Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

Mmadụ Iru Uju Ọ̀ Dị Njọ?

Mmadụ Iru Uju Ọ̀ Dị Njọ?

Ò nwetụla mgbe ị rịara obere ọrịa? Ọ bụrụ na o nwetụla, ikekwe, ị gbakere ngwa ngwa nke na i chefuodịla nsogbu o nyere gị. Ma, ọ bụghị otú ọ na-adị ma mmadụ ruwe uju. Otu dọkịta aha ya bụ Alan Wolfelt kwuru ihe ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ di ma ọ bụ nwunye ya. Ọ sịrị: “Mmadụ anaghị akwụsị iru uju akwụsị.” Ma, o kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-agbalị akasi onye ahụ obi, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe ya.”

Ka anyị legodị ihe Ebreham mere mgbe nwunye ya nwụrụ. Baịbụl kwuru na o “bidoro ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.” (Jenesis 23:2; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, nke afọ 2013, Bekee) Mgbe Baịbụl kwuru na Ebreham “bidoro” ịkwara nwunye ya ákwá arịrị, ọ na-egosi na o were ya oge tupu ya enwee ike idi ọnwụ nwunye ya. * Jekọb rutekwara uju aka mgbe ụmụ ya ghọgburu ya, mee ka o were ya na anụ ọhịa adọgbuola Josef nwa ya. O ruuru ya uju ruo “ọtụtụ ụbọchị.” Ndị ezinụlọ ya enwelighịkwa ike ịkasi ya obi. Mgbe ọtụtụ afọ gachakwara, ọnwụ Josef ka nọ na-ewute ya.—Jenesis 37:34, 35; 42:36; 45:28.

Ebreham ruru uju mgbe Sera nwunye ọma ya nwụrụ

Ọ bụkwa otú ọ na-adị ọtụtụ ndị taa ma onye ha na ha dị n’ezigbo mma nwụọ. Ka anyị leba anya n’akụkọ mmadụ abụọ.

  • Otu nwaanyị aha ya bụ Gail, onye dị́ afọ iri isii, kwuru, sị: “Robert di m nwụrụ n’otu ihe mberede mere n’abalị itoolu n’ọnwa Julaị afọ 2008. Mgbe anyị richara nri ụtụtụ n’ụbọchị ahụ, anyị mere ihe anyị na-emekarị tupu ya agawa ọrụ. Anyị susuru ibe anyị ọnụ, makụọ ibe anyị, sịkwa ibe anyị, ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Afọ isii ọ nwụchara, ọnwụ ya ka na-agbawa m obi. Echeghị m na ọ ga-apụli m apụ n’obi.”

  • Otu nwoke aha ya bụ Etienne, onye dị́ afọ iri asatọ na anọ, kwuru, sị: “N’agbanyeghị na ọ karịala afọ iri na asatọ nwunye ọma m nwụrụ, agụụ ịhụ ya na-agụ m, m ka na-erukwara ya uju. M hụ ihe mara mma, mụ echeta ya, na-echekwa otú obi gaara adị ya ma á sị na ọ hụrụ ihe ahụ m hụrụ.”

N’eziokwu, o nweghị onye ọ na-adịrị mfe idi ọnwụ mmadụ. Otú ndị mmadụ si eru uju dị iche iche, ọ dịghịkwa mma ịta mmadụ ụta maka otú o si eru uju. Anyị ekwesịghịkwa ịtawa onwe anyị ụta ma o siwere anyị ike idi ọnwụ onye nwụnahụrụ anyị. Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka idi ya?

^ para. 4 Aịzik nwa Ebreham bụkwa onye ọzọ ruru uju ruo ogologo oge. N’isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke dị́ n’Ụlọ Nche a, e kwuru na mgbe ihe dị ka afọ atọ Sera nne ya nwụchara, ọ ka na-eru uju ọnwụ ya.—Jenesis 24:67.

GỤKWUO GBASARA YA

Otú Ị Ga-esi Die Ọnwụ Di Gị ma Ọ Bụ Ọnwụ Nwunye Gị

Ọ bụrụ na di mmadụ ma ọ bụ nwunye ya anwụọ, ọ na-agbawa obi. Tụlee otú olileanya mbilite n’ọnwụ Baịbụl kwuru okwu ya si akasi mmadụ obi.