Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 2 n'Afọ 2016

E Mee Ngwa Ngwa, E Meghara Ọdachi

E Mee Ngwa Ngwa, E Meghara Ọdachi

N’ABALỊ iri abụọ na isii n’ọnwa Disemba afọ 2004, otu oké ala ọma jijiji mere n’àgwàetiti a na-akpọ Simeulue, nke dị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ebe ugwu obodo Sumatra dị́ n’Indoneshia. Ọ bụ Oké Osimiri India gbara àgwàetiti a gburugburu. Ngwa ngwa ala ọma jijiji ahụ mechara, oké osimiri a bịara talatawa otú a na-ahụtụbeghị mbụ. Anya ndị niile bí n’àgwàetiti a tọrọ ná mmiri ahụ. Ozugbo ahụ, onye ọ bụla malitere ịgbaga n’ugwu, na-eti mkpu, na-asị “Smong! Smong!” nke pụtara na ala ọma jijiji emewela n’oké osimiri ahụ. Ka ọ na-erula nkeji iri atọ, nnukwu ebili mmiri malitere ime n’oké osimiri ahụ, na-asọpụta mmiri n’ike n’ike ma laa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ n’iyi.

Mgbe ala ọma jijiji ahụ mere, ọ bụ n’àgwàetiti Simeulue ka o bu ụzọ kpaa mkpamkpa. Ma, n’ime 78,000 ndị bi na ya, ọ bụ naanị mmadụ asaa nwụrụ. Gịnị mere na ndị nwụrụ n’ebe a adịghị ọtụtụ ma e jiri ya tụnyere ndị nwụrụ n’ebe ndị ọzọ ihe a mere? * Otu ilu ndị bi n’àgwàetiti a na-atụkarị bụ: ‘Ọ bụrụ na ala ọma jijiji emechaa, oké osimiri atalatawa, gbara gawa n’ugwu, n’ihi na ọ gaghị ete aka osimiri ahụ abịa ọgụ.’ Ndị Simeulue ejirila ihe mere ha na mbụ mara na osimiri na-aga ibigbọ ma ọ malitehaa talatawa. Ha mere ngwa ngwa, meghara ọdachi.

O nwere ọdachi Baịbụl kwuru na-abịanụ. Ọ bụ “oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Matiu 24:21) Ma, ọ pụtaghị na ụmụ mmadụ ga-eji ihe ndị ha mepụtara bibie ụwa a, ma ọ bụkwanụ na ọdachi ndị na-emere onwe ha ga-ebibi ya, n’ihi na nzube Chineke bụ ka ụwa a dịrị ruo mgbe ebighị ebi. (Ekliziastis 1:4) Kama, oké mkpagbu ahụ bụ ihe Chineke ga-eji ‘bibie ndị na-ebibi ụwa.’ Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe ọjọọ na ahụhụ niile ga-akwụsị. (Mkpughe 11:18; Ilu 2:22) N’eziokwu, oge ahụ ga-amagbu onwe ya.

Ihe ọzọkwa bụ na Chineke agaghị ebibikọta ndị ọjọọ na ndị ọma otú ala ọma jijiji na ugwu ndị na-agbọpụta ọkụ si eme. Baịbụl gwara anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” Chineke, onye aha ya bụ Jehova, kwere nkwa na “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 4:8; Abụ Ọma 37:29) Ma, olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịnwụ n’oké mkpagbu ahụ, kama, ka i nweta ọtụtụ ihe ọma Chineke kwere nkwa ha? Ọ bụ ime ngwa ngwa ka i meghara ọdachi.

GBALỊA GHỌTA IHE MGBANWE NDỊ NA-EME N’ỤWA PỤTARA

Anyị agaghị amatali ụbọchị ihe ọjọọ na ahụhụ niile ga-akwụsị, n’ihi na Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” Ma, Jizọs gbara anyị ume ka anyị ‘na-eche nche.’ (Matiu 24:36; 25:13) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eche nche? Baịbụl gwara  anyị otú ihe ga-esi kwụrụ n’ụwa tupu Chineke ebibie ndị ọjọọ niile. Otú ahụ ọ na-abụ ndị Simeulue hụ na oké osimiri ejirila ike talatawa, ha amata na ọ na-aga ịbịa ọgụ, otú ahụkwa ka mgbanwe ndị na-eme n’ụwa n’ike n’ike ga-esi eme ka anyị mata na ọgwụgwụ adịla nso. Ihe e dere n’igbe dị́ n’isiokwu a kọrọ mgbanwe ụfọdụ Baịbụl kwuru na a ga-enwe.

N’eziokwu, o nweela mgbe ihe ụfọdụ a kpọrọ aha n’igbe a mere otu otu. Ma, Jizọs kwuru na anyị hụ ka “ihe ndị a niile” na-eme, anyị ga-ama na ọgwụgwụ dị nso. (Matiu 24:33) Jụzie onwe gị, sị, ‘Kemgbe ụmụ mmadụ dịwara ndụ, olee oge ihe ndị ahụ niile Jizọs kwuru (1) mere n’ebe niile n’ụwa, (2) mee n’otu oge, (3) meekwa otú a na-ahụtụbeghị ya mbụ?’ O doro anya na ọ bụ n’oge anyị a.

IHE GOSIRI NA CHINEKE HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

Otu onye bụ́bu onyeisi ala ndị Amerịka kwuru n’otu oge, sị, “Ígwè ọrụ ndị na-agbara ndị mmadụ àmà na ọdachi na-aga ime . . . na-azọ ndị mmadụ ndụ.” Mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara n’afọ 2004, o nwere ihe e mere iji hụ na ụdị ihe ahụ mee ọzọ, ọ gaghị ata isi ọtụtụ ndị mmadụ otú ọ tara na nke ahụ. A rụnyere ígwè ọrụ ga na-agbara ndị bi n’ebe ndị ahụ àmà na ala ọma jijiji ebidola ime n’oké osimiri. Chineke ahaziekwala ka a gbaara ndị mmadụ àmà tupu ọgwụgwụ abịa. Baịbụl sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

N’afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ji ihe karịrị otu ijeri awa na narị nde itoolu kwusaa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. Anyị nwere ike ịsị na ozi ọma a na-ekwusa ebe niile taa so n’ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ dị nso. Ndịàmà Jehova hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji eme ike ha niile iji gbaara ha àmà banyere ụbọchị ikpe Chineke nke ji oké ọsọ na-abịa. (Matiu 22:39)  Ebe ọ bụ na ị nụla àmà a ha na-agba, o gosiri na Jehova hụrụ gị n’anya. Cheta na ‘Chineke achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9) Ị̀ ga-ege Chineke ntị, mee ihe ọ sị gị mee, ka ị ghara iso ná ndị ọ ga-ebibi?

GBAGA N’EBE GA-AZỌ GỊ NDỤ

Ọ̀ kwa i chetara na ngwa ngwa ndị Simeulue hụrụ na oké osimiri ahụ atalatawala, ha gbagara n’ugwu ebe ọ na-enweghị aka ga-akpa ha? Ha echereghị ka o bu ụzọ bịa ọgụ. Ihe a ha mere n’egbughị oge zọrọ ha ndụ. Ihe ga-emekwa ka oké mkpagbu ahụ na-abịanụ ghara ịta isi gị bụ ịgbaga n’ebe a kpọrọ ugwu Jehova tupu oge agafee. Olee otú ị ga-esi eme ya? Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka Aịzaya onye amụma dee gbasara òkù a ga na-akpọ ndị mmadụ “n’oge ikpeazụ,” nke bụ́ oge a anyị bi na ya. Ọ sịrị: “Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, . . . ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”—Aịzaya 2:2, 3.

Onye gbagara n’ugwu mgbe ala ọma jijiji mere n’oké osimiri na-enwe ike ịhụ ihe niile na-emenụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ya. Ọ bụkwa otú ọ dị ọtụtụ nde ndị na-amụ Baịbụl taa n’ụwa niile. Ha na-amụta ihe na-enyere ha aka ịgbanwe ndụ ha. (2 Timoti 3:16, 17) Ha si otú ahụ ‘na-eje ije n’ụzọ Chineke,’ ha na ya adịrị ná mma, ya ana-echebekwa ha.

Ị̀ ga-ege ntị n’òkù ahụ Chineke na-akpọ gị ka o wee chebe gị n’ụbọchị ndị a tara akpụ? Gbalịa gụọ ihe e dere n’igbe dị́ n’isiokwu a nke ọma ka i nwee ike ịmata ihe Baịbụl kwuru e ji amata ‘oge ikpeazụ.’ Ndịàmà Jehova nọ́ n’ebe i bi ga-enwe mmasị ịkọwakwuru gị amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe ahụ, nyekwara gị aka ịmata ihe i kwesịrị ime. Ị ga-amatakwa ihe ndị ọzọ ị chọrọ ịma gbasara okwu a ma ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig. Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.

^ para. 3 Ala ọma jijiji a mere n’afọ 2004 tara isi ihe karịrị 220,000. O so n’ala ọma jijiji ndị kasị njọ metụrụla n’ụwa.