Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

Kwe Ka A Kasie Gị Obi, Na-akasikwa Ndị Ọzọ Obi

Kwe Ka A Kasie Gị Obi, Na-akasikwa Ndị Ọzọ Obi

Anyị niile na-arịa ọrịa n’ihi na anyị ezughị okè. Ụfọdụ na-arịakwa ọrịa ndị siri ike. Ụdị nsogbu ahụ bịara anyị, olee otú anyị nwere ike isi die ya?

Ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, na ụmụnna anyị na-akasi anyị obi. Ọ bụ otu ihe ga-enyere anyị ezigbo aka idi nsogbu ndị ahụ.

Okwu ọma enyi hụrụ anyị n’anya gwara anyị nwere ike ịdị anyị ka mmanụ otite nke na-eme ka ahụ́ dị anyị mma, obi eruokwa anyị ala. (Ilu 16:24; 18:24; 25:11) Ma mkpa ezi Ndị Kraịst abụghị naanị ka a kasie ha obi. Ha na-agbalị ‘ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi ha.’ (2 Kọr. 1:4; Luk 6:31) Otu onye nlekọta distrikti na Meksiko aha ya bụ Antonio si n’ihe mere ya mata na ihe a bụ eziokwu.

Mgbe a chọpụtara na ọrịa kansa abanyela Antonio n’ọbara, o wutere ya nke ukwuu. Ma, ọ gbalịrị ijide obi ya aka. Olee otú o si mee ya? Ọ gbalịrị iburu abụ Alaeze n’isi ma na-abụ ha ka o nwee ike ịna-atụgharịkwa uche na ha. Ihe ndị ọzọ kasiri ya obi nke ọma bụ ikwupụta ihe ọ na-ekpe n’ekpere na ịgụ Baịbụl.

Ma, Antonio aghọtala ugbu a na ihe so n’ihe kacha nyere ya aka bụ Ndị Kraịst ibe ya. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ, obi dawa mụ na nwunye m mbà, anyị na-akpọ otu onye ikwu anyị bụ́ okenye ọgbakọ ka ọ bịa n’ụlọ anyị ka anyị na ya kpee ekpere. Ihe ahụ kasiri anyị obi, meekwa ka obi ruo anyị ala.” O kwukwara, sị: “N’eziokwu, aka ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị nyeere anyị mere ka anyị nwee ike imeri obi na-ajọ anyị njọ n’oge na-adịghị anya.” Obi dị ya ezigbo ụtọ na o nwere ụdị ndị enyi ahụ hụrụ ya n’anya!

Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka n’oge nsogbu bụ mmụọ nsọ Chineke kwere nkwa inye anyị. Pita onyeozi kwuru na Chineke ‘na-enye mmụọ nsọ ya n’efu.’ (Ọrụ 2:38) Ọ bụ ihe mere mgbe e ji mmụọ nsọ tee ọtụtụ Ndị Kraịst mmanụ na Pentikọst afọ 33. Ma, Chineke nwekwara ike inye anyị niile mmụọ nsọ ya n’efu. Mmụọ nsọ ya juru eju bara abara. N’ihi ya, ọ̀ bụ na i kwesịghị ịna-arịọ ya ka o nye gị ya n’ụba?—Aịza. 40:28-31.

GOSI NA AHỤHỤ NDỊ ỌZỌ NA-ATA NA-EMETỤ GỊ N’OBI

Pọl onyeozi diri ọtụtụ ihe isi ike. E nwedịrị mgbe a chọrọ igbu ya. (2 Kọr. 1:8-10) Ma, ụjọ ọnwụ atụghị Pọl. Obi siri ya ike n’ihi na ọ ma na Chineke nọnyeere ya. O dere, sị: “Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile bụrụ onye a gọziri agọzi, onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Kọr. 1:3, 4) O meghị ka Pọl na-akwa ụwa. Kama, ọnwụnwa ndị ahụ o diri nyeere ya aka ịmụta inwe ọmịiko, nke mere ka o nwekwuo ike ikasi ndị ọzọ obi mgbe ha nọ ná nsogbu.

Mgbe Antonio gbakere n’ọrịa ya, ọ malitekwara ọrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ihe banyere ụmụnna ya na-emetụ ya n’obi kemgbe. Ma n’oge ahụ, ya na nwunye ya gbalịsikwuru ike ịna-eleta ndị ọrịa, na-agbakwa ha ume. Dị ka ihe atụ, mgbe ha letachara otu nwanna na-arịa ọrịa siri ike, Antonio chọpụtara na nwanna ahụ anaghịzi achọ ịga ọmụmụ ihe. Antonio kwuru, sị: “Ọ bụghị na ọ hụghị Jehova na ụmụnna ndị ọzọ n’anya, kama ọrịa ya mere ka o chee na ya abaghịzi uru.”

Otu ihe Antonio mere iji gbaa nwanna ahụ ume bụ ịgwa ya ka o duo ụmụnna n’ekpere ná nnọkọ ha gara n’oge na-adịbeghị anya. N’agbanyeghị na nwanna ahụ chere na ya erughị eru, o kwetara ikpe ekpere ahụ. Antonio kwuru, sị: “O kpere ekpere magburu onwe ya. Mgbe o kpechara, ọ kwụsịrị iche na ya erughị eru. Obi esiela ya ike ugbu a na ọ bara uru.”

N’eziokwu, anyị niile ediela nsogbu ụfọdụ, ma ọ̀ bụ nnukwu nsogbu ma ọ̀ bụ nke obere. Ma, Pọl kwuru na idi nsogbu nwere ike ime ka anyị nwee ike ịkasi ndị ọzọ obi mgbe nsogbu bịaara ha. N’ihi ya, ka anyị na-akasi ndị ọzọ obi. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na ahụhụ ụmụnna anyị na-ata na-emetụ anyị n’obi nakwa na anyị na-eṅomi Chineke anyị, bụ́ Jehova.