Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2016

 AKỤKỌ NDỤ

Jehova Mere Ka Ozi M Jeere Ya Gaa Nke Ọma

Jehova Mere Ka Ozi M Jeere Ya Gaa Nke Ọma

M gwara onyeisi ndị agha na e nweela mgbe a tụrụ m mkpọrọ n’ihi na ekweghị m aga agha. M jụrụ ya, sị, “Ị̀ chọrọ ime ka m gaa mkpọrọ ọzọ?” Nke ahụ bụ nke ugboro abụọ e nyere m iwu ka m soro ná ndị agha Amerịka.

A MỤRỤ m n’afọ 1926 n’obodo Kruksvil dị́ n’Ohayo, n’Amerịka. Papa m na mama m mụrụ ụmụ asatọ. Ha anaghị aga chọọchị, ma ha gwara mụ na ụmụnne m ka anyị gawa chọọchị. M gawara Chọọchị Metọdist. Mgbe m dị afọ iri na anọ, ụkọchukwu anyị nyere m onyinye maka na o nweghị ụbọchị Sọnde m na-agaghị chọọchị n’otu afọ.

Margaret Walker nyeere m aka ịmụta eziokwu (ọ bụ ya bụ nwanna nwaanyị nke abụọ ma é si n’aka ekpe)

N’oge ahụ, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova aha ya bụ Margaret Walker malitere ịbịa na-akụziri mama m Baịbụl. Ọ bụ onye agbata obi anyị. Otu ụbọchị, m kpebiri na m ga-anọ nụ ihe ha na-ekwu. Mama m chere na m ga-akpaghasịrị ha ihe ha na-amụ. N’ihi ya, ọ gwara m ka m pụọ n’èzí. Ma, m jisiri ike na-egere ihe ha na-ekwu. Mgbe nwaanyị ahụ bịakwuru ugboro ole na ole, ọ jụrụ m, sị, “Ị̀ ma aha Chineke?” Mụ asị ya, “Onye ọ bụla manụ ya. Aha ya bụ Chineke.” Ya asị m, “Weta Baịbụl gị, gụọ Abụ Ọma 83:18.” M gụrụ ya, chọpụta na aha Chineke bụ Jehova. M gbagara n’ebe ndị enyi m nọ, sị ha, “Unu laruo n’abalị, gụọnụ Abụ Ọma 83:18 na Baịbụl unu ka unu hụ ihe bụ́ aha Chineke.” I nwere ike ikwu na m malitere izi ndị ọzọ ozi ọma ozugbo.

M mụrụ Baịbụl, e mee m baptizim n’afọ 1941. Obere oge, a gwara m ka m duziwe ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ. M gwara mama m na ụmụnne m ka ha bịa. Ha niile malitere ịbịa ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ ahụ m na-eduzi. Ma, papa m enweghị mmasị.

OTÚ E SI MEGIDE M N’ỤLỌ

E nyekwuru m ọrụ n’ọgbakọ. Enwetakwara m ọtụtụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Otu ụbọchị, papa m tụrụ akwụkwọ ndị ahụ aka, sị m: “Ọ̀ kwa ị hụrụ akwụkwọ a niile? Achọghịzi m ịhụ ma gị ma ha n’ụlọ a.” M hapụrụ ụlọ anyị, gaa biri n’otu obodo dị́ nso a na-akpọ Zanzvil, nke dị́ n’Ohayo. Ma, m na-esi ebe ahụ aga agba mama m na ụmụnne m ume.

Papa m gbalịrị ịkwụsị mama m ịga ọmụmụ ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ gawa ọmụmụ ihe, papa m achụkwuru ya n’ụzọ, kpụrụ ya laghachi n’ụlọ. Ma, ọ na-esi n’ọnụ ụzọ ọzọ dị́ n’ụlọ anyị gbapụ, gaa ọmụmụ ihe. M gwara mama m, sị: “Enyela onwe gị nsogbu. Ike ịchụgharị gị ga-emecha gwụ ya.” Ka oge na-aga,  papa m kwụsịrị inye ya nsogbu, ya ana-agazi ọmụmụ ihe otú ọ chọrọ.

Mgbe e bidoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’afọ 1943, m malitere ime ihe omume n’ọgbakọ anyị. Ndụmọdụ e nyere m mgbe ọ bụla m mechara ihe omume nyeere m aka ịmụtakwu otú e si ekwu okwu.

