Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2013

Ì Ji Ihe Nketa Jehova Nyere Anyị Kpọrọ Ihe?

Ì Ji Ihe Nketa Jehova Nyere Anyị Kpọrọ Ihe?

‘Chineke chere ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.’—ỌRỤ 15:14.

1, 2. (a) Gịnị bụ “ụlọ ndò Devid,” oleekwa otú e si wughachi ya? (b) Olee ndị bụ́ ndị ohu Jehova taa?

N’AFỌ 49, òtù na-achị isi nwere nnọkọ na Jeruselem. Ná nnọkọ ahụ, Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Simiọn [ya bụ, Pita] kọrọ nke ọma otú Chineke si chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị. Nke a na okwu Ndị Amụma kwekọrọ, dị nnọọ ka e dere, sị, ‘Mgbe ihe ndị a gasịrị, m ga-alaghachi wee wughachi ụlọ ndò Devid nke dara ada; m ga-ewughachikwa mkpọmkpọ ebe ya ma wulite ya ọzọ, ka ndị fọdụrụ n’ime ndị a wee chọsie Jehova ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Jehova kwuru, onye na-eme ihe ndị a, bụ́ ihe ndị a maara site n’oge ochie.’”—Ọrụ 15:13-18.

2 Ndị a kpọrọ “Ụlọ ndò Devid” bụ ndị eze si n’ezinụlọ Devid. Ụlọ ndò ahụ dara mgbe a napụrụ Eze Zedekaya ọchịchị. (Emọs 9:11) Ma, e wughachiri “ụlọ ndò” ahụ mgbe e mere Jizọs Eze ga-achịru mgbe ebighị ebi. Ị manụ na Jizọs bụ nwa Devid. (Ezik. 21:27; Ọrụ 2:29-36) Dị ka Jems kwuru ná nzukọ ahụ dị mkpa, amụma ahụ Emọs buru na-emezu n’oge ahụ n’ihi na a na-achịkọta ndị Juu na ndị Jentaịl, bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze ya. Taa, ndị fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ na ọtụtụ nde ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ji otu obi na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Baịbụl.—Jọn 10:16.

A DỌỌRỌ NDỊ JUU N’AGHA

3, 4. Gịnị nyeere ndị Jehova aka ka ha ghara iso na-ekpe okpukpe ụgha mgbe ha nọ na Babịlọn?

3 Mgbe a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn, o doro anya na “ụlọ ndò Devid” dara. Ebe ọ bụ na okpukpe ụgha juru Babịlọn, olee otú ndị Chineke si bie iri afọ asaa n’ebe ahụ ma ghara iso na-ekpe okpukpe ụgha?  Ọ bụ otú ahụ anyị si biri n’ụwa Setan ma ka bụrụ ndị Jehova. (1 Jọn 5:19) E nwere ezigbo ihe nketa Jehova nyere anyị, nke na-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ofufe ya.

4 Taa, ihe so n’ihe nketa Jehova nyere anyị bụ Baịbụl, bụ́ Okwu Chineke. Ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn enweghị Akwụkwọ Nsọ zuru ezu, ma ha ma Iwu Mozis na Iwu Iri e dere na ya. Ha ma “abụ Zayọn,” na-echeta ọtụtụ ilu, marakwa banyere ndị ọzọ fere Jehova n’oge ochie. N’eziokwu, ndị Juu ahụ bere ákwá mgbe ha chetara Zayọn, ha echefughịkwa Jehova. (Gụọ Abụ Ọma 137:1-6.) Ihe ndị ahụ niile nyeere ha aka ịnọ Jehova nso n’agbanyeghị na okpukpe ụgha juru na Babịlọn.

ATỌ N’IME OTU AMALITEGHỊ TAA

5. Olee chi ndị dị atọ atọ ndị Babịlọn na ndị Ijipt fere n’oge ochie?

5 N’oge ochie, ndị Babịlọn fere chi ndị dị atọ atọ. Dị ka ihe atụ, chi atọ n’ime otu ndị Babịlọn na-efe bụ chi ọnwa, chi anyanwụ, na chi nwaanyị nke ọmụmụ na agha. Ndị Ijipt oge ochie fekwara chi ndị dị atọ atọ. E nwere chi nke ha kweere na ọ lụrụ chi nwaanyị, nke mụtaara ya nwa, ha atọ abụrụ atọ n’ime otu. N’agbanyeghị na chi ndị ahụ bụ atọ n’ime otu, ndị na-efe ha kwetara na ha atọ ahaghị. Chi atọ n’ime otu ọzọ ndị Ijipt fere bụ chi Osaịris, chi nwaanyị Aịsis, na nwa ha bụ́ Họrọs.

6. Gịnị bụ Atọ n’Ime Otu? Gịnị mere na ndị Jehova ekwetaghị ozizi ụgha ahụ?

6 Taa, Krisendọm nwekwara chi atọ n’ime otu nke ha. Ndị ụkọchukwu na-akụzi na Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ bụ otu Chineke. Ma ozizi ahụ na-eme ka o yie ka Jehova abụghị Ọkaakaa ebe ọ bụ na e nwere ndị ọzọ so ya bụrụ Chineke. Ndị Jehova ekwetaghị ozizi ụgha ahụ. Ha kwetara ihe Baịbụl kwuru na Diuterọnọmi 6:4. Ebe ahụ sịrị: “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.” Jizọs kwughachiri ihe ahụ. Ò nwere ezigbo Onye Kraịst na-agaghị ekweta ihe ahụ Jizọs kwuru?—Mak 12:29.

7. Gịnị mere na a gaghị eme onye kweere n’ozizi Atọ n’Ime Otu baptizim?

7 Ozizi Atọ n’Ime Otu na-emegide iwu ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị, “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Mat. 28:19) Onye chọrọ ka e mee ya baptizim ka ọ bụrụ ezigbo Onye Kraịst nakwa Onyeàmà Jehova ga-ekweta na Jehova, bụ́ Nna, bụ Ọkaakaa. Ọ ga-ekwetakwa na Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, bịara n’ụwa ma jiri ndụ ya chụọ àjà. Onye ahụ ga-ekwetakwa na mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ, ọ bụghị chi nke so n’atọ n’ime otu. (Jen. 1:2) Ọ bụrụ na mmadụ ka kweere n’Atọ n’Ime Otu, a gaghị eme ya baptizim. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ihe nketa Jehova nyere anyị emeela ka anyị ghara ikweta ozizi ụgha ahụ e ji akparị Chineke.

OTÚ MGBAASỊ SI MALITE

8. Gịnị ka ndị Babịlọn kweere banyere chi ndị ha na-efe? Gịnịkwa ka ha kweere banyere ndị mmụọ ọjọọ?

8 Okpukpe ụgha a na-ekpe na Babịlọn mere ka ndị mmadụ kwere n’ozizi ụgha dị iche iche na ọtụtụ chi ụgha. O mekwara ka ha na-efe ndị mmụọ ọjọọ, na-emekwa mgbaasị. Otu akwụkwọ nke na-akọwa ihe e kwuru na Baịbụl kwuru, sị: “Ndị na-esote chi ndị a na-efe na Babịlọn bụ ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-eme ka ndị mmadụ na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche. Ndị na-efe chi ndị ahụ na-ekpekukwa ha ka ha napụta ha n’aka ndị mmụọ ọjọọ.”

9. (a) Mgbe ndị Juu bichara na Babịlọn, olee otú ọtụtụ n’ime ha si mụta ozizi ụgha? (b) Olee otú Chineke si echebe anyị ka anyị ghara ịga ndị mmụọ ọjọọ nso?

 9 Mgbe ndị Juu bichara na Babịlọn, ọtụtụ n’ime ha mụtara ozizi ụgha. Ka oge na-aga, ha malitekwara ịmụta ozizi ndị Grik. Otu n’ime ihe ndị Grik na-akụziri ndị mmadụ bụ na ndị mmụọ ọjọọ nwere ike imere ha ihe ọma. Ma ihe nketa Jehova nyere anyị emeela ka anyị ghara ịga ndị mmụọ ọjọọ nso. Anyị ma na Chineke kwuru na itinye aka na mgbaasị adịghị mma. (Aịza. 47:1, 12-15) Anyị na-agbakwara mgbaasị ọsọ otú ahụ Chineke gwara anyị ka anyị na-eme.—Gụọ Diuterọnọmi 18:10-12; Mkpughe 21:8.

10. Gịnị ka e nwere ike ikwu banyere omume ọjọọ Babịlọn Ukwu ahụ na-eme na ozizi ụgha ọ na-ezi ndị mmadụ?

10 Ọ bụghị naanị ndị Babịlọn oge ochie mere mgbaasị, Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ okpukpe ụgha niile dị n’ụwa taa, na-emekwa mgbaasị. (Mkpu. 18:21-24) Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl kwuru, sị: “Babịlọn [Ukwu ahụ] abụghị otu obodo. Ihe e ji mara ya bụ na ọ na-ekpere arụsị.” N’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi Babịlọn Ukwu ahụ n’ihi na ọ na-eme mgbaasị, na-ekpere arụsị, na-emekwa ihe ọjọọ ndị ọzọ.—Gụọ Mkpughe 18:1-5.

