Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2013

Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!

Nwee Obi Ike, Jehova Nọnyeere Gị!

“Nwee obi ike, dịkwa ike. . . . Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.”—JỌSH. 1:9.

1, 2. (a) Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị? (b) Gịnị bụ okwukwe? Nye ihe atụ.

OZI Jehova na-eme ka anyị nwee ọṅụ. Ma, ihe isi ike ndị na-abịara ndị ọzọ na-abịakwara anyị, anyị nwekwara ike ‘ịta ahụhụ n’ihi ezi omume.’ (1 Pita 3:14; 5:8, 9; 1 Kọr. 10:13) Anyị kwesịrị inwe okwukwe na obi ike iji die ọnwụnwa ndị ahụ nke ọma.

2 Gịnị bụ okwukwe? Pọl onyeozi dere, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.” (Hib. 11:1) Okwu Grik e si sụgharịta “atụmanya e ji n’aka” bụ okwu a na-edekarị n’akwụkwọ achụmnta ego. Ọ na-egosikwa na obi siri mmadụ ike na ọ ga-emecha nweta ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. N’otu aka ahụ, ebe ọ bụ na anyị nwere okwukwe na Chineke na-emezu nkwa ya mgbe niile, obi siri anyị ike na anyị ga-enweta ihe anyị na-atụ anya ya. Okwukwe anyị nwere na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-ahụ mgbe nkwa ndị e kwere na Baịbụl ga-emezu, nakwa na ihe niile Chineke gwara anyị bụ eziokwu, ma ndị anyị “na-adịghị ahụ anya.”

3, 4. (a) Gịnị bụ obi ike? (b) Olee otu ụzọ anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sie ike, anyị enwekwuo obi ike?

3 Obi ike bụ “ịkata obi kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’atụghị egwu mgbe ihe siri ike ma ọ bụ mgbe nsogbu bịara.” Ọ bụrụ na anyị nwere obi ike, obi ga-aka anyị, anyị agaghị na-ama jijiji ma ọ bụ na-atụ ụjọ. Anyị ga-enwekwa anya ike.—Mak 6:49, 50; 2 Tim. 1:7.

4 Anyị niile kwesịrị inwe okwukwe na obi ike. Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma anyị chọpụta na anyị kwesịrị inwekwu okwukwe na obi ike? Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ ndị nwere okwukwe na obi ike, bụ́ ndị anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha. N’ihi ya, otu ụzọ anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sie ike, anyị enwekwuo obi ike bụ ịtụle ihe ha mere.

 JEHOVA NỌNYEERE JỌSHỤA

5. Iji bụrụ ezigbo onye ndú, gịnị ka Jọshụa kwesịrị inwe?

5 Ka anyị tụlee ihe mere ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. N’oge ahụ, afọ iri anọ agaala kemgbe Jehova napụtara ọtụtụ nde ndị Izrel n’aka ndị Ijipt. Onye amụma bụ́ Mozis bụ onye ndú ha. Ọ dị otu narị afọ na iri abụọ mgbe ọ nọ n’elu Ugwu Nibo hụ Ala Nkwa ahụ. Ọ nwụrụ n’elu ugwu ahụ. Onye nọchiri ya bụ Jọshụa, bụ́ nwoke “jupụtara na mmụọ amamihe.” (Diut. 34:1-9) Ndị Izrel ejikerela mgbe ahụ iweghara ala Kenan. Ihe ga-eme ka Jọshụa bụrụ ezigbo onye ndú bụ inwe amamihe si n’aka Chineke. O kwesịkwara inwe okwukwe na Jehova, nwee obi ike ma dị ike.—Diut. 31:22, 23.

6. (a) Dị ka e kwuru na Jọshụa 23:6, gịnị ka obi ike ga-enyere anyị aka ime? (b) Gịnị ka anyị mụtara n’Ọrụ Ndịozi 4:18-20 nakwa n’Ọrụ Ndịozi 5:29?

6 Ọ ga-abụrịrị na amamihe, obi ike, na okwukwe Jọshụa nwere mere ka obi sie ndị Izrel ike n’afọ ndị ahụ ha lụrụ agha iji nweta ala Kenan. Ha kwesịrị inwe obi ike, ọ bụghị naanị iji lụọ agha, kamakwa iji na-erubere Chineke isi. Mgbe ọ fọrọ obere ka Jọshụa nwụọ, ọ gwara ha, sị: ‘Nweenụ obi ike idebe na ime ihe niile e dere n’akwụkwọ iwu Mozis, site n’ahapụghị ha gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.’ (Jọsh. 23:6) Anyịnwa kwesịkwara inwe obi ike iji na-erubere Jehova isi mgbe niile, nke ka nke, mgbe ndị mmadụ gwara anyị mee ihe na-abụghị uche Chineke. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:18-20; 5:29.) Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere ma tụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyere anyị aka inwe ụdị obi ike ahụ.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA ỤZỌ ANYỊ GAA NKE ỌMA

7. Gịnị ka Jọshụa kwesịrị ime iji nwee obi ike, ihe agakwaara ya nke ọma?

7 Anyị kwesịrị ịna-amụ Baịbụl ma na-eme ihe anyị mụtara iji nwee obi ike ime uche Chineke. Ọ bụ ihe Chineke gwara Jọshụa mee mgbe ọ nọchiri Mozis. Chineke gwara ya, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu ka i wee lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị. . . . Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị, ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.” (Jọsh. 1:7, 8) Jọshụa mere ihe ahụ Chineke gwara ya. N’ihi ya, ‘ụzọ ya gara nke ọma.’ Anyị meekwa otú ahụ, anyị ga-enwekwu obi ike, ihe agakwaara anyị nke ọma n’ozi Chineke.

Isiokwu afọ 2013 bụ: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’—Jọshụa 1:9

8. Olee amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu afọ 2013? Oleekwa otú i chere ihe e kwuru n’amaokwu ahụ ga-esi nyere gị aka?

8 Ọ ga-abụrịrị na obi sikwuru Jọshụa ike mgbe Jehova gwara ya, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.” (Jọsh. 1:9) Jehova nọnyekwaara anyị. N’ihi ya, ka anyị ghara ‘ịma jijiji ma ọ bụ tụọ ụjọ’ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara anyị. Cheta na Jehova gwara Jọshụa, sị: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’ A họrọla ihe ahụ e kwuru na Jọshụa 1:9 ka ọ bụrụ isiokwu afọ 2013. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike n’ọnwa ndị na-abịa abịa, otú ahụ okwu na omume ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na-agba anyị ume, bụ́ ndị nwere okwukwe na obi ike.

 HA JI OBI IKE KPEBIE IME UCHE CHINEKE

9. Olee otú Rehab si gosi na ya nwere okwukwe na obi ike?

9 Mgbe Jọshụa zipụrụ mmadụ abụọ ka ha gaa ledo ala Kenan, Rehab bụ́ nwaanyị akwụna zoro ha ma mee ka ndị iro ha chụrụ ha gawa n’ebe ọzọ. N’ihi okwukwe ya na obi ike ya, e chebere ya na ndị ezinụlọ ha mgbe ndị Izrel bibiri obodo Jeriko. (Hib. 11:30, 31; Jems 2:25) N’eziokwu, Rehab kwụsịrị ibi ndụ rụrụ arụ ka o nwee ike ime ihe dị Jehova mma. Ụfọdụ ndị ghọrọ Ndị Kraịst egosila na ha nwere okwukwe na obi ike ma kata obi gbanwee otú ha si ebi ndụ iji mee ihe dị Chineke mma.

10. Gịnị mere Rut tupu o kpebie ife ezi Chineke? Olee otú Jehova si gọzie ya?

10 Mgbe Jọshụa nwụchara, Rut, bụ́ nwaanyị Moab, ji obi ike kpebie ife ezi Chineke. Ebe di ya nwụrụ anwụ bụ onye Izrel, ọ ga-abụ na ọ matụ Jehova. Neomi, bụ́ nne di ya, bibu na Moab. Ma mgbe di ya na ụmụ ya nwụrụ, o kpebiri ịlaghachi Betlehem, bụ́ obodo ndị Izrel. Mgbe ha nọ n’ụzọ, Neomi gwara Rut ka ọ lakwuru ndị obodo ha bụ́ ndị Moab. Ma Rut zara ya, sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị . . . Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ihe ahụ Rut kwuru si ya n’obi. Boaz, bụ́ onye ikwu Neomi ha, mechara lụọ Rut, ya amụọrọ ya nwa nwoke, nke mere ka ọ bụrụ nne ochie Devid na Jizọs. N’eziokwu, Jehova na-agọzi ndị nwere okwukwe na obi ike.—Rut 2:12; 4:17-22; Mat. 1:1-6.

ỌTỤTỤ NDỊ MERE UCHE CHINEKE N’AGBANYEGHỊ NA O NWERE IKE IME KA E GBUO HA!

11. Olee otú Jehoyada na Jehoshiba si gosi na ha nwere obi ike, oleekwa uru ihe ha mere bara?

11 Okwukwe anyị na obi ike anyị na-esikwu ike mgbe anyị hụrụ na Chineke na-anọnyere ndị kpebisiri ike ime uche ya na ichebe ụmụnna ha. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jehoyada na nwunye ya bụ́ Jehoshiba. Mgbe Eze Ehazaya nwụchara, nne ya bụ́ Atalaya gburu ndị niile bụ́ ụmụ eze ma e wezụga Jehoash ma mee onwe ya eze nwaanyị. Jehoyada na Jehoshiba zọpụtara Jehoash bụ́ nwa Ehazaya n’agbanyeghị na Atalaya nwere ike igbu ha ma ọ mata ihe ha mere. Ha zoro ya ruo afọ isii. N’afọ nke asaa, Jehoyada mere Jehoash eze ma nye iwu ka e gbuo Atalaya. (2 Eze 11:1-16) Jehoyada mechara nyere Eze Jehoash aka ịrụzi ụlọ nsọ Jehova. Jehoyada nwụrụ mgbe ọ gbara otu narị afọ na iri atọ, e lie ya n’ebe a na-eli ndị eze “n’ihi na o mere ihe ọma n’Izrel, meekwa ihe ọma n’ihe banyere ezi Chineke na ụlọ Ya.” (2 Ihe 24:15, 16) Ihe Jehoyada na nwunye ya ji obi ike mee mere ka e chebe ezinụlọ Devid, bụ́ ebe e si mụta Mesaya.

12. Gịnị ka Ibed-melek ji obi ike mee?

12 Ibed-melek, bụ́ ọnaozi n’ụlọ Eze Zedekaya, nyeere Jeremaya aka n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ya ma a mata. Ndị isi Juda gwara eze na Jeremaya na-akụda ndị agha na ndị ọzọ aka. Eze gwara ha ka ha mee Jeremaya ihe masịrị ha. N’ihi ya, ha tụbara ya n’olulu apịtị juru ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. (Jere. 38:4-6) Ibed-melek gara rịọ Eze Zedekaya ka o nyere Jeremaya aka. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị kpọrọ Jeremaya asị, ihe ahụ Ibed-melek mere nwere ike ime ka e gbuo ya. Zedekaya kwetara inyere Jeremaya aka. N’ihi ya, o dunyere iri ndị ikom atọ ka ha soro Ibed-melek gaa kpọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Chineke si n’ọnụ Jeremaya mesie Ibed-melek obi ike na a gaghị egbu ya mgbe ndị Babịlọn ga-ebibi Jeruselem. (Jere. 39:15-18) Chineke  na-agọzi ndị ji obi ike mee uche ya.

13. Gịnị ka ndị Hibru atọ ahụ ji obi ike mee, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ha?

 13 Ihe dị ka narị afọ isii tupu Kraịst, Chineke mere ka o doo ndị Hibru atọ bụ́ ndị ohu ya anya na ya na-agọzi ndị nwere okwukwe na obi ike. Eze Nebukadneza kpọkọtara ndị isi niile ma nye ha iwu ka ha kpọọrọ nnukwu ihe oyiyi ọlaedo isiala. Onye ọ bụla na-ekweghị akpọrọ ihe ahụ isiala, a ga-atụba ya n’oké ọkụ. Ndị Hibru atọ ahụ weturu obi gwa Nebukadneza, sị: “Chineke anyị bụ́ onye anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị. Ọ ga-anapụta anyị n’oké ọkụ ahụ a kwanyere, napụtakwa anyị n’aka gị, eze. Ọ bụrụgodị na ọ gaghị anapụta anyị, mara amara, eze, na anyị agaghị efe chi gị dị iche iche, anyị agaghịkwa akpọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ i guzobere isiala.” (Dan. 3:16-18) Daniel 3:19-30 kọrọ otú Jehova si zọpụta ndị Hibru atọ ahụ. E nwere ike egwu a ga-eyi anyị agaghị abụ na a ga-atụba anyị n’oké ọkụ, ma ụdị ọnwụnwa ndị ọzọ na-abịara anyị. Obi kwesịkwara isi anyị ike na Chineke ga-agọzi anyị ma anyị nwee okwukwe na obi ike.

14. Dị ka a kọrọ na Daniel isi isii, olee otú Daniel si gosi na ya nwere obi ike, gịnịkwa mechara mee?

14 Ndị iro Daniel mere ka Eze Darayọs mee iwu ga-emegide Daniel. Ha gwara eze, sị: “Onye ọ bụla nke rịọrọ chi ọ bụla ma ọ bụ mmadụ ọ bụla ọzọ arịrịọ n’ime ụbọchị iri atọ ma e wezụga gị, eze, a ga-atụba ya n’olulu ọdụm.” Daniel nwere okwukwe na obi ike. Ozugbo ọ matara ihe eze nyere n’iwu, ‘ọ banyere n’ụlọ ya, e meghekwaara ya windo ọnụ ụlọ ya nke dị n’elu emeghe bụ́ nke chere ihu na Jeruselem, ọ na-egbukwa ikpere n’ala kpee ekpere ma too Chineke ya ugboro atọ n’ụbọchị, dị ka ọ na-eme mgbe niile tupu oge ahụ.’ (Dan. 6:6-10) Daniel atụghị ụjọ. A tụbara ya n’olulu ọdụm, ma Jehova napụtara ya.—Dan. 6:16-23.

15. (a) Olee otú Akwịla na Prisila si gosi na ha nwere okwukwe na obi ike? (b) Gịnị ka ihe ahụ Jizọs kwuru na Jọn 13:34 pụtara, oleekwa otú ọtụtụ Ndị Kraịst sirila gosi na ha nwere ụdị ịhụnanya ahụ?

15 Baịbụl kwuru na Akwịla na Prisila ‘tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ n’ihi mkpụrụ obi Pọl,’ ma o kwughị otú ha si mee ya. (Ọrụ 18:2; Rom 16:3, 4) Ha ji obi ike mee ihe Jizọs kwuru, nke bụ́: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) Iwu Mozis kwuru na mmadụ kwesịrị ịhụ mmadụ ibe ya n’anya dị ka onwe ya. (Lev. 19:18) Gịnịzi mere iwu ahụ Jizọs nyere ji bụrụ iwu “ọhụrụ”? Ọ bụ n’ihi na iwu ahụ kwuru na otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ịdị njikere  ịnwụ n’ihi ha, otú ahụ Jizọs mere. Ọtụtụ Ndị Kraịst egosila na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya. Otú ha si mee ya bụ iji obi ike ‘tinye ndụ ha n’ize ndụ’ ka ndị iro ghara imerụ ụmụnna ha ahụ́ ma ọ bụ gbuo ha.—Gụọ 1 Jọn 3:16.

Ndị Kraịst oge mbụ ekweghị efe eze ukwu ndị Rom

16, 17. Olee ọnwụnwa bịaara Ndị Kraịst oge mbụ, oleekwa otú o si yie ihe e mere ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge anyị a?

16 Dị ka Jizọs, Ndị Kraịst oge mbụ ji obi ike fee naanị Jehova. (Mat. 4:8-10) Ha ekweghị esurere eze ndị Rom ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Lee foto dị na peeji nke 10.) Daniel P. Mannix dere, sị: “Ọtụtụ Ndị Kraịst ekweghị eme ya n’agbanyeghị na a rụrụ ebe ịchụàjà n’ámá egwuregwu ahụ, bụ́ ebe ha nwere ike isi were ọkụ ha ga-eji suree ya. Naanị ihe onye mkpọrọ ga-eme bụ ịchịrị ihe nsure ọkụ ma wụnye ya n’ọkụ ahụ, e nye ya akwụkwọ gosiri na o nwerela onwe ya. Ha na-agwa ya na ime ihe ahụ apụtaghị na ọ na-efe eze ukwu ahụ ofufe, kama na ọ bụ iji gosi na o kwetara na eze ukwu ndị Rom bụ chi. N’agbanyeghị nke ahụ, naanị Ndị Kraịst ole na ole kwetara ime ihe ahụ ka ha nwee ike inwere onwe ha.”—Akwụkwọ bụ́ Those About to Die.

17 E tinyere ọtụtụ Ndị Kraịst n’ogige ịta ahụhụ n’oge ndị Nazi na-achị. A gwara ha ugboro ugboro ihe ha ga-eme ka e nwee ike ịhapụ ha, ka a gharakwa igbu ha. Ihe ha ga-eme bụ ịbịanye aka n’akwụkwọ gosiri na ha ajụla Jehova. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ. Mgbe a na-alụ agha na Rụwanda, ụmụnna bụ́ ndị Tutsi chebere ụmụnna bụ́ ndị Hutu n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka e gbuo hanwa. Ụmụnna ndị Hutu mekwara otú ahụ. Ihe ahụ ndị Chineke mere gosiri na ha nwere obi ike na okwukwe.

CHETA NA JEHOVA NỌNYEERE ANYỊ!

18, 19. Olee ndị nwere okwukwe na obi ike a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma?

18 Ihe ùgwù anyị nwere ugbu a bụ iso na-arụ ọrụ kachanụ Chineke nyetụrụla ndị ohu ya n’ụwa, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze ya na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jizọs gosiri otú anyị ga-esi arụ ya! “Ọ nọ na-aga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’obodo nta ruo n’obodo nta, na-ekwusa ma na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke.” (Luk 8:1) Anyị kwesịrị iṅomi ya, nwee okwukwe na obi ike iji na-ekwusa ozi ọma ahụ. N’ike Chineke, anyị nwere ike inwe obi ike dị ka Noa, bụ́ onye na-atụghị ụjọ ma ‘kwusaa ezi omume n’ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke’ mgbe ọ fọrọ obere ka e jiri iju mmiri bibie ha.—2 Pita 2:4, 5.

19 Ekpere na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Mgbe a na-akpagbu ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o mee ka ha nwee ike ‘ịna-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.’ Chineke zara ekpere ha. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 4:29-31.) Ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, rịọ Jehova ka o nyekwuo gị okwukwe na obi ike. Ọ ga-aza ekpere gị.—Gụọ Abụ Ọma 66:19, 20. *

20. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, olee ndị nọnyeere anyị?

20 Ọ dịghị mfe ịna-eme uche Chineke n’ụwa ochie a nsogbu juru. Ma, Chineke ahapụghị anyị. Ọ nọnyeere anyị. Ọkpara ya, bụ́ Isi nke ọgbakọ, nọnyekwaara anyị. Anyị nwekwara ụmụnna karịrị nde asaa n’ụwa niile. Ka anyị niile na-egosi mgbe niile na anyị nwere okwukwe ma na-ekwusa ozi ọma, burukwa isiokwu afọ 2013 n’uche, ya bụ: ‘Nwee obi ike, dịkwa ike. Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị.’—Jọsh. 1:9.

^ para. 19 Ị chọọ ịgụ banyere ndị ọzọ nwere obi ike, gụọ isiokwu bụ́ “Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike nke Ukwuu,” n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2012.