Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

Akwụsịla Inwe Olileanya!

Akwụsịla Inwe Olileanya!

Ị̀ bụ Onyeàmà Jehova kemgbe ọtụtụ afọ, ma ya ana-agụsi gị ike ka di gị ma ọ bụ nwunye gị soro gị na-efe Jehova?

Obi ọ̀ dara gị mbà mgbe onye ị na-amụrụ Baịbụl na-ekweghị abata n’ọgbakọ, n’agbanyeghị na o yiri ka o nwere ezigbo mmasị ná mmalite?

 Ihe ụfọdụ ụmụnna nọ na Briten kọrọ ga-enyere gị aka ịghọta na i kwesịghị ịkwụsị inwe olileanya. Ị ga-amatakwa ihe i nwere ike ime ka i “zipụ achịcha gị n’elu mmiri,” ka i nwee ike inyere ndị na-anatabeghị eziokwu aka.—Ekli. 11:1.

Ọ DỊ MKPA KA Ị NỌSIE IKE N’OFUFE JEHOVA

Otu ihe dị mkpa i kwesịrị ime bụ ịnọsi ike n’ofufe Chineke. I kwesịrị ijisi eziokwu ahụ ike, raparakwa Jehova n’ahụ́. (Diut. 10:20) Ọ bụ ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Georgina mere. Mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl n’afọ 1970, di ya, bụ́ Kyriacos, were ezigbo iwe. Ọ gbalịrị ime ka nwunye ya kwụsị ịmụ Baịbụl. Ọ naghị ekwe ka Ndịàmà Jehova bịa n’ụlọ ha. Ọ na-atụfu akwụkwọ Ndịàmà Jehova ọ bụla nwunye ya ji.

Mgbe Georgina malitere ịga ọmụmụ ihe, iwe wekwuru Kyriacos. Otu ụbọchị, ọ gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ọ gaa kpata ọgba aghara. Mgbe otu nwanna nwaanyị chọpụtara na Kyriacos na-asụ asụsụ Grik karịa Bekee, ọ kpọrọ otu nwanna nwoke onye Grik, bụ́ onye nọ n’ọgbakọ ọzọ, ka ọ bịa gwa ya okwu. Otú nwanna nwoke ahụ si jiri obiọma gwa Kyriacos okwu mere ka o gee ya ntị. O kwedịrị ka ọ mụọrọ ya Baịbụl ruo ọnwa ole na ole. Ma Kyriacos mechara kwụsị ịmụ Baịbụl.

Kyriacos ka nọkwa na-emegide nwunye ya bụ́ Georgina ruo afọ atọ ọzọ. O kwuru na ya ga-achụpụ nwunye ya ma ọ nwaa anwa kwe ka e mee ya baptizim. N’ụbọchị a ga-eme Georgina baptizim, o kpesiri ekpere ike, rịọ Jehova ka ọ ghara ikwe ka Kyriacos chụpụ ya. Mgbe ụmụnna ji ụgbọala bịa iburu ya gaa mgbakọ, Kyriacos gwara ha, sị: “Gawanụ. Anyị ga-eji ụgbọala anyị na-eso unu.” Ọ nọ mgbe a na-eme ihe omume nke ụtụtụ ma hụ ka e mere nwunye ya baptizim!

Georgina mechara hụ ka e mere di ya baptizim. N’oge ahụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na iri afọ anọ agaala kemgbe Ndịàmà Jehova ziri Georgina ozi ọma

Ka oge na-aga, Kyriacos kwụsịtụrụ inye nwunye ya nsogbu, jirikwa nwayọọ nwayọọ na-agbanwe àgwà ya. Georgina mechara hụ ka e mere di ya baptizim. N’oge ahụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na iri afọ anọ agaala kemgbe Ndịàmà Jehova ziri Georgina ozi ọma. Gịnị nyeere Kyriacos aka? O kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na Georgina ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ife Jehova.” Georgina sịrị: “N’agbanyeghị na di m na-emegide m, ekpebiri m na m gaghị akwụsị ife Chineke m. N’oge ahụ niile, m nọ na-ekpegara Jehova ekpere, akwụsịghịkwa m inwe olileanya.”

IYIRI MMADỤ ỌHỤRỤ AHỤ BARA URU

Ihe ọzọ i kwesịrị ime iji nyere di gị ma ọ bụ nwunye gị aka ịmalite ife Jehova bụ ịmụta ịkpa àgwà Ndị Kraịst. Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst bụ́ nwunye ọdụ, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke.” (1 Pita 3:1) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Christine mere ihe ahụ Pita kwuru, n’agbanyeghị na o were ọtụtụ afọ tupu omume ọma ya emee ka di ya bata n’ọgbakọ. Ọ karịala iri afọ abụọ Christine ghọrọ Onyeàmà Jehova. Ma, n’oge ahụ, di ya bụ́ John ekweghị na Chineke. Ọ chọghịkwa iso n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe, ma ọ ghọtara na okpukpe nwunye ya bụ́ Christine malitere ikpe ọhụrụ dị ya ezigbo mkpa. John kwuru, sị: “Achọpụtara m na ọ na-eme ya obi ụtọ. Ọ mụtara ikpebisi ike ime ihe ọ chọrọ ime, bụrụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Àgwà ya nyeere m aka imeri ọtụtụ nsogbu bịaara m.”

O nweghị mgbe Christine gbalịrị ịmanye di ya ka ọ ghọọ Onyeàmà Jehova. Di ya kwuru, sị: “Site ná mmalite, Christine ghọtara na ọ ga-akacha mma ka ọ ghara ịna-ezi m ozi ọma. O nweere m ndidi ma hapụ m ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-amụ ihe banyere Baịbụl otú m chọrọ.” Ọ na-abụ, Christine hụ isiokwu Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! nke kwuru ihe o chere ga-amasị di ya, dị ka sayensị na ihe ndị Chineke kere eke, ọ na-agwa ya, sị, “Ọ dị m ka isiokwu a ọ̀ ga-amasị gị.”

John mechara laa ezumike nká ma malite ịkọ obere ugbo. Ebe ọ bụ na o nwere efe iche echiche banyere ihe ndị gbasara ndụ, ọ malitere iche, sị: ‘Ndụ anyị dị ugbu a ọ̀ malitere na mberede, ka ò nwere ihe mere e ji kee ndị mmadụ?’ Otu ụbọchi, otu nwanna ya na John na-akparịta ụka gwara ya, sị, “Ka m mụwaranụ gị Baịbụl.” John kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na amalitela m ikwere na Chineke, ekwetara m ka ọ mụwara m Baịbụl.”

Ọ bara ezigbo uru na Christine akwụsịghị inwe olileanya! E mere John baptizim mgbe afọ iri abụọ gacharala kemgbe nwunye ya kpewere ekpere ka ọ ghọọ Onyeàmà Jehova. Ha abụọ jizi ịnụ ọkụ n’obi na-efekọ Jehova ọnụ. John sịrị: “E nwere ihe abụọ mere ka m kpebie ịghọ Onyeàmà Jehova. Ọ bụ obiọma ụmụnna nwere na otú ha si hụ ibe ha n’anya. Ọ bụrụkwa na di gị ma ọ bụ nwunye gị bụ Onyeàmà Jehova, mara na ọ bụ ezigbo mmadụ e kwesịrị ịtụkwasị obi na onye na-echebara ndị ozọ echiche.” N’eziokwu,  Christine mere ihe e kwuru na 1 Pita 3:1, o mekwara ka di ya chegharịa!

IHE ANYỊ KỤRỤ NWERE IKE IMECHA MỊA MKPỤRỤ

Gịnị ka ị ga-eme ma e nwee ihe mere ka ndị ị na-amụrụ Baịbụl kwụsị ịmụ ihe? Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ghaa mkpụrụ gị n’ụtụtụ, ekwekwala ka aka gị zuo ike ruo n’anyasị; n’ihi na ị maghị ebe ọ ga-eme nke ọma, ma ọ̀ bụ n’ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ, ma ọ̀ bụ na ha abụọ ga-adịcha mma.” (Ekli. 11:6) Mgbe ụfọdụ, ọ na-ewe ọtụtụ afọ tupu ụfọdụ ekweta eziokwu a kụziiri ha. Ma, mmadụ nwere ike imecha ghọta na ịbịaru Chineke nso bara uru. (Jems 4:8) N’eziokwu, otu ụbọchị, i nwere ike ịnụ ihe ị na-atụghị anya ya nke ga-eme gị obi ụtọ.

Chegodị banyere Alice, bụ́ onye si India kwaga Ingland. Ọ malitere ịmụ Baịbụl n’afọ 1974. Ọ na-asụ asụsụ Hindi ma chọọ ịmụtakwu Bekee. Alice mụrụ ihe ruo afọ ole na ole, gaakwa ọmụmụ ihe ugboro ole na ole n’ọgbakọ ndị ji asụsụ Bekee amụ ihe. Ọ ma na ihe ọ na-amụta bụ eziokwu, ma ọ ghọtaghị na ọ dị ezigbo mkpa. Ihe ọzọ bụ na mkpa ya mgbe ahụ bụ ịchụ ego, ikpori ndụ na-atọkwa ya ezigbo ụtọ. Alice mechara kwụsị ịmụ Baịbụl.

Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gachara, Alice degaara Stella, bụ́ onye na-amụburu ya ihe, akwụkwọ ozi. Alice dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Ama m na obi ga-adị gị ụtọ ịnụ na e mere onye ahụ ị malitere ịmụrụ Baịbụl n’afọ 1974 baptizim ná mgbakọ distrikti e mere n’oge na-adịbeghị anya. Ihe ị kụziiri m baara m ezigbo uru. Ị kụnyere eziokwu Baịbụl n’obi m. N’agbanyeghị na achọbeghị m inyefe Chineke onwe m mgbe ahụ, echefughị m eziokwu ahụ ị kụziiri m.”

Akwụkwọ ozi ahụ Alice degaara Stella kwuru, sị: “Ama m na obi ga-adị gị ụtọ ịnụ na e mere onye ahụ ị malitere ịmụrụ Baịbụl n’afọ 1974 baptizim ná mgbakọ distrikti e mere n’oge na-adịbeghị anya”

Gịnị mere ka Alice gbanwee? O kwuru na obi gbawara ya mgbe di ya nwụrụ n’afọ 1997. O kpegaara Chineke ekpere. Tupu nkeji iri agachaa, Ndịàmà Jehova abụọ na-asụ asụsụ Punjabi bịara n’ụlọ ya ma nye ya traktị isiokwu ya bụ Olileanya Dị Aṅaa Dịịri Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? Alice ghọtara na ọ bụ otú Chineke si zaa ekpere ya. N’ihi ya, o kpebiri ịgawa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ma, olee ebe ọ ga-ahụ ha? Ọ chọtara otu akwụkwọ ochie o dere ebe Stella gwara ya ọgbakọ ndị Punjabi na-amụ ihe. Alice gara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụnna ndị na-eji asụsụ Punjabi amụ ihe nabatara ya nke ọma. Alice kwuru, sị: “Echefughị m ịhụnanya ha gosiri m echefu, o mekwara ka m nweta onwe m n’uju m nọ na-eru.”

Ọ malitere ịgachi ọmụmụ ihe anya, kwekwa ka e bido ịmụrụ ya ihe. Ọ mụtara ịsụ asụsụ Punjabi nke ọma, na-agụkwa ya. E mere ya baptizim n’afọ 2003. Ihe ikpeazụ o kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara Stella bụ, “Ana m ekele gị nke ukwuu maka otú i si kụnye eziokwu Baịbụl n’obi m afọ iri abụọ na itoolu gara aga nakwa otú i si jiri omume gị kụziere m ihe m kwesịrị ime.”

“Ana m ekele gị nke ukwuu maka otú i si kụnye eziokwu Baịbụl n’obi m afọ iri abụọ na itoolu gara aga nakwa otú i si jiri omume gị kụziere m ihe m kwesịrị ime.”—Alice

Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe ndị a a kọrọ? Ọ bụrụ na mmadụ ji obi ya niile chọọ ịma Chineke ma dị umeala n’obi, Jehova ga-eme ka eziokwu Baịbụl gbaa mgbọrọgwụ n’obi ya. Ma ọtụtụ afọ nwere ike ịgafe karịa ka ị tụrụ anya ya. Cheta na Jizọs kwuru n’otu ihe atụ ya, sị: “Mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, [ọgha mkpụrụ ahụ amaghị]. Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta.” (Mak 4:27, 28) Mkpụrụ na-eto nwayọọ nwayọọ “n’onwe ya.” Ihe ọ pụtara bụ na onye nkwusa anaghị ama otú eziokwu Baịbụl ọ kụrụ n’obi ndị mmadụ nwere ike isi gbanye mgbọrọgwụ. N’ihi ya, na-agha mkpụrụ n’ụba. I nwekwara ike ịghọrọ mkpụrụ n’ụba.

Echefula na ekpere dịkwa ezigbo mkpa. Georgina na Christine kpegaara Jehova ekpere ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na ị ‘nọgidesie ike n’ekpere’ ma ghara ịkwụsị inwe olileanya, “mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị,” i nwere ike ịhụkwa “achịcha” i zipụrụ n’elu mmiri.—Rom 12:12; Ekli. 11:1.