Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

Otú Ị Ga-esi Akasi Mmadụ Obi

Otú Ị Ga-esi Akasi Mmadụ Obi

Ò nwetụla mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme ma ọ bụ ihe ị ga-ekwu iji kasie onye mmadụ nwụnahụrụ obi? Ya dị ụfọdụ ndị otú a, ha agaghị eme ihe ọ bụla iji kasie onye ahụ obi. Ma, lee ihe ụfọdụ i nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka.

Ihe na-akasikarị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ obi bụ ịga na nke ha ma sị ha “ndo.” N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ịmakụ onye ahụ ma ọ bụ ikonye ya aka ga-eme ka onye ahụ mara na ihe mere ya wutere anyị. Onye ahụ chọọ ikwu okwu, gee ya ntị nke ọma. Ihe kacha mkpa i nwere ike imere ezinụlọ ihe ahụ mere bụ imere ha ihe ụfọdụ ha na-enweghị ike ime, dị ka isi nri, ilekọta ụmụaka ha, ma ọ bụ inyeaka n’olili ozu ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị ha. Imere ha ihe ndị ahụ nwere ike iru ha n’obi karịa okwu nkịtị ị gwara ha.

Ka oge na-aga, i nwere ike ikwuwe gbasara onye ahụ nwụrụ anwụ, ikekwe, na-akọ gbasara àgwà ọma ụfọdụ onye ahụ nwere ma ọ bụ ihe ndị o mere mere gị obi ụtọ. Ịkọrọ onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ ihe ndị a nwedịrị ike ime ka o bido mụmụwa ọnụ ọchị. Dị ka ihe atụ, di otu nwaanyị aha ya bụ Pam nwụrụ afọ isii gara aga. Aha di ya a bụ Ian. Pam kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-agwa m gbasara ihe ọma di m mere m na-amaghịdị. Ọ na-emekwa m obi ụtọ.”

 Ndị na-eme nchọpụta kwuru na oge mmadụ nwụrụ ọhụrụ, ndị mmadụ na-abịa akasi ndị ezinụlọ ya obi. Ma, obere oge gachaa, onye ọ bụla ebidokwa mewe ihe ndị dịịrị ya, o nweghịzi onye ga-echeta bịa nyere ndị ahụ ihe mere aka. N’ihi ya, gbalịa ka gị na enyi gị mmadụ nwụnahụrụ na-ekwurịta okwu ọtụtụ mgbe. * Ụdị ihe a na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ n’ihi na ọ na-eme ka ha nwee ike ikwu otú nsogbu ahụ dị ha n’obi, ha enwetakwa onwe ha.

Legodị ihe mere Kaori. Ọ bụ nwa agbọghọ onye Japan. Mama ya nwụrụ, n’ime otu afọ na ọnwa atọ kwa, nwanne ya nwaanyị anwụọ. Obi gbawara ya. Ma ndị enyi ya nọgidere na-enyere ya aka. Aha otu n’ime ha bụ Ritsuko. Ritsuko tọrọ Kaori ọfụma. Ọ kpawara Kaori nso. Kaori kwuru, sị: “Ịgwa gị eziokwu, obi adịghị mụ mma maka otú o si na-eme ka ọ̀ bụ mama m. Achọghị m ka onye ọ bụla nọchie mama m, echeghịkwa m na onye ọ bụla ga-anọchili ya. Ma n’ihi otú mama a si na-egosi m na ya hụrụ m n’anya, mụ na ya bịara dị n’ezigbo mma. Mụ na ya na-eso aga ozi ọma na ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla. Ọ na-akpọ m ka mụ na ya ṅụkọọ tii ma ọ bụ rikọọ nri. Ọ na-edetara m akwụkwọ ozi, na-ezitekwara m kaadị ọtụtụ oge. Àgwà ọma mama a nyeere m ezigbo aka.”

Afọ iri na abụọ agaala kemgbe mama Kaori nwụrụ. Taakwa, Kaori na di ya na-ezisa ozi ọma oge niile. Kaori kwuru, sị: “Mama Ritsuko nọgidere na-egosi m na ya hụrụ m n’anya. Mgbe ọ bụla m gara ụlọ anyị, m na-aga eleta ya. Mụ na ya kparịtachaakwa, obi na-adị m ụtọ.”

Onye ọzọ ndị mmadụ kasiri obi mgbe mmadụ nwụnahụrụ ya bụ otu nwaanyị Saịprọs aha ya bụ Poli. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Aha di ya bụ Sozos. Di ya ejighị ya egwu egwu. Ọ bụkwa okenye e ji ama atụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ na-akpọkarị ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ka ha bịa n’ụlọ ha, ha esoro ha kparịta ụka, rikọọkwa nri. (Jems 1:27) Ma ọrịa akpụ ụbụrụ gburu Sozos mgbe ọ dị afọ iri ise na atọ. Poli sịrị: “Ọnwụ egbuola ezigbo di m mụ na ya lụrụla ruo afọ iri atọ na atọ.”

Chọọ otú ị ga-esi na-enyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka

Mgbe e lichara Sozos, Poli kpọọrọ Daniel nwa ha nwoke nke nta dị́ afọ iri na ise kwaga Kanada. Mgbe ha rutere, ha malitere iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova nọ́ ebe ahụ na-amụ ihe. Poli kwuru, sị: “Ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ a amaghị gbasara ihe mere anyị na nsogbu anyị na ya na-alụ. Ma, ha bịara na-akpa anyị nso, na-agwa anyị okwu ndị na-eru anyị n’obi, na-enyekwara anyị aka n’ihe ụfọdụ. Aka ahụ ha nyeere anyị baara anyị ezigbo uru, karịchaa, n’ihi na o mere ka nwa m nwoke ghara ịna-echegbukarị onwe ya maka ọnwụ papa ya. Ụmụnna ndị na-elekọta ọgbakọ anyị ejighị Daniel egwu egwu. Otu n’ime ha na-akpọ ya aga ebe ọ bụla ya na ndị enyi ya chọrọ ịga nọrịa. Ọ na-akpọkwa ya aga agba bọl.” Poli na nwa ya nwoke na-enwe obi ụtọ taa.

Otu ihe doro anya bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka ma kasie ha obi. Ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu na-akasikwa anyị obi.

^ para. 6 Ụfọdụ ndị na-akanye akara ụbọchị onye ahụ nwụrụ na kalenda ha, ka ha nwee ike icheta ịkasi ndị ọ nwụnahụrụ obi n’ụbọchị ọ bụla ọ manyere n’afọ ma ọ bụ ma ụbọchị ahụ ruwe.