Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 6 n'Afọ 2016

Ụgbala

Ihe Anyị Na-amụta n’Aka Anụ Ufe nke Eluigwe

Ihe Anyị Na-amụta n’Aka Anụ Ufe nke Eluigwe

“Biko, jụọ . . . anụ ufe nke eluigwe, ha ga-akọkwara gị. Olee nke n’ime ihe ndị a niile nke na-amaghị nke ọma na ọ bụ aka Jehova mere ihe a?”—Job 12:7, 9.

IHE karịrị puku afọ atọ gara aga, e nwere otu nna ochie aha ya bụ Job. Ọ ghọtara na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka anụ ufe nke eluigwe ma ọ bụ ụmụ nnụnụ gbasara ihe ndị Chineke kere. Ma, otú ụmụ nnụnụ si eme ihe na-eme ka e jiri ha na-eme ihe atụ ma ọ bụ na-akụziri anyị ihe. Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ebe e kwuru gbasara ha. E ji ha na-akụziri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ na otú anyị na Chineke ga-esi na-adị ná mma. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

EBE ELEKENTỊỌBA NA-ARỤ AKWỤ́

Elekentịọba

Ndị bi na Jeruselem ma nnụnụ a na-akpọ elekentịọba nke ọma. Ọ na-arụ akwụ́ n’elu ụlọ. Ụfọdụ n’ime ha rụrụ akwụ́ n’ogige ụlọ nsọ Chineke nke Sọlọmọn rụrụ. Ọ ga-abụ na enweghị ihe na-eme elekentịọba ndị ahụ na-arụ akwụ́ ha n’ogige ụlọ nsọ Chineke kwa afọ n’ihi na ebe ahụ na-adị ha mma ịnọ zụọ ụmụ ha.

Ọ bụ otu n’ime ụmụ Kora dere Abụ Ọma nke 84. Ọ na-eje ozi n’ụlọ nsọ Chineke otu izu n’ọnwa isii ọ bụla. Ọ na-ahụkwa akwụ́ ndị ahụ elekentịọba rụrụ n’ogige ụlọ nsọ Chineke. Ọ chọsiri ike ibi n’ụlọ Jehova mgbe niile ka elekentịọba ndị ahụ rụrụ akwụ́ ha ebe ahụ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha. Lee ka m si hụ ụlọikwuu gị dị ebube n’anya. Agụụ ogige ụlọ Jehova agụkatala mkpụrụ obi m ike gwụ ya. Jehova nke ụsụụ ndị agha, Eze m na Chineke m, ọbụna nnụnụ enwetawo ebe obibi, elekentịọba kpakwara akwụ́, ná nnukwu ebe ịchụàjà gị, bụ́ ebe o debeworo ụmụ ya.’ (Abụ Ọma 84:1-3) Ọ̀ na-agụsi anyị na ụmụ anyị agụụ ike ịga ọmụmụ ihe, ma na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ọmụmụ ihe anyị na-aga?—Abụ Ọma 26:8, 12.

ỤGBALA MAARA OGE YA

Jeremaya kwuru, sị: “Ụgbala nke na-efe n’eluigwe maara oge ya a kara aka.” Ọ ma nke ọma na ụgbala na-esi n’otu obodo fere gafee Ala Nkwa ahụ gaa obodo ọzọ. N’oge opupu ihe ubi, e nweela mgbe ụgbala ọcha karịrị narị puku atọ si n’Afrịka fere gafee Ndagwurugwu Jọdan ruo na Yurop. Oge ụla ha ruo, ahụ́ ha na-agwa ha ka ha laghachị ebe ha na-anọ n’oge ọkọchị. Ha ‘ma nke ọma oge ha ji alọta,’ otú ahụ nnụnụ ndị ọzọ na-efe otú ha si efe si ama.—Jeremaya 8:7.

Otu akwụkwọ aha ya bụ Collins Atlas of Bird Migration kwuru, sị: “Ihe mere otú ụmụ nnụnụ si esi n’otu mba aga mba ọzọ ji eju ndị mmadụ anya bụ na ha na-ama mgbe ha ji aga na mgbe ha ji alọta.” Ọ bụ Jehova Chineke nyere nnụnụ ndị a ụdị amamihe a, nyekwanụ mmadụ amamihe o ji amata oge ihe ụfọdụ ji eme. (Luk 12:54-56) Ọ bụ ihe Chineke na-akụziri anyị na-enyere anyị aka ịghọta ihe ihe ndị na-eme n’oge anyị a pụtara. Ma, ụgbala enweghị ike ịghọta ihe ndị a n’ihi na Chineke enyeghị ha ụdị amamihe o nyere mmadụ. N’oge Jeremaya, ndị Izrel aghọtaghị ihe ihe ndị na-eme n’oge ha pụtara. Chineke kwuru ihe kpatara ya.  Ọ sịrị: “Ha ajụwo okwu Jehova, olee ụdị amamihe ha nwere?”—Jeremaya 8:9.

N’oge anyị a, anyị nwere ọtụtụ ihe na-egosi na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1-5) Ị̀ ga-achọnụ ịdị ka ụgbala ma mata ihe ‘oge a kara aka’ na-egosi?

ANYA YA NA-ERU N’EBE DỊ OKÉ ANYA

Ugo

E kwuru okwu banyere ugo ọtụtụ ugboro na Baịbụl. E nwere ọtụtụ ọmarịcha ugo n’Ala Nkwa ahụ. Baịbụl kwuru na ugo na-esi n’akwụ́ ya dị n’ọnụ ọnụ nkume dị n’ugwu dị elu aga “achọ nri, anya ya na-erukwa n’ebe dị oké anya.” (Job 39:27-29) Ugo na-ahụ ụzọ nke ọma nke na o nwere ike ịnọ otu ebe hụ ewi nọ otu kilomita.

Jehova na-ama ihe ga-eme n’ọdịnihu dị oké anya, otú ahụ ugo na-ahụ ihe dị “n’ebe dị oké anya.” Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo na ya bụ “onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ, onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.” (Aịzaya 46:10) Jehova nwere amamihe na-enweghị atụ, marakwa ihe echi ga-abụ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọ na-agwa anyị, ọ ga-abara anyị uru.— Aịzaya 48:17, 18.

Baịbụl jikwa ndị na-atụkwasị Chineke obi tụnyere ugo. O kwuru, sị: “Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike. Ha ga-eji nku fegoo n’elu dị ka ugo.” (Aịzaya 40:31) Ikuku ọkụ na-ala elu na-enyere ugo aka ifego elu elu. Ozugbo ugo chọpụtara ikuku a, ọ na-agbasa nku ya, na-agba ikuku a gburugburu, ikuku a eburu ya na-aga elu elu. Ugo enweghị ike ifego elu elu n’onwe ya ma o nweghị ihe na-enyere ya aka. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị tụkwasịrị Jehova obi. Ha nwere obi ike na Jehova ga-enye ha “ike karịrị ike nkịtị” otú ahụ o kwere ha ná nkwa.—2 Ndị Kọrịnt 4:7, 8.

“DỊ KA NNEKWU ỌKỤKỌ SI ACHỊKỌTA ỤMỤ YA”

Nnekwu ọkụkọ na ụmụ ya

Obere oge tupu e gbuo Jizọs, ọ nọ otu ebe lee Jeruselem, bụ́ isi obodo ndị Juu, anya. Ọ mara ọsụ ma kwuo, sị: “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,—lee ọtụtụ ugboro m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị, dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya. Ma unu achọghị ya.”—Matiu 23:37.

Otu n’ime ihe ndị magburu onwe ya nnụnụ ma ọ bụ nnekwu ọkụkụ na-eme bụ na ha na-achọ ichebe ụmụ ha ka ihe ọ bụla ghara ime ha. Dị ka ihe atụ, anya na-abụ nnekwu ọkụkọ ọkịrị ma ya na ụmụ ya nọrọ ka o nwee ike ịhụ mgbe nsogbu na-abịa. Ya hụ ebe egbe na-erugharị n’elu, ya ebee ubé, ka ụmụ ya mara na agwọ dị n’akịrịka. Ụmụ ya nụ ubé ahụ, ha agbara ọsọ gbaba n’okpuru nku ya ka egbe ahụ ghara iburu ha. Ha nwekwara ike ịgbaba n’okpuru nku nne ha mgbe oké anwụ na-acha ma ọ bụ mgbe ezigbo mmiri na-ezo. Jizọs chọrọ imere ndị bi na Jeruselem ụdị ihe a nnekwu ọkụkọ na-emere ụmụ ya. Ọ chọrọ ka ha bịakwute ya ka obi ruo ha ala, ha na Chineke adịrịkwa ná mma. N’oge anyị a, Jizọs na-agwakwa anyị ka anyị bịakwute ya. Ime otú ahụ ga-eme ka obi ruo anyị ala ná nsogbu ndị anyị na ha na-alụ kwa ụbọchị.—Matiu 11:28, 29.

O doro anya na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka nnụnụ ndị a. Ka ị na-ele otú ha si eme ihe, gbaa mbọ ka i cheta ihe atụ ndị e ji ha mee na Baịbụl na ihe ndị ha na-akụziri anyị. Ka ihe e kwuru gbasara elekentịọba mee ka i jiri ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye gị ike ị ga-eji fego elu ka ugo. Gbalịa ka ị bịakwute Jizọs ka ị mụta eziokwu dị na Baịbụl. Eziokwu a ga-echebe gị otú ahụ nnekwu ọkụkọ si echebe ụmụ ya n’okpuru nku ya. Ka ihe e kwuru gbasara ụgbala mee ka ị ghara ichefu ihe ihe ndị na-eme n’ụwa anyị a na-egosi.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

Chọpụta ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile, otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere, na ihe anyị ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso.