Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

‘Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ’

‘Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ’

“Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.”—ỌMA 119:165.

1. Gịnị ka otu nwaanyị na-agba ọsọ mere, nke gosiri na o kpebisiri ike imeri n’ọsọ ọ na-agba?

OTU nwaanyị aha ya bụ Mary Decker malitere ịgba ọsọ mgbe ọ ka na-eto eto. Otú o si agba ọsọ mere ka ọtụtụ ndị chee na ọ ga-agbata ọlaedo n’egwuregwu Olimpik nke afọ 1984. Ma, egwú dagharịrị. Mgbe ọ na-agba ọsọ puku mita atọ, ụkwụ ya na ụkwụ onye ọzọ kụkọtara, ya adaa, merụọ ahụ́. E si n’ebe ahụ a na-agba ọsọ bupụ ya, anya mmiri eju ya anya. Ọ gbarughị ọsọ ahụ n’isi. Ma, ihe ahụ mere ya emeghị ka ọ kwụsị ịgba ọsọ. N’ihe na-erughị otu afọ, ọ gbara ọsọ ọzọ ma gbakarịa nwaanyị ọ bụla gbatụrụla ụdị ọsọ ahụ.

2. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na Ndị Kraịst nọ n’ọsọ? Gịnịkwa bụ ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa?

2 E nwere ụdị ọsọ anyị bụ́ Ndị Kraịst na-agba. Ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa bụ ka anyị merie n’ọsọ a. Ọsọ anyị na-agba abụghị ọsọ a na-agba ike ike ịgbaru ebe dị nso iji merie. Ọ bụghịkwa ọsọ ndị umengwụ, nke mmadụ ga-agbakata kwụsị, zurutụ ike. Kama, o yiri ọsọ mmadụ na-agba ịga ebe dị anya. Onye na-agba ụdị ọsọ a kwesịrị ịtachi obi ka o nwee ike ịgbaru ya n’isi. Pọl onyeozi ji onye na-agba ọsọ mee ihe atụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt. Ihe e ji mara obodo ahụ bụ asọmpi egwuregwu a na-enwe na ya. Pọl dere, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ egwuregwu na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ? Na-agbanụ ọsọ n’ụzọ ga-eme ka unu nweta ya.”—1 Kọr. 9:24.

3. Gịnị ka ndị niile so na-agba ọsọ a ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi?

3 Baịbụl gwara anyị ka anyị soro na-agba ọsọ a. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:25-27.) Ihe anyị ga-agbata bụ ndụ ebighị ebi. Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enweta nke ha  n’eluigwe, ndị ọzọ na-agba ya ga-enweta nke ha n’ụwa. Ọsọ a adịghị ka ọsọ ndị ọzọ ọtụtụ ndị na-agbacha ma gbara aka. Ndị niile tachiri obi gbaruo ọsọ a n’isi ga-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ. (Mat. 24:13) Naanị ihe ga-eme ka onye so na-agba ya ghara ịgbata ihe bụ ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ya otú e kwesịrị isi gbaa ya ma ọ bụ na ọ gbarughị ya n’isi. Ọ bụkwa naanị n’ọsọ a ka mmadụ ga-agbata ndụ ebighị ebi.

4. Gịnị mere na ọsọ ndụ ebighị ebi anyị na-agba adịghị mfe?

4 Ịgbaru ọsọ a n’isi adịghị mfe. Onye chọrọ ịgbaru ya n’isi kwesịrị ịna-ejide onwe ya, jisiekwa ike mee ihe o kpebiri ime. Ọ bụ naanị Jizọs Kraịst gbaruru ọsọ ahụ n’isi n’asụghị ngọngọ mgbe ọ bụla. Ma Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ ya, dere na ndị niile na-eso ụzọ Kraịst “na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ọ bụ eziokwu! Anyị niile nwere ezughị okè nke anyị. Anyị na-edikwa ezughị okè nke ndị ọzọ. N’ihi ya, anyị nwere ike ịkpọbi ụkwụ mgbe ụfọdụ, sụọ ngọngọ ma ọ bụ kwụsịtụ n’ọsọ a. Anyị nwedịrị ike ịda; ma anyị nwere ike ibili, gbarakwa gawa. Ụfọdụ ndị na-ada, kụọ afọ n’ala nke na e kwesịrị inyere ha aka tupu ha ebilie, gbarakwa ọsọ a gawa. N’ihi ya, anyị nwere ike ịsụ ngọngọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro ugboro, ma ọ bụdị daa.—1 Eze 8:46.

Ị daa, kwe ka e nyere gị aka; biliekwa!

Ị SỤỌ NGỌNGỌ, AKWỤSỊLA ỊGBA ỌSỌ

5, 6. (a) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na e nweghị ihe na-eme ka Onye Kraịst “sụọ ngọngọ”? Ọ bụrụ na Onye Kraịst adaa, gịnị ga-enyere ya aka ‘ibili’? (b) Gịnị mere na ụfọdụ anaghị ebili ma ha daa?

5 O nwere ike ịbụ na i kwutụla na mmadụ ‘sụrụ ngọngọ’ ma ọ bụ ‘daa’ mgbe onye ahụ mejọrọ ihe ma ọ bụ mgbe okwukwe ya na-esighịzi ike. Na Baịbụl, okwu abụọ ahụ nwere ike ịpụta otu ihe, ma ọ bụghị mgbe niile. Dị ka ihe atụ, Ilu 24:16 kwuru, sị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha; ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ.”

6 Jehova agaghị ekwe ka ndị tụkwasịrị ya obi “sụọ ngọngọ” ma ọ bụ daa nke na ha enweghị ike ibili. Ihe isi ike ma ọ bụ nsogbu ọzọ agaghị eme ka ha daa mbà n’okwukwe ha. Jehova mere ka obi sie anyị ike na ya ga-enyere anyị aka ka anyị ‘bilie’ ka anyị nwee ike iji obi anyị niile na-efe ya. Nkwa a Jehova kwere na-eme ka obi dị ndị niile ji obi ha dum hụ Jehova n’anya ụtọ.  Ndị ajọ omume anaghị achọ ibili ma ha daa. Ha anaghị achọ ka mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ndị ohu Chineke nyere ha aka. Ha anaghịkwa ekwe ka e nyere ha aka. Ma, e nweghị ihe ga-eme ka ndị ‘hụrụ iwu Jehova n’anya’ sụọ ngọngọ ma kwụsị ịgba ọsọ ndụ.—Gụọ Abụ Ọma 119:165.

7, 8. Olee otú mmadụ ga-esi ‘daa’ ma ka bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke?

7 Ụfọdụ na-eme mmehie na-adịghị oké njọ ugboro ugboro n’ihi adịghị ike. Ma ha ka ga-abụ ndị ezi omume n’anya Jehova ma ọ bụrụ na ha ‘ebilie,’ ya bụ, ma ha jiri obi ha niile chegharịa, na-agbalịsikwa ike ime ihe ziri ezi. Otú Chineke si gbaghara ndị Izrel gosiri na ihe a bụ eziokwu. (Aịza. 41:9, 10) Ilu 24:16 anaghị ekwusi okwu ike banyere ihe anyị na-emejọ, kama o gosiri na Chineke anyị, bụ́ onye obi ebere, ga-enyere anyị aka ka anyị ‘bilie’ ma ọ bụrụ na anyị adaa. (Gụọ Aịzaya 55:7.) Obi siri Jehova Chineke na Jizọs Kraịst ike na anyị ga-eme ihe anyị kwesịrị ime. Ha na-agbakwa anyị ume ka anyị ‘bilie.’—Ọma 86:5; Jọn 5:19.

8 Ọ bụrụgodị na mmadụ na-agba ọsọ ịga ebe dị anya, ma ya akpọọ ụkwụ n’ihe ma ọ bụ daa, ọ ka nwere ike inweta onwe ya ma gbaruo ọsọ ahụ n’isi ma ọ bụrụ na o bilie ozugbo. N’ọsọ ndụ ebighị ebi anyị na-agba, anyị amaghị ‘ụbọchị na oge awa’ anyị ga-agbacha ọsọ a. (Mat. 24:36) Ma ọ bụrụ na anyị na-agbalị ka anyị ghara ịsụ ngọngọ, ọ ga-adịrị anyị mfe ịna-agba ọsọ a ma gbaruo ya n’isi. N’ihi ya, gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ?

IHE NDỊ NWERE IKE IME KA ANYỊ SỤỌ NGỌNGỌ

9. Olee ihe ise anyị ga-atụle, bụ́ ihe ndị nwere ike ime ka anyị sụọ ngọngọ?

9 Ka anyị tụlee ihe ise nwere ike ime ka anyị sụọ ngọngọ: adịghị ike anyị, ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị, mgbe anyị chere na ihe e mere anyị n’ọgbakọ adịghị mma, ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu, na ezughị okè nke ndị ọzọ. Ma, ọ bụrụ na anyị asụọ ngọngọ, ka anyị cheta na Jehova nwere ndidi. Ọ naghị ewere anyị ozugbo ka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi.

10, 11. Olee adịghị ike ya na Devid nọ na-alụ?

10 E nwere ike iji adịghị ike anyị tụnyere nkume ndị dị n’ụzọ mgbe anyị na-agba ọsọ. Anyị tụlee ihe ndị mere Eze Devid na Pita onyeozi, anyị nwere ike ịmata ihe abụọ nwere ike ịbụ adịghị ike mmadụ. Nke mbụ bụ enweghị njide onwe onye. Nke abụọ abụrụ egwu mmadụ.

11 Eze Devid ejideghị onwe ya mgbe niile. Nsogbu ahụ mere ka ya na Bat-shiba kwaa iko. Mgbe Nebal kparịrị Devid, ọ fọrọ obere ka Devid gbuo ọchụ. N’eziokwu, o jideghị onwe ya mgbe ahụ, ma ọ kwụsịghị ịgbalị ime ihe dị Jehova mma. Ndị ọzọ nyeere ya aka, ya ‘ebilie,’ jirikwa obi ya niile na-ejere Chineke ozi.—1 Sam. 25:5-13, 32, 33; 2 Sam. 12:1-13.

12. Olee otú Pita si nọsie ike n’ọsọ ndụ a n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ?

12 Pita tụrụ egwu mmadụ ma sụọ ngọngọ mgbe ụfọdụ; ma o meghị ka ọ hapụ Jizọs na Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ gọnahụrụ Nna ya ukwu n’ihu ndị mmadụ, ọ bụghị otu ugboro, kama ugboro atọ. (Luk 22:54-62) N’oge ọzọ, Pita akpaghị àgwà ka Onye Kraịst. O mesoro ụmụnna bụ́ ndị Jentaịl ka à ga-asị na Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu e biri úgwù ka ha mma. Ma, Pọl onyeozi ghọtara ihe e kwesịrị ime, ya bụ, na e kwesịghị ịna-akpa ókè n’ọgbakọ. Àgwà ahụ Pita kpara adịghị mma. Tupu ụmụnna ndị ọzọ amụta àgwà ọjọọ ahụ Pita kpara, Pọl gakwuuru ya, dụọ ya ọdụ. (Gal. 2:11-14) Mpako ò mere ka iwe wee Pita, ya akwụsị ịgba ọsọ ndụ a? Mbanụ! O chebaara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ya echiche, mee ihe ọ gwara ya, nọsiekwa ike n’ọsọ ndụ ọ na-agba.

13. Olee otú ọrịa nwere ike isi mee ka anyị sụọ ngọngọ?

13 Mgbe ụfọdụ, adịghị ike anyị nwere ike ịbụ na e nwere ọrịa anyị na ya na-alụ. O nwekwara ike ime ka anyị sụọ ngọngọ. O nwere ike ime ka anyị ghara ịna-agbasi ọsọ ndụ ike ma ọ bụkwanụ mee ka anyị chọwa ịda ma ọ bụ daa mbà. Dị ka ihe  atụ, mgbe e mechara otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Japan baptizim, ọ rịara ọrịa afọ iri na asaa. Uche ya niile dị n’ọrịa ya, nke mere ka ọ na-eleghara ihe gbasara ofufe Jehova anya. O mechara kwụsị ịga ozi ọma. Ndị okenye abụọ gara leta ya. Ha ji obiọma gbaa ya ume, ya amalitekwa ịga ọmụmụ ihe. O kwuru, sị, “Anya mmiri gbara m n’ihi otú ụmụnna ndị ahụ si wetuo obi kelee m.” Nwanna nwaanyị ahụ amalitekwala ịgba ọsọ ndụ a.

14, 15. Ọ bụrụ na ime ihe ọjọọ agụwa anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mee? Nye ihe atụ.

14 Ihe na-agụ anụ ahụ́ emeela ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ. Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa ahụ abịara anyị, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịna-eche ihe dị mma n’obi anyị, na-emekwa omume ọma otú Chineke chọrọ. Cheta na Jizọs dụrụ anyị ọdụ ka anyị “tụfuo” ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị sụọ ngọngọ, ọ bụrụgodị anya anyị ma ọ bụ aka anyị. Ọ̀ bụ na echiche ọjọọ na omume rụrụ arụ ndị nwere ike ime ka anyị kwụsị ịgba ọsọ ndụ esoghị n’ihe ndị ahụ?—Gụọ Matiu 5:29, 30.

15 Otu nwanna a mụrụ n’ọgbakọ kwuru na kemgbe ya maara ihe, ọ na-agụsi ya agụụ ike ka ya na nwoke ibe ya nwee mmekọahụ. O kwuru, sị: “Ihere na-emekarị m. Ọ na-adị m ka m̀ gbapụrụ iche.” Mgbe ọ dị iri afọ abụọ, ọ bụrụla ọsụ ụzọ oge niile na ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Ka oge na-aga, o mere mmehie. N’ihi ya, ndị okenye ji Baịbụl dọọ ya aka ná ntị ma nyere ya aka. O kpesiri ekpere ike, na-amụ Okwu Chineke, na-agbalịsikwa ike inyere ndị ọzọ aka. Ihe ndị ahụ nyeere ya aka inweta onwe ya, gbarakwa ọsọ ndụ a na-aga. Ka ọtụtụ afọ gachara, o kwuru, sị: “Ụdị ihe ọjọọ ndị ahụ ka na-agụ m mgbe ụfọdụ, ma anaghị m ekwe ka o merie m. Amụtala m na Jehova agaghị ekwe ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị. N’ihi ya, obi siri m ike na Chineke ma na m ga-emeri ọnwụnwa a.” Nwanna ahụ kwukwara, sị: “Mbọ niile m gbara imeri ọnwụnwa ga-abara m uru n’ụwa ọhụrụ. Achọsiri m ike ịbanye n’ụwa ọhụrụ! Ka ọ dị ugbu a, m ga na-agbalịsi ike imeri ọnwụnwa a.” O kpebiela na o nweghị ihe ga-eme ka ọ kwụsị ọsọ ndụ ọ na-agba.

16, 17. (a) Gịnị nyeere otu nwanna aka, bụ́ onye chere na e mere ya ihe ọjọọ n’ọgbakọ? (b) Ọ bụrụ na anyị achọghị ịsụ ngọngọ, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta banyere ọgbakọ?

16 Ihe ọzọ nwere ike ime ka mmadụ sụọ ngọngọ bụ ma o chee na ihe ụmụnna mere ya n’ọgbakọ adịghị mma. Na Frans, otu onye bụbu okenye n’ọgbakọ chere na ihe e mere ya n’ọgbakọ adịghị mma. Iwe eju ya obi. N’ihi ya, ọ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ndị okenye abụọ gara leta ya. Ha weturu obi gee ya ntị mgbe ọ na-akọ ihe o chere bụ́ ihe ọjọọ e mere ya. Ha anapụghị ya okwu n’ọnụ. Ha gbara ya ume ka ọ tụkwasị Jehova ihe ahụ na-echegbu ya, gwakwa ya na ihe kacha mkpa bụ ka o mee ihe dị Chineke mma. O mere ihe ha gwara ya. N’oge na-adịghị anya, ọ malitekwara ịgba ọsọ ndụ a, sorokwa ọgbakọ na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma.

17 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-echeta na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Isi nke ọgbakọ, ọ bụghị ndị mmadụ na-ezughị okè. Baịbụl kwuru na ‘anya Jizọs dị ka ọkụ na-enwu enwu.’ N’ihi ya, ọ na-ahụ ihe niile na-eme n’ọgbakọ karịa otú anyị si ahụ ha. (Mkpu. 1:13-16) Dị ka ihe atụ, ọ ma na anyị nwere ike ịghọtahie ihe e mere n’ọgbakọ. N’ihi ya, anyị echee na e mere anyị ihe ọjọọ. Ma, e nwee ihe e mejọrọ n’ọgbakọ, Jizọs ga-elebara ya anya nke ọma mgbe oge ruru. Ọ bụ ya mere na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe nwanna mere mee ka anyị sụọ ngọngọ.

18. Olee otú anyị ga-esi merie ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu ndị bịaara anyị?

18 Ihe abụọ ọzọ ndị nwere ike ime ka mmadụ sụọ ngọngọ bụ ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu, na ezughị okè nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. N’ilu Jizọs tụrụ banyere ọgha mkpụrụ, o kwuru na “ahụhụ ma ọ bụ mkpagbu” n’ihi okwu Chineke nwere ike ime ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ. Ndị ezinụlọ anyị, ndị agbata obi anyị, ma ọ bụ ndị ọchịchị  nwere ike ịna-akpagbu anyị ma ọ bụ na-emegide anyị. Ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka mmadụ sụọ ngọngọ, karịchaa ma ọ bụrụ na onye ahụ ‘enweghị mgbọrọgwụ n’ime onwe ya,’ ya bụ na okwukwe ya esighị ike. (Mat. 13:21) Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe Jehova, ozi Alaeze Chineke ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. Ọnwụnwa bịara gị, gbalịsie ike ịna-ekpe ekpere ma na-atụgharị uche n’ihe ndị “kwesịrị otuto.” (Gụọ Ndị Filipaị 4:6-9.) N’ike Jehova, anyị ga-emeri ọnwụnwa, anyị agaghịkwa ekwe ka nsogbu ndị bịaara anyị mee ka anyị sụọ ngọngọ.

Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịgbaru ọsọ ndụ n’isi!

19. Gịnị ka anyị ga-eme ka iwe mmadụ kpasuru anyị ghara ime ka anyị sụọ ngọngọ?

19 Ọ dị mwute na kemgbe ọtụtụ afọ, ụfọdụ ndị ekwela ka ezughị okè nke ndị ọzọ mee ka ha kwụsị ịgba ọsọ ndụ. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji sụọ ngọngọ bụ na ụmụnna ndị ọzọ mere ihe hanwa na-anaghị eme n’ihi akọnuche ha. (1 Kọr. 8:12, 13) Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe were anyị iwe, ọ̀ ga-eme ka anyị hapụ ọgbakọ? Baịbụl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe, ka ha na-agbaghara ndị ọzọ, gharakwa ịna-esi ọnwụ n’ihe ha chere ruuru ha. (Luk 6:37) Mmadụ mee ihe were gị iwe, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe mere m ji maa onye ahụ ikpe ọ̀ bụ n’ihi na o meghị ihe m chọrọ? Ebe m ma na ụmụnna m ezughị okè, m̀ ga-ekwe ka ezughị okè ha mee ka m kwụsị ịgba ọsọ ndụ?’ Ịhụ Jehova n’anya nwere ike inyere anyị aka ikpebisi ike na anyị agaghị ekwe ka ihe onye ọzọ mere mee ka anyị ghara ịgbaru ọsọ ndụ a n’isi.

JIRI NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ, ASỤLA NGỌNGỌ

20, 21. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’ọsọ ndụ anyị na-agba?

20 Ì kpebisiri ike ‘ịgba ọsọ ndụ a ruo n’isi’? (2 Tim. 4:7, 8) Ọ bụrụ na i kpebisiri ike ime otú ahụ, na-amụsi Baịbụl ike. Jiri Baịbụl na akwụkwọ nzukọ Jehova na-ebipụta na-eme nchọnchọ ma na-atụgharị uche ka i nwee ike ịmata ihe ndị nwere ike ime ka ị sụọ ngọngọ. Na-arịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ga-eme ka okwukwe gị sie ike. Cheta na ọ bụrụ na onye na-agba ọsọ akpọbie ụkwụ ma ọ bụ daa, ọ pụtaghị na o nweghị ike ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. O nwere ike ibili, gbarakwa na-aga. O nwedịrị ike isi n’ihe ndị chọrọ ịkwatu ya mụta ihe ga-abara ya uru. Otú ahụkwa ka anyị nwere ike isi n’ihe anyị mejọrọ mụta ihe ga-enyere anyị aka imeri ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara anyị.

21 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na onye na-agba ọsọ ndụ ebighị ebi kwesịrị ịna-agba ọsọ, ọ bụghị ịfanye aka n’ụkwụ. Ọ dịghị ka ebe ndị mmadụ banyere n’ụgbọala, ya eburuo ha ebe ha na-aga. Anyị ga-ejirịrị ụkwụ anyị na-agba ọsọ ndụ a. Ka anyị na-agba ọsọ a, “udo dị ukwuu” Jehova na-enye anyị ga na-ekusa anyị dị ka ikuku ndụ. (Ọma 119:165) Ka obi sie anyị ike na ọ ga na-agọzi anyị ugbu a nakwa na ọ ga-agọzi ndị niile gbaruru ọsọ a n’isi ma nye ha ndụ ebighị ebi.—Jems 1:12.