Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2016

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na mmadụ nwụọ, o nwere ihe na-esi n’ime ya pụọ gaa dịwa ndụ ebe ọzọ, ma ndị ọzọ chere na onye nwụọ, nke ya agaala. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Anyị nwụọ, anyị adịghịzi adị.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • Nwoke mbụ, bụ́ Adam, laghachiri n’ájá mgbe ọ nwụrụ. (Jenesis 2:7; 3:19) Onye ọ bụla nwụrụnụ na-alaghachikwa n’ájá.—Ekliziastis 3:19, 20.

  • A gbagharala onye ọ bụla nwụrụ anwụ mmehie ya. (Ndị Rom 6:7) O nweghị ahụhụ ọzọ a ga-ata ya maka mmehie ndị o mere tupu ya anwụọ.

Mmadụ nwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Ee

  • Mba

  • O nwere ike

IHE BAỊBỤL KWURU

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ.”—Ọrụ Ndịozi 24:15.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Baịbụl na-ejikarị ọnwụ atụnyere ụra. (Jọn 11:11-14) Chineke ga-akpọteli onye nwụrụ anwụ, otú ahụ anyị ga-akpọteli onye na-ehi ụra.—Job 14:13-15.

  • Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ. Ọ bụkwa ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.—1 Ndị Eze 17:17-24; Luk 7:11-17; Jọn 11:39-44.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ndị Nwụrụ Anwụ?

Gịnị na-eme ndị nwụrụ anwụ? Ànyị ga-ahụ ndị anyị nwụrụ anwụ ọzọ? Gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ.