Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2016

Ihe Anyị Ga-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala

Ihe Anyị Ga-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala

E NWEGHỊ ihe nwa a mụrụ ọhụrụ na-emeliri onwe ya. Mgbe a mụrụ anyị, ọ bụ ndị nne na nna anyị na-elekọta anyị. Mgbe anyị bidoro ịga ije, ọ na-abụ anyị hụ ndị ka anyị, obi amapụ anyị ma ọ bụrụ na naanị anyị so. Ma obi na-eru anyị ala ma anyị na papa anyị ma ọ bụ mama anyị soro, anyị ejide ya aka na-aga.

Mgbe anyị bụ ụmụaka, ezigbo ndụmọdụ ndị mụrụ anyị nyere anyị na otú ha si gosi anyị na ha hụrụ anyị n’anya mere ka ihe dịrị anyị mma. Mgbe anyị chọpụtara na ha hụrụ anyị n’anya, obi bịara na-erukwu anyị ala. Ha gwa anyị na anyị na-eme nke ọma, obi na-esikwu anyị ike, anyị na-emekwukwa nke ọma.

Mgbe anyị tolitewere, ezigbo ndị enyi anyị mere ka obi na-erukwu anyị ala. Ụjọ anaghị atụ anyị ma anyị na ha nọrọ, ha na-emekwa ka obi ghara ịna-awụnye anyị n’afọ ma anyị cheta ịga ụlọ akwụkwọ.

Otú ahụ ka ihe kwesịrị ịdịrị ụmụaka niile. Ma, o nwere ụmụaka ọ na-esiri ike inweta ezigbo ndị enyi, nweekwa ndị nke ndị mụrụ ha na-anaghị elekọta. Otu nwaanyị aha ya bụ Melissa * kwuru, sị: “M hụ ebe e sere ezinụlọ ndị na-emekọ ihe ọnụ, mụ agwa m onwe m, sị, ‘Ọ gaara atọgbu m atọgbu ma a sị na ezinụlọ anyị dị otú a mgbe m dị obere.’” O nwekwara ike ịbụ na ọ na-adị gị otú ahụ.

NSOGBU ỤMỤAKA OBI NA-ERUGHỊ ALA NA-ENWE

O nwere ike ịbụ na ụjọ na-atụkarị gị mgbe ị ka na-eto eto. O nwekwara ike ịbụ n’ihi na ndị mụrụ gị elekọtaghị gị nke ọma. I nwere ike icheta ọgụ mama gị na papa gị na-alụ mgbe niile, nakwa otú ha si mechaa gbasaa, gị ana-eche na ọ bụ gị mere ha ji gbasaa. O nwedịrị ike ịbụ na mama gị ma ọ bụ papa gị gwara gị okwu ọjọọ ma ọ bụkwanụ kụọ gị ihe mgbe ọ na-enweghị ihe i mejọrọ.

Olee ihe ụmụaka obi na-anaghị eru ala nwere ike ime? Ọ na-abụ ụfọdụ n’ime ha tolitetụ, ha ebido ịṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè. Ndị ọzọ na-abanye n’òtù ọjọọ ka ọ dị́ ha ka ò nwere ihe ha dị mma ya. E nwere ndị nke na-ebido mewe enyi nwoke na enyi nwaanyị n’ihi na ha chọrọ onye ga na-egosi ha na ọ hụrụ ha n’anya. Ma, ọ naghị ete aka ha agbasaakwa, ya akpatakwuoro ha obi erughị ala.

 Ma e nwekwara ndị nke na-agaghị emewe ihe ọjọọ ndị a. Ma, ha tolite, obi ha ana-agwa ha na e nweghị uru ha bara. Otu nwaanyị aha ya bụ Ana kwuru, sị: “Ọ bịara doo m anya na o nweghị ihe m dị mma ya, n’ihi na ọ bụ ihe mama m na-agwakarị m. O nweghị mgbe ọ bụla o gosiri m na ọ hụrụ m n’anya ma ọ bụkwanụ kelee m sị na m metere ihe m mere.”

Ọ bụghị naanị ihe mere anyị mgbe anyị na-etolite na-eme ka obi ghara iru anyị ala. Obi anaghị eru ụfọdụ ndị ala ma ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha gbaa alụkwaghịm, ma ọ bụ ma ha na nká na-alụ, ma ọ bụkwanụ n’ihi na otú ha dị adịghị ha mma. Ọ bụrụ na obi erughị anyị ala, ihe ọ sọkwara ya bụrụ ya kpatara ya, o nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, anyị na ndị ọzọ agharakwa ịdị ná mma. Oleezi ihe ga-enyere anyị aka ka obi na-eru anyị ala?

CHINEKE NA-ECHE BANYERE ANYỊ

Obi kwesịrị isi anyị ike na obi ga-eruli anyị ala. O nwere onye ga-enyeliri anyị niile aka. Ọ chọkwara inyere anyị aka. Ọ bụ Chineke n’onwe ya.

Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa anyị, sị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.” (Aịzaya 41:10, 13) O doro anya na o nweghị ihe kwesịrị ime ka anyị tụọ ụjọ ma anyị cheta na Chineke chọrọ ichebe anyị.

Baịbụl kwuru gbasara oge obi na-erughị ụfọdụ ndị Chineke ala, ma, ha emechaa tụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere ha aka. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Hana, bụ́ nne Samuel, chere na o nweghị ihe ya dị mma ya n’ihi na ọ mụtalighị nwa. A nọkwa na-akwa ya emo. Ya ejiri maka ya ghara ịna-eri nri, na-ebezi sọ ákwá. (1 Samuel 1:6, 8) Ma, mgbe ọ gwachara Chineke otú obi dị ya, obi bịara ruo ya ala.—1 Samuel 1:18.

O nwekwara mgbe obi na-eruchaghị otu ọbụ abụ aha ya bụ Devid ala. Eze Sọl nọ na-achọgharị otú ọ ga-esi egbu ya ruo ọtụtụ afọ. Ma, Devid gbanahụrụ ya ọtụtụ ugboro. Ihe a meziri ka ụjọ ọnwụ tụwa Devid mgbe ụfọdụ. (Abụ Ọma 55:3-5; 69:1) N’agbanyeghị ihe a mere ya, Devid dere, sị: “M ga-edina ala hie ụra n’udo, n’ihi na ọ bụ naanị gị, Jehova, na-eme ka m nọrọ n’obi iru ala.”—Abụ Ọma 4:8.

Ma Hana ma Devid gwara Jehova ihe na-enye ha nsogbu n’obi, Jehova nyekwaara ha aka. (Abụ Ọma 55:22) Olee otú anyị ga-esi eme ka ha?

 IHE ATỌ ANYỊ GA-EME KA OBI NA-ERUKWU ANYỊ ALA

1. Na-atụkwasị Jehova obi n’ihi na ọ bụ Nna gị.

Jizọs gwara anyị ka anyị mata Nna ya, “onye naanị ya bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Pọl onyeozi gwara anyị na ‘Chineke anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ Ndịozi 17:27) Jems kwuru na anyị ‘bịaruo Chineke nso, ọ ga-abịarukwa anyị nso.’—Jems 4:8.

Otu ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka obi na-eru anyị ala bụ ịmata na anyị nwere Nna bí n’eluigwe, onye hụrụ anyị n’anya ma na-eche gbasara anyị. Ọ bụ eziokwu na ịmụta ịtụkwasị Jehova obi nwere ike iwetụ oge, ma, ọtụtụ ndị agbalịala mụta ịtụkwasị ya obi, ya enyekwara ha aka. Otu nwaanyị aha ya bụ Caroline kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe m ghọtara na Jehova bụ Nna m ka m matara na enweela m onye m nwere ike ịkọrọ otú obi dị m. O mekwara ka obi ruo m nnọọ ala.”

Otu nwaanyị aha bụ Rachel kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova mere ka obi ruo m ala mgbe ndị mụrụ m hapụrụ m n’ụlọ gaa mba ọzọ. M na-akọrọ ya obi m, na-arịọkwa ya ka o nyere m aka ná nsogbu m niile. O nyekwaara m aka.” *

2. Soro ndị na-efe Chineke na-efe ya.

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha were ibe ha ka ụmụnne na ụmụnna. Ọ gwara ha na ‘ha niile bụ ụmụnna.’ (Matiu 23:8) Ọ chọrọ ka ezigbo ndị na-eso ụzọ ya na-ahụ ibe ha n’anya ma na-efekọ Chineke ọnụ dị ka otu nnukwu ezinụlọ.—Matiu 12:48-50; Jọn 13:35.

Ndị nọ́ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-eji obi ha dum agba mbọ ka obi na-eru ndị niile na-abịa ọmụmụ ihe ha ala otú o kwesịrị ịdị n’ezinụlọ Chineke. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọtụtụ ndị obi na-anaghị eru ala achọpụtala na obi na-eru ha ala ma ha gaa ọmụmụ ihe.

