Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2013

Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị’

Ndị Okenye Ọgbakọ Bụ ‘Ndị Ọrụ Ibe Anyị Maka Ọṅụ Anyị’

“Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu.”—2 KỌR. 1:24.

1. Gịnị ka Pọl nụrụ banyere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, nke mere ya obi ụtọ?

N’AFỌ 55, Pọl onyeozi nọ n’obodo Troas, bụ́ ebe e nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Ma ọ nọ na-eche banyere obodo Kọrịnt. N’afọ ahụ, o wutere ya mgbe ọ nụrụ na ụmụnna ndị nọ ebe ahụ sere okwu. N’ihi ya, o degaara ha akwụkwọ ozi iji dụọ ha ọdụ ebe ọ bụ na ọ hụrụ ha n’anya otú nna si ahụ ụmụ ya. (1 Kọr. 1:11; 4:15) O bula ụzọ zigara ha Taịtọs, bụ́ onye ọrụ ibe ya, gwakwa ya ka ọ bịa Troas kọọrọ ya ihe o jetara. Pọl nọ na Troas na-eche Taịtọs, na-atụsi anya ike ịnụ otú ụmụnna nọ na Kọrịnt mere. Ma o wutere Pọl na Taịtọs abịaghị. Gịnị ka Pọl ga-eme? Ọ bara ụgbọ mmiri gawa Masedonia, bụ́ ebe ha abụọ mechara zute, obi atọọ ya ezigbo ụtọ. Taịtọs kọọrọ Pọl na ụmụnna ndị nọ na Kọrịnt nabatara ndụmọdụ o nyere ha n’akwụkwọ ozi ya, na-atụsikwa anya ike ịhụ ya. Mgbe Pọl nụrụ akụkọ ọma ahụ, ọ ‘ṅụrịkwuru ọṅụ.’—2 Kọr. 2:12, 13; 7:5-9.

2. (a) Gịnị ka Pọl degaara ndị Kọrịnt banyere okwukwe na ọṅụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 N’oge na-adịghị anya, Pọl degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi nke abụọ. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ okwukwe unu mere unu ji guzosie ike.” (2 Kọr. 1:24) Gịnị ka ihe a Pọl kwuru pụtara? Gịnịkwa ka ndị okenye ọgbakọ taa kwesịrị ịmụta na ya?

OKWUKWE ANYỊ NA ỌṄỤ ANYỊ

3. (a) Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o dere, sị: “Ọ bụ okwukwe unu mere unu ji guzosie ike”? (b) Olee otú ndị okenye si eṅomi Pọl?

3 Pọl kwuru banyere ihe abụọ dị mkpa n’ofufe anyị na-efe Chineke, ya bụ, okwukwe na ọṅụ. Cheta na o dere banyere okwukwe, sị: “Ọ bụghị na anyị bụ  ndị nwe okwukwe unu, . . . n’ihi na ọ bụ okwukwe unu mere unu ji guzosie ike.” Ihe ahụ Pọl kwuru gosiri na ọ ghọtara na ihe mere ụmụnna ndị nọ na Kọrịnt ji guzosie ike bụ okwukwe ha nwere na Chineke, ọ bụghị n’ihi Pọl ma ọ bụ mmadụ ọzọ. N’ihi ya, Pọl matara na ọ baghị uru ime ka ọ̀ bụ ya nwe okwukwe ụmụnna ya, ọ chọghịkwa ime otú ahụ. Obi siri ya ike na ha bụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, chọọkwa ịna-eme ihe ziri ezi. (2 Kọr. 2:3) Taa, ndị okenye na-eṅomi Pọl. Obi na-esi ha ike na ụmụnna ha nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ nakwa na ha bu ezi ihe n’obi na-efe ya. (2 Tesa. 3:4) Kama imere ọgbakọ iwu ndị ga-eke ha agbụ, ndị okenye na-eji ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na ihe nzukọ Jehova kwuru enyere ha aka. A sị ka e kwuwe, ọ bụghị ndị okenye nwe okwukwe ụmụnna ha.—1 Pita 5:2, 3.

4. (a) Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o dere, sị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu”? (b) Olee otú ndị okenye taa si eṅomi Pọl?

4 Pọl kwukwara, sị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu.” O kwuru ihe ahụ banyere onwe ya na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl chetaara ndị Kọrịnt banyere mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ ha na ya na-arụkọ ọrụ. O dere banyere Jizọs, sị: ‘E kwusara ya n’etiti unu site n’ọnụ anyị, ya bụ, site n’ọnụ mụ na Silvenọs na Timoti.’ (2 Kọr. 1:19) Mgbe ọ bụla Pọl kwuru banyere ‘ndị ọrụ ibe ya’ n’akwụkwọ ozi ya, ọ na-ekwu banyere ndị ha na ya rụkọrọ ọrụ, dị ka Apọlọs, Akwịla, Priska, Timoti, Taịtọs, na ndị ọzọ. (Rom 16:3, 21; 1 Kọr. 3:6-9; 2 Kọr. 8:23) N’ihi ya, mgbe Pọl kwuru, sị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu maka ọṅụ unu,” ọ na-eme ka obi sie ndị Kọrịnt ike na ya na ndị ibe ya chọrọ ime ihe niile ha nwere ike ime ka ndị niile nọ n’ọgbakọ na-enwe ọṅụ. Taa, ndị okenye ọgbakọ bukwa otu ihe ahụ n’obi. Ha chọrọ ime ihe niile ha nwere ike ime iji nyere ụmụnna ha aka ‘iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi.’—Ọma 100:2; Fil. 1:25.

5. Olee ajụjụ anyị ga-atụle, nke a jụrụ ụmụnna ụfọdụ? Gịnị ka anyị kwesịkwara ichebara echiche?

5 N’oge na-adịbeghị anya, a gbara ụfọdụ ụmụnna na-anụ ọkụ n’obi ajụjụ ọnụ. Ha si ná mba dị iche iche. Ajụjụ a jụrụ ha bụ: “Gịnị ka otu okenye kwuru ma ọ bụ mee, nke mere ka obi tọọ unu ụtọ?” Ka anyị na-atụle ihe ụmụnna ndị ahụ zara, lee ma ọ̀ ga-eme ka i cheta ihe ndị okenye kwuru ma ọ bụ mee, nke mere ka obi tọọ gị ụtọ. Ka anyị niile cheekwa banyere otú anyị nwere ike isi mee ka ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-enwe obi ụtọ. *

“KELEENỤ PESIS, ONYE ANYỊ HỤRỤ N’ANYA”

6, 7. (a) Olee otu ụzọ ndị okenye nwere ike isi ṅomie Jizọs, Pọl, na ndị ọzọ jeere Chineke ozi? (b) Gịnị mere obi ji adị ụmụnna ụtọ ma e cheta aha ha?

6 Ọtụtụ ụmụnna na-ekwu na obi na-adị ha ụtọ ma okenye gosi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. Otu ụzọ ndị okenye nwere ike isi mee ya bụ iṅomi Devid, Elaịhu, na Jizọs. (Gụọ 2 Samuel 9:6; Job 33:1; Luk 19:5.) Onye ọ bụla n’ime ndị ohu Jehova ndị ahụ kpọrọ ndị mmadụ aha ha, nke gosiri na ha hụrụ ndị ahụ n’anya. Pọl onyeozi ghọtakwara na ọ dị mkpa icheta aha Ndị Kraịst ibe ya ma na-akpọ ha ya. Mgbe ọ na-emechi akwụkwọ ozi ndị o dere, ọ kpọrọ aha ihe karịrị ụmụnna iri abụọ na ise. Otu n’ime ha bụ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Pesis. Pọl kwuru banyere ya, sị: “Keleenụ Pesis, onye anyị hụrụ n’anya.”—Rom 16:3-15.

 7 Ọ na-esiri ụfọdụ ndị okenye ike icheta aha ndị ọzọ. Ma, ọ bụrụ na ha agbalịsie ike icheta aha nwanna, ọ pụtara na ha na-agwa ya, sị, ‘Eji m gị kpọrọ ihe.’ (Ọpụ. 33:17) Obi ga-adị ụmụnna ụtọ ma ndị okenye kpọọ ha aha ha mgbe ha chọrọ ịkpọ ha ka ha zaa ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe ọzọ.—Tụlee Jọn 10:3.

“NWAANYỊ A RỤRỤ ỌTỤTỤ ỌRỤ N’IME ONYENWE ANYỊ”

8. Olee otu ụzọ dị mkpa Pọl si ṅomie Jehova na Jizọs?

8 Pọl gosikwara na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya. Otú o si mee ya bụ iji obi ya niile na-aja ha mma. Ọ bụ ụzọ ọzọ ndị okenye nwere ike isi nyere ụmụnna ha aka iji ọṅụ na-ejere Chineke ozi. N’otu akwụkwọ ozi ahụ Pọl nọ kwuo na ya chọrọ ime ka ụmụnna ya na-enwe ọṅụ, o dere, sị: “Eji m unu anya isi nke ukwuu.” (2 Kọr. 7:4) Ọ ga-abụrịrị na mma ahụ Pọl jara ụmụnna nọ na Kọrịnt mere ha obi ụtọ. Pọl kwuru ụdị ihe ahụ n’akwụkwọ ozi ndị o degaara ọgbakọ ndị ọzọ. (Rom 1:8; Fil. 1:3-5; 1 Tesa. 1:8) N’eziokwu, mgbe ọ kpọchara Pesis aha n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom, o kwuru, sị: “Nwaanyị a rụrụ ọtụtụ ọrụ n’ime Onyenwe anyị.” (Rom 16:12) Chegodị otú ihe ahụ Pọl kwuru si gbaa nwanna nwaanyị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ume! Mma Pọl jara ndị ọzọ gosiri na o ṅomiri Jehova na Jizọs.—Gụọ Mak 1:9-11; Jọn 1:47; Mkpu. 2:2, 13, 19.

9. Gịnị mere obi ji adịkwu ụmụnna ụtọ ma ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ na-aja ibe ha mma?

9 Taa, ndị okenye ma na ọ dị mkpa ka ha na-agwa ụmụnna ha na ha ji ha kpọrọ ihe. (Ilu 3:27; 15:23) Mgbe ọ bụla okenye mere otú ahụ, ọ pụtara na ọ na-agwa nwanna ya, sị: ‘M na-ahụ ihe ị na-eme. M na-echekwa banyere gị.’ Ndị okenye kwesịrị ịna-agwa ụmụnna ụdị okwu ahụ iji na-agba ha ume. Otu nwanna nwaanyị dị ihe dị ka iri afọ ise na ise kwuru ihe dị ndị ọzọ n’obi mgbe o kwuru, sị: “Ọ na-esi ike tupu a jaa m mma n’ụlọ ọrụ. Ndị mmadụ anaghị achọ ịma ma ndị ọzọ hà dị ndụ ma hà nwụrụ anwụ. Ha na-azọkwa onye ka ibe ya. N’ihi ya, okenye jaa m mma maka ihe m meere ọgbakọ, ọ na-agba m ume, meekwa ka obi dị m mma! Ọ na-eme ka m ghọta na Nna m nke eluigwe hụrụ m n’anya.” Otú ahụ ka obi dị otu nwanna nwoke nke naanị ya na-azụ ụmụ ya abụọ. N’oge na-adịbeghị anya, otu okenye ji obi ya niile jaa ya mma. Olee otú obi dị nwanna ahụ ọ jara mma? Nwanna ahụ kwuru, sị: “Ihe okenye ahụ gwara m gbara m ezigbo ume!” N’eziokwu, ọ bụrụ na okenye ejiri obi ya niile na-aja ụmụnna mma, ọ ga-agba ha ume, meekwa ka obi dịkwuo ha ụtọ. Ọ ga-emekwa ka ha nwee ike iji obi ha niile na-eje ije n’ụzọ nke ndụ ma ghara ‘ịda mbà.’—Aịza. 40:31.

“NA-AZỤ ỌGBAKỌ CHINEKE DỊ KA ATỤRỤ”

10, 11. (a) Olee otú ndị okenye nwere ike isi ṅomie Nehemaya? (b) Gịnị ga-enyere okenye aka ịgwa ndị ọ gara ileta ihe ga-abara ha uru?

10 Olee ụzọ dị ezigbo mkpa ndị okenye si egosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, na-enyekwara ha aka iji obi ụtọ na-ejere Chineke ozi? Ọ bụ ime ihe ngwa ngwa iji nyere ndị e kwesịrị ịgba ume aka. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:28.) Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme otú ahụ, ha na-eṅomi ndị ji obi ha niile jeere Chineke ozi n’oge ochie. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na mgbe Nehemaya, bụ́ onye nlekọta kwesịrị ntụkwasị obi, chọpụtara na ụfọdụ ndị Juu ibe ya adawala mbà, o biliri ozugbo, gbaa ha ume. (Nehe. 4:14) Taa, ndị okenye kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Ha ‘na-ebili,’ ya bụ, ime ihe ha kwesịrị ime iji nyere ụmụnna ha aka, mee ka  okwukwe ha sie ike. O kwe ha omume, ha na-aga n’ụlọ ụmụnna ha ma gbaa ha ume. Ihe mere ha ji aga ileta ha bụ ka ha ‘nye ha onyinye ime mmụọ,’ ya bụ, gwa ha ihe ga-eme ka okwukwe ha sie ike. (Rom 1:11) Olee ihe ga-enyere ndị okenye aka ime otú ahụ?

11 Tupu okenye agawa nleta ọzụzụ atụrụ, o kwesịrị iwepụta oge chee echiche banyere onye ahụ ọ na-aga ileta. Olee nsogbu ndị onye ahụ nwere? Gịnị ka m ga-agwa ya, nke nwere ike ịgba ya ume? Olee amaokwu Baịbụl ma ọ bụ onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl nke ga-adaba adaba? Ọ bụrụ na okenye eburu ụzọ chebara ihe ndị ahụ echiche, ọ ga-enyere ya aka ịgwa onye ahụ ihe ga-abara ya uru, kama ikwu ihe na-adịghị mkpa. Mgbe okenye gara nleta ọzụzụ atụrụ, o kwesịrị ikwe ka nwanna ọ gara ileta kwuo ihe dị ya n’obi, yanwa egee ntị nke ọma. (Jems 1:19) Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Obi na-adị m mma mgbe okenye ji obi ya niile gee m ntị.”—Luk 8:18.

Ịkwadebe nke ọma ga-enyere okenye aka inye ụmụnna ọ gara ileta “onyinye ime mmụọ”

12. Olee ndị e kwesịrị ịna-agba ume n’ọgbakọ, n’ihi gịnịkwa?

12 Ole ndị ka ndị okenye kwesịrị ịna-eleta? Pọl dụrụ ndị okenye ibe ya ọdụ ka ha ‘na-elezi ìgwè atụrụ ahụ dum anya.’ N’eziokwu, e kwesịrị ịna-agba mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ume, ma ndị nkwusa ma ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị ji obi ha niile na-ejere Chineke ozi kemgbe ọtụtụ afọ. Gịnị mere ndị okenye ji kwesị ịna-agba ha ume? Ọ bụ n’ihi na mgbe ụfọdụ, nsogbu ụwa ọjọọ a na-akpakwa ụmụnna ndị ahụ okwukwe ha siri ike aka ọjọọ. Iji ghọta ihe mere o ji dị mkpa ka a na-agba ụmụnna ndị dị otú ahụ ume, ka anyị tụlee otu ihe mere Eze Devid.

“ABISHAỊ . . . BỊARA NYERE YA AKA”

13. (a) Olee mgbe Ishbaị-binọb chọrọ igbu Devid? (b) Olee otú Abishaị si gbatara Devid ọsọ enyemaka?

13 Mgbe Devid bụ nwa okoro, e tere ya mmanụ ịbụ eze. N’oge na-adịghị anya, o busoro Golayat, bụ́ dike si n’agbụrụ ndị Refeyim, agha. Devid ji obi ike gbuo  nwoke ahụ gbara ajọ dimkpa. (1 Sam. 17:4, 48-51; 1 Ihe 20:5, 8) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ka ndị Izrel na ndị Filistia na-alụ agha, Devid lụsokwara nwoke ọzọ gbara ajọ dimkpa ọgụ. Aha ya bụ Ishbaị-binọb, onye sikwa n’agbụrụ ndị Refeyim. (2 Sam. 21:16) Ma, ọ fọrọ obere ka nwoke ahụ gbuo Devid. Maka gịnị? Ọ bụghị n’ihi na obi akaghịzi Devid, kama ọ bụ n’ihi na ike adịghịzi ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ike wee gwụ Devid.” Ozugbo Ishbaị-binọb matara na ike adịghịzi Devid, ọ ‘chọrọ igbu ya.’ Ma, tupu dike ahụ amaa Devid ube, ‘Abishaị nwa Zeruya bịara ozugbo nyere Devid aka wee gbuo onye Filistia ahụ.’ (2 Sam. 21:15-17) Ọ fọrọ obere ka Devid nwụọ! O doro anya na obi dị ya ụtọ na Abishaị legidere ya anya ma gbatara ya ọsọ enyemaka mgbe a chọrọ igbu ya! Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ahụ?

14. (a) Olee otú anyị ga-esi nwee ike imeri nsogbu ndị tara akpụ otú ahụ Devid meriri Golayat? (b) Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị nwee ume na ọṅụ? Nye ihe atụ.

14 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-eje ozi anyị n’ụwa niile n’agbanyeghị na Setan na ndị òtù ya na-eme ka o siere anyị ike. Nsogbu ndị tara ezigbo akpụ abịarala ụfọdụ n’ime anyị, anyị emerie ha niile otú ahụ Devid meriri Golayat, n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile. Ma, mgbe ụfọdụ, ọgụ anyị na nsogbu ụwa Setan na-alụ na-eme ka ike na-agwụ anyị, meekwa ka anyị dawa mbà. Mgbe ike gwụrụ anyị, nsogbu ndị anyị gaara edili nweziri ike ime ka anyị daa mbà. N’ụdị oge ahụ, ọ bụrụ na okenye agbaa anyị ume, o nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị nwee ume na ọṅụ. E sila otú ahụ nyere ọtụtụ ụmụnna aka. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ nke dị ihe dị ka iri afọ isii na ise kwuru, sị: “E nwere mgbe ahụ́ na-adịghị m, ike ịga ozi ọma adịghịkwa m. Otu okenye hụrụ na ike gwụrụ m ma bịakwute m. O ji ihe a kọrọ na Baịbụl gbaa m ume. Emere m ihe ọ tụụrụ m aro ya, ya abaara m uru.” O kwukwara, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na anya ruru okenye ahụ ala ịmata na ike gwụrụ m ma nyere m aka!” N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị okenye hụrụ anyị n’anya, bụ́ ndị ‘na-abịa enyere anyị aka’ otú ahụ Abishaị nyeere Devid aka.

HA MA NA PỌL HỤRỤ HA N’ANYA

15, 16. (a) Gịnị mere ụmụnna ndị ọzọ ji jiri obi ha niile hụ Pọl n’anya? (b) Gịnị mere anyị ji hụ ndị okenye ọgbakọ n’anya?

15 Ọrụ onye ọzụzụ atụrụ adịghị mfe. Mgbe ụfọdụ, ndị okenye na-amụ anya abalị n’ihi na ihe banyere ìgwè atụrụ Chineke na-emetụ ha n’obi. Ha nwekwara ike ibili n’ime abalị kpewe ekpere banyere ụmụnna ha ma ọ bụ nyewere ha aka. (2 Kọr. 11:27, 28) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị okenye na-eji ọṅụ arụ ọrụ ha otú ahụ Pọl mere. O degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ, sị: “Mụ onwe m ga-eji oké ọṅụ mefuo ihe niile, kwekwa ka e jiri m mee ihe n’ụzọ zuru ezu n’ihi mkpụrụ obi unu.” (2 Kọr. 12:15) N’eziokwu, Pọl ji obi ya niile na-eme ka okwukwe ụmụnna ya sie ike n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 2:4; Fil. 2:17; 1 Tesa. 2:8) Ka a sịkwa ihe mere ụmụnna ji jiri obi ha niile hụ Pọl n’anya!—Ọrụ 20:31-38.

16 Anyị bụ́ ndị ohu Chineke taa hụkwara ndị okenye ọgbakọ n’anya, na-ekpekwa ekpere ma na-ekele Jehova maka inye anyị ndị okenye na-elekọta anyị. Otú ha si egosi na ihe banyere anyị na-emetụ ha n’obi na-eme anyị obi ụtọ. Nleta ha na-eleta anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Anyị na-ekelekwa Jehova na ndị okenye na-abịa enyere anyị aka mgbe ọ bụla ọ dị anyị ka nsogbu bịaara anyị ọ̀ karịala. N’eziokwu, ụdị ndị okenye ahụ bụ ‘ndị ọrụ ibe anyị maka ọṅụ anyị.’

^ para. 5 A jụkwara ụmụnna ndị ahụ, sị, “Olee àgwà kacha mma ị chọrọ ka okenye nwee?” Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ha chọrọ ka okenye dị obiọma, na-enyekwa mmadụ ihu. A ga-atụle àgwà ahụ n’isiokwu a ga-ebipụta n’ọdịnihu.