Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 6 n'Afọ 2016

Lefèvre d’Étaples—Ọ Chọrọ Ka Ndị Nkịtị Mara Okwu Chineke

Lefèvre d’Étaples—Ọ Chọrọ Ka Ndị Nkịtị Mara Okwu Chineke

E NWERE otu ihe mere n’otu ụtụtụ Sọnde n’ihe dị ka afọ 1522 n’obere obodo dị na Paris. Aha obodo a bụ Moo. Ihe ahụ merenụ bụ na a gụpụtaara ndị Katọlik bịara chọọchị ụbọchị ahụ Okwu Chineke n’asụsụ ha bụ́ French, kama ị gụrụ ha ya n’asụsụ Latịn. Ihe a tụrụ ha n’anya.

Onye sụgharịrị Baịbụl ahụ a gụpụtara na chọọchị bụ Jacques Lefèvre d’Étaples. O mechara degara otu ezigbo enyi ya akwụkwọ ozi, sị: “Ọ ga-eju gị anya ịhụ otú Chineke si na-eme ka [ndị nkịtị] nọ n’obodo ụfọdụ jiri Okwu ya na-akpọrọ ihe.”

N’oge ahụ, Chọọchị Katọlik na ndị ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe na Paris achọghị ka ndị mmadụ na-agụ Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ ndị ọzọ na-abụghị Latịn. Oleezi ihe mere Lefèvre ji sụgharịa Baịbụl n’asụsụ French? Olee otú o si nyere ndị nkịtị aka ịghọta ihe Okwu Chineke na-ekwu?

OTÚ O SI GBAA MBỌ KA Ọ GHỌTA IHE AKWỤKWỌ NSỌ KWURU

Tupu Lefèvre amalite ịsụgharị Baịbụl, o mere nchọnchọ ka ọ mata ihe ihe ndị e dere n’akwụkwọ ụfọdụ kọrọ banyere okpukpe nakwa amamihe ụwa pụtara. Mgbe ọ chọpụtachara ihe ha pụtara, o dezigharịrị ha ma kọwazie ha otú e kwesịrị isi akọwa ha. N’akwụkwọ ndị ahụ e dere kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọ chọpụtara na e nwere ihe ndị na-eduhie ndị mmadụ ndị sụgharịrị akwụkwọ ndị ahụ na-asụgharịtaghị. Ka ọ na-agba mbọ ka ọ ghọta ihe ndị e dere n’akwụkwọ ndị ahụ nke ọma, ọ malitere ilebakwu Baịbụl ndị Katọlik anya ka ọ mata otú e si sụgharịa ya. Aha Baịbụl a bụ Latin Vulgate.

Baịbụl ahụ Lefèvre malitere ilebakwu anya mere ka o kwuzie na “ịmụ eziokwu dị na Baịbụl na-eme . . . ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ.” Ọ bụ ya mere o ji kwụsị ịmụ akwụkwọ ndị ahụ ndị ọkà mmụta dere ma tinyezie isi n’ịsụgharị Baịbụl.

N’afọ 1509, Lefèvre bipụtara akwụkwọ Abụ Ọma * ise ndị ọzọ sụgharịrị n’asụsụ Latịn ka e were nke ọ bụla tụnyere ibe ya. O bipụtakwara Baịbụl Vulgate o dezigharịrị ihe na ya. Lefèvre emeghị ka ndị ọkà mmụta okpukpe ndị ọzọ e nwere n’oge ya. O ji okwu ndị mmadụ ga-aghọta sụgharịa Baịbụl. Otú o si sụgharịa Baịbụl nyeere ndị na-amụ gbasara Baịbụl na ndị chọrọ ka Chọọchị Katọlik gbanwee ihe ndị na-abụghị eziokwu ha na-akụzi, ezigbo aka.—Gụọ igbe bụ́ “ Otú Baịbụl Lefèvre Sụgharịrị Si Baara Martin Luther Uru.”

Ihe a bụ chaatị e dere utu aha Chineke e dere n’Abụ Ọma. E si n’akwụkwọ Fivefold Psalter nke e biri n’afọ 1513 nweta ya

Lefèvre bụ onye Katọlik. O kwetasiri ike na ọ bụrụ na e mee ka ndị nkịtị mata ihe Baịbụl na-ekwu, ọ ga-eme ka chọọchị gbanwee ihe ndị na-abụghị eziokwu ha na-akụzi ma na-eme. Ma, olee otú Baịbụl ga-esi baara ndị nkịtị uru ebe ọ bụ na ọtuṭụ Baịbụl e nwere n’oge ahụ dị n’asụsụ Latịn?

BAỊBỤL ONYE UKWU NA ONYE NTA NWERE IKE INWETA

Ihe e dere n’okwu mmalite nke akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn ahụ Lefèvre sụgharịrị, gosiri na ọ chọrọ ime ka mmadụ niile nweta Baịbụl n’asụsụ ha

Lefèvre ji Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji kpebisie ike ịsụgharị ya ka ọtụtụ ndị nweta ya. Ka o nwee ike ime ya, n’ọnwa Jun afọ 1523, o bipụtara akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn ọ sụgharịrị n’asụsụ French. Baịbụl a dị nkebi abụọ, dịrịkwa obere. Ihe e rere ya bụ ọkara ihe e rere nke nnukwu, ya emee ka ndi ogbenye nwee ike ịzụta ya.

 Ndị mmadụ malitere ịzụ Baịbụl a n’ike n’ike. Ha chọsiri ike ịgụ okwu Jizọs n’asụsụ ha. Ọ bụ ya mere otu puku na narị abụọ mbụ e bipụtara ji gwụ n’ime ọnwa ole na ole.

Ọ GBARA MBỌ SỤGHARỊA BAỊBỤL

N’okwu mmalite nke akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn ahụ Lefèvre sụgharịrị, Lefèvre kwuru na ihe mere ya ji sụgharịa ha n’asụsụ French bụ ka “ndị nkịtị” nọ na chọọchị “nwee ike ịgụ eziokwu dị na Baịbụl n’asụsụ French ma ghọta otu ihe ahụ ndị na-agụ nke e dere n’asụsụ Latịn ghọtara.” Ma, gịnị mere Lefèvre ji chọsie nnọọ ike inyere ndị nkịtị aka ka ha ghọta ihe Baịbụl na-akụzi?

Lefèvre ma na ozizi ụgha Chọọchị Katọlik na-akụziri ndị mmadụ eduhiela ha. (Mak 7:7; Ndị Kọlọsi 2:8) O kwetasikwara ike na oge eruola ka ‘e kwusaara ndị mmadụ n’ụwa niile ihe Jizọs kụziri, ka a gharazie iji ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-akụzi na-eduhie ndị mmadụ.’

Ọ gbakwara mbọ mee ka ndị mmadụ mata na ihe ndị na-achọghị ka a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ French na-ekwu, abụghị eziokwu. Ọ katọrọ omume ihu abụọ ha na-eme. Ọ sịrị: “Olee otú ha ga-esi na-akụziri [ndị mmadụ] ka ha na-eme ihe niile Jizọs nyere n’iwu, ebe ọ bụ na ha achọghị ka ha nweta Okwu Chineke ma na-agụ ya n’asụsụ ha?”—Ndị Rom 10:14.

Obere oge o kwuchara ihe a, ndị ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe na Mahadum Paris dị́ na Sọbọn, gbawara mbọ ime ka ọ kwụsị Baịbụl ahụ ọ nọ na-asụgharị. N’ọnwa Ọgọst afọ 1523, ha kwuru na ha achọghị ka a sụgharịa Baịbụl n’asụsụ ndị  nkịtị ma ọ bụ dee akwụkwọ ndị na-akọwa Baịbụl n’asụsụ ndị ahụ. Ha weere ha ka “ihe ga-eme ka ndị Katọlik dapụ n’okwukwe.” N’oge ahụ, ha gbara mbọ ka ha gbuo Lefèvre n’ihi na ha weere ya ka onye na-agba Chọọchị Katọlik mgba okpuru. Á sị na Eze Francis nke Mbụ emeghị ihe, ha gaara egbu ya.

Ọ SỤGHARỊCHARA BAỊBỤL N’AGBANYEGHỊ NSOGBU E NYERE YA

Lefèvre ekweghị ka nsogbu ndị ahụ a na-enye ya mee ka ọ kwụsị Baịbụl ọ nọ na-asụgharị. Mgbe ọ sụgharịchara Akwụkwọ Nsọ Grik n’afọ 1524, o wepụtara akwụkwọ Abụ Ọma ọ sụgharịrị n’asụsụ French. Ihe mere o ji wepụta ya bụ ka o nyere ndị kwere ekwe aka “iji ekpere kpọrọkwuo ihe, ma jiri obi ha niile na-ekpe ekpere.” Ihe ufọdụ ndị na-akpọ Akwụkwọ Nsọ Grik bụ Agba Ọhụrụ.

Ozugbo Lefèvre wepụtachara Baịbụl ahụ, ndị ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe na Sọbọn sara anya ná mmiri gụọ ya. Mgbe ha gụchara ya, ha nyere iwu ozugbo ka a kpọọ ya ọkụ n’ihu ọha. Ha kwukwara na Baịbụl ndị ọzọ ọ sụgharịrị bụ oké rie ọ nwụọ n’ihi na ha “na-akwado ozizi ọjọọ Luther na-ezi ndị mmadụ.” Mgbe ndị ọkà mmụta ahụ kpọrọ Lefèvre ka ọ bịa zara ọnụ ya, ọ gbachiri ha nkịtị ma gbaga n’obodo Strasbọg. Ọ nọkwa n’obodo a na-asụgharị Baịbụl na nzuzo. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị weere ya na ọ bụ onye ụjọ, ma ọ ghọtara na otú ahụ o si gbachie ha nkịtị bụ otú kacha mma e kwesịrị isi meso ndị na-achọghị iji ntị anụ eziokwu dị na Baịbụl, bụ́ nke e nwere ike iji tụnyere ezi nkume “pel.”—Matiu 7:6.

Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo otu afọ Lefèvre gbapụrụ, Eze Francis nke Mbụ kpọọrọ ya ka ọ kụziwere nwa ya nwoke dị afọ anọ ihe. Aha nwa ya ahụ bụ Charles. Ọrụ a mere ka Lefèvre nwee nnukwu ohere ịsụgharịcha Baịbụl ahụ ọ nọ na-asụgharị. N’afọ 1530, e bipụtara Baịbụl zuru ezu ọ sụgharịrị. Ma, ọ bụ na Antwap ka ọ nọ bipụta ya, ọ bụghịzi na Frans. Ọ bụ Eze Ukwu Charles nke Ise nyere ikike ka e bipụta ya. *

IHE Ọ TỤRỤ ANYA YA

Mgbe Lefèvre nọ ndụ, ọ tụrụ anya na Chọọchị Katọlik ga-akwụsị ịkụzi ihe ndị ahụ na-abụghị eziokwu ha na-akụziri ndị mmadụ ma kụziwe eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. O kwetasiri ike na “Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịna-agụ Baịbụl na ịna-amụ ya.” Ọ bụ ya mere o ji gbaa ezigbo mbọ ime ka ọ dịrị onye ukwu na onye nta mfe inweta Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na ihe ahụ Lefèvre tụrụ anya ka o mee, emeghị, ma, Baịbụl ndị ahụ ọ sụgharịrị baara ndị nkịtị ezigbo uru. O mere ka ha mata Okwu Chineke.

^ para. 8 N’akwụkwọ bụ́ Fivefold Psalter, e depụtara akwụkwọ Abụ Ọma ise ahụ iche iche. E depụtakwara utu aha Chineke na mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ndị nọchiri aha Chineke.

^ para. 21 Na 1535, mgbe afọ ise gachara, otu onye aha ya bụ Olivétan wepụtakwara Baịbụl nke ya ọ sụgharịrị n’asụsụ French. O si na Baịbụl ndị e dere n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl sụgharịa ya. Baịbụl ahụ Lefèvre sụgharịrị nyeere Olivétan ezigbo aka mgbe ọ na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ọ̀ Na-ekwu Eziokwu?

Ọ bụrụ na Baịbụl bụ okwu Chineke, ọ ga-adị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ e detụrụla.