Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

“Ugbu A Unu Maara Chineke,” Gịnị Ka Unu Kwesịrị Ime?

“Ugbu A Unu Maara Chineke,” Gịnị Ka Unu Kwesịrị Ime?

“Unu maara Chineke.”—GAL. 4:9.

1. Gịnị mere onye na-anya ụgbọelu ji ele anya n’ebe e dere ihe niile kwesịrị ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ụgbọelu tupu ya anyawa ya?

MGBE ọ bụla onye na-anya ụgbọelu chọrọ ịnya ụgbọelu, ọ na-ebu ụzọ eleru ụgbọelu ahụ anya nke ọma. Ọ ga-ele anya n’ebe e dere ihe niile kwesịrị ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ụgbọelu ahụ ka ọ mata ma hà na-arụkwa ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na o leghị ihe ndị ahụ, o nwere ike ọ gaghị achọpụta nsogbu nwere ike ime ka ụgbọelu ahụ kpọkaa. Ị̀ ma ndị a na-akacha agwa ka ha leruo ihe ndị ahụ anya mgbe ọ bụla ha chọrọ ịnya ụgbọelu? Ọ bụ ndị aka ochie n’ịnya ụgbọelu. Ndị nyarala ụgbọelu ọtụtụ afọ nwere ike iche na ha macha ihe niile ma chefuo ile ihe ụfọdụ tupu ha anyawa ya.

2. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ele mgbe niile?

2 Anyị kwesịrị ịna-eme ka onye na-anya ụgbọelu nke na-achọghị ka ụgbọelu ya kpọkaa. E nwere ihe ndị anyị kwesịrị ileru anya ka anyị mata ihe anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike ọ bụrụgodị na nsogbu abịara anyị. Ma à ka mere anyị baptizim ọhụrụ ma ànyị efeela Chineke ọtụtụ afọ, anyị kwesịrị ịna-ele mgbe niile ma okwukwe anyị ò sikwara ike, nakwa ma ànyị ji obi anyị niile na-efe Jehova Chineke. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme otú ahụ mgbe niile, ọnwụnwa nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.”—1 Kọr. 10:12.

3. Gịnị ka Ndị Kraịst nọ na Galeshia kwesịrị ime?

3 Ndị Kraịst nọ na Galeshia kwesịrị ịna-ele ma okwukwe ha ò sikwara ike. Obi kwesịkwara ịdị ha ụtọ na Chineke mere ka ha nwere onwe ha. Àjà ahụ Jizọs chụrụ mere ka ndị niile nwere okwukwe na ya mata Chineke n’ụzọ pụrụ iche, ya bụ na ha nwere ike ịbụ ụmụ Chineke! (Gal. 4:9) Ọ bụrụ na ndị Galeshia chọrọ ka ha bụrụ ụmụ Chineke, ha kwesịrị ịjụ ihe okpukpe ndị Juu  na-akụzi, nke bụ́ na ọ bụ idebe Iwu Mozis ga-eme ka Ndị Kraịst bụrụ ndị ezi omume. Ma, o nwetụbeghị mgbe Ndị Kraịst bụ́ ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù debere Iwu ahụ! N’ihi ya, ma ndị Juu ma ndị Jentaịl kwesịrị ịna-agbalịsi ike ịghọtakwu ihe Chineke chọrọ ka ha na-eme. Ha kwesịrị ịghọta na ọ bụghị idebe Iwu Mozis ga-eme ka ha bụrụ ndị ezi omume n’anya Chineke.

IHE NDỊ ANYỊ MERE KA ANYỊ NWEE IKE ỊMARA CHINEKE

4, 5. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ndị Galeshia? Olee otú o si gbasa anyị?

4 Ihe mere e ji dee ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere ndị Galeshia na Baịbụl bụ ichetara ezi Ndị Kraịst niile ka ha ghara ịhapụ eziokwu ndị ha mụtara na Baịbụl ma gaghachi n’ihe ndị ha hapụrụ. Jehova nyere Pọl onyeozi mmụọ nsọ ya ka ọ gbaa Ndị Kraịst niile ume ka ha nọsie ike n’ozi Chineke, ma ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ dị na Galeshia ma ndị niile na-efe Jehova taa.

5 Anyị niile kwesịrị icheta otú Jehova si kpọpụta anyị n’okpukpe ụgha, mee ka anyị bụrụ Ndịàmà ya. Ihe ga-enyere gị aka bụ ichebara ajụjụ abụọ a echiche: Ì chetara ihe ndị i mere ka e nwee ike ime gị baptizim? Ì chetara otú i si mara Chineke na otú o si mara gị, nke mere ka obi dị gị ụtọ na Chineke mere ka i nwere onwe gị n’eziokwu?

6. Olee ihe ndị anyị ga-atụle?

6 E nwere ihe itoolu anyị mere mgbe anyị natara eziokwu. E dere ha niile n’igbe bụ́  “Ihe Ndị Anyị Mere Tupu E Mee Anyị Baptizim Nwere Ike Inyere Anyị Aka Ịna-emekwu nke Ọma.” Ọ bụrụ na anyị na-echeta ihe itoolu ndị ahụ mgbe niile, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, ka anyị ghara ịlaghachi n’ihe ndị dị n’ụwa. Otú ahụ onye na-anya ụgbọelu si eleru ụgbọelu ya anya tupu ya anyara ya gawa, i kwesịrị ịna-echebara ihe itoolu ndị ahụ echiche mgbe niile ka i nwee ike iji obi gị niile na-ejere Jehova ozi.

NDỊ CHINEKE MAARA NA-AMỤTAKWU EZIOKWU BAỊBỤL

7. Olee ụkpụrụ anyị kwesịrị iso, n’ihi gịnịkwa?

7 Ihe ndị ahụ onye na-anya ụgbọelu na-ebu ụzọ ele na-enyere ya aka icheta na e nwere ihe ndị o kwesịrị ime nke ọma mgbe ọ bụla ọ chọrọ ịnya ụgbọelu. Anyị kwesịkwara ịna-eleru onwe anyị anya ma ọ bụ na-enyocha onwe anyị na ihe anyị na-eme kemgbe e mere anyị baptizim. Pọl degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Jidesie ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ ike bụ́ nke ị nụrụ n’ọnụ m, ya na okwukwe na ịhụnanya ndị dị n’ime Kraịst Jizọs.” (2 Tim. 1:13) Ọ bụ na Baịbụl bụ́ Okwu Chineke ka ‘okwu ahụ na-enye ezi ndụ’ dị. (1 Tim. 6:3) Onye na-ese ihe nwere ike ibu ụzọ see ihe ahụ elu elu. Ma ihe ahụ o sere elu elu nwere ike ime ka a mata otú ihe ahụ ga-adị. Otú ahụ ka “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ” si eme ka anyị ghọta ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme, nyekwara anyị aka ịna-eme ya. Ka anyị tụlezie ihe ndị ahụ anyị mere tupu e mee anyị baptizim, ka anyị nwee ike ịmata ma ànyị na-esokwa eziokwu ahụ anyị mụtara.

8, 9. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-amụkwu banyere Chineke, na-emekwa ka okwukwe anyị na-esikwu ike? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ime ka okwukwe anyị na-eto? Olee otú o si yie osisi na-eto eto?

8 Ihe mbụ anyị mere bụ ịmata Chineke nke ọma, nke mere ka anyị nwee okwukwe. Ma, anyị kwesịrị ịna-amụkwu banyere Chineke, meekwa ka okwukwe anyị “na-eto eto.” (2 Tesa. 1:3) Ọ na-abụ, ihe na-eto, ya ana-agbanwe otú ọ dị. Ọ bụrụ na ihe na-eto, ọ pụtara na ọ na-ebu ibu ma ọ bụ na-adịkwu ogologo. N’ihi ya, e mechaa anyị baptizim, anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka anyị na Chineke nwee ike ịna-adịkwu ná mma.

Osisi anaghị akwụsị ito eto. Okwukwe Ndị Kraịst kwesịkwara ịna-eto eto

9 E nwere ike iji okwukwe anyị tụnyere osisi na-eto eto. Osisi nwere ike ito ezigbo ogologo, karịchaa ma ọ bụrụ na mgbọrọgwụ ya banyere nke ọma n’ime ala. Dị ka  ihe atụ, ụfọdụ oké osisi sida ndị dị na Lebanọn nwere ike itoru ka ụlọ elu dị okpukpu iri na abụọ. Mgbọrọgwụ ha na-esi ezigbo ike. Úkwù ha nwekwara ike ibu ibu nke na eriri ga-aga otu n’ime ha gburugburu ga-eru mita iri na abụọ. (Abụ Sọlọ. 5:15) Osisi na-eto ngwa ngwa ná mmalite. E mechaa, ya adị ka ọ naghịzi eto. Ma, ọ ka ga na-eto nwayọọ nwayọọ. Ka ọtụtụ afọ na-aga, úkwù ya ga na-ebukwu ibu, mgbọrọgwụ ya ana-abakwu n’ime ala, na-agbasakwa, mee ka osisi ahụ sikwuo ike. E nwere ike iji ya tụnyere otú okwukwe Ndị Kraịst kwesịrị isi na-eto. Mgbe a malitere ịmụrụ anyị Baịbụl, okwukwe anyị nwere ike ito ngwa ngwa, e meekwa anyị baptizim. Obi dị ndị ọgbakọ anyị ụtọ ịhụ na anyị na-eme nke ọma. O nwedịrị ike ịbụ na anyị bụzi ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ nwee ihe ùgwù ndị ọzọ n’ọgbakọ. Ka afọ na-aga, o nwere ike ọ gaghị adịchara ndị ọzọ mfe ịhụ na okwukwe anyị na-esikwu ike. Ma, anyị ka kwesịrị ịna-amụtakwu banyere Chineke, na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike “ruo mgbe anyị ghọrọ dimkpa, ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.” (Efe. 4:13) N’ihi ya, mgbe okwukwe anyị na-esikwu ike, anyị ga-adị ka obere mkpụrụ a kụrụ, nke toro ghọọ nnukwu osisi.

10. Gịnị mere ndị nọrọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ ji kwesị ịgbalị na-eme ka okwukwe ha na-esikwu ike?

10 Ma anyị ekwesịghị ịkwụsị ebe ahụ. Anyị kwesịrị ịna-amụkwu banyere Chineke, okwukwe anyị kwesịkwara ịna-esikwu ike, nke ga-eme ka anyị gbanyekwuo mgbọrọgwụ n’Okwu Chineke. (Ilu 12:3) E nwere ọtụtụ ụmụnna ndị merela otú ahụ n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nke bụ́ okenye kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ kwuru na ya ka na-agbalị ime ka okwukwe ya na-esikwu ike. O kwuru, sị: “Aghọtakwuola m ọtụtụ ihe na Baịbụl. M na-amụtakwu ụzọ dị iche iche m ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ịga ozi ọma na-atọkwu m ụtọ.”

MEE KA GỊ NA CHINEKE NA-ADỊKWU NÁ MMA

11. Olee otú anyị nwere ike isi na-amatakwu Jehova ka oge na-aga?

11 Ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike pụtara na anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma, ya abụrụ Enyi anyị na Nna anyị. Ọ chọrọ ka obi dị anyị mma ma ruo anyị ala, anyị amatakwa na ọ hụrụ anyị n’anya otú ahụ obi na-eru nwata ala ma nne ya ma ọ bụ nna ya hụrụ ya n’anya kuru ya. Ọ bụkwa otú obi na-adị anyị ma anyị na ezigbo enyi anyị nọrọ. Ị manụ na ọ bụghị otu ụbọchị ka mmadụ na-eji aghọ enyi Jehova. Ịmata Chineke na ịhụ ya n’anya ga-ewe anyị oge. N’ihi ya, kpebisie ike iwepụta oge na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ka i nwee ike ịmatakwu Jehova. Na-agụkwa  Ụlọ Nche na Teta! ọ bụla e bipụtara nakwa akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Baịbụl.

12. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Jehova mara anyị?

12 Ihe ọzọ nwere ike ime ka okwukwe ndị enyi Chineke na-esi ike bụ ikpe ekpere nakwa ha na ndị na-efe Jehova ịna-anọkọ. (Gụọ Malakaị 3:16.) Jehova na-ege ntị n’ekpere ndị enyi ya na-ekpe. (1 Pita 3:12) Jehova na-ege anyị ntị mgbe anyị na-akpọku ya ka o nyere anyị aka otú ahụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-emere ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’ (Rom 12:12) Anyị agaghị abụ Ndị Kraịst tozuru okè ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị anyị aka. Nsogbu ndị na-abịara anyị n’ụwa ochie a abụghị ihe anyị ga-eji naanị ike anyị merie. Ọ bụrụ na anyị akwụsị ikpe ekpere, anyị agaghịzi na-enweta ike Chineke na-enye ndị ohu ya mgbe niile. Mgbe ị na-ekpe ekpere, ị̀ na-agwa Jehova okwu otú ị na-esi agwa enyi gị ị tụkwasịrị obi? È nwere ihe ndị i kwesịrị ime ka ekpere gị ka mma?—Jere. 16:19.

13. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke bụrụ ezigbo enyi?

13 ‘Ndị niile na-agbaba n’ime Jehova’ na-eme ya obi ụtọ. N’ihi ya, e mechaa anyị baptizim, anyị kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya ka anyị na ndị ọzọ maara Jehova na-anọkọ. (Nehọ. 1:7) E nwere ọtụtụ ihe na-agbawa obi n’ụwa a. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-aga ebe anyị na ụmụnna anyị ga na-anọkọ ka ha nwee ike ịna-agba anyị ume. Olee uru ọ ga-abara anyị? Ọ bụ n’ọgbakọ ka anyị ga-ahụ ndị ga-agba anyị ume ịhụ ndị ọzọ n’anya na “ịrụ ezi ọrụ.” (Hib. 10:24, 25) Anyị agaghị enwe ụdị ịhụnanya ahụ Pọl gwara ndị Hibru ka ha nwee ma ọ bụrụ na anyị esoghị ụmụnna anyị nọrọ n’ọgbakọ, bụ́ ebe anyị na ha ga-eji otu obi na-efe Chineke. N’ihi ya, ịgachi ọmụmụ ihe anya na ịza ajụjụ so n’ihe ndị i kwesịrị ịna-echebara echiche ma ị̀ na-emekwa ha mgbe niile.

14. Gịnị mere o ji bụrụ na nchegharị na nchigharị abụghị ihe a na-eme naanị otu mgbe?

14 Tupu anyị aghọọ Ndị Kraịst, anyị chegharịrị ma chigharịa, ya bụ, hapụ mmehie anyị. Ma, nchegharị abụghị ihe a na-eme naanị otu mgbe. Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, mmehie ka zoro n’ime anyị dị ka agwọ chọrọ ịta mmadụ. (Rom 3:9, 10; 6:12-14) N’ihi ya, ka anyị saa anya ná mmiri mgbe niile, ghara ịna-eme ka ànyị zuru okè. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-enwere anyị ndidi ka anyị na-agbalịsi ike imeri adịghị ike anyị, na-agbanwekwa àgwà ọ bụla na-adịghị mma anyị na-akpa. (Fil. 2:12; 2 Pita 3:9) Otu n’ime ihe ga-enyere anyị ezigbo aka bụ iji oge anyị na akụ̀ anyị na-ejere Jehova ozi, kama iji ha na-achụ ihe ga-abara naanị anyị uru. Otu nwanna nwaanyị dere, sị: “A mụrụ m n’ọgbakọ, ma otú m si ele Jehova anya dị iche n’otú ọtụtụ ndị ọzọ si ele ya anya. Ebe anyị kwesịrị ịna-atụ egwu ya, echere m na m gaghị emeli ihe ga-adị ya mma.” Ka oge na-aga, nwanna nwaanyị a mere ọtụtụ ihe ọjọọ, nke mere ka okwukwe ya gharazie isi ike. Ọ sịrị: “Ihe mere m ji mee ihe ndị ahụ bụ na amaghị m Jehova nke ọma, ọ bụghị n’ihi na ahụghị m ya n’anya. Ma, mgbe m kpesiri ekpere ike ọtụtụ ugboro, m malitere ịgbanwe àgwà m. M matara na Jehova nọ na-edu m ka nwatakịrị, na-enyere m aka nwayọọ nwayọọ imeri nsogbu ọ bụla bịaara m, na-egosikwa m ihe m kwesịrị ime.”

15. Gịnị ka Jizọs na Nna ya na-ahụ?

15 Mgbe mmụọ ozi Chineke kpọpụtara Pita na ndịozi ndị ọzọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ sịrị ha, “Nọgidenụ na-agwa ndị mmadụ” okwu Chineke. (Ọrụ 5:19-21) N’ihi ya, ikwusa ozi ọma kwa izu bụ ihe ọzọ anyị kwesịrị ilebara anya iji mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Jizọs na Nna ya na-ahụ ma okwukwe anyị ma ozi ọma anyị na-eje. (Mkpu. 2:19) Okenye ahụ e kwuru okwu ya sịrị: “Ikwusa ozi ọma kwesịrị ịdị anyị ezigbo mkpa.”

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-echeta na anyị enyefeela Jehova onwe anyị?

16 Na-echeta na i nyefeela Chineke onwe gị. Akụ̀ kacha mkpa anyị nwere bụ  adịm ná mma anyị na Jehova. Jehova ma ndị bụ́ ndị ya. (Gụọ Aịzaya 44:5.) Na-echesi echiche ike banyere otú gị na Chineke dịruru ná mma. Na-ekpekwa ekpere ka o mee ka gị na ya na-adịkwu ná mma. Na-echetakwa baptizim e mere gị. Echefula ụbọchị ahụ dị mkpa. Baptizim e mere gị mere ka ndị ọzọ mata na i nyefeela Jehova onwe gị. Ọ bụkwa ihe kacha mkpa i kpebitụrụla ime.

NTACHI OBI GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNỌ JEHOVA NSO

17. Gịnị mere anyị ji kwesị ịtachi obi iji nọrọ Jehova nso?

17 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Galeshia, o mere ka o doo anya na ha kwesịrị ịna-atachi obi. (Gal. 6:9) Onye Kraịst kwesịkwara ịna-atachi obi taa. Ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara gị, ma Jehova ga-enyere gị aka. Na-arịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ. Ọ ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ, obi eruokwa gị ala n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara gị. (Mat. 7:7-11) Chegodị echiche: Ebe ọ bụ na Jehova na-elekọta ụmụ nnụnụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị elekọta gịnwa hụrụ ya n’anya ma nyefee ya onwe gị? (Mat. 10:29-31) A sịgodị na nsogbu ndị siri ike abịara gị, alaghachila n’ihe ndị ị hapụrụ; adala mbà. Jehova si n’ọtụtụ ụzọ agọzi anyị n’ihi na ọ ma anyị.

18. ‘Ugbu a anyị maara Chineke,’ gịnị ka anyị kwesịrị ime?

18 N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya e mere gị baptizim, gịnị ka i kwesịrị ime? Na-amatakwu Jehova, na-emekwa ka okwukwe gị na-esikwu ike. Ọ́ bụrụkwanụ na e mere gị baptizim kemgbe ọtụtụ afọ, gịnị ka i kwesịrị ime? I kwesịkwara ịna-amụkwu banyere Jehova. Ka anyị ghara iche na anyị amatachaala Chineke. Kama iche otú ahụ, anyị kwesịrị ịna-eme, anyị nọtụ, anyị atụleghachi ihe ndị anyị mụrụ n’isiokwu a ka anyị na Jehova nwee ike ịna-adịkwu ná mma. Ọ bụ Nna hụrụ anyị n’anya, Enyi anyị, na Chineke anyị.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5, 6.