Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2016

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si emepụta akwụkwọ mpịakọta n’oge e dere Baịbụl, oleekwa ihe a na-eji ya eme?

Akwụkwọ mpịakọta e ji akpụkpọ anụ mee n’ihe dị ka n’agbata afọ 1701 na afọ 1800. Ihe e dere na ya bụ akwụkwọ Esta dị́ na Baịbụl

Oziọma Luk kwuru na Jizọs meghere akwụkwọ mpịakọta Aịzaya, gụọ ihe dị́ na ya, fụkọtakwa ya. Ná ngwụcha Oziọma Jọn, Jọn kwukwara gbasara akwụkwọ mpịakọta. Ọ sịrị na o nwere ihe ịrịba ama ndị Jizọs mere, ndị ya na-enwelighị ike idenye n’akwụkwọ mpịakọta o ji dee ihe.—Luk 4:16-20; Jọn 20:30; 21:25.

Olee otú e si emepụta akwụkwọ mpịakọta? Ọ na-abụ ewekọta akpụkpọ anụ ndị e ji ede ihe, ma ọ bụ nke a na-akpọ papaịrọs, e jiri ihe nyakọta ha, ha etoo ogologo otú e nwere ike ịfụkọta ha afụkọta. E nweziri ike ịfụkọta ya n’osisi otú ihe ndị e dere na ya ga-adị n’ime. A na-ede ihe na ya ná nkebi ná nkebi. E nwee akwụkwọ mpịakọta toro oké ogologo, a na-eji osisi abụọ afụkọta ya n’isi ya abụọ, otú ọ ga-abụ, onye chọọ ịgụ ya, ya ejiri otu aka meghee ya, jiri aka nke ọzọ na-afụkọta ya ruo mgbe ọ chọtara ebe ọ chọrọ ịgụ.

Otu akwụkwọ a na-akpọ The Anchor Bible Dictionary kwuru, sị: “Otu uru akwụkwọ mpịakọta bara bụ na ọ dị ogologo (ọ na-adịkarị ihe dị ka mita iri ma ọ bụ ihe dị ka amaụkwụ iri atọ na atọ n’ogologo), nke na e nwere ike iji otu akwụkwọ mpịakọta dee otu akwụkwọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị kwuru na ọ ga-abụ na ihe e dere n’Oziọma Luk bara n’otu mpịakọta akwụkwọ dị́ ihe dị ka amaụkwụ iri atọ na otu (ma ọ bụ mita itoolu na ọkara) n’ogologo. A na-akpụchakarị ọnụ ọnụ akwụkwọ mpịakọta, jiri ụdị nkume e ji echi ụkwụ mụọ ọnụ ọnụ ya, ya ana-akwọ mụrụmụrụ, e jirizie ihe tejie ya.

Who may have been the “chief priests” who were mentioned in the Christian Greek Scriptures?

Malite mgbe ndị Izrel bidoro inwe ndị nchụàjà, ọ na-abụ naanị otu onye na-abụ nnukwu onye nchụàjà n’otu oge. Onye ahụ ga-abụgide ya ruo mgbe ọ nwụrụ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:25) Erọn bụ onye mbụ ghọrọ nnukwu onye nchụàjà n’Izrel. Nnukwu onye nchụàjà nwụọ, ọ na-abụkarị diọkpara ya na-aghọzi nnukwu onye nchụàjà. (Ọpụpụ 29:9) Ọtụtụ n’ime ụmụ nwoke ndị sí n’ezinụlọ Erọn ghọrọ ndị nchụàjà. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ghọrọ nnukwu ndị nchụàjà.

Mgbe ndị mba ọzọ bidoro ịchị ụmụ Izrel, ndị a na-achị ha bịara jirizie aka ha na-ahọpụta onye Izrel ga-abụ nnukwu onye nchụàjà, na-achụpụkwa ya mgbe ha chọrọ. Ma, o yiri ka hà na-esikarị n’ezinụlọ ndị a ma ama ahọrọ onye ga-abụ nnukwu onye nchụàjà, karịchaa, ndị sí n’ezinụlọ Erọn. Ndị só ná “ndị isi nchụàjà” bụ ndị nọ́ n’isi n’ezinụlọ ndị nchụàjà. Ndị ọzọ nwekwara ike iso ná ha bụ ndị isi nke ìgwè iri abụọ na anọ bụ́ ndị nchụàjà, ndị a ma ama sí n’ezinụlọ e si ahọpụta nnukwu onye nchụàjà nakwa nnukwu ndị nchụàjà a chụpụrụ n’ọrụ ịchụàjà, dị ka Anas.1 Ihe E Mere 24:1-19; Matiu 2:4; Mak 8:31; Ọrụ Ndịozi 4:6.

GỤKWUO GBASARA YA

Ònye Dere Baịbụl?

Ndị dere Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova gwara ha ihe ha dere. Gịnị gosiri na ihe ha dere bụ Okwu Chineke?