Otu nwaanyị aha ya bụ Eva kwuru, sị: “N’ọgbakọ anyị, e nwere otu nwanna nwaanyị mụ na ya bụ ezigbo enyi. Ọ na-aghọta otú obi dị m. Ọ na-ege m ntị ma m na-akọrọ ya otú obi dị m. Ọ na-agụrụ m ebe ụfọdụ na Baịbụl, sorokwa m kpee ekpere. Ọ na-abịakarị anọnyere m. Ọ na-ewepụta oge mụ na ya ana-akparịta ihe ndị na-enye m nsogbu n’obi. Anyị kwuchaakwa ya, ya adị m ka è buturu m ibu dị́ arọ m bu. O mere ka obi na-eru m ala.” Rachel kwukwara, sị: “Ahụrụ m ndị ghọọrọ m nne na nna n’ọgbakọ anyị. Ha gosiri m na ha hụrụ m n’anya, meekwa ka obi na-eru m ala.”

 3. Na-egosi ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya, na-emekwara ha ihe ọma.

Ọ bụrụ na ị na-egosi ndị ọzọ na ị hụrụ ha n’anya, na-emekwara ha ihe ọma, gị na ha ga na-adị ná mma. Jizọs kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ọ bụrụ na anyị ana-egosikwu ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị ga-achọpụta na hanwa ga-ahụkwukwa anyị n’anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.”—Luk 6:38.

Obi ga na-erukwu anyị ala ma anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya, hanwa ahụkwa anyị n’anya. Baịbụl kwuru na “ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Ndị Kọrịnt 13:8) Otu nwaanyị aha ya bụ María kwuru, sị: “N’ime ime obi m, ama m na ọ bụghị eziokwu na o nweghị ihe m dị mma ya. Inyere ndị ọzọ aka mere ka m kwụsị iche na o nweghị ihe m dị mma ya. Obi na-atọ m ụtọ mgbe ọ bụla m meere ndị ọzọ ihe ọma.”

MGBE OBI GA-ERU MMADỤ NIILE ALA

Ihe anyị na-ekwu abụghị na mmadụ mewe ihe atọ ndị anyị kwuru ebe a, obi eruwe ya ala ozugbo, ma ọ bụkwanụ na ọ gaghịzi enwe mgbe obi na-agaghị eru ya ala. Ma, obi ga-aka eru onye ahụ ala ma ọ na-eme ha. Caroline kwuru, sị: “A ka nwere mgbe ụfọdụ obi na-anaghị eru m ala. Ma, anaghịzi m eche na abaghị m uru. M ma na Chineke hụrụ m n’anya, enwekwara m ọtụtụ ezigbo ndị enyi na-eme ka obi ruo m ala.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Rachel. Ọ sịrị: “O nwere mgbe ụfọdụ obi na-ajọ m njọ. Ma, ama m na enwere m ụmụnna ndị mụ na ha so efe Chineke, ndị m nwere ike ịkọrọ mkpa m nakwa ndị na-eme ka m ghara ịna-echegbu onwe m. Ma, ihe kacha enyere m aka bụ ekpere m na-ekpegara Nna m bí n’eluigwe kwa ụbọchị.”

Baịbụl gwara anyị gbasara oge Chineke ga-eme ka ụwa a dị́ ọhụrụ. Obi ga-eru onye ọ bụla ala n’oge ahụ

O nwekwara mgbe obi ga na-eru mmadụ niile ala ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl gwara anyị gbasara oge Chineke ga-eme ka ụwa a dị́ ọhụrụ. Obi ga-eru onye ọ bụla ala n’oge ahụ. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:4) N’oge ahụ, o nweghịzi onye ga-eme ka obi ghara iru anyị ala, o nweghịkwa onye ga-emerụ anyị ahụ́. Anyị ‘agaghịdị echeta ihe mbụ niile’ ahụ mere ka obi ghara iru anyị ala. (Aịzaya 65:17, 25) Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jizọs, ga-eme ka e nwee “ezi omume” n’ụwa. Ezi omume a ga-emezi ka e nwee “ịnọ jụụ na ịnọ n’obi iru ala ruo mgbe ebighị ebi.”— Aịzaya 32:17.

^ para. 5 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 21 Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị chọrọ ịbịaru Chineke nso Baịbụl na-anaghị ha ego.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ọ̀ Ga-enyere M Aka Ma M Kpee Ekpere?

Nsogbu anyị hà na-emetụ Chineke n’obi?