Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) EPREL 2013

“Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

“Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—FIL. 1:10.

1, 2. Olee ihe Jizọs kwuru ga-eme n’oge ikpeazụ nke o nwere ike ịbụ na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eche banyere ya? Oleekwa ihe ọ ga-abụ na ha nọ na-eche?

E NWERE mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-ebibi ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ihe ahụ ọ gwara ha nọ na-echu Pita, Jems, Jọn, na Andru ụra. (Mak 13:1-4) N’ihi ya, mgbe naanị ha na Jizọs nọ, ha jụrụ ya, sị: “Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Mat. 24:1-3) Jizọs malitere ịgwa ha ma ihe ndị ga-eme tupu e bibie Jeruselem ma ihe ndị ga-eme n’oge ikpeazụ nke ụwa Setan a. Jizọs gwara ha na a ga-enwe ihe ndị ga-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala, ma agha ma ụkọ nri. Ọ gwakwara ha na mmebi iwu ga-aba ụba. Ma, e nwere ihe ọma o kwuru ga-eme n’oge ikpeazụ. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:7-14.

2 Ndị na-eso ụzọ Jizọs so Jizọs kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ozi ọma ahụ ha kwusara tọkwara ha ụtọ. (Luk 8:1; 9:1, 2) O nwekwara ike ịbụ na ha chetara na o kwuru, sị: “N’ezie, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Luk 10:2) Ma, ọ ga-abụ na ha nọ na-eche, sị: ‘Olee otú anyị ga-esi kwusaa ozi ọma “n’elu ụwa dum mmadụ bi,” gbaakwa “àmà nye mba niile”? Olee ebe a ga-esi nweta ndị ga-arụ ọrụ a?’ Ha gaara ama ma a sị na ha hụrụ ihe ga-eme n’ọdịnihu. O doro anya na ọ gaara atụ ha n’anya ma a sị na ha nọ ya hụ otú ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 24:14 si na-emezu.

 3 Ihe ahụ Jizọs kwuru na-emezu n’oge anyị a. Ọtụtụ nde mmadụ na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile taa. (Aịza. 60:22) Ma, Jizọs kwukwara na ọ gaghị adịchara ụfọdụ ndị mfe ime ka ọrụ ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha n’oge ikpeazụ a. A ga-enwe ihe ndị ga na-emegharị ha anya nakwa ihe ndị ‘ga na-anyịgbu obi ha.’ (Gụọ Luk 21:34.) Anyị na-ahụkwa ka ihe ahụ Jizọs kwuru na-emezu. E nwere ihe ndị na-emegharị ụfọdụ ndị ohu Chineke anya taa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ekwe ka ụdị ọrụ ha ga-arụ, ịga ụlọ akwụkwọ mahadum, na ịchụ akụnụba megharịa ha anya. Ụfọdụ na-ejikwa oge karịrị akarị atụrụ ndụ. E nwekwara ndị na-anaghị eme nke ọma n’ozi Jehova n’ihi nchegbu nke ndụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si eme? Gịnị ka ihe ndị m na-eme na-egosi na ọ bụ ya kacha m mkpa?’

4 N’oge ndịozi Jizọs, ọ dịrịghị Ndị Kraịst mfe ime ka ọrụ ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ha. N’ihi ya, Pọl onyeozi kpere ekpere ka ndị Filipaị “chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Gụọ Ndị Filipaị 1:9-11.) Ọtụtụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi ji obi ike kwuo “okwu Chineke n’atụghị egwu” otú Pọl mere. (Fil. 1:12-14) Ọtụtụ n’ime anyị taa jikwa obi ike na-ekwusa Okwu Chineke. Ma, ọ ga-abara anyị uru ma anyị tụlee otú Jehova si jiri nzukọ ya na-emezu ihe ahụ dị na Matiu 24:14. Ọ ga-enyere anyị aka iji obi anyị niile na-ekwusasi ozi ọma ike. Ọ bụ ihe a ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a. Gịnị ka nzukọ Jehova na-arụ? Ọ bụrụkwa na anyị amata ihe ọ na-arụ, olee otú ọ ga-esi gbaa anyị na ndị ezinụlọ anyị ume? N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe nwere ike inyere anyị aka ịtachi obi n’ozi Jehova nakwa otú anyị ga-esi na-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ.

