Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 4 n'Afọ 2016

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị pụrụ iche n’otú Jizọs si meso ndị ekpenta?

Ndị Juu oge ochie na-atụ ụjọ ibute ụdị ọrịa ekpenta ndị mmadụ na-arịa n’oge a na-ede Baịbụl. Ọrịa ọjọọ a nwere ike imebi akwara onye o jidere ma kwarụọ onye ahụ ahụ́. N’oge ahụ, o nweghị onye ma ọgwụ ekpenta. Kama, ndị ekpenta na-ebipụ iche, iwu jikwa ha ịna-agwa ndị ọzọ na ha bụ ndị ekpenta, ka ha ghara ịbịa ha nso.—Levitikọs 13:45, 46.

Ndị isi okpukpe ndị Juu tiri iwu karịrị nke Akwụkwọ Nsọ tiri gbasara ndị ekpenta, nke mere ka ihe siere ndị ekpenta ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, iwu ha kwuru na o nweghị onye kwesịrị iru onye ekpenta nso ruo kubit anọ ma ọ bụ ihe dị ka amaụkwụ isii (ya bụ, mita abụọ). Ma ọ bụrụzie na ifufe na-efe, iwu ha kwuru na o nweghị onye kwesịrị iru onye ekpenta nso ruo otu narị kubit ma ọ bụ ihe dị ka otu narị amaụkwụ na iri ise (ya bụ, mita iri anọ na ise). Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị ekpenta kwesịrị ibi “ná mpụga ebe [ụmụ Izrel] mara ụlọikwuu.” Ma, ụfọdụ ndị ọkachamara na-amụ gbasara akwụkwọ okpukpe ndị Juu a na-akpọ Talmud kọwara na ihe ọ pụtara bụ na ndị ekpenta ekwesịghị ibi n’ime obodo. Ọ bụ ya mere otu onye rabaị ji tụwa onye ekpenta ọ hụrụ n’ime obodo okwute ma sị ya: “Gaa nọrọ n’ebe i kwesịrị ịnọ, emerụla ndị ọzọ.”

Ma, otú Jizọs si meso ndị ekpenta dị nnọọ iche. Kama ịchụpụ ha, o metụrụ ha aka ma gwọọ ha.—Matiu 8:3.

Olee ihe ndị isi okpukpe ndị Juu na-eji maka ya ekweta ka a gbaa alụkwaghịm?

Akwụkwọ ịgba alụkwaghịm e dere n’afọ 71 ma ọ bụ n’afọ 72

N’oge ndịozi Jizọs, ndị isi okpukpe dị iche iche enweghị otu olu n’ihe e kwesịrị iji maka ya gbaa alụkwaghịm. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị Farisii ji jụọ Jizọs n’otu oge, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”—Matiu 19:3.

Iwu Mozis kwuru na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ “chọpụtawo ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ahụ nọ.” (Diuterọnọmi 24:1) N’oge Jizọs nọ n’ụwa, e nwere òtù ndị rabaị a na-akpọ Shammai na ndị nke a na-akpọ Hillel. Otú ha si akọwa ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru dịcha iche iche. Ndị Shammai na-ekwu na ihe ọ pụtara bụ na naanị ihe ga-eme ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm bụ ma nwaanyị ahụ kwaa iko. Ma, ndị Hillel na-ekwu na nwoke nwere ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma e nwee ihe na-esere ha, ọ bụrụgodị na ọ bụ obere ihe. Ndị Hillel kwukwara na nwoke nwedịrị ike ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na nwunye ya esighị nri dị ụtọ ma ọ bụkwanụ na nwoke ahụ hụrụ nwaanyị ọzọ mara mma karịa nwunye ya.

Gịnịzi ka Jizọs zara ndị Farisii ahụ? Ọ gwara ha hoo haa, sị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Matiu 19:6, 9.

GỤKWUO GBASARA YA

Jizọs Ọ̀ Bụ Naanị Ezigbo Mmadụ Ka È Nwere Ihe Ọzọ Ọ̀ Bụ?

Ihe mere otú Jizọs si bie ndụ ji kacha agbanwe ndụ ndị mmadụ.

Baịbụl Ọ̀ Kagburu Ịgba Alụkwaghịm?

Chọpụta ihe Chineke kwuru nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. Chọpụtakwa ihe Chineke na-achọghị.