MGBE M NA-EKWEGHỊ AGA AGHA

Mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ n’afọ 1944, ndị ọchịchị nyere m iwu ka m ghọọ onye agha. M gara n’ogige ndị agha dị́ na Kolọmbọs, Ohayo, e lee m ahụ́, mụ edejupụtakwa akwụkwọ ndị e nyere m. M gwakwara ndị isi n’ebe ahụ na agaghị m abụ onye agha. Ha ahapụ m ka m laa. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gara, otu onye uwe ojii bịara n’ụlọ m, sị m, “Corwin Robison, e nyere m ikike ịbịa nwụchie gị.”

Izu abụọ ihe ahụ mechara, ọkàikpe gwara m n’ụlọikpe, sị: “A sị na ọ dị m n’aka ikpebi, a gaara atụ gị mkpọrọ mkpụrụ ọka. È nwere ihe ị chọrọ ikwu?” Mụ asị ya: “Onye nwe m, e kwesịrị iwere m ka onye ụkọchukwu. M na-anọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ndị mmadụ ekwu okwu Chukwu. Eziela m ọtụtụ ndị ozi ọma Alaeze Chineke.” Ọkàikpe ahụ gwara òtù ikpe ga-ekpebi ikpe ahụ, sị: “Unu abịaghị ebe a ikpebi ma nwa okorobịa a ọ̀ bụ ụkọchukwu ka ọ̀ bụ na ọ bụghị. Ọ bụ ikpebi ma ò kwetara ịga agha ka ọ̀ bụ na o kwetaghị.” N’ihe na-erughị otu awa, òtù ikpe ahụ kpebiri na ikpe mara m. Ọkàikpe ahụ tụrụ m mkpọrọ afọ ise n’ụlọ mkpọrọ dị́ n’Ashland, Kentọki.

JEHOVA CHEBERE M N’ỤLỌ MKPỌRỌ

Anọrọ m izu abụọ mbụ n’ụlọ mkpọrọ dị́ na Kolọmbọs, Ohayo. N’ụbọchị nke mbụ, m nọrọ n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nke m. M kpere ekpere, sị Jehova: “Agaghị m anọli n’ụlọ mkpọrọ afọ ise. Amaghị m ihe m ga-eme.”

N’echi ya, ndị na-eche ndị mkpọrọ nche kwere ka m pụtatụ apụta. M gakwuuru otu onye mkpọrọ toro ogologo, nweekwa akpụ obi. Mụ na ya eguzoro ebe ahụ na-elepụ anya na windo. Ọ jụrụ m, sị, “Nwa Mkpụmkpụ, gịnị kpọtara gị ebe a?” Mụ asị ya, “Abụ m Onyeàmà Jehova.” Ya asị m, “Eziokwu? Ị̀ bịakwaranụ ebe a ime gịnị?” M sịrị ya, “Ndịàmà Jehova anaghị aga agha, ha anaghịkwa egbu mmadụ.” Ya asị, “Ihe mere e ji tụọ gị mkpọrọ bụ na i kweghị egbu mmadụ. Ihe mere e ji atụ ndị ọzọ mkpọrọ bụ na ha gburu mmadụ. Ọ̀ dabara adaba?” Mụ asị ya, “Mbanụ!”

Ọ sịrị m, “M nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ọzọ afọ iri na ise. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m gụrụ ụfọdụ akwụkwọ unu.” Mgbe m nụrụ ya, m kpere ekpere, sị: “Jehova, mee ka nwoke a nyewere m aka.” Aha onye mkpọrọ ahụ bụ Paul. Ọ sịrị m ozugbo: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ndị mkpọrọ ndị a emetụ gị aka, tie mkpu. M ga-emesi ya ike.” N’ihi ya, n’oge m nọrọ ebe ahụ,  e nweghị onye n’ime ndị mkpọrọ iri ise nọ́ n’ebe ahụ nyere m nsogbu.

Eso m ná Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’Ashland dị́ na Kentọki n’ihi na anyị ekweghị aga agha

Mgbe a kpọfere m n’ụlọ mkpọrọ dị́ n’Ashland, m hụrụ ụfọdụ ụmụnna ma nke a na-akọ, ndị nọ́ ebe ahụ tupu mụ abịa. Ha nyeere mụ na ụmụnna ndị ọzọ aka ịnọ Jehova nso. Ha na-ekenye anyị ọgụgụ Baịbụl kwa izu. Anyị na-akwadebekwa ajụjụ na azịza maka ọmụmụ ihe anyị na-akpọ Nnọkọ Baịbụl. Anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ ọnụ ụlọ ya buru ibu, e dewechaa àkwà n’akụkụ abụọ. E nwere nwanna ọrụ ya bụ ịhazi ebe onye ọ bụla ga na-ezi ozi ọma. Ọ na-asị m, “Robison, ọ bụ gị ketara àkwà nke a na nke a. Ọ bụ gị ga na-ezi ndị e nyere ha ozi ọma. Hụ na i ziri onye ọ bụla n’ime ha ozi ọma tupu ya anọchaa.” Otú ahụ ka e si hazie otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma.

IHE M HỤRỤ MGBE M SI N’ỤLỌ MKPỌRỌ PỤTA

Agha Ụwa nke Abụọ biri n’afọ 1945, ma a kpọpụtaghị m n’ụlọ mkpọrọ ozugbo ahụ. Ihe banyere mama m na ụmụnne m nọ na-echu m ụra n’ihi na o nwere mgbe papa m sịrị m: “Ọ bụrụ na m chụpụ gị, m ga-ama ihe m ga-eme ndị fọrọ afọ.” Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ihe m hụrụ mere m ezigbo obi ụtọ. Mmadụ asaa n’ezinụlọ anyị agawala ọmụmụ ihe, otu n’ime ụmụnne m ndị nwaanyị emeekwala baptizim n’agbanyeghị otú papa m si na-emegide ha.

Ebe mụ na Demetrius Papageorge nọ n’ozi ọma. Ọ bụ nwanna e tere mmanụ. Ọ malitere ijere Jehova ozi n’afọ 1913

Mgbe Agha Koria malitere n’afọ 1950, e nyere m iwu ọzọ ka m ghọọ onye agha. A gwara m ka m bịa ọzọ n’ogige ndị agha. Mgbe e lechara ma m̀ ruru eru ịga agha, otu onye agha sịrị m, “I so ná ndị kacha mee nke ọma.” Mụ asị ya, “Ọ dị mma, ma agaghị m aga agha.” M gwara ya ihe e kwuru na 2 Timoti 2:3, sịzie ya, “Abụ m onye agha Kraịst.” Ọ gbara nkịtị, nọkata sị m: “Ngwa, lawa.”

N’oge na-adịghị anya, m gara nnọkọ e nwere maka ndị chọrọ ịga Betel n’otu mgbakọ e mere na Sinsinati dị́ n’Ohayo. Nwanna Milton Henschel gwara anyị na a chọrọ ụmụnna ndị chọrọ ịna-arụsi ọrụ ike maka Alaeze Chineke. M dejupụtara akwụkwọ maka ozi Betel, e mechaa kpọọ m. M malitere ije ozi na Bruklin n’ọnwa asatọ, n’afọ 1954. Anọkwa m na Betel kemgbe ahụ.

Ọrụ zuru m ahụ́ kemgbe m bịara Betel. Ruo afọ ole na ole, ọ bụ m na-akpa aka n’ígwè na-esi mmiri ọkụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ nakwa n’ọfis dị́ iche iche, na-arụzikwa ígwè na ihe ndị e ji akpọchi ọnụ ụzọ. M na-agakwa arụ ọrụ n’Ụlọ Mgbakọ ndị dị́ na Niu Yọk Siti.

Ebe m na-arụ ọrụ n’ebe e nwere ígwè na-esi mmiri ọkụ na Betel dị́ na Bruklin

Ihe ndị a na-eme na Betel na-atọ m ezigbo ụtọ, ma ịtụle Okwu Chineke n’ụtụtụ ọ bụla ma Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ma iso ndị ọgbakọ anyị aga ozi ọma. I leruo ihe ndị a anya, ị ga-aghọta na ha bụ ihe ezinụlọ ọ bụla bụ́ Ndịàmà Jehova kwesịrị ịna-eme  mgbe niile. Ọ bụrụ na nne na nna na ụmụ ha na-atụlekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ, na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya, na-aga ọmụmụ ihe, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, o nwere ike ime ka ha niile nọrọ Jehova nso.

Emetala m ọtụtụ ndị enyi, ma na Betel ma n’ọgbakọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị e tere mmanụ, ndị garala eluigwe ugbu a. E nwekwara ndị na-abụghị ndị e tere mmanụ. Ma ndị ohu Jehova niile bụ ndị na-ezughị okè, ma ndị nọ́ na Betel. Ọ bụrụ na mụ na nwanna enwee nghọtahie, m na-agbalị mgbe niile ka anyị mee udo. M na-echeta Matiu 5:23, 24 nakwa otú anyị kwesịrị isi na-edozi nghọtahie. Ọ naghị adị mfe ịsị “ewela iwe,” ma a na-esikarị otú ahụ edozi ọtụtụ nghọtahie.

URU OZI M JERE BARA

Nká emeela ka ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ na-esiziri m ike, ma adabeghị m mbà. Amụtala m obere asụsụ Chaịniiz. Obi na-adịkwa m ụtọ ịgakwuru ndị Chaịna n’okporo ámá. N’ụtụtụ ụfọdụ, m na-enyefe ndị nwere mmasị magazin iri atọ ma ọ bụ iri anọ.

Ebe m na-ezi ndị Chaịna ozi ọma na Bruklin dị́ na Niu Yọk

E nwedịrị mgbe m meere onye nọ́ na Chaịna nletaghachi. Otu ụbọchị, otu ọmarịcha nwa agbọghọ mụmụụrụ m ọnụ ọchị mgbe ọ na-enye ndị mmadụ akwụkwọ o ji na-akpọsa ebe a na-ere mkpụrụ osisi. M mụmụkwaara ya ọnụ ọchị ma nye ya Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ Chaịniiz. Ọ naara m ha, gwa m na aha ya bụ Katie. Ọ na-abụzi, ya hụ m, ya abịa ka anyị kwurịta okwu. M kụziiri ya ihe ndị Bekee na-akpọ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri dị́ iche iche. Ọ na-abụ m kwuo, ya esoro m kwuo. M kọwakwaara ya amaokwu Baịbụl ụfọdụ, ya anara m akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ma, mgbe izu ole na ole gara, ahụghịzi m ya.

Mgbe ọtụtụ ọnwa gara, m nyere nwa agbọghọ ọzọ Ụlọ Nche na Teta! mgbe ọ na-enye ndị mmadụ akwụkwọ o ji na-akpọsa ebe a na-ere mkpụrụ osisi, ya anara m ha. N’izu na-eso ya, o nyere m ekwentị ya, sị m, “Gị na onye nọ́ na Chaịna kwuo.” Mụ asị ya, “O nweghị onye m ma na Chaịna.” Ma, o siri ọnwụ. N’ihi ya, m naara ya ekwentị ahụ, sị, “Heloo, aha m bụ Robison.” M nụrụ olu sịrị m, “Robby, ọ bụ Katie. Alaghachila m Chaịna.” M sịrị ya, “Ị̀ sịrị Chaịna?” Katie zara, sị: “Ee. Robby, ọ̀ kwa ị ma nwa agbọghọ ahụ nyere gị ekwentị i ji? Ọ bụ nwanne m. Ị kụziiri m ọtụtụ ihe ọma. Biko, kụziere ya ihe otú ahụ i si kụziere m.” Mụ asị ya, “Katie, m ga-anwa ike m. I meela gwa m ebe ị nọ ugbu a.” N’oge na-adịghị anya, mụ na nwanne Katie kwurịtara okwu nke ikpeazụ. Ebe ọ bụla ụmụ agbọghọ abụọ ahụ nọ ugbu a, m nwere olileanya na ha ga-amụta banyere Jehova.

Ejeerela m Jehova ozi afọ iri asaa na atọ. Obi dịkwa m ụtọ na o nyeere m aka ka m ghara ịga agha, meekwa ka m jiri obi m niile fee ya mgbe a tụrụ m mkpọrọ. Ụmụnne m na-agwakwa m na otú m si jisie ike na-efe Chineke n’agbanyeghị mmegide papa m nọ na-emegide m gbara ha ume. Mama m na mmadụ isii n’ime ụmụnne m mechara mee baptizim. Àgwà papa m gbanwetụrụ. Ọ gatụrụ ọmụmụ ihe tupu ya anwụọ.

Ọ bụrụ uche Chineke, ndị ezinụlọ m na ndị enyi m nwụrụla anwụ ga-adị ndụ n’ụwa ọhụrụ. Chegodị ụdị ọṅụ anyị ga-enwe mgbe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. *—Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.

^ para. 32 Ka a na-akwadebe ibipụta isiokwu a, Nwanna Corwin Robison nwụrụ. O fere Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ.