Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù

Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù

‘M ga-enye aha gị otuto ruo mgbe ebighị ebi.’—ỌMA 86:12.

1, 2. Olee otú Ndịàmà Jehova si ele aha Chineke anya, nke dị iche n’otú chọọchị Krisendọm si ele ya anya?

O DORO anya na ọtụtụ chọọchị Krisendọm na-agbara aha Chineke ọsọ. Dị ka ihe atụ, otu Baịbụl a kpọrọ Revised Standard Version kwuru n’okwu mmalite ya, sị: “Chọọchị Ndị Kraịst niile e nwere n’ụwa ekwesịghị inwe aha ọ bụla a na-akpọ onye ahụ naanị ya bụ Chineke.”

2 Ma, Ndịàmà Jehova echeghị otú ahụ. Obi dị anyị ụtọ na a kpọkwasịrị anyị aha Chineke nakwa na anyị na-enye ya otuto. (Gụọ Abụ Ọma 86:12; Aịzaya 43:10.) Ihe ọzọ bụ na anyị ghọtara na ọ bụ ihe ùgwù na anyị ma ihe aha ahụ pụtara, ghọtakwa na ọ dị mkpa ka e doo aha Chineke nsọ. (Mat. 6:9) Ma anyị ekwesịghị iji ihe ùgwù ahụ gwurie egwu. N’ihi ya, ka anyị tụlee ajụjụ atọ dị mkpa: Gịnị ka ịma aha Chineke pụtara? Olee otú Jehova si gosi na ya ruru eru ịza aha ahụ, nke mere ka a na-etokwu aha ahụ? Olee otú anyị nwere ike isi na-ejegharị n’aha Jehova?

IHE ỊMA AHA CHINEKE PỤTARA

3. Gịnị ka ịma aha Chineke pụtara?

3 Ịma aha Chineke apụtaghị naanị ịma na aha ya bụ “Jehova.” Ọ pụtara ịma ụdị Chineke Jehova bụ, àgwà ya, nzube ya, na ihe ndị Baịbụl gwara anyị na o mere, karịchaa otú o si emeso ndị ya. N’eziokwu, ka Jehova na-emezu nzube ya, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka a ghọta ụdị Chineke ọ bụ. (Ilu 4:18) Jehova mere ka Adam na Iv mara aha ya; n’ihi ya, Iv kpọrọ aha ahụ mgbe ọ mụrụ Ken. (Jen. 4:1) Ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge ochie, dị ka Noa, Ebreham, Aịzik, na Jekọb maara aha Chineke. Ha ji nwayọọ nwayọọ na-amatakwu ụdị Chineke Jehova bụ ka ọ na-agọzi ha, na-elekọta ha, na-emekwa ka ha mara ihe o bu n’obi imere ha. Chineke mere ka Mozis ghọta ihe pụrụ iche aha ya bụ́ Jehova pụtara.

Mozis ma ihe aha Chineke pụtara, o mekwara ka okwukwe ya sie ike

4. Gịnị mere Mozis ji jụọ Chineke ihe bụ́ aha ya? Gịnị mere o ji chọọ ihe ọ ga-eji mee ka ndị Izrel kweta na Chineke ga-anapụta ha?

 4 Gụọ Ọpụpụ 3:10-15. Mgbe Mozis dị iri afọ asatọ, Chineke nyere ya iwu, sị: ‘Ị ga-akpọpụta ndị m bụ́ ụmụ Izrel n’Ijipt.’ Mozis weturu obi jụọ ya otu ajụjụ dị mkpa. Ihe ajụjụ ahụ pụtara bụ, ‘Gịnị bụ aha gị?’ Ebe ọ bụ na a ma aha Chineke kemgbe, gịnị mere Mozis ji jụọ ajụjụ ahụ? Ọ dị ka ọ̀ chọrọ ịmatakwu banyere onye na-aza aha ahụ, ya bụ na ọ chọrọ ịmata ihe ndị ọ ga-eji mee ka ndị Izrel kweta na ọ bụ eziokwu na Chineke ga-anapụta ha. Ihe ahụ Mozis chọrọ ịma kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na ndị Izrel agbaala ohu ọtụtụ afọ n’Ijipt. Ha nwere ike ịna-eche ma Chineke ndị nna nna ha ọ̀ ga-anapụtali ha. N’eziokwu, ụfọdụ ndị Izrel malitedịrị ife chi ndị Ijipt! —Ezik. 20:7, 8.

5. Olee otú Jehova si mee ka Mozis ghọtakwuo ihe aha ya pụtara?

5 Gịnị ka Jehova zara Mozis? Ọ zara ya, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘M GA-ABỤ ezitewo m ka m bịakwute unu.’” * O kwukwara, sị: “Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà . . . ezitewo m ka m bịakwute unu.” Chineke mere ka Mozis mata na ya ga-abụ ihe ya chọrọ ịbụ iji mezuo nzube ya, na ya ga-emezu ihe ọ bụla ya kwuru. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo banyere onwe ya n’amaokwu nke iri na ise, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ.” Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ Jehova gwara Mozis mere ka okwukwe ya sie ike, meekwa ka ọ na-atụ egwu Chineke!

JEHOVA GOSIRI NA YA RURU ERU ỊZA AHA YA

6, 7. Olee otú Jehova si mezuo nkwa ndị o kwere?

6 N’oge na-adịghị anya ka Jehova gwachara Mozis okwu, o mezuru nkwa o kwere ma napụta ndị Izrel n’Ijipt. O ji ihe otiti iri kụziere ndị Ijipt ihe ma gosi na Fero na chi ndị Ijipt adịghị ike. (Ọpụ. 12:12) Jehova mechara mee ka Oké Osimiri Uhie kewaa, meekwa ka ndị Izrel si n’etiti ya gafee. Ma, o mere ka oké osimiri ahụ rie Fero na ndị agha ya. (Ọma 136:13-15) Ná “nnukwu ala ịkpa nke dị egwu,” Jehova chebere ndị ya ma na-enye ha nri na mmiri. O nwere ike ịbụ na ha niile ruru nde mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ. O mekwara ka uwe ha na akpụkpọ ụkwụ ha ghara ịka nká. (Diut. 1:19; 29:5) N’eziokwu, o nweghị ihe ga-egbochi Jehova imezu nkwa ọ bụla o kwere. O mechara gwa Aịzaya, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, e nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.”—Aịza. 43:11.

 7 Jọshụa, bụ́ onye nọchiri Mozis, jikwa anya ya hụ ihe ndị dị egwu Jehova mere n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa. N’ihi ya, mgbe ọ fọrọ obere ka Jọshụa nwụọ, o ji obi ya niile gwa ndị Izrel ibe ya, sị: “Unu jikwa obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum mara nke ọma na ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.” (Jọsh. 23:14) O doro anya na Jehova gosiri na ya na-emezu nkwa ọ bụla o kwere.

8. Olee otú Jehova si emezu nkwa ya taa?

8 Taa, Jehova ka na-emezu nkwa ya. O si n’aka Ọkpara ya buo amụma na n’oge ikpeazụ, a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze ya “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Olee onye ọzọ ma e wezụga Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile, nke nwere ike ibu ụdị amụma ahụ, hụ na o mezuru, jirikwa ọtụtụ ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị” na-arụ ọrụ ahụ? (Ọrụ 4:13) N’ihi ya, mgbe anyị na-arụ ọrụ ahụ, anyị so na-emezu amụma ahụ e buru na Baịbụl. Anyị na-akwanyere aha Nna anyị, bụ́ Jehova, ùgwù ma na-egosi na anyị ji obi anyị niile na-ekpe ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Mat. 6:9, 10.

AHA YA DỊ UKWUU

Fero gbara isi akwara, jụ ikweta na Jehova bụ Chineke

9, 10. Gịnị ọzọ ka anyị mụtara banyere Jehova n’otú o si mesoo ndị Izrel?

9 Oge na-adịghị anya ka ndị Izrel hapụchara Ijipt, Jehova mere ka ha ghọtakwuo ụdị Chineke ọ bụ. O si n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ mee ka ha mata na ya bụ ‘di nwe ha.’ O sikwa n’ụzọ dị iche iche na-elekọta ha otú ahụ di si elekọta nwunye ya. (Jere. 3:14) N’ihi ya, ndị Izrel dịzi ka nwunye ya, bụ́ ndị ọ kpọkwasịrị aha ya. (Aịza. 54:5, 6) Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha niile na-erubere ya isi ma na-edebe iwu ya, ọ ga-abụ “Di” ha. Ọ ga na-agọzi ha, na-echebe ha, na-enyekwa ha udo. (Ọnụ Ọgụ. 6:22-27) A ga-esi otú ahụ na-enye aha Jehova otuto n’etiti mba niile. (Gụọ Diuterọnọmi 4:5-8; Abụ Ọma 86:7-10.) N’eziokwu, n’oge ahụ niile ndị Izrel ka bụ ndị Chineke, ọtụtụ ndị mba ọzọ kpebiri iso ha na-efe Chineke. Ha ji omume ha kwuo ụdị ihe ahụ Rut bụ́ nwaanyị Moab gwara Neomi, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.”—Rut 1:16.

10 Ruo ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise, otú Jehova si mesoo ndị Izrel mere ka a mata ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere àgwà ya. N’agbanyeghị na mba ahụ nupụụrụ Jehova isi ugboro ugboro, o gosiri ha na ya bụ “Chineke nke na-eme ebere,” nakwa na ya ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.’ Ọ bụ Chineke nke nwere ndidi na ogologo ntachi obi pụrụ iche. (Ọpụ. 34: 5-7) Ma, e nwere ebe Jehova na-enweru ndidi. Mgbe mba ndị Juu jụrụ Ọkpara Chineke ma gbuo ya, Jehova jụrụ ha. (Mat. 23:37, 38) O kweghịzi ka mba Izrel bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha ya. N’anya Jehova, mba Izrel dịzi ka ndị nwụrụ anwụ. Ha yiri osisi kpọnwụrụ akpọnwụ. (Luk 23:31) Oleezi otú ha si na-ele aha Chineke anya?

11. Olee otú ndị Juu si kwụsị ịkpọ aha Chineke?

11 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ndị Izrel malitere ile aha Chineke anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ha malitere iche na ebe ọ bụ na aha Chineke dị nsọ, e kwesịghị ịna-akpọ ya. (Ọpụ. 20:7) E ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịkpọ aha Chineke n’okpukpe ndị Juu. O doro anya na o wutere Jehova ịhụ na ha akwanyereghị aha ya ùgwù. (Ọma 78:40, 41) Jehova weere aha ya ka ihe dị ezigbo mkpa. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na ọ na-ekworo aha ya ekworo. Ebe ọ bụ na ndị Izrel akwanyereghị aha Jehova ùgwù, ha erughịzi eru ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha ahụ. (Ọpụ. 34:14) Ihe ahụ merenụ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịna-akwanyere aha Onye kere anyị ezigbo ùgwù.

MBA ỌHỤRỤ A KPỌKWASỊRỊ AHA CHINEKE

12. Ole ndị bụ mba ọhụrụ a kpọkwasịrị aha Chineke?

12 Jehova si n’ọnụ Jeremaya mee ka a mata na ya na mba ọhụrụ, bụ́ Izrel nke Chineke, ga-agba “ọgbụgba ndụ ọhụrụ.” Jeremaya buru amụma na ndị niile so ná mba ọhụrụ ahụ ga-ama Jehova, “malite n’onye kasị nta n’ime ha ruo n’onye kasị ukwuu n’ime ha.” (Jere. 31:31, 33, 34) Amụma ahụ malitere imezu na Pentikọst afọ 33 mgbe Chineke na mba ọhụrụ ahụ, bụ́ “Izrel nke Chineke,” gbara ndụ. Ndị so na ya bụ ma ndị Juu ma ndị mba ọzọ. Ha ghọrọ ndị ‘e wepụtaara aha Chineke.’ Jehova kwuru na ha bụ ‘ndị a kpọkwasịrị aha ya.’—Gal. 6:16; gụọ Ọrụ Ndịozi 15:14-17; Mat. 21:43.

13. (a) Ndị Kraịst oge mbụ hà kpọrọ aha Chineke? Kọwaa. (b) Olee otú obi dị gị n’ihi ihe ùgwù i nwere nke bụ́ ịkụziri ndị ọzọ aha Chineke?

13 Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst oge ochie bụ “ndị a kpọkwasịrị aha [Chineke],” o doro anya na ha na-akpọ aha Chineke, karịchaa, mgbe ha na-ekwu ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. * N’ihi ya, mgbe Pita onyeozi na-agwa ìgwè ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata okwu na Pentikọst afọ 33, ọ kpọrọ aha Chineke ọtụtụ ugboro. (Ọrụ 2:14, 20, 21, 25, 34) Ndị Kraịst oge ochie kwanyeere aha Jehova ùgwù. Jehova gọzikwara ozi ọma ha n’oge ahụ. Taakwa, Jehova na-agọzi ozi anyị ka anyị ji obi ụtọ na-ekwusa aha ya ma na-egosi ya ndị nwere mmasị na Baịbụl nke ha mgbe ọ bụla o kwere omume. Anyị si otú ahụ na-eme ka ha mata ezi Chineke. Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù Chineke nyere anyị na ha! Ndị anyị nyeere aka ịmata Jehova nwere ike isi otú ahụ malite ịbụ ndị ya, ha na ya ana-adịkwu ná mma ruo mgbe ebighị ebi.

14, 15. Gịnị ka Jehova mere iji chebe aha ya n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị malitere ịkụzi ozizi ụgha?

14 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, nke ka nke, mgbe ndịozi nwụchara, ụfọdụ ndị malitere izi ozizi ụgha n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (2 Tesa. 2:3-7) Ndị na-ezi ozizi ụgha mụtara omenala ndị Juu, nke bụ́ na e kwesịghị ịna-akpọ aha Chineke. Ma, Jehova ọ̀ ga-ekwe ka e chefuo aha ya? Mbanụ! Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị kpọmkwem otú e si akpọ aha ahụ n’oge ochie, ma aha ahụ ka dịkwa. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, e deela ya na Baịbụl dị iche iche nakwa n’ọtụtụ  akwụkwọ ndị na-akọwa Baịbụl dere. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1757, Chas Pitas (Charles Peters) dere na aha ahụ bụ́ “Jehova” adịghị ka ọtụtụ aha a na-etu Chineke nakwa na “ọ dị ka ọ̀ bụ aha ahụ kacha egosi ụdị Chineke Jehova bụ.” N’otu akwụkwọ e biri n’afọ 1797, nke kwuru banyere ofufe Chineke, ihe mbụ Họptịn Henz (Hopton Haynes) dere n’isi nke asaa bụ: “JEHOVA bụ ezigbo aha ndị Juu na-akpọ CHINEKE; ọ bụ naanị ya ka ha fere; ọ bụkwa naanị ya ka Kraịst na Ndịozi ya fere.” Ihe Henri Gruu [Henry Grew (1781-1862)] mere abụghị naanị ide aha Chineke n’akwụkwọ ya, kama o kwukwara na ndị mmadụ anaghị akwanyere aha Chineke ùgwù nakwa na e kwesịrị ido ya nsọ. N’otu aka ahụ, Jọj Stọz [George Storrs (1796-1879)], bụ́ onye ya na Chas Rọsel (Charles T. Russell) rụkọrọ ọrụ, dere aha Chineke n’akwụkwọ ya, dịkwa ka Nwanna Rọsel mere.

15 Ndị Chineke agaghị echefu ihe mere n’afọ 1931 echefu. Tupu mgbe ahụ, a na-akpọ ha Ndị Mmụta Baịbụl nke Mba Niile. Ma ọ bụ n’afọ ahụ ka ha malitere ịza Ndịàmà Jehova, bụ́ aha si na Baịbụl. (Aịza. 43:10-12) Ha si otú ahụ mee ka ụwa niile mara na obi dị ha ezigbo ụtọ ịbụ ndị na-efe onye ahụ naanị ya bụ ezi Chineke, ịbụ ‘ndị e wepụtaara aha ya,’ na ndị na-eto aha ahụ. (Ọrụ 15:14) Ihe ndị ahụ merenụ na-echetara anyị ihe Jehova kwuru na Malakaị 1:11. Ọ sịrị: “Malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu n’etiti mba niile.”

NA-EJEGHARỊ N’AHA JEHOVA

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta na ijegharị n’aha Jehova bụ ihe ùgwù?

16 Maịka onye amụma dere, sị: “Ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Maị. 4:5) Ndị Chineke n’oge ahụ ghọtara na ịbụ ndị a kpọkwasịrị aha ya bụ ezigbo ihe ùgwù. Nke kachanụ bụ na o mekwara ka obi sie ha ike na Chineke na-ele ha anya ọma. (Gụọ Malakaị 3:16-18.) Ma, olee otú obi dị gịnwa n’ihi aha ahụ? Ị̀ na-agbalịsi ike ‘ịna-ejegharị n’aha Jehova’? Ị̀ ghọtara ihe ọ pụtara?

17. Gịnị ka ijegharị n’aha Chineke pụtara?

17 Ọ dịkarịa ala, e nwere ihe atọ ijegharị n’aha Chineke pụtara. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ịna-akọrọ ndị ọzọ banyere aha ahụ n’ihi na anyị ma na ọ bụ naanị ndị “na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.” (Rom 10:13) Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ịna-eṅomi àgwà Jehova, karịchaa ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Nke atọ bụ na anyị kwesịrị iji obi ụtọ na-erubere iwu Chineke isi. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, anyị ga-eme ka a kọchaa aha nsọ Nna anyị. (1 Jọn 5:3) Ì kpebisiri ike ‘ịna-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi’?

18. Gịnị mere ndị niile na-akwanyere aha ukwu Jehova ùgwù nwere ike iji jiri obi ike na-atụ anya ihe ga-eme n’ọdịnihu?

18 Taa, ọtụtụ ndị na-eleghara Jehova anya ma ọ bụ na-enupụrụ ya isi. N’oge na-adịghị anya, a ga-amanye ha niile ịmata onye ọ bụ. (Ezik. 38:23) Ndị dị otú ahụ na-eme ka Fero, bụ́ onye kwuru, sị: “Ònye bụ Jehova, nke mere m ga-eji rube isi n’ihe o kwuru?” Fero mechara mata na Jehova bụ Chineke dị ukwuu. (Ọpụ. 5:1, 2; 9:16; 12:29) Ma, anyịnwa ji obi anyị niile kpebie ịmata Jehova. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na a kpọkwasịrị anyị aha ya nakwa na anyị na-erubere ya isi. N’ihi ya, anyị ji obi ike na-atụ anya ihe ga-eme n’ọdịnihu, tụkwasịkwa nkwa ahụ e dere n’Abụ Ọma 9:10 obi. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, n’ihi na gị onwe gị, Jehova, agaghị ahapụ ndị na-achọ gị.”

^ para. 5 N’asụsụ Hibru, okwu e si nweta aha Chineke pụtara “ịghọ.” N’ihi ya, aha ahụ bụ́ “Jehova” pụtara na ọ na-aghọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya.—Jen. 2:4.

^ para. 13 E dere mkpụrụ okwu anọ nọchiri anya aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Hibru Ndị Kraịst oge ochie na-agụ. Ihe ndị a chọpụtara gosiri na e dekwara aha ahụ na Septuagint, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik.