Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) JENỤWARỊ 2013

Ije Ozi n’Akwaghị Mmakwaara

Ije Ozi n’Akwaghị Mmakwaara

“Ana m echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe m inweta ihe ndị dị n’ihu.”—FIL. 3:13.

1-3. (a) Olee otú obi na-adị ụfọdụ ndị ma ha cheta ihe ha mere ma ọ bụ ihe ha gaara eme? (b) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Pọl mere banyere ijere Chineke ozi n’akwaghị ụta?

Ọ BỤRỤ na ihe agaaraghị ndị mmadụ otú ha tụrụ anya ya, o nwere ike iwute ha, ha akwawa mmakwaara. Ha nwere ike ikwu, sị: “A sị na m ma, m garaghị eme ihe ahụ m mere.” Anyị niile nwere ike icheta ihe anyị na-agaraghị eme otú anyị si mee ya. Ma, ụfọdụ ndị na-akwa ụta mgbe niile, ma ọ bụdị na-enwe mwute n’ihi ihe ha mere ma ọ bụ ihe ha na-emeghị. È nwere ihe ndị ị na-akwara mmakwaara?

2 Ụfọdụ ndị nwere ihe ndị ha na-emetaghị ma ọ bụdị mmehie ndị dị oké njọ ha mere. E nwekwara ndị ihe ha mere na-adịchaghị njọ, ma obi esichaghị ha ike ma ihe ha mere ọ̀ bụ ihe ha kwesịrị ime. Ụfọdụ ndị akwụsịla iche banyere ihe ndị ha mere n’oge gara aga ma na-eme ihe ndị ha kwesịrị ime. E nwere ndị obi na-ama ikpe n’ihi ihe ndị ha mere n’oge gara aga, ha ana-eche, sị: ‘A sị na m ma, agaraghị m eme ya.’ (Ọma 51:3) Olee otú obi na-adị gịnwa? Ị̀ chọrọ iji obi gị niile na-ejere Chineke ozi ma ghara ịna-echegbu onwe gị banyere ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga? È nwere onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, bụ́ onye anyị nwere ike ịmụta otú o si mee ya? Ee, e nwere. Ọ bụ Pọl onyeozi.

3 N’oge Pọl, e nwere ọtụtụ ihe o mejọrọ, nweekwa ihe ọma ndị o mere. Ihe ndị o mejọrọ tupu ya aghọọ Onye Kraịst wutere ya, ma ọ mụtakwara otú ọ ga-esi jiri obi ya niile na-ejere Chineke ozi. Ka anyị tụlee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ya banyere otú anyị ga-esi na-efe Chineke n’akwaghị ụta.

IHE PỌL MEJỌRỌ TUPU YA AGHỌỌ ONYE KRAỊST

4. Gịnị ka Pọl onyeozi mere, mechaa kwaa mmakwaara?

4 Mgbe Pọl bụ nwa okorobịa, ọ bụ onye Farisii, meekwa ihe ndị o mechara kwaara mmakwaara. Dị ka ihe  atụ, ọ bụ ya bu mmegide e megidere ndị na-eso ụzọ Jizọs n’isi. Baịbụl kwuru na ozugbo e gbuchara Stivin n’ihi okwukwe ya, “Sọl [bụ́ onye e mechara kpọwa Pọl] . . . malitere imeso ọgbakọ ahụ n’ụzọ jọgburu onwe ya. Ọ na-awakwasị ụlọ niile n’otu n’otu, na-adọkpụpụta ma ndị ikom ma ndị inyom, ọ na-enyefekwa ha ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.” (Ọrụ 8:3) Otu ọkà mmụta Baịbụl, bụ́ Albert Barnes, kwuru na okwu Grik e si sụgharịta ‘imeso n’ụzọ jọgburu onwe ya’ pụtara na Sọl ji obi ọjọọ na-alụso ọgbakọ Ndị Kraịst ọgụ “dị ka anụ ọhịa.” Ebe Sọl bụ onye Juu na-anụ ọkụ n’obi, obi ya niile bụ na Chineke chọrọ ka ya kpochapụ ọgbakọ ndị Kraịst. N’ihi ya, o ji obi ọjọọ na-emesi Ndị Kraịst ike, ‘na-eyi ha egwu, na-achọsi ike igbu ma ndị ikom ma ndị inyom,’ na-agbalịsikwa ike igbukpọ ha.—Ọrụ 9:1, 2; 22:4. *

5. Kọwaa otú Sọl si kwụsị ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs ma kwusawa banyere Kraịst.

5 Sọl bu n’obi ịga Damaskọs, dọkpụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụlọ ha, kpụrụ ha gaa Jeruselem ka ụlọikpe Sanhedrin taa ha ahụhụ. Ma o mezughị ihe o bu n’obi n’ihi na ọ na-emegide Jizọs, bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 5:23) Mgbe Sọl nọ n’ụzọ Damaskọs, ya na Jizọs zutere, ìhè si n’eluigwe emee ka Sọl kpuo ìsì. Jizọs gwara Sọl ka ọ gaa Damaskọs chere ihe a ga-agwa ya mee. Ị manụ ihe mechara mee.—Ọrụ 9:3-22.

6, 7. Gịnị gosiri na Pọl ghọtara na o mere ihe jọgburu onwe ya n’oge gara aga?

6 Ozugbo Pọl ghọrọ Onye Kraịst, ọ gbanwere otú o si ele ihe anya. Kama ịna-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ malitere ikwusasi ike banyere Kraịst. N’agbanyeghị nke ahụ, o mechara dee banyere onwe ya, sị: “N’ezie, unu nụrụ banyere omume m n’oge gara aga n’okpukpe ndị Juu, na m nọgidere na-akpagbu ọgbakọ Chineke ma na-agbalị ibibi ya, ọbụna gabiga ókè.” (Gal. 1:13) Mgbe o degaara ndị Kọrịnt, ndị Filipaị, nakwa Timoti akwụkwọ, o mechara kwuo banyere ihe ọjọọ ndị o mere n’oge gara aga. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:9; Fil. 3:6; 1 Tim. 1:13) Pọl ejighị ihe ndị ahụ o mere na-etu ọnụ, ma o meghị ka à ga-asị na o meghị ihe ndị ahụ. Ọ ghọtara na o mere ihe jọgburu onwe ya.—Ọrụ 26:9-11.

7 Otu ọkà mmụta Baịbụl, bụ́ Frederic W. Farrar, dere banyere ihe Sọl mere “mgbe a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst.” Farrar kwuru na naanị ihe ga-eme ka anyị ghọta otú ihe ahụ Pọl mere si na-ewute ya bụ iche echiche banyere ụdị arụrụala ọ rụsara Ndị Kraịst nakwa otú ndị ọzọ nwere ike isi na-akatọ ya. O nwere ike ịbụ na mgbe ụfọdụ, ụmụnna nọ n’ọgbakọ Pọl na-eleta, bụ́ ndị na-ahụbeghị ya mbụ, na-asị ya, ‘Ya bụ na ọ bụ gị bụ Pọl ahụ nọ na-emesi anyị ike!’—Ọrụ 9:21.

8. Olee otú obi dị Pọl n’ihi ebere Jehova na Jizọs meere ya nakwa otú ha si hụ ya n’anya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Pọl mere?

8 Ma, Pọl ghọtara na ọ bụ naanị obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ mere ka ya nwee ike ịna-eje ozi ya. N’akwụkwọ ozi iri na anọ o dere, o kwuru banyere obiọma Chineke ihe dị ka ugboro iri itoolu, nke karịrị ugboro ole ndị ọzọ so dee Baịbụl kwuru banyere ya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:10.) Obi dị Pọl ezigbo ụtọ na Chineke meere ya ebere. Ọ chọsikwara ike igosi na ebere ahụ Chineke meere ya abụghị ihe efu. Ọ bụ ya mere o ji ‘dọgbuo onwe ya n’ọrụ karịa’ ndịozi ndị ọzọ niile. Ihe ahụ o mere mere ka o doo anya na anyị kwupụta mmehie anyị ma kwụsị ihe ọjọọ anyị na-eme, Jehova ga-ehichapụ mmehie anyị n’ihi àjà mgbapụta ahụ Jizọs chụrụ, ọ bụrụgodị mmehie ndị dị oké njọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na i chere na ihe ọjọọ i mere karịrị ihe a ga-eji àjà ahụ Kraịst chụrụ gbaghara, cheta Pọl onyeozi! (Gụọ 1 Timoti 1:15, 16.)  Ọ bụ eziokwu na Pọl jibu obi ọjọọ na-akpagbu Kraịst, o dere, sị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Gal. 2:20; Ọrụ 9:5) N’eziokwu, Pọl mụtara otú ọ ga-esi jiri obi ya niile na-ejere Chineke ozi n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ n’oge gara aga, ka ọ ghara imekwu ihe ọ ga-akwara mmakwaara. Ị̀ mụtala ime otú ahụ?

Pọl mụtara otú ọ ga-esi jeere Chineke ozi n’akwaghị mmakwaara

È NWERE IHE NDỊ Ị NA-AKWARA MMAKWAARA?

9, 10. (a) Gịnị mere ụfọdụ ndị na-efe Jehova ji akwa mmakwaara? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị mgbe niile banyere ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga?

9 È nwere ihe ndị i mere ị na-akwara mmakwaara? Ò nwetụla mgbe i ji ike gị na oge gị mee ihe na-abaghị uru? È nwere otú ihe i mere si kpatara ndị ọzọ nsogbu? O nwere ike ịbụ na e nwere ihe ndị ọzọ i mejọrọ ị na-akwara ụta. Ajụjụ dị mkpa bụ, Gịnị ka i nwere ike ime?

10 Obi anaghị ezu ọtụtụ ndị ike! Ha na-echekata banyere ihe ọjọọ ndị ha mere, obi ana-agbawa ha, ọsụkọsụ ana-asụgbu ha. O nweghị mgbe obi na-eru ha ala. Nchegbu ò nwere ike ime ka nsogbu laa? Mbanụ! Ka e were ya na e nwere ebe ị chọrọ ịga. Gị arịgoro n’elu janglova, na-anyasi ya ike. Ị ka ga-anọkwa ebe ị nọ! Kama ichegbuwe onwe gị, e nwere ihe ndị i kwesịrị ime ga-abara gị uru. Ọ bụrụ na i mejọrọ mmadụ, i nwere ike ịrịọ ya mgbaghara iji mee ka unu dịkwa ná mma. Chee echiche ihe mere i ji mee ihe ahụ i mejọrọ ka ị ghara ime ya ọzọ. Ma, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na ị ga na-edi nsogbu ihe i mere kpataara gị. Ma, ichegbu onwe gị banyere ihe ndị i mejọrọ n’oge gara aga agaghị abara gị uru. N’eziokwu, o nwere ike ime ka ị ghara iji ike gị niile na-ejere Chineke ozi.

11. (a) Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova meere anyị ebere, hụkwa anyị n’anya? (b) Gịnị ka Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ime ka obi ghara ịna-ama anyị ikpe maka ihe ndị anyị mejọrọ n’oge gara aga?

11 Ụfọdụ ndị chere na mmehie ndị ha mere n’oge gara aga dị oké njọ nke na  ha abaghịzi uru n’anya Chineke. Ha nwere ike iche na Chineke enweghị ike imere ha ebere n’ihi na ihe ha mere jọgburu onwe ya ma ọ bụ na ọ karịrị akarị. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na n’agbanyeghị ihe ha mere n’oge gara aga, ha nwere ike ichegharị, gbanwee ma rịọ Chineke mgbaghara. (Ọrụ 3:19) Jehova nwere ike imere ha ebere ma hụ ha n’anya otú ahụ o meere ọtụtụ ndị ọzọ. Jehova ga-eji obiọma gbaghara onye wedara onwe ya ala ma jiri obi ya niile chegharịa. Chineke meere Job otú ahụ. Ọ bụ ya mere Job ji sị: “Echegharịwo m n’ájá na ntụ.” (Job 42:6) Baịbụl gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime iji mee ka obi ghara ịna-ama anyị ikpe maka ihe ndị anyị mejọrọ nakwa ihe ga-eme ka obi ruo anyị ala. O kwuru, sị: “Onye na-ezochi ajọ omume ya agaghị enwe ihe ịga nke ọma, ma onye na-ekwupụta ya ma na-ahapụ ya ka a ga-emere ebere.” (Ilu 28:13; Jems 5:14-16) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikwupụtara Chineke mmehie anyị, rịọ ya mgbaghara, gbalịsiekwa ike na-eme ihe gosiri na ihe anyị mere wutere anyị. (2 Kọr. 7:10, 11) Ọ bụrụ na anyị emeela ihe ndị a, Jehova ga-emere anyị ebere n’ihi na ọ ‘na-agbaghara mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’—Aịza. 55:7.

12. (a) Gịnị ka ihe Devid mere na-akụziri anyị banyere ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na obi na-ama anyị ikpe? (b) Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na Jehova na-agbanwe obi ya? Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta na ya? (Gụọ ihe e dere n’igbe.)

12 Ekpere na-akpa ike; Chineke ji ya enyere anyị aka. N’ọmarịcha abụ Devid bụrụ, o kwuru na ya nwere okwukwe na Chineke zara ekpere ya. (Gụọ Abụ Ọma 32:1-5.) Tupu Devid ekwupụtara Chineke mmehie ya, otú obi si na-ama ya ikpe mere ka obi ghara iru ya ala! Ọ nọ na-echegbu onwe ya, obi dara ya mbà, ike ana-agwụkwa ya. Gịnị mere ka Chineke gbaghara Devid, obi eruokwa ya ala? Ọ bụ ikwupụtara Chineke mmehie ya. Jehova zara ekpere Devid ma mee ka o nweta onwe ya, na-emekwa ihe ziri ezi. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị banyere ihe ndị i mejọrọ, jiri obi gị niile kpee ekpere rịọ Jehova mgbaghara, gbalịsiekwa ike ịgbanwe omume gị. I mee otú ahụ, ka obi sie gị ike na ọ nụrụ ekpere gị ma gbaghara gị!—Ọma 86:5.

NA-ECHE BANYERE ỌDỊNIHU

13, 14. (a) Olee ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa ugbu a? (b) Olee ajụjụ ndị nwere ike ime ka anyị chebara onwe anyị echiche ugbu a?

13 A na-ekwukarị na mmadụ nwere ike ịmụta ihe n’ihe ndị ọ na-echeta banyere oge gara aga, ma ihe ga-akacha abara anyị uru bụ iche banyere ọdịnihu. N’ihi ya, kama ịna-echegbu onwe anyị banyere oge gara aga, anyị kwesịrị ịna-eche banyere ugbu a nakwa ọdịnihu. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ò nwere ihe ndị m na-eme ugbu a ma ọ bụ ihe ndị m na-anaghị eme ugbu a, bụ́ ndị ga-eme ka m kwaa mmakwaara n’ọdịnihu? M̀ ji obi m niile na-efe Chineke ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-eme ka m kwaa mmakwaara n’ọdịnihu?’

 14 Oké mkpagbu adịla ezigbo nso. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla anyị ga-akwara mmakwaara ma oké mkpagbu bịa, mgbe ahụ, anyị ajụwa onwe anyị, sị: ‘Gịnịdị mere na ewepụtaghị m oge jekwuoro Chineke ozi? Gịnị mere na asụghị m ụzọ mgbe m nwere ohere ime otú ahụ? Gịnị gbochiri m ịgbalịsi ike ka e mee m ohu na-eje ozi? M̀ mere ihe niile m nwere ike ime iji na-akpa àgwà ka ezigbo Onye Kraịst? Àbụ m ụdị onye Jehova chọrọ ka o biri n’ụwa ọhụrụ ya?’ Kama ịnọ na-eche naanị banyere ihe ndị anyị gaara eme, anyị kwesịrị iji ajụjụ ndị a chebara onwe anyị echiche ma na-agbalịsi ike ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. Ma ọ́ bụghị ya, otú anyị si ebi ndụ nwere ike ime ka anyị mekwuo ihe ndị ga-eme ka anyị kwaa mmakwaara.—2 Tim. 2:15.

AKWALA MMAKWAARA N’OZI Ị NA-EJERE CHINEKE

15, 16. (a) Gịnị na gịnị ka ọtụtụ ndị hapụrụ ka ha nwee ike iji oge ha niile na-ejere Chineke ozi? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịkwa mmakwaara ma anyị cheta ihe ọ bụla anyị hapụrụ maka ozi Chineke?

15 Gịnị ka ụmụnna ndị hapụrụ ihe ụfọdụ iji na-ejere Jehova ozi oge niile kwesịrị ịna-echeta? O nwere ike ịbụ na ị hapụrụ ezigbo ọrụ ị na-arụbu ma ọ bụ ihe ọzọ i ji akpata ezigbo ego ka i nwee ike iwepụtakwu oge jeere Chineke ozi. O nwekwara ike ịbụ na i kpebiri na ị gaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ na ị gaghị amụ ụmụ ka i nwee ike ịna-eje ozi oge niile na Betel, soro na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ná mba dị iche iche, bụrụ onye nlekọta sekit ma ọ bụ onye ozi ala ọzọ. Ọ bụrụ na ị katawala ahụ́ n’ozi Jehova, ì kwesịrị ịkwa mmakwaara ugbu a ma i cheta ihe ndị ahụ i mere? Ì kwesịrị ichewe ugbu a na a sị na ị ma, ị gaaraghị ahapụ ihe ndị ahụ ma ọ bụ na ọ bụghị mgbe ahụ ka ị gaara ahapụ ha? Mbanụ!

16 Ihe mere i ji kpebie ịhapụ ihe ndị ahụ bụ na i ji obi gị niile hụ Jehova n’anya, chọsiekwa ike inyere ndị ọzọ chọrọ ife ya aka. I kwesịghị iche na ihe gaara akara gị mma ma a sị na i meghị ihe ndị ahụ i mere. Obi kwesịrị ịdị gị ezigbo ụtọ n’ihi na ị ma na i mere ihe i kwesịrị ime. Na-aṅụrị ọṅụ na i mere ihe niile i nwere ike ime n’ozi Jehova. Ọ gaghị echefu ihe niile ị hapụrụ iji na-ejere ya ozi. Mgbe ị ga-enweta ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie, ọ ga-enye gị ngọzi karịrị ihe ọ bụla i nwere ike ichetụ n’echiche ugbu a!—Ọma 145:16; 1 Tim. 6:19.

OTÚ Ị GA-ESI NA-EJERE CHINEKE OZI N’AKWAGHỊ MMAKWAARA

17, 18. (a) Gịnị ka Pọl mụtara nke nyeere ya aka ijere Chineke ozi n’akwaghị mmakwaara? (b) Gịnị ka i kpebiri ime banyere oge gara aga, ugbu a, na ọdịnihu n’ozi ị na-ejere Jehova?

17 Gịnị ka Pọl mụtara nke nyeere ya aka ijere Chineke ozi n’akwaghị mmakwaara? O dere, sị: “Ana m echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe m inweta ihe ndị dị n’ihu.” (Gụọ Ndị Filipaị 3:13, 14.) Pọl anọghị na-eche mgbe niile banyere ihe ọjọọ ndị o mere mgbe ọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. Kama, o ji ike ya niile na-efe Chineke ka o nwee ike inweta ụgwọ ọrụ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.

18 Anyị niile kwesịrị ịmụta ihe mere Pọl ji kwuo ihe ahụ o kwuru. Kama ịna-echegbu onwe anyị banyere oge gara aga na ihe ndị anyị na-enweghị ike ịgbanwe, anyị kwesịrị ịna-eche banyere ihe ndị anyị ga-emeli ugbu a iji nweta ngọzi n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ike ichefu ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga, ma anyị ekwesịghị igbu onwe anyị n’ihi ya. Anyị kwesịrị ịgbalị ichefu ihe gara aga, jiri ike anyị niile na-ejere Chineke ozi ugbu a ma na-eche banyere ihe ọma ndị Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu!

^ para. 4 Baịbụl kwuru ugboro ugboro na ndị inyom so ná ndị Sọl kpagburu. Ọ pụtara na n’oge ndịozi, e nwere ọtụtụ ndị inyom so na-ekwusa ozi ọma otú ahụ e nwekwara n’oge anyị a.—Ọma 68:11.