NDỊ OHU JEHOVA NDỊ NỌ N’ELUIGWE

5, 6. (a) Gịnị mere Jehova ji mee ka anyị mara ihe ndị ohu ya nọ n’eluigwe na-eme? (b) Olee ihe Ezikiel hụrụ n’ọhụụ?

5 E nwere ọtụtụ ihe Jehova na-agwaghị anyị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọ gwaghị anyị ihe niile gbasara otú ụbụrụ anyị si arụ ọrụ ma ọ bụ ihe niile gbasara eluigwe na ụwa. Ma, ọ gwara anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe bụ́ uche ya na ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-erubere ya isi. (2 Tim. 3:16, 17) Obi dịkwa anyị ụtọ na Jehova gwara anyị banyere ndị ohu ya nọ n’eluigwe. Ọ na-atọ anyị ụtọ ịgụ banyere ha n’akwụkwọ Aịzaya, Ezikiel, Daniel nakwa n’akwụkwọ Mkpughe. (Aịza. 6:1-4; Ezik. 1:4-14, 22-24; Dan. 7:9-14; Mkpu. 4:1-11) Ọ dị ka à ga-asị na Jehova mepere anya anyị ka anyị hụ ihe na-eme n’eluigwe. Gịnị mere o ji mee ka anyị mara ihe ndị a?

6 Jehova achọghị ka anyị chefuo na anyị na ndị ohu ya nọ n’eluigwe so n’otu nzukọ. E nwere ọtụtụ ihe ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe na-eme iji hụ na a na-eme uche Jehova. Dị ka ihe atụ, n’ọhụụ e gosiri Ezikiel, ọ hụrụ ụgbọ ịnyịnya na-agba n’eluigwe, nke nọchiri anya ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe. Ụgbọ ịnyịnya ahụ ji oké ọsọ na-agba, na-agbanwekwa ebe ọ na-aga  n’egbughị oge. (Ezik. 1:15-21) Mgbe ọ bụla wiil ụgbọ ịnyịnya ahụ gbagharịrị, ọ na-agbaru ebe dị anya. Ezikiel hụkwara Onye na-agba ụgbọ ịnyịnya ahụ. O kwuru, sị: “M wee hụ ihe yiri ọla na-egbu maramara dị ka ọkụ gbaa gburugburu . . . O yiri ebube Jehova.” (Ezik. 1:25-28) Ọ ga-abụrịrị na ọhụụ ahụ riri Ezikiel ọnụ. Ọ hụrụ ka Jehova na-eduzi nzukọ ya, jiri mmụọ nsọ ya na-eme ka ọ na-aga ebe ọ bụla ọ chorọ. Ụgbọ ịnyịnya ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ bụ ihe magburu onwe ya Jehova ji kọwaara anyị otú ndị ohu ya nọ n’eluigwe si eme uche ya n’egbughị oge.

7 Daniel hụkwara ọhụụ na-eme ka obi sie anyị ike. Ọ hụrụ “Onye Ochie ahụ,” ya bụ, Jehova, ka ọ nọ n’ocheeze ya. Ocheeze ahụ bụ ire ọkụ ire ọkụ, nweekwa ụkwụ. (Dan. 7:9) Jehova chọrọ ime ka Daniel ghọta na nzukọ ya na-aga n’ihu, na-emezu uche ya. Daniel hụkwara “onye yiri nwa nke mmadụ,” ya bụ, Jizọs, ka a na-enye ya ikike ịchị ndị ohu Jehova nọ n’ụwa. Ọ bụghị afọ ole na ole ka Kraịst ga-achị ụmụ mmadụ. Kama, “ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.” (Dan. 7:13, 14) Ọhụụ a na-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi ma ghọta ihe o ji nzukọ ya arụ. O nyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, “ọchịchị na ùgwù na alaeze.” Jehova tụkwasịrị ya obi n’ihi na a nwaala ya, ya anọsie ike na-erubere Jehova isi. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Jizọs ga-achị anyị otú dị mma.

 8 Olee otú ọhụụ ahụ Ezikiel hụrụ kwesịrị ịdị anyị? O kwesịrị ịdị anyị otú ahụ ọ dị Ezikiel. Ọhụụ ndị ahụ riri ya ọnụ, meekwa ka ọ dịkwuo umeala n’obi. (Ezik. 1:28) Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara otú nzukọ Jehova si aga n’ihu, o nwere ike ime ka anyị mee ihe Aịzaya mere. Mgbe a chọrọ ka ọ gaa gwa ndị ọzọ banyere ihe Jehova na-eme, o kwetara ịga ozugbo. (Gụọ Aịzaya 6:5, 8.) Obi siri Aịzaya ike na ọ ga-emeli ihe niile Jehova gwara ya mee n’ihi na Jehova na-akwado ya. Ihe anyị ma banyere nzukọ Jehova kwesịkwara ime ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nọ ná nzukọ Jehova nke na-enyere ndị mmadụ aka ime uche Jehova!

NDỊ OHU JEHOVA NDỊ NỌ N’ỤWA

9, 10. Gịnị mere e ji kwesị ịhazi ndị ohu Jehova nọ n’ụwa?

9 Jehova ji Ọkpara ya hazie ndị ohu ya nọ n’ụwa ka ha na ndị ohu ya nọ n’eluigwe na-arụkọ ọrụ. Gịnị mere e ji kwesị ịhazi ndị ohu Chineke nọ n’ụwa iji rụọ ọrụ ahụ e kwuru okwu ya na Matiu 24:14? Ka anyị leba anya n’ihe atọ mere e ji kwesị ime otú ahụ.

10 Nke mbụ bụ na Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ozi ọma a n’ebe niile ma “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Nke abụọ bụ na e kwesịrị ịkụziri ndị ga-ekwusa ozi ọma ahụ Baịbụl, gbaakwa ha ume. (Jọn 21:15-17) Nke atọ abụrụ na e kwesịrị ime ndokwa ka ndị ahụ ga-ekwusa ozi ọma nwee ike ịna-ezukọ efe Jehova, a kụziekwara ha otú ha ga-esi na-ekwusa ozi ọma. (Hib. 10:24, 25) N’ihi ya, e kwesịrị ịhazi ọrụ a nke ọma ka Ndị Kraịst nwee ike ịrụ ya nke ọma.

11. Olee otú anyị si egosi na anyị na-akwado nzukọ Jehova?

11 Olee otú anyị si egosi na anyị na-akwado nzukọ Jehova? Otu ihe dị mkpa anyị ga-eme bụ ịtụkwasị ndị a họpụtara ka ha na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma a obi. Jehova na Jizọs tụkwasịrị ha obi, anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ. E nwere ọtụtụ ihe ụmụnna ndị a na-edu ndú nwere ike iji oge ha na ike ha na-eme n’ụwa a. Ma, ha anaghị eme ihe ndị ahụ. Ka anyị leba anya n’ihe kacha bụrụ mkpa nzukọ Jehova kemgbe ụwa.

IHE KACHA NZUKỌ JEHOVA MKPA BỤ IME “IHE NDỊ KA MKPA”

12, 13. Olee otú ndị okenye si arụ ọrụ ha? Oleekwa ihe i nwere ike ịmụta n’aka ha?

12 N’ụwa niile, a họpụtala ndị okenye ma nke a na-akọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma ná mba ebe ha na-eje ozi. Tupu ha ekpebie ihe a ga-eme, ha na-agụ Baịbụl, jiri ya mere ‘oriọna nke na-enye ụkwụ ha ìhè na ìhè nke na-enwu n’okporo ụzọ ha.’ Ha na-arịọsikwa Jehova ike ka o duzie ha. Ha si otú a na-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ.—Ọma 119:105; Mat. 7:7, 8.

13 Ndị okenye ndị na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma taa na-eme ka ndị okenye nọ n’oge ndịozi Jizọs. “Ozi banyere okwu Chineke” bụ ihe kacha ha mkpa ná ndụ. (Ọrụ 6:4) Obi na-atọ ha ụtọ ịhụ otú ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ si na-aga n’ihu ma ná mba ebe ha bi ma n’ụwa niile. (Ọrụ 21:19, 20) Kama itiri ndị Chineke ọtụtụ iwu, ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, na-ekwekwa ka mmụọ nsọ na-eduzi ha mgbe ha na-ahazi otú a ga-esi na-ekwusa ozi ọma Alaeze  Chineke. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:28.) Ndị okenye ndị a si otú a na-akpa àgwà ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị iṅomi.—Efe. 4:11, 12.

