Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

Ọ̀ Bụ Josifọs Dere Ya n’Eziokwu?

Ọ̀ Bụ Josifọs Dere Ya n’Eziokwu?

N’oge ndịozi Jizọs, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Fleviọs Josifọs dere akwụkwọ nke kọrọ banyere ndị Juu oge ochie. N’Akwụkwọ nke Iri Abụọ n’akwụkwọ ahụ, o kwuru banyere ọnwụ “Jems, bụ́ nwanne Jizọs onye a kpọrọ Kraịst.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na ọ bụ Josifọs dere ihe ahụ. Ma, ụfọdụ ekwetaghị na ọ bụ Josifọs dere ihe ọzọ e kwuru n’akwụkwọ ahụ banyere Jizọs. Ihe a kpọrọ akwụkwọ ahụ bụ Testimonium Flavianum. O kwuru, sị:

“N’ihe dị ka n’oge ahụ, e nwere otu nwoke a kpọrọ Jizọs. Ọ bụ onye maara ihe. Amaghị m ma è kwesịrị ịkpọ ya mmadụ, n’ihi na ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube. Ọ na-atọkwa ọtụtụ ndị ụtọ ige ya ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. O mere ka ọtụtụ ndị Juu na ndị Jentaịl na-eso ya. Ọ bụ ya bụ Kraịst; mgbe ndị isi ndị obodo anyị mere ka Paịlet maa ya ikpe ọnwụ n’elu obe, ndị hụrụ ya n’anya site ná mmalite ahapụghị ya, n’ihi na o mere ka ha hụ ya mgbe o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, otú ahụ ndị amụma Chineke buru ihe ndị ahụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ magburu onwe ha n’amụma banyere ya; ruokwa taa, a ka nwere ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a na-akpọ “Ndị Kraịst.”—Akwụkwọ bụ́ Josephus—The Complete Works, nke William Whiston sụgharịrị.

Kemgbe ihe dị ka narị afọ anọ, ndị kwetara na ọ bụ Josifọs dere ihe a na ndị na-ekwetaghị na-arụ ezigbo ụka. E nwere otu onye Frans aha ya bụ Serge Bardet. Ọ bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme na aka ochie n’ide akwụkwọ gbasara ndị mgbe ochie. Ọ gbalịrị ịchọpụta nke bụ́ eziokwu n’ụka a tara ezigbo akpụ ndị ọkà mmụta na-arụ kemgbe narị afọ anọ. O bipụtara ihe ọ chọpụtara n’otu akwụkwọ o dere n’asụsụ French.

Josifọs abụghị Onye Kraịst. Ọ bụ onye Juu nke na-akọ banyere ihe ndị Juu mere; n’ihi ya, ihe mere ndị ọkà mmụta ji arụ ụka banyere ihe a bụ na akwụkwọ ahụ kwuru na Jizọs bụ “Kraịst.” Mgbe Bardet tụlechara ihe ahụ, o kwuru na otú e si dee “Kraịst” n’akwụkwọ ahụ dabara adaba ‘n’otú e si ede aha ndị mmadụ n’asụsụ Grik.’ Bardet kwukwara na e lee okwu ahụ anya otú ndị Juu na Ndị Kraịst si ele ihe anya, “o nwere ike ịbụ na Josifọs kwuru na Jizọs bụ Kraịst.” Bardet kwukwara na ọtutụ n’ime ndị ahụ na-arụ ụka na-eleghara ihe a e kwuru anya. Ma, ha ekwesịghị ime otú ahụ.”

Ọ̀ ga-abụ na e nwere onye mechara gaa degharịa ihe Josifọs dere? Mgbe Bardet tụlechara ihe akụkọ ihe mere eme na ihe ndị ọzọ na-egosi, o kwuru na e nweghị onye ga-emeli ya. Onye ga-emeli ụdị ihe ahụ ga-abụ onye “ma otú e si eṅomi mmadụ nke a na-enweghị ụdị ya n’oge ochie,” ya bụ, “onye ya na Josifọs bụ otu.”

Gịnịzi mere ndị ọkà mmụta ji ekwu na ọ bụghị Josifọs dere ihe ahụ? Bardet kwuru na ihe kpatara ya bụ na “e nwere ndị kwetara ihe e dere n’ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie, ma ha ekwetaghị ihe e dere na nke ahụ Josifọs dere.” O kwukwara na ihe mere ụfọdụ ndị ji arụ ihe ahụ e dere ụka kemgbe ọtụtụ narị afọ bụ na ha “bu ihe na-adịghị mma n’obi,” ọ bụghị n’ihi ihe ha chọpụtara n’ihe e dere na ya. Ma, a tụlee ihe e dere na ya nke ọma, a ga-aghọta na ọ bụ Josifọs dere ya.

Anyị amaghị ma ihe a Bardet kwuru ọ̀ ga-eme ka ndị ọkà mmụta gbanwee otú ha si ele akwụkwọ ahụ Josifọs dere anya. Otu nwoke ihe ahụ Bardet kwuru mere ka ọ gbanwee obi ya bụ Pierre Geoltrain. Ọ bụ ọkachamara n’ihe gbasara okpukpe ndị Juu n’oge ndị Grik na-achị nakwa Ndị Kraịst n’oge ochie. O kwetaburu na ọ bụghị Josifọs dere ihe ahụ. Ọ na-achịbu ndị kwetara na ọ bụ Josifọs dere ya ọchị. Ma, ọ gbanwere obi ya. O kwuru na ọ bụ ihe ahụ Bardet dere mere ka ọ gbanwee obi ya. Geoltrain ekwuola na “malite ugbu a gawa, mmadụ ekwesịghị ịnwa anwa kwuo na ọ bụghị Josifọs dere ihe ahụ.”

N’eziokwu, e nwere ihe ọzọ mere Ndịàmà Jehova ji kweta na Jizọs bụ Kraịst. Ọ bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru.—2 Tim. 3:16.