Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) 2000-10-15

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme

“Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—MATIU 6:10.

1. Gịnị ka ọbịbịa nke Alaeze Chineke ga-apụta?

MGBE Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka Alaeze Chineke, ọ maara na ọbịbịa ya ga-eweta njedebe nke ọtụtụ afọ nke ọchịchị mmadụ na-achị n’adabereghị n’ebe Chineke nọ. N’oge ahụ nile, ọ bụghị uche Chineke ka a na-eme n’ụwa n’ozuzu ya. (Abụ Ọma 147:19, 20) Ma mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ n’eluigwe, a ga-eme uche Chineke n’ebe nile. Oge maka mgbanwe na-emenye egwu bụ́ mgbe a ga-esi n’ọchịchị ụmụ mmadụ gafee n’ọchịchị Alaeze eluigwe Chineke, na-abịaru nnọọ nso.

2. Gịnị ga-aka oge mgbanwe site n’ọchịchị ụmụ mmadụ gaa n’ọchịchị Alaeze ahụ, akara?

2 Ihe ga-aka oge mgbanwe a akara bụ oge ahụ Jisọs kpọrọ “mkpagbu ukwu . . . , nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Bible ekwughị otú oge ahụ ga-aharu  n’ogologo, ma nhụsianya ndị ga-ewere ọnọdụ n’oge ahụ ga-adị njọ karịa ihe ọ bụla metụworo n’ụwa. Ná mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ, otu ihe nke ga-awụ ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ bi n’ụwa oké akpata oyi ga-eme: mbibi nke okpukpe ụgha nile. Nke ahụ agaghị awụ Ndịàmà Jehova akpata oyi, n’ihi na ọ dịwo anya ha tụwara anya nke a. (Mkpughe 17:1, 15-17; 18:1-24) Mkpagbu ukwu ahụ ga-ejedebe n’Amagedọn bụ́ mgbe Alaeze Chineke ga-etipịa usoro ihe Setan dum.—Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16.

3. Olee otú Jeremaịa si akọwa ọdịnihu a kara aka nke ndị nnupụisi?

3 Gịnị ka nke a ga-apụtara ndị “na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma” banyere Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Kraịst? (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9) Amụma Bible na-agwa anyị, sị: “Lee, ihe ọjọọ na-apụ si n’otu mba jeruo mba ọzọ, a ga-akpọtekwa oké ifufe site ná nsọtụ nile nke ụwa. Ndị Jehova gburu ga-adịzukwa n’ụbochị ahụ site n’otu nsọtụ ụwa wee ruo nsọtụ ọzọ nke ụwa: a gaghị etiri ha aka n’obi, a gaghị achịkọtakwa ha, a gaghị elikwa ha; nsị anụ n’elu ala ka ha ga-aghọ.”—Jeremaịa 25:32, 33.

Njedebe nke Ajọ Omume

4. N’ihi gịnị ka Jehova ji zie ezi n’iweta ajọ usoro a ná njedebe?

4 Ruo ọtụtụ puku afọ, Jehova Chineke ekwewo ka ajọ omume dịrị, bụ́ oge ga-ezuru ndị obi ha ziri ezi ịhụ na ịchịisi ụmụ mmadụ akụwo afọ n’ala. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke 20 nanị, e gburu ihe karịrị nde mmadụ 150 n’agha, ná mgbanwe ọchịchị dị iche iche, nakwa n’ọgba aghara ndị ọzọ a na-enwe n’obodo, dị ka otu akwụkwọ si kwuo. A hụrụ obi ọjọọ mmadụ karịsịa n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ mgbe e gburu ihe dị ka nde mmadụ 50, ọtụtụ n’ime ha nwụkwara n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi. Dị nnọọ ka Bible buru n’amụma, n’oge anyị ‘ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ agawo n’ihu n’ịjọkarị njọ.’ (2 Timoti 3:1-5, 13) Taa, omume rụrụ arụ, mpụ, ime ihe ike, nrụrụ aka, na nlelị nke ụkpụrụ Chineke bụ ihe jupụtara ebe nile. N’ihi ya, Jehova ziri nnọọ ezi n’iweta ajọ usoro a ná njedebe.

5, 6. Kọwaa ajọ omume dịịrị na Kenean oge ochie.

5 Ọnọdụ dị ugbu a yiri nke e nwere na Kenean ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. Bible na-ekwu, sị: “Ihe arụ nile nke Jehova, nke Ọ na-akpọ asị, ka ha mewooro chi ha; n’ihi na ọbụna ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom ka ha na-esurere chi ha n’ọkụ.” (Deuterọnọmị 12:31) Jehova gwara mba Israel, sị: “Ọ bụ n’ihi mmebi iwu nke mba ndị a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-anapụ ha ala ha n’ihu gị.” (Deuterọnọmị 9:5) Ọkà n’ịkọwa akụkọ Bible bụ́ Henry H. Halley kwuru, sị: “Ofufe nke Beal, Ashtarọt, na chi ndị ọzọ nke Kenean jupụtara n’imebiga ihe arụ ókè; ụlọ nsọ ha nile bụ ogige nke ajọ omume.”

6 Halley gosipụtara otú ajọ omume ha jọrubigara njọ ókè, n’ihi na n’otu n’ime ọtụtụ ebe ndị dị otú ahụ, ndị ọkà mmụta ihe ochie “chọtara ọtụtụ ite ájá ndị akụkụ ahụ ụmụ ọhụrụ a chụworo n’àjà nye Beal, dị n’ime ha.” O kwuru, sị: “Ebe ahụ nile pụtara ìhè dị ka ebe a na-eli ozu ụmụ ọhụrụ. . . . Ndị Kenean fere ofufe, site n’itinye aka n’omume rụrụ arụ, dị ka ememe okpukpe, n’ihu chi ha dị iche iche; mgbe ahụkwa, site n’igbu ụmụ ha ndị e bu ụzọ mụọ, dị ka àjà nyekwa chi ndị a. O yiri ka, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, ala Kenean ọ̀ ghọwo nke yiri Sọdọm na Gọmọra n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru mba ọnụ. . . . Mmepeanya nke omume rụrụ arụ na obi ọjọọ jọgburu onwe ya dị otú ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ na-adịgide? . . . Ọ tụrụ ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie, bụ́ ndị gwuru ihe ná mkpọmkpọ ebe nke obodo ndị dị na Kenean n’anya na Chineke ebibighị ha ngwa ngwa karịa ka o mere.”

Iketa Ụwa

7, 8. Olee otú Chineke ga-esi ekpocha ụwa a?

7 Dị nnọọ ka Chineke kpochara Kenean,  n’oge na-adịghị anya ọ ga-ekpocha ụwa nile ma nye ya ndị na-eme uche ya. “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa.” (Ilu 2:21, 22) Ọbụ abụ ahụ na-ekwukwa, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) A ga-ewepụkwa Setan, ka “o wee ghara iduhie mba nile ọzọ, ruo mgbe [otu puku afọ] ahụ ga-agwụsị.” (Mkpughe 20:1-3) Ee, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

8 N’ịchịkọta olileanya dịịrị ndị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, Jisọs kwuru, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Ma eleghị anya ọ nọ na-ezo aka n’Abụ Ọma 37:29, bụ́ nke buru amụma, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Jisọs maara na ọ bụ nzube Jehova ime ka ndị ezi omume biri n’ụwa paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Jehova na-ekwu, sị: “Mụ onwe m emewo ụwa, na mmadụ na anụmanụ nke dị n’elu ụwa, site n’ike m dị ukwuu, . . .  ewerewokwa m ya nye onye o ziri ezi n’anya m inye.”—Jeremaịa 27:5.

Ụwa Ọhụrụ Dị Ebube

9. Ụwa dị aṅaa ka Alaeze Chineke ga-eweta?

9 Amagedọn gasịa, Alaeze Chineke ga-eweta “ụwa ọhụrụ” dị ebube bụ́ nke “ezi omume bi n’ime [ya].” (2 Pita 3:13) Lee ahụ efe dị ukwuu ọ ga-ewetara ndị lanarịrị Amagedọn ịbụ ndị e wepụụrụ ajọ usoro ihe a na-emegbu ha! Lee ka ha ga-esi nwee obi ụtọ ịbụ ndị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke dị n’okpuru ọchịchị nke Alaeze eluigwe ahụ, na-enwe olileanya nke ngọzi ndị dị ebube na ndụ ebighị ebi!—Mkpughe 7:9-17.

10. Olee ihe ọjọọ ndị na-agaghịzi adị n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ?

10 Agha, mpụ, agụụ, ma ọ bụ ọbụna anụ ndị na-eri ibe ha agaghịzi eyi ụmụ mmadụ egwu. “Mụ na [ndị m] ga-agbakwa ọgbụgba ndụ udo, M ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa kwụsị n’ala ha . . . Osisi ọhịa ga-amịkwa mkpụrụ ya, ala ga-emekwa ihe omume ya, ha ga-anọkwa n’elu ala ha ná ntụkwasị obi.” “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Ezikiel 34:25-28; Maịka 4:3, 4.

11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na ọrịa anụ ahụ ga-akwụsị?

11 A ga-ewepụ ọrịa, iri újú, na ọbụna ọnwụ. “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.” (Aịsaịa 33:24) “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo. . . . Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:4, 5) Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, o gosipụtara ikike ya ime ihe ndị ahụ site n’ike Chineke nyeworo ya. Site ná nkwado nke mmụọ nsọ, Jisọs gazuru ala ahụ nile na-agwọ ndị ngwụrọ na ndị ọrịa.—Matiu 15:30, 31.

12. Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

 12 Jisọs mere ọbụna ihe karịrị nke ahụ. O mere ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. Olee otú ndị nwere obi umeala si meghachi omume? Mgbe ọ kpọlitere nwata nwanyị dị afọ 12 n’ọnwụ, ‘ibobo nwụbigara ndị mụrụ ya ókè n’ahụ.’ (Mak 5:42) Nke a bụ ihe atụ ọzọ banyere ihe Jisọs ga-eme n’ụwa nile n’okpuru ịchịisi Alaeze, n’ihi na n’oge ahụ, “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Cheedị echiche banyere oké ibobo ga-anwụ ndị mmadụ n’ahụ́ mgbe ọtụtụ ìgwè ndị nwụrụ anwụ ga na-adịghachi ndụ ma bụrụ ndị ha na ndị ha hụrụ n’anya ga-ebikọghachi! Obi abụọ adịghị ya na a ga-enwe ọrụ izi ihe dị ukwuu ná nduzi nke Alaeze ahụ ka “ihe ọmụma Jehova [wee jupụta] ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

“Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị”

E Wepụ Ọbụbụeze Jehova n’Ụta

13. Olee otú a ga-esi egosipụta izi ezi nke ịchịisi Chineke?

13 Mgbe otu puku afọ nke ọchịchị Alaeze ahụ ga-ejedebe, a ga-eweghachiwo ezinụlọ ụmụ mmadụ gaa n’izu okè nke uche na nke anụ ahụ. Ụwa ga-abụ ogige Iden zuru ụwa ọnụ, bụ́ paradaịs. A ga-enwewo udo, obi ụtọ, nchebe, na ọha mmadụ na-ahụ n’anya. Ọ dịtụghị mgbe ọ bụla a ga-ahụ ihe dị otú a n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ tupu ịchịisi Alaeze ahụ. Lee ọdịiche dị ukwuu a ga-egosipụtawo mgbe ahụ n’etiti ọtụtụ puku afọ ndị bu ụzọ nke ajọ ịchịisi ụmụ mmadụ na otu puku afọ nke ịchịisi dị ebube nke Alaeze eluigwe Chineke! A ga-egosipụtawo na ịchịisi Chineke site n’Alaeze ya ka nnọọ mma n’ụzọ ọ bụla. A ga-ewepụwo oruru o ruuru Chineke ịchị isi, bụ́ ọbụbụeze ya, n’ụta.

14. Gịnị ga-eme ndị nnupụisi mgbe otu puku afọ ahụ ga-agwụsị?

14 Ná ngwụsị nke otu puku afọ ahụ, Jehova ga-ekwe ka ụmụ mmadụ zuru okè nwere onwe ha ịhọrọ onye ha chọrọ ijere ozi. Bible na-egosi na “a ga-atọpụ Setan n’ụlọ mkpọrọ ya.” Ọ ga-anwa iduhie ndị mmadụ ọzọ, bụ́ ndị ụfọdụ ha ga-ahọrọ inwere onwe ha pụọ n’ebe Chineke nọ. Iji gbochie ‘mkpagbu ibili nke ugbo abụọ,’ Jehova ga-egbu Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị nile na-enupụ isi megide ọbụbụeze Jehova. Ọ dịghị onye ga-arụ ụka na e nyeghị ụmụ mmadụ ọ bụla e bibiri ruo mgbe ebighị ebi n’oge ahụ ohere ọ bụla ma ọ bụ na ụzọ ndụ ha na-ezighị ezi bụ n’ihi ezughị okè. Ee, ha ga-adị ka Adam na Iv zuru okè, bụ́ ndị ji ọchịchọ obi họrọ inupụ isi megide ịchịisi ezi omume Jehova.—Mkpughe 20:7-10; Nehum 1:9.

Ndị na-eguzosi ike n’ihe na Jehova ga-adịghachi ná mma

15. Mmekọrịta dị aṅaa ka ndị na-eguzosi ike n’ihe na Jehova ga-enwe?

15 N’aka nke ọzọ, o yiri ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụ mmadụ hà ga-ahọrọ ịkwado ọbụbụeze Jehova. Mgbe a ga-egbusịwo onye nnupụisi ọ bụla, ndị ezi omume ga-eguzo n’ihu Jehova, n’ịbụ ndị gafeworo ule ikpeazụ nke iguzosi ike n’ihe. Jehova ga-anabatazi ndị a na-eguzosi ike n’ihe dị ka ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom. Ya mere, ha ga-esoghachi Chineke na-enwe mmekọrịta ahụ Adam na Iv nwere tupu ha enupụ isi. N’ụzọ dị otú a, a ga-emezu Ndị Rom 8:21: “A ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya [ihe a kpọrọ mmadụ] pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” Aịsaịa onye amụma na-ebu amụma, sị: “[Chineke ga-eloda] ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi; Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8.

Olileanya nke Ndụ Ebighị Ebi

16. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ịtụ anya maka ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi?

16 Lee atụmanya dị ebube nke na-echere ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, bụ́ ịmara na Chineke ga-eme ka ha nweta abamuru ime mmụọ na nke anụ ahụ n’ụba ruo mgbe ebighị ebi! Ọbụ abụ ahụ ziri ezi n’ikwu, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe [ziri ezi] dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” (Abụ Ọma 145:16) Jehova na-agba ndị so n’ìgwè ndị ga-ebi n’elu  ala ume inwe olileanya a nke ịdị ndụ n’ime Paradaịs dị ka akụkụ nke okwukwe ha nwere n’ebe ọ nọ. Ọ bụ ezie na ihe banyere ọbụbụeze Jehova ka mkpa, ọ dịghị agwa ndị mmadụ ka ha na-ejere ya ozi n’enweghị atụmanya ụgwọ ọrụ. N’akụkụ nile nke Bible, e jikọtachiri nguzosi ike n’ihe nye Chineke na olileanya nke ndụ ebighị ebi anya dị ka akụkụ ndị dị mkpa nke okwukwe onye Kraịst nwere n’ebe Chineke nọ. “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

17. Olee otú Jisọs si gosipụta na o ziri ezi anyị ịbụ ndị olileanya anyị kwagidere?

17 Jisọs kwuru, sị: “Ma nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’ebe a, o jikọtara ịmara Chineke na nzube ya na ụgwọ ọrụ nke a ga-eweta. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye mere ihe ọjọọ rịọrọ ka Jisọs cheta ya mgbe Ọ banyechara n’Alaeze Ya, Jisọs kwuru, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ọ gwaghị nwoke ahụ ka o nwee okwukwe ọbụna ma ọ bụrụ na o nwetaghị ụgwọ ọrụ. Ọ maara na Jehova chọrọ ka ndị ohu ya nwee olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs iji nye aka ịkwagide ha ka ha na-eche ọnwụnwa dịgasị iche ihu n’ụwa a. N’ihi ya, ịtụ anya ụgwọ ọrụ ahụ bụ ihe enyemaka dị mkpa n’ịtachi obi dị ka onye Kraịst.

Ọdịnihu nke Alaeze Ahụ

18, 19. Gịnị ga-eme Eze ahụ na Alaeze ahụ ná ngwụsị nke Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ?

18 Ebe ọ bụ na Alaeze ahụ bụ ọchịchị inyeaka nke Jehova ga-eji mee ka ụwa na ndị bi n’ime ya bịaruo n’izu okè ma soro ya dịghachi ná mma, ọrụ dị aṅaa ka Eze Jisọs Kraịst na ndị eze na ndị nchụàjà 144,000 ahụ ga na-arụ mgbe Narị Afọ Iri ahụ gasịrị? “E mesịa ọgwụgwụ ihe nile ga-abịa, mgbe ọ bụla Ọ ga-arara alaeze Ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna; mgbe ọ bụla Ọ ga-emeworị ka ọbụbụisi nile na ịchịisi nile na ike nile ghara ịdị irè. N’ihi na Ọ ghaghị ịbụ eze, ruo mgbe Ọ ga-edebeworị ndị iro Ya nile n’okpuru ụkwụ Ya.”—1 Ndị Kọrint 15:24, 25.

19 Mgbe Kraịst ga-enyefe Chineke Alaeze ahụ, olee otú a ga-esi aghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ na-ekwu banyere ya dị ka nke ga-adịru ebighị ebi? Ihe ndị Alaeze ahụ rụzuru ga-adịru ebighị ebi. A ga-asọpụrụ Kraịst ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ọrụ ndị ọ rụrụ maka iwepụ ọbụbụeze Chineke n’ụta. Ma ebe ọ bụ na mgbe ahụ a ga-ewepụwo mmehie na ọnwụ kpam kpam, gbapụtakwa ihe a kpọrọ mmadụ, nke a ga-eweta mkpa ọ dị dị ka Onye Mgbapụta ná njedebe. Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Alaeze ahụ ga-achịzuwokwa; ya mere mkpa maka ọchịchị inyeaka ịdị n’etiti Jehova na ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi agaghịzi adị. Ya mere, “Chineke [ewee] bụrụ ihe nile n’ime ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 15:28.

20. Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta ihe ọdịnihu Kraịst na 144,000 ahụ ga-abụ?

20 Ọrụ dị aṅaa ka Kraịst na ndị ya na ha ga-eso achị ga na-arụ n’ọdịnihu mgbe Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ ga-ezu? Bible ekwughị. Ma, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-enyekwu ha ọtụtụ ihe ùgwù ije ozi n’ebe ihe nile o kere eke nọ. Ka anyị nile taa kwadoo ọbụbụeze Jehova ma bụrụ ndị e nyere ndụ ebighị ebi, ka anyị wee nwee ike n’ọdịnihu, ịdị ndụ iji chọpụta ihe Jehova zubeworo maka Eze ahụ nakwa ndị eze na ndị nchụàjà ibe ya, nakwa maka eluigwe na ala ya dị egwu!