11. Olee ihe nzukọ Jehova derela iji dọọ anyị aka ná ntị banyere mgbaasị?

11 Jehova kwuru, sị: “Apụghị m ịnabata ime anwansi.” (Aịza. 1:13) N’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ndị na-eme mgbaasị. Ọ bụ ya mere Ụlọ Nche (Bekee) nke Mee 1885 ji kwuo, sị: “Ozizi ahụ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ebe ọzọ abụghị ihe ọhụrụ. O so n’ihe a kụziri n’okpukpe ndị e nwere n’oge ochie, bụrụkwa ebe e si nweta akụkọ ifo niile.” O kwukwara na ozizi ụgha ahụ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịgwa ndị dị ndụ okwu ‘na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka hà bụ ndị nwụrụ anwụ. Ndị mmụọ ọjọọ esila otú ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ndị mmụọ ọjọọ chọrọ n’amaghị na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ka ha na-efe.’ Akwụkwọ nzukọ Jehova bipụtara ọtụtụ afọ gara aga dọrọ ndị Jehova aka ná ntị ka ha zere mgbaasị. Akwụkwọ ndị a na-ebipụtakwa n’oge a na-adọkwa anyị aka ná ntị otú ahụ.

NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ NA-ATA AHỤHỤ N’ỤWA ỌZỌ?

12. Gịnị ka Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ kwuo banyere ndị nwụrụ anwụ?

12 “Ndị niile mataworo eziokwu” ga-azali ajụjụ ahụ. (2 Jọn 1) Anyị kwetara ihe eze Sọlọmọn kwuru, nke bụ́: “Nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma. N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị . . . Ihe niile ruru gị aka ime, jiri ike gị dum mee ha, n’ihi na ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol, ebe ị na-aga.”—Ekli. 9:4, 5, 10.

13. Gịnị ka ndị Juu mụtara n’okpukpe ndị Grik nakwa n’omenala ha?

13 Ndị Juu ma eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ. Ma, mgbe ndị ọchịagha Alegzanda Onye Ukwu malitere ịchị Juda na Siria, ha gbalịsiri ike ka ndị ha na-achị kpewe okpukpe ndị Grik, mewekwa omenala ha. N’ihi ya, ndị Juu bịara kweta na ndị mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ nakwa na e nwere ebe a na-ata mkpụrụ obi ahụhụ. Ọ bụghị ndị Grik malitere ịkụzi na e nwere ebe a na-ata mkpụrụ obi ahụhụ. Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere ndị Babịlọn oge ochie kwuru na ha kweere na e nwere ebe chi ndị siri ike na ndị mmụọ ọjọọ na-ata ndị mmadụ  ahụhụ. N’eziokwu, ndị Babịlọn kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ.

14. Gịnị ka Job na Ebreham ma banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ?

14 N’agbanyeghị na e nwebeghị Baịbụl n’oge Job dị ndụ, ọ ma na ndị nwụrụ anwụ enweghị ihe ha ma. Ọ ghọtakwara na ọ bụrụ na ya anwụọ, na ọ ga-agụsi Jehova agụụ ike ịkpọlite ya n’ọnwụ n’ihi na Chineke hụrụ ya n’anya. (Job 14:13-15) Ebreham makwa na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Gụọ Ndị Hibru 11:17-19.) Ebe ọ bụ onye nwụrụ anwụ ka a na-akpọlite n’ọnwụ, ndị ohu Chineke ndị ahụ ekwetaghị na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. O doro anya na mmụọ nsọ Chineke nyeere Job na Ebreham aka ịghọta ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ. Ha kwekwara na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Eziokwu ndị a so n’ihe nketa Jehova nyere anyị.

ÀJÀ JIZỌS CHỤRỤ BAARA ANYỊ URU

15, 16. Olee otú Chineke si gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ?

15 Obi dị anyị ụtọ na Chineke emeela ka anyị mata eziokwu banyere otú ọ ga-esi napụta anyị ná mmehie na ọnwụ anyị ketara n’aka Adam. (Rom 5:12) Anyị ghọtara na ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa ‘abụghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bụ ka o jee ozi, nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mak 10:45) Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị ma banyere “ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.”—Rom 3:22-24.

16 Na narị afọ mbụ, ndị Juu na ndị Jentaịl kwesịrị ichegharị ná mmehie ha ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, a gaghị agbaghara ha mmehie ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. (Jọn 3:16, 36) Ọ bụrụ na mmadụ ekweghị ahapụ ozizi  ụgha, dị ka Atọ n’Ime Otu ma ọ bụkwanụ kwere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ agaghị abara ya uru. Ma anyị nwere ike irite uru na ya. Anyị ma eziokwu banyere “Ọkpara nke ịhụnanya [Chineke], onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, ya bụ, mgbaghara nke mmehie anyị.”—Kọl. 1:13, 14.

NỌSIE IKE N’OZI JEHOVA

17, 18. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmụ akụkọ banyere nzukọ Jehova, oleekwa uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị na-amụ banyere ya?

17 Ihe nketa ndị ọzọ Jehova nyere anyị bụ ihe ọ kụziiri anyị nakwa ụzọ ndị ọzọ o si na-enyere anyị aka ma na-agọzi anyị. Kemgbe ọtụtụ afọ, Akwụkwọ Mgbaafọ anyị na-agwa anyị banyere otú ndị Jehova n’ụwa niile si na-ejere ya ozi. Anyị nwere ike ịmụta banyere Ndịàmà Jehova na vidio bụ́ Faith in Action (Okwukwe Siri Ike nke Ndịàmà Jehova Nwere), Nke Mbụ na Nke Abụọ, nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ dị ka Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Ụlọ Nche na Teta! na-akọkwara anyị banyere akụkọ ndụ ụmụnna anyị anyị hụrụ n’anya.

18 Ọ bụrụ na anyị na-amụ banyere ihe ndị mere ná nzukọ Jehova, ọ ga-abara anyị uru otú ahụ o si baara ndị Izrel uru mgbe ha tụgharịrị uche n’otú Chineke si napụta ha n’Ijipt. (Ọpụ. 12:26, 27) Mgbe Mozis mere agadi, ọ gwara ndị Izrel banyere ọrụ ebube Chineke rụụrụ ha, sị: “Cheta ụbọchị ndị gara aga, chebaranụ afọ ndị gara aga site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ echiche; jụọ nna gị, ọ pụrụ ịkọrọ gị; jụọkwa ndị agadi gị, ha pụrụ ịgwa gị ya.” (Diut. 32:7) Anyị bụ ‘ndị Jehova na ìgwè atụrụ nọ n’ebe ịta nri ya.’ N’ihi ya, anyị ji ọṅụ na-ekwusa otuto ya, na-akọkwara ndị ọzọ banyere ọrụ dị ebube ọ na-arụ. (Ọma 79:13) Anyị kwesịkwara ịna-atụle akụkọ banyere nzukọ Jehova, na-amụta ihe na ya, na-echebarakwa ihe anyị ga-eme n’ọdịnihu echiche.

19. Ebe ọ bụ na Chineke enyela anyị ìhè ya, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

19 Obi dị anyị ụtọ na anyị anọghị n’ọchịchịrị. Kama ịnọ n’ọchịchịrị, Chineke enyela anyị ìhè. (Ilu 4:18, 19) N’ihi ya, ka anyị na-amụsi Okwu Chineke ike, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ banyere eziokwu dị na ya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-eṅomi Devid. O toro Onyenwe anyị Jehova n’ekpere. Ọ sịrị: “M ga-ekwu banyere ezi omume gị, bụ́ naanị ezi omume nke gị. Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata, ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube. Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́, ruo mgbe m kọọrọ ọgbọ ọzọ banyere ogwe aka gị, kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ịdị ike gị.”—Ọma 71:16-18.

20. Anyị nọsie ike n’ofufe Jehova, gịnị ka anyị ga-egosi na anyị kwetara? Olee otú obi dị gị banyere ya?

20 Anyị ji obi anyị niile na-efe Jehova n’ihi na ọ bụ ya ka anyị kwesịrị ife. Anyị makwa na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. N’eziokwu, anyị na-ekwusa eziokwu doro anya, nke bụ́ na Jehova bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa nakwa na mmadụ niile kwesịrị iji obi ha niile na-efe ya. (Mkpu. 4:11) Mmụọ nsọ Jehova na-enyere anyị aka izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma, ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi, na ịkasi ndị na-eru uju obi. (Aịza. 61:1, 2) Mbọ niile Setan na-agba imegharị ndị ohu Chineke na ụmụ mmadụ ndị ọzọ anya akụọla afọ n’ala. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe nketa Jehova nyere anyị. Anyị ekpebiekwala na anyị ga-eji obi anyị niile na-efe Chineke, na-etokwa Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova. Anyị ga na-etokwa ya ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Abụ Ọma 26:11; 86:12.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke

Jehova ji ọgbụgba ndụ isii mee ka obi sie anyị ike na Alaeze ya ga-emezu nzube ya. Olee otú ọgbụgba ndụ ndị ahụ ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike?