Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2013

E Ziri Ndị Nche Eze Ozi Ọma

E Ziri Ndị Nche Eze Ozi Ọma

N’afọ 59 n’Oge Ndị Kraịst, ọchịagha aha ya bụ Juliọs na ndị agha ibe ya ike gwụrụ du ndị mkpọrọ bata Rom. Ebe ha si bata obodo ahụ bụ n’ọnụ ụzọ ámá Pọta Kapena. Obí Eze Ukwu Niro dịkwanụ n’elu Ugwu Palataịn. Ndị agha na-eche obí ahụ nche na-eke mma agha n’úkwù yikwasị ya uwe agha ha. * Juliọs kpọ ndị mkpọrọ si n’akụkụ ebe ndị Rom na-ezukọ gbagoo n’Ugwu Viminal. Ha gafere ebe a na-azụ ndị agha na otu ogige ndị Rom na-anọ achụrụ chi ha dị iche iche àjà.

Ebe a kpụrụ Ndị Nche Eze. A na-ekwu na ebe e si nweta ya bụ ná Mgbidi Klọdiọs, nke a rụrụ n’afọ 51

Pọl onyeozi so ná ndị mkpọrọ ndị ahụ. Mgbe ebili mmiri nọ na-atụgharị ụgbọ Pọl ha ọnwa ole na ole tupu oge ahụ, mmụọ ozi Chineke gwara ya, sị: “Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza.” (Ọrụ 27:24) Ò ruola mgbe Pọl ga-eguzo n’ihu Siza? Ka o legharịrị anya n’obodo ahụ, ọ ga-abụ na o chetara ihe Jizọs gwara ya mgbe ọ nọ n’Ụlọ Elu Antonia na Jeruselem afọ ole na ole gara aga. Jizọs gwara ya, sị: “Nwee obi ike! N’ihi na dị ka ị nọworo na-agba àmà nke ọma n’ihe banyere m na Jeruselem, otú ahụkwa ka ị na-aghaghị ịgba àmà na Rom.”—Ọrụ 23:10, 11.

O nwere ike ịbụ na Pọl kwụsịtụrụ lee ogige ndị nche eze, nke a na-akpọ Kastra Pritoria. Ọ bụ nnukwu ụlọ elu nke e ji brik rụọ. Ọ bụ ebe ahụ ka ndị nche eze na ndị uwe ojii obodo ahụ bi. Ebe ọ bụ na e nwere ìgwè ndị nche iri na abụọ * nakwa ọtụtụ ndị uwe ojii n’ebe ahụ, o nwere  ike ịbụ na ọtụtụ puku ndị agha na ndị agha ịnyịnya bi n’ebe ahụ. Ụlọ elu ahụ na-echetara ndị mmadụ na eze ukwu Rom na-akpa ike. Ndị nche eze na-elekọta ndị mkpọrọ nọ n’ebe niile Alaeze Ukwu Rom na-achị. N’ihi ya, Juliọs, bụ́ otu n’ime ndị nche eze, du ndị mkpọrọ si n’otu n’ime ọnụ ụzọ ámá anọ dị na Rom banye. Ndị mkpọrọ ahụ nọrọ n’ụzọ ọtụtụ ọnwa ma mechaa rute Rom.—Ọrụ 27:1-3, 43, 44.

PỌL KWUSARA OZI ỌMA “N’ENWEGHỊ IHE MGBOCHI”

Mgbe Pọl nọ n’ụzọ na-abịa Rom, ọ hụrụ ọhụụ nke mere ka ọ mata na o nweghị onye ga-anwụ ma ụgbọ ha kpuo. O nweghị ihe mere ya mgbe agwọ ọjọọ tara ya. Ọ gwọrọ ndị ọrịa n’agwaetiti Mọlta nke mere ka ndị ụfọdụ kwuwe na Pọl bụ chi. O nwere ike ịbụ na ndị nche eze ndị ọzọ nụrụ akụkọ ihe niile ahụ merenụ ma na-ekwu banyere ha.

Pọl eburula ụzọ hụ ụmụnna ndị si Rom bịa ‘zute ya n’Ahịa Apịọs nakwa n’Ụlọ Atọ nke Ndị Ije.’ (Ọrụ 28:15) Ọ na-agụsi Pọl agụụ ike ikwusa ozi ọma na Rom. Ma, ebe ọ bụ onye mkpọrọ, olee otú ọ ga-esi kwusaa ozi ọma? (Rom 1:14, 15) Ụfọdụ chere na a ga-akpọrọ ndị mkpọrọ ahụ kpọnye onyeisi ndị nche. Ọ bụrụ na e mere otú ahụ, ọ ga-abụ na onye a kpọọrọ Pọl kpọnye bụ onyeisi ndị nche eze aha ya bụ Afranịọs Bọros. O nwere ike ịbụ ya na-esote eze ukwu Rom. * Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ọ bụghị ndị ọchịagha na-eche Pọl nche, kama ọ bụzi naanị otu onye nche eze. A hapụrụ ya ka o jiri aka ya chọta ebe ọ ga-anọ, kwekwa ka ndị mmadụ na-abịa eleta ya, ya ana-ezikwa ha ozi ọma “n’enweghị ihe mgbochi.”—Ọrụ 28:16, 30, 31.

PỌL ZIRI NDỊ UKWU NA NDỊ NTA OZI ỌMA

Otú mgbidi ogige ndị nche eze dị taa

O nwere ike ịbụ na Bọros gbara Pọl onyeozi ajụjụ ọnụ n’ogige ndị nche eze ma ọ bụ n’obí eze tupu ya akpọrọ ya gakwuru Niro. Pọl ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghara iji oge ahụ pụrụ iche “gbaara ma ndị nta ma ndị ukwu àmà.” (Ọrụ 26:19-23) N’agbanyeghị ihe Bọros kpebiri banyere Pọl, ọ tụghị Pọl mkpọrọ n’ogige Ndị Nche Eze. *

Ụlọ Pọl bi buru ibu. Ọ bụ ya mere o ji ‘kpọkọta ndị isi ndị Juu’ nakwa ọtụtụ ndị ọzọ “n’ebe obibi ya” ma zie ha niile  ozi ọma. Pọl zikwara ndị agha so ná ndị nche eze ozi ọma. Ha nụrụ ka Pọl na-ezi ndị Juu ozi ọma banyere Jizọs na Alaeze Chineke, “malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị.”—Ọrụ 28:17, 23.

Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ, ndị agha na-anụ ka ọ na-ekwu ihe a ga-ede n’akwụkwọ ozi ya

A na-agbanwe ndị agha na-eche obí eze nche kwa ụbọchị. Otú ahụ ka a na-agbanwekwa ndị na-eche Pọl nche. N’afọ abụọ ahụ a tụrụ Pọl mkpọrọ, ọtụtụ ndị agha nụrụ ka ọ na-ekwu ihe a ga-ede n’akwụkwọ ozi ndị ọ chọrọ izigara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nakwa Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, Filipaị, na Kọlọsi. Ha hụkwara mgbe o ji aka ya na-ede akwụkwọ ozi nke ọ ga-ezigara otu Onye Kraịst aha ya bụ Faịlimọn. Mgbe Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ, o nyeere Onesimọs, bụ́ ohu gbara ọsọ, aka. Pọl kwuru na ya ‘ghọrọ nna Onesimọs mgbe ya nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ.’ O mechara gwa ya ka ọ lakwuru nna ya ukwu. (Faị. 10) O doro anya na omume Pọl mesoro ndị ahụ na-eche ya nche gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. (1 Kọr. 9:22) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ jụrụ onye nche ihe a na-eji ihe agha dị iche iche eme ma si n’ihe ọ jụtara mee ihe atụ n’akwụkwọ ozi o dere.—Efe. 6:13-17.

 ‘NA-EKWU OKWU CHINEKE N’ATỤGHỊ EGWU’

Mkpọrọ a tụrụ Pọl mere ka Ndị Nche Eze niile na ndị ọzọ nụ ozi ọma. (Fil. 1:12, 13) Ndị ha na ndị bi n’ogige ndị nche eze na-emekọ ihe bụ ma eze ukwu Rom ma ndị bi n’ụlọ ya ma ndị si n’ebe dị iche iche Alaeze Ukwu Rom na-achị. Ndị bi n’ụlọ ya bụ ndị ezinụlọ ya, ndị na-ejere ya ozi, na ndị ohu ya. Ụfọdụ n’ime ha mechara ghọọ Ndị Kraịst. (Fil. 4:22) Otú Pọl si jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma mere ka obi sie ụmụnna bi na Rom ike ‘ịna-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu.’—Fil. 1:14.

N’agbanyeghị ọnọdụ anyị, anyị nwere ike ịna-ezi ndị bịara ileta anyị ozi ọma

Ozi ọma Pọl kwusara na Rom na-agbakwa anyị ume ka anyị ‘na-ekwusa okwu Chineke n’oge dị mma na n’oge nsogbu.’ (2 Tim. 4:2) E nwere ụfọdụ n’ime anyị ọrịa na-anaghị ekwe pụta èzí. Ụfọdụ nọ n’ụlọ ọgwụ. E nwekwara ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe ha kweere. N’agbanyeghị ọnọdụ anyị, anyị nwere ike ịna-ezi ndị bịara ileta anyị ozi ọma, ma ndị na-elekọta anyị ma ndị bịara ịrụrụ anyị ọrụ dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ike na-ekwusa ozi ọma mgbe niile, anyị ga-eji anya anyị hụ na o nweghị ihe ga-eme ka ‘e kee okwu Chineke agbụ.’—2 Tim. 2:8, 9.

^ para. 2 Gụọ igbe bụ́ “Ndị Nche Eze n’Oge Niro Na-achị.”

^ para. 4 Otu ìgwè ndị agha Rom na-erucha otu puku ndị agha.

^ para. 7 Gụọ igbe bụ́ “Sekstọs Afranịọs Bọros.”

^ para. 9 Ọ bụ ebe ahụ ka Taịbiriọs Siza tụrụ Herọd Agrịpa mkpọrọ n’afọ 36 ruo 37 Oge Ndị Kraịst n’ihi na Herọd kwuru na ọ bụ Kaligula kwesịrị ịbụ eze ukwu. Mgbe Kaligula ghọrọ eze ukwu, o mere Herọd eze na-achị Juda.—Ọrụ 12:1.