14, 15. (a) Olee ihe a na-eme iji kwado ọrụ ikwusa ozi ọma n’ụwa? (b) Olee otú obi dị gị na ị na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma?

14 Ọtụtụ ụmụnna anyị na-agba mbọ iji hụ na anyị nwetara akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ha na-akwadebekwa ihe ndị anyị ga-amụ n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ ndị anyị na-aga. Ọtụtụ n’ime anyị agaghị aghọtacha ụdị mbọ ha na-agba. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ puku ndị wepụtara onwe na-asụgharị akwụkwọ anyị dị iche iche n’ihe dị ka narị asụsụ isii. Akwụkwọ ndị a na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmụta “ihe ndị dị ebube nke Chineke” n’asụsụ ha. (Ọrụ 2:7-11) Ụmụnna anyị ndị na-eto eto na-arụsi ọrụ ike iji hụ na e bipụtara akwụkwọ ndị a. A na-ebugaziri ha ọgbakọ dị iche iche, ma ọgbakọ ndị dị n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ.

15 E nwekwara ọtụtụ ọrụ a na-arụ iji nyere anyị aka ka uche anyị niile dịrị n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ puku ụmụnna anyị na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ dị iche iche. E nwekwara ụmụnna ndị na-aga enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, nwee ndị na-aga enyere ụmụnna anyị ndị nọ n’ụlọ ọgwụ aka. Ụfọdụ na-ahazi mgbakọ dị iche iche, ebe ndị ọzọ na-ahazikwa ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova. Gịnị mere e ji arụ ọrụ ndị a niile? Ọ bụ iji nyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma, ma na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ọrụ ndị ahụ na-emekwa ka anyị nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka ife Jehova. Kemgbe ụwa, ihe kacha bụrụ mkpa ndị Jehova nọ n’ụwa bụ ime ihe ndị ka mkpa.

NA-EME IHE NZUKỌ JEHOVA NA-EME

16. Olee ihe unu nwere ike ịmụ n’oge ofufe ezinụlọ unu ma ọ bụ ihe i nwere ike ịmụ mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye?

16 Ànyị na-eme anyị nọtụ, anyị echebara ihe nzukọ Jehova na-arụ echiche? Ụfọdụ ụmụnna na-eji oge ha ji enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ oge ha ji enwe ọmụmụ ihe onwe onye eme nchọnchọ banyere ihe nzukọ Jehova na-arụ, ma na-echebara ihe ndị ahụ echiche. Ọ na-atọ ụtọ ịmụ banyere ọhụụ ndị ohu Chineke hụrụ, ma nke Aịzaya, Ezikiel, Daniel, ma nke Jọn. Akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom na akwụkwọ ndị ọzọ nakwa diiviidi ndị e nwere n’asụsụ anyị na-akụziri anyị ọtụtụ ihe gbasara nzukọ Jehova.

17, 18. (a) Olee uru isiokwu a baara gị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ichebara echiche?

17 Ọ dị mma ka anyị na-atụgharị uche n’ihe Jehova ji nzukọ ya arụ. Ka anyị kpebisie ike ịna-eme ihe ndị ka mkpa otú ahụ nzukọ Jehova na-eme. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi ga-adị anyị otú ahụ ọ dị Pọl onyeozi. O kwuru, sị: “Ebe anyị nwere ozi a dị ka ebere e meere anyị si dị, anyị adịghị ada mbà.” (2 Kọr. 4:1) Ọ gbakwara ụmụnna ya ume, sị: “Ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—Gal. 6:9.

18 È nwere ihe ụfọdụ i kwesịrị ime ma ọ bụ nke gị na ndị ezinụlọ gị kwesịrị ime iji hụ na unu ji ndụ unu eme ihe ndị ka mkpa? Ì nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ ị na-eme ka i nwee ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma? N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe ise ga-enyere anyị aka iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ.