Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 4 n'Afọ 2016

Ndị Masoret sara anya na mmiri depụtaghachi Akwụkwọ Nsọ

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala

Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala

NSOGBU E NWERE: Baịbụl dịgidere n’agbanyeghị na o nwere ike irekasị nakwa na ọtụtụ ndị chọrọ ka ọ ghara ịdị. Ma, ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl na ndị depụtaghachiri ya gbara mbọ ịgbanwe ihe dị na Baịbụl. N’ụfọdụ Baịbụl ndị ha sụgharịrị ma ọ bụ depụtaghachi, ha gbanwere ihe ụfọdụ na Baịbụl ka o kwekọọ n’ihe ha na-akụzi, kama ịgbanwe ihe ha na-akụzi ka o kwekọọ n’ihe Baịbụl kwuru. Legodị ihe atụ ụfọdụ:

  • Ebe a na-anọ efe Chineke: N’ihe dị ka n’agbata afọ 400 na afọ 101 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Samerịa só sụgharịa akwụkwọ ise mbụ na Baịbụl gbakwunyere ihe n’Ọpụpụ 20:17 ná nsụgharị ha a na-akpọ Pentetuk nke Ndị Samerịa. Okwu ha gbakwunyere bụ, “n’Ugwu Gerizim. N’ebe ahụkwa ka ị ga-arụ ebe ịchụàjà.” Ndị Samerịa ahụ chọrọ ka e nwee ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na ụlọ nsọ ha rụrụ n’Ugwu Gerizim kwesịrị ekwesị.

  • Ozizi Atọ n’Ime Otu: N’ihe na-erughị narị afọ atọ e dechara Baịbụl, otu nwoke, onye na-ede akwụkwọ gbasara Atọ n’Ime Otu, gbakwunyere ihe na 1 Jọn 5:7. Okwu ndị ọ gbakwunyere bụ, “n’eluigwe, Nna ahụ, Okwu ahụ, na Mmụọ Nsọ ahụ: ha atọ bụkwa otu.” Okwu ndị a adịghị na Baịbụl mbụ e dere. Otu ọkachamara nke na-amụ gbasara Baịbụl, onye aha ya bụ Bruce Metzger, kwuru na “sí n’afọ 501 gawa, a bịara na-edenyekwu okwu ndị ahụ n’akwụkwọ mpịakọta Baịbụl dị́ na Latịn Ochie nakwa na Baịbụl Latịn a na-akpọ Vulgate.”

  • Aha Chineke: Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl kpebiri iwepụ aha Chineke na Baịbụl n’ihi na ndị Juu kweere na aha Chineke dị nsọ nke na e kwesịghị ịna-akpọ ya. Ha dere “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe Anyị” n’ebe ha kwesịrị ide aha Chineke. *

OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE: Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị depụtaghachiri Baịbụl elezighị anya, ụfọdụkwa ji aghụghọ gbakwunye ihe ndị masịrị ha, e nwere ọtụtụ ndị sara anya na mmiri depụtaghachi ihe niile otú ọ dị na Baịbụl mbụ. N’agbata afọ 501 na afọ 1000, ndị Masoret depụtaghachiri Akwụkwọ Nsọ Hibru. E kwuru na ha gụrụ mkpụrụokwu na mkpụrụ akwụkwọ ole ha  depụtara ọnụ iji hụ na ha na nke dị n’ebe ha si depụta ha hà otu. E nwee ebe ha chere na ihe e dere na nke ha ji na-edepụtaghachi Baịbụl dị iche n’ihe e dere na Baịbụl mbụ, ha na-ede ihe n’akụkụ peeji ahụ iji gosi na obi akachaghị ha na ihe e dere ebe ahụ ziri ezi. Ha agbanweghị ihe ọ bụla e dere na Baịbụl. Otu prọfesọ aha ya bụ Moshe Goshen-Gottstein kwuru na ndị Masoret “weere na ha kpachara anya gbanwee ihe na Baịbụl, na ha emeela mmehie kachanụ mmadụ nwere ike ime.”

Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị e nwere taa na-enyere ndị na-amụ gbasara Baịbụl aka ịchọpụta ndị nke e dehiere ihe na ha. Dị ka ihe atụ, kemgbe ọtụtụ afọ, ndị isi okpukpe na-ekwu na ihe dị na Baịbụl Latịn ha bụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl mbụ. Ma, ha gbakwunyere okwu ndị ha na-ekwesịghị ịgbakwunye na 1 Jọn 5:7 anyị kwuru gbasara ya ná mmalite isiokwu a. Ndị sụgharịrị Baịbụl Bekee King James Version gbakwunyedịrị okwu ndị ahụ na ya. Ma, mgbe a hụrụ akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ndị ọzọ, gịnị ka a chọpụtara? Bruce Metzger kwuru, sị: “Okwu ndị ahụ a gbakwunyere [na 1 Jọn 5:7] adịghị n’akwụkwọ mpịakọta Baịbụl ochie niile (n’asụsụ Siriak, asụsụ ndị Ijipt, Aminian, Itiopik, Arabik, Slavonik), e wezụga nke Latịn.” Ọ bụ ya mere e jizi wepụ okwu ndị ahụ na Baịbụl King James Version ndị e degharịrị edegharị nakwa na Baịbụl ndị ọzọ.

Otu n’ime akwụkwọ papaịrọs e ji dee Baịbụl n’ihe dị ka n’afọ 200. Aha ya bụ Chester Beatty P46

È nwere akwụkwọ mpịakọta ochie ndị ọzọ gosiri na a gbanwebeghị ihe e dere na Baịbụl mbụ? Mgbe a hụrụ Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ n’afọ 1947, ndị na-amụ gbasara Baịbụl jizi akwụkwọ mpịakọta ndị a e dere ihe karịrị otu puku afọ tupu afọ 1947 lee ma ihe e dere na ha na ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị Masoret depụtaghachiri hà bụ otu. Otu n’ime ha kwuru na otu n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ gosiri na n’ime ihe karịrị otu puku afọ ndị Juu ji aka depụtaghachi Baịbụl, ha sara anya na mmiri hụ na ha agbanweghị ihe ọ bụla na Baịbụl.

N’ọ́bá akwụkwọ a na-akpọ Chester Beatty Library, nke dị́ na Dọblịn, n’Ayaland, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ papaịrọs nke akwụkwọ niile dị́ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E nwekwara akwụkwọ mpịakọta ndị e dere malite n’afọ 101 gawa. Ọ pụtara na e dere ha naanị ihe dị ka otu narị afọ e dechara Baịbụl. Akwụkwọ a na-akpọ The Anchor Bible Dictionary kwuru na “ihe ndị e dere n’akwụkwọ papaịrọs ndị a na-eme ka a ghọtakwuo okwu ụfọdụ e dere na Baịbụl, na-emekwa ka o doo anya na a gbanwebeghị ihe dị na Baịbụl.”

“Anyị nwere ike ikwu na e wezụga ya, e nweghị akwụkwọ ọzọ merela ochie e depụtaghachiri kpọmkwem ihe dị na ya”

URU Ọ BARA: Akwụkwọ mpịakọta ndị a nọrọla ọtụtụ afọ emeela ka a ghọta na a gbanwebeghị ihe dị na Baịbụl. Mgbe otu nwoke a na-akpọ Sir Frederic Kenyon na-ekwu gbasara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ sịrị na “e nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ merela ochie nke e nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị mekwarala ochie na-egosi na a gbanwebeghị ihe e dere n’ime ya. E nwekwaghị onye na-ekwu eziokwu, nke na-amụ gbasara Baịbụl, ga-ekwu na ihe ndị e dere na Baịbụl ndị anyị nwere ugbu a abụghị ihe dị na Baịbụl mbụ.” Otu nwoke aha ya bụ William Henry Green, onye na-amụ gbasara Baịbụl, kwukwara banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: “Anyị nwere ike ikwu na e wezụga ya, e nweghị akwụkwọ ọzọ merela ochie e depụtaghachiri kpọmkwem ihe dị na ya.”

^ para. 6 Ị chọọ ịmatakwu gbasara aha Chineke, gụọ isi nke 1 na nke 2 n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl. Ọ dịkwa na www.jw.org/ig.

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị E Nyere Ọrụ Ịsụgharị “Okwu Dị Nsọ nke Chineke”—Ndị Rom 3:2

Kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ejirila Baịbụl dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma. Ma, gịnị mere ha ji jiri aka ha sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Bekee a na-asụ ugbu a?

Gịnị Mere Anyị Ji Bipụta Baịbụl A Na-akpọ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ?

Gịnị mere Baịbụl a ji dị iche ná ndị ọzọ?