Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2016

Ihe a bụ otu n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị e ji dee Baịbụl. Ihe dị́ n’ebe ndị a gbara okirikiri bụ aha Chineke

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Chineke ò nwere aha?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-ASỊ na o nweghị aha, ndị ọzọ na-asị na aha ya bụ Chineke ma ọ bụ Onyenwe anyị, ndị ọzọ na-asịkwa na o nwere ọtụtụ aha. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ aha a na-etu Chineke, ma, o nwere naanị otu aha ọ gụrụ onwe ya.—Ọpụpụ 3:15.

  • Anyị ga-amatali onye Chineke bụ; ọ chọrọ ka anyị mata ya.—Ọrụ Ndịozi 17:27.

  • Anyị mata aha Chineke, o nwere ike ime ka anyị na ya dịwa ná mma.—Jems 4:8.

Ọ̀ dị njọ ịkpọ aha Chineke?

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Ee

  • Mba

  • Mgbe ụfọdụ

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ejila aha Jehova bụ́ Chineke gị eme ihe efu.” (Ọpụpụ 20:7) Naanị mgbe ọ dị njọ ịkpọ aha Chineke bụ ma e jiri ya na-egwu egwu.—Jeremaya 29:9.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

 

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.