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst, o ji iwe na-akpagbu Ndị Kraịst. O kwuru banyere ụdị anya o jibu ele ndị na-eso ụzọ Kraịst, sị: ‘M nwere ọnụma n’ụzọ gabigara ókè megide ha.’ (Ọrụ 26:11) Pọl mụtara otú ọ ga-esi na-ejide onwe ya. Ma, mgbe ụfọdụ, o siiri ya ike ijide onwe ya mgbe iwe na-ewe ya na mgbe ọ na-ekwu okwu. (Ọrụ 15:36-39) Gịnị nyeere ya aka?

10 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, ọ kọwara otú o si adọ onwe ya aka ná ntị. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:26, 27.) Ọ na-emesi anụ ahụ́ ya na-ezughị okè ike dị ka à ga-asị na ọ na-esu ya ezigbo ọkpọ. Ọ ga-abụ na Pọl chebaara ndụmọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ echiche, kpesie ekpere ike ka Chineke nyere ya aka ime ihe ọ mụtara, gbalịsiekwa ike ịna-eme ya. * Ime ihe ahụ Pọl mere nwere ike ịbara anyị uru n’ihi na anyị na anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè na-alụkwa ọgụ taa.

11. Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-anwale’ onwe anyị ka anyị mata ma ànyị ka na-eje ije n’ụzọ eziokwu?

11 Anyị ekwesịghị ịna-eme anya ụra n’ofufe Chineke. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ‘ịna-anwale’ onwe anyị ka anyị mata ma ànyị ka na-eje ije n’ụzọ eziokwu. (2 Kọr. 13:5) Mgbe anyị na-agụ amaokwu ndị dị ka Ndị Kọlọsi 3:5-10, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-agbalịsi ike ka anụ ahụ́ m ghara ime ka m mee mmehie? Ka ihe Jehova kpọrọ asị ọ̀ malitela ịmasị m? Ọ bụrụ na ihe rụrụ arụ apụta mgbe m na-achọ ihe n’Ịntanet, m̀ na-emechi ya ozugbo, ka m̀ na-eji aka m achọ ebe ihe rụrụ arụ dị n’Ịntanet?’ Ọ bụrụ na anyị na-eche echiche otú ahụ banyere otú anyị ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ‘ga-amụrụ anya ma nwee uche ziri ezi.’—1 Tesa. 5:6-8.

“Ọ BARA URU IJI YA . . . MEE KA IHE GUZOZIE”

12, 13. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ibu n’obi mgbe anyị na-agbalị ‘ime ka ihe guzozie’? Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie otú Jizọs si mee ka ihe guzozie? (b) Olee ụdị okwu anyị na-ekwesịghị ikwu mgbe anyị chọrọ ka anyị na ndị ọzọ kpezie?

12 Okwu Grik e si sụgharịta “mee ka ihe guzozie” pụtara “ime ka ihe dị mma, zie ezie, dịrị otú o kwesịrị ịdị, ma ọ bụ kwụrụ ọtọ.” Ọ bụrụ na ndị ọzọ aghọtahie anyị, anyị kwesịrị ime ihe ga-eme ka anyị na ha kpezie. Dị ka ihe atụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu kwuru na Jizọs na-emere “ndị ọnaụtụ na ndị mmehie” ebere. Jizọs zara ha, sị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu. Ya mere, gaanụ mata ihe ihe a pụtara, ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’” (Mat. 9:11-13) O ji ndidi na obiọma kọwaara mmadụ niile ihe Chineke kwuru. O mere ka ndị dị obi umeala mata na Jehova bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Ọpụ. 34:6) N’ihi otú Ọkpara Chineke si gbaa mbọ ka ‘ihe guzozie,’ ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ozi ọma o kwusara.

13 Ihe Jizọs mere gosiri otú anyị kwesịrị isi na-enyere ndị ọzọ aka. Onye a kpasuru iwe nwere ike iji iwe kwuo, sị, ‘O nwere ihe m chọrọ ka mụ na gị dozie ugbu a.’ Ma, onye mere otú ahụ emeghị ihe e kwuru  na 2 Timoti 3:16. “Akwụkwọ Nsọ dum” enyeghị anyị ikike iji iwe gwa ndị ọzọ okwu. Ịgwa mmadụ okwu ọjọọ na-adị ka “ebe e ji mma agha maa” onye ahụ. Ọ na-agbawa obi. O nweghịkwa uru ọ na-aba.—Ilu 12:18.

14-16. (a) Olee otú ndị okenye nwere ike isi ‘mee ka ihe guzozie’ ka ha nwee ike inyere ndị ọzọ aka imeri nsogbu ha? (b) Gịnị mere iji Baịbụl ‘eme ka ihe guzozie’ ji dị mkpa n’ịzụ ụmụ?

14 Oleekwanụ otú anyị nwere ike isi jiri ndidi na obiọma ‘na-eme ka ihe guzozie’? Ka e were ya na di na nwunye gwara okenye ọgbakọ ka o nyere ha aka ịkwụsị okwu ha na-esekarị. Gịnị ka okenye ahụ ga-eme? Kama ịdụnyere otu n’ime ha úkwù, o kwesịrị igosi ha abụọ ihe Baịbụl kwuru banyere nsogbu ha na-enwe. O nwere ike iji ihe e kwuru n’isi nke atọ n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ nyere ha aka. Ka ha na okenye ahụ na-atụle ihe ndị ahụ, di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịhụ ihe Baịbụl kwuru o kwesịrị ịgbalịsikwu ike na-eme. E mechaa, okenye ahụ kwesịrị ịjụ ha otú ihe si aga n’ezinụlọ ha ma nyekwuoro ha aka e kwesịrị inyere ha.

 15 Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi ‘mee ka ihe guzozie’ ka okwukwe ụmụ ha nwee ike ịna-esikwu ike? Ka e were ya na ị chọrọ inyere nwa gị nwaanyị na-eto eto aka ka ọ ghara imeta onye ọjọọ enyi. Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịmatakwu onye ahụ ọ chọrọ imeta enyi. Ọ bụrụ na ị na-enyo onye ahụ enyo, i nwere ike ịgwa nwa gị nwaanyị banyere ya. Ihe e kwuru n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, nwere ike inyere gị aka. Ka oge na-aga, i nwere ike iwepụtakwu oge ka gị na ya na-anọrị. I nwekwara ike ịgbalị na-amata otú obi na-adị ya mgbe ọ nọ n’ozi ọma ma ọ bụ mgbe o so ndị ọzọ n’ezinụlọ unu na-atụrụ ndụ. I nwee ndidi na obiọma, nwa gị ga-aghọta na ị hụrụ ya n’anya. O nwere ike ime ka o mee ihe ị gwara ya ma gbaara nsogbu ọsọ.

Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri Baịbụl ‘na-eme ka ihe guzozie’ mgbe ha na-azụ ụmụ ha, ha ga-enyere ụmụ ha aka izere ihe ga-agbawa ha obi

(Gaa na paragraf nke 15)

16 E nwere ndị ihe banyere ahụ́ ike ha na-echu ụra, ndị obi gbawara n’ihi na a chụrụ  ha n’ọrụ, ma ọ bụ ndị ihe ụfọdụ Baịbụl na-akụzi gbagwojuru anya. Anyị nwere ike iji ndidi na obiọma gbaa ndị dị otú ahụ ume. Iji Okwu Chineke ‘eme ka ihe guzozie’ na-abara ndị Jehova ọtụtụ uru.

“Ọ BARA URU IJI YA . . . NYE ỌZỤZỤ N’EZI OMUME”

17. Gịnị mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ maka ọzụzụ a na-enye anyị?

17 Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke na-eyi ihe na-enye ọṅụ mgbe a na-adọ ya, kama ọ na-eyi ihe mwute; ma n’ikpeazụ, ọ na-amịrị ndị e ji ya zụọ mkpụrụ udo, ya bụ, ezi omume.” (Hib. 12:11) Ọtụtụ Ndị Kraịst torola eto ghọtara na otú nne ha na nna ha bụ́ Ndị Kraịst si zụọ ha baara ha uru. Jehova si n’aka ndị okenye ọgbakọ na-azụ anyị ma ọ bụ na-adọ anyị aka ná ntị. Ọ bụrụ na anyị na-anabata ya, anyị ga-anọsi ike n’ụzọ ndụ.—Ilu 4:13.

18, 19. (a) Gịnị mere ndụmọdụ ahụ e nyere n’Ilu 18:13 ji dị mkpa ‘n’inye ọzụzụ n’ezi omume’? (b) Ọ bụrụ na ndị okenye ejiri obiọma na ịhụnanya na-adọ ndị mere mmehie aka ná ntị, olee uru o nwere ike ịba?

18 A na-amụ inye ọzụzụ bara uru amụ. Jehova gwara Ndị Kraịst ka ha na-enye ọzụzụ “n’ezi omume.” (2 Tim. 3:16) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ihe Baịbụl kwuru na-adọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ilu 18:13 kwuru, sị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.” N’ihi ya, e nwee nwanna e boro ebubo na o mere mmehie dị oké njọ, ndị okenye kwesịrị ibu ụzọ sie imi n’ala nke ọma, mata otú ihe si mee, tupu ha adọọ onye ahụ aka ná ntị. (Diut. 13:14) Ha mee otú ahụ, ọ pụtara na ha na-enye ọzụzụ “n’ezi omume.”

19 Baịbụl gwakwara ndị okenye ọgbakọ ka ha “jiri nwayọọ” na-agbazi ndị ọzọ. (Gụọ 2 Timoti 2:24-26.) N’eziokwu, ihe mmadụ mere nwere ike ime ka a kọchaa aha Jehova. O nwekwara ike ịkpatara ndị aka ha dị ọcha nsogbu. Ma, ọ bụrụ na okenye ejiri iwe na-adụ onye ahụ ọdụ, okenye ahụ agaghị enyeliri ya aka. Ma, ọ bụrụ na ndị okenye eṅomie “obiọma Chineke,” ha nwere ike ime ka onye ahụ mere mmehie chegharịa.—Rom 2:4.

20. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ndị nne na nna kwesịrị iji na-azụlite ụmụ ha ma ọ bụ na-adọ ha aka ná ntị?

20 Ndị nne na nna kwesịrị iji ihe Baịbụl kwuru na-azụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Nna ekwesịghị ịta nwa ya ahụhụ naanị n’ihi ihe a sịrị na o mere, n’ebughị ụzọ chọpụta otú o si mee. E kwesịghị ịna-ewe iwe ọkụ n’ezinụlọ Ndị Kraịst. “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” Ndị nne na nna kwesịkwara iji obi ọmịiko na obi ebere na-adọ ụmụ ha aka ná ntị.—Jems 5:11.

BAỊBỤL BỤ ONYINYE BARA URU JEHOVA NYERE ANYỊ

21, 22. Olee ihe e kwuru n’Abụ Ọma 119:97-104 nke kacha kọwaa otú i si ele Okwu Jehova anya?

21 E nwere mgbe otu ohu Chineke kwuru ihe mere o ji hụ iwu Jehova n’anya. (Gụo Abụ Ọma 119:97-104.) Ihe ọ mụtara n’Okwu Chineke mere ka o nwee amamihe, ezi uche, na nghọta. Ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nyeere ya aka izere ihe ọjọọ ndị ọzọ na-eme, nke na-akpatara ha nsogbu. Ịmụ Akwụkwọ Nsọ tọrọ ya ụtọ, meekwa ka obi ruo ya ala. O kpebisiri ike ịna-erubere Chineke isi n’ihi na ndụmọdụ Chineke abaarala ya ọtụtụ uru.

22 Ì ji “Akwụkwọ Nsọ dum” kpọrọ ihe? I nwere ike iji ya mee ka okwukwe gị sie ike na Chineke ga-emezu nzube ya. Ndụmọdụ Jehova nyere anyị na-eme ka anyị ghara ịna-eme mmehie, nke bụ́ ihe ga-akpatara anyị ọnwụ. Ọ bụrụ na ị na-akọwa Okwu Chineke nke ọma, i nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịbata n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ ma nọsie ike na ya. Ka anyị jiri “Akwụkwọ Nsọ dum” na-eme ihe a niile anyị tụlere ma na-efe Jehova, bụ́ Chineke anyị nke maara ihe niile, Onye hụkwara anyị n’anya.

^ para. 1 Gụọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 80.

^ para. 7 Mgbe Jizọs na-ezi ihe, ọ na-ajụkarị ndị mmadụ, sị: “Gịnị ka unu chere?” Ya agbatụ nkịtị ka ha kwuo ihe ha bu n’obi.—Mat. 18:12; 21:28; 22:42.

^ para. 10 N’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere, ọ gbara anyị ume ugboro ugboro ka anyị na-alụso ezughị okè anyị ọgụ. (Rom 6:12; Gal. 5:16-18) Obi kwesịrị isi anyị ike na yanwa mere ihe ndị ahụ ọ dụrụ ndị ọzọ ọdụ ka ha na-eme.—Rom 2:21.