Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MACH 2013

Ụlọ Nche a ga-echetara Ndị Kraịst niile otú ha ga-esi na-agba ọsọ ndụ. Ọ ga-agwa anyị otú anyị ga-esi mata ihe dị anyị n’obi, marakwa Chineke anyị, bụ́ Jehova.

‘Ọ Dịghị Ihe Na-eme Ka Ndị Hụrụ Jehova n’Anya Sụọ Ngọngọ’

Gịnị mere na e nweghị ihe na-eme ka ndị hụrụ iwu Jehova n’anya sụọ ngọngọ? Chọpụta ihe nwere ike inyere anyị aka ịnọsi ike n’ọsọ ndụ a.

Ì Nwere ‘Obi Ị Ga-eji Mara’ Jehova?

Ihe Jeremaya onye amụma kwuru nwere ike inyere gị aka inwe ezigbo obi.

“Ugbu A Unu Maara Chineke,” Gịnị Ka Unu Kwesịrị Ime?

Mụta ihe mere i ji kwesị ịna-ele ma okwukwe gị ò sikwara ike nakwa ma ì ji obi gị niile na-efe Jehova Chineke.

Kwe Ka A Kasie Gị Obi, Na-akasikwa Ndị Ọzọ Obi

Anyị niile na-arịa ọrịa. Ụfọdụ na-arịakwa ọrịa ndị siri ike. Ụdị nsogbu ahụ bịara anyị, olee otú anyị nwere ike isi die ya?

Jehova Bụ Ebe Obibi Anyị

N’agbanyeghị na anyị bi n’ụwa ochie a, gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-echebe ndị ya?

Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù

Olee otú obi dị gị n’ihi ihe ùgwù i nwere nke bụ́ ịkụziri ndị ọzọ aha Chineke? Gịnị ka ịma aha Chineke na ijegharị n’aha ya pụtara?

Ọ̀ Bụ Josifọs Dere Ya n’Eziokwu?

Ọ̀ bụ Josifọs, bụ́ onye Juu nke na-akọ akụkọ ihe mere eme, dere akwụkwọ a kpọrọ Testimonium Flavianum?

Akwụsịla Inwe Olileanya!

I kwesịghị ịkwụsị inwe olileanya na mmadụ ga-emecha nata eziokwu. Gụọ banyere ndị mechara nata eziokwu na ihe mere ha ji mee otú ahụ.