Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2016

Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi

Na-eṅomi Ndị Ha na Jehova Bụ Ezigbo Enyi

“Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya.”—ABỤ ỌMA 25:14.

ABỤ: 106, 118

1-3. (a) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-abụli enyi Chineke? (b) Olee ndị anyị ga-amụ banyere ha n’isiokwu a?

BAỊBỤL kpọrọ Ebreham enyi Chineke. (Aịzaya 41:8; Jems 2:23) Ọ bụ naanị ya ka Baịbụl kpọrọ enyi Chineke otú ahụ. Ọ̀ pụtara na e wepụ Ebreham, o nweghị mmadụ ọzọ bụtụrụla enyi Chineke? Mba. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na anyị niile ga-abụli enyi Chineke.

2 Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ndị tụrụ egwu Jehova, nwee okwukwe na ya, ha na ya abụrụkwa ezigbo enyi. (Gụọ Abụ Ọma 25:14.) Ha bụ ụdị ndị dị́ iche iche. Ha niile so ‘n’oké ìgwè ndị àmà’ Pọl kwuru banyere ha. Ha bụkwa ndị enyi Chineke.—Ndị Hibru 12:1.

3 Ka anyị mụọ banyere mmadụ atọ bụ́ ndị enyi Jehova Baịbụl kwuru gbasara ha. Onye nke mbụ bụ Rut, nwa agbọghọ Moab di ya nwụrụ. Onye nke abụọ bụ Hezekaya, onye só ná ndị eze Juda ji obi ha niile fee Jehova.  Onye nke atọ abụrụ Meri nne Jizọs, onye dị́ umeala n’obi. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú onye ọ bụla n’ime ha si ghọọ enyi Chineke?

RUT HỤRỤ JEHOVA NA NEOMI N’ANYA

4, 5. Olee ihe na-adịghị mfe Rut kpebiri ime? Gịnịkwa mere na ọ dịghị mfe ikpebi ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Neomi na ndị nwunye ụmụ ya, bụ́ Rut na Ọpa, si na Moab na-aga ka ha laghachi n’Izrel. Mgbe ha nọ n’ụzọ, Ọpa kpebiri ịlaghachi Moab. Ma Neomi kpebisiri ike na ya ga-alaghachi n’ala ya bụ́ Izrel. Gịnị ka Rut kpebiri ime? Ikpebi ihe ọ ga-eme adịghị mfe. Ọ̀ ga-alakwuru ndị ezinụlọ ha na Moab, ka ọ̀ ga-esoro nne di ya bụ́ Neomi gawa Betlehem?—Rut 1:1-8, 14.

5 Ndị ezinụlọ Rut bi na Moab. O nwere ike ịlakwuru ha, ha nwekwara ike ilekọta ya. Ọ ma ndị Moab, mara asụsụ ha, na omenala ha. Neomi agaghị ekweli ya nkwa na ihe ga-adịrị ya otú ahụ na Betlehem. Obi esighị Neomi ike na ya ga-eme ka Rut lụta di ma ọ bụ nweta ezinụlọ. N’ihi ya, Neomi gwara ya ka ọ laghachi Moab. Baịbụl gwara anyị na Ọpa ‘lakwuuru ndị ya na chi ya.’ (Rut 1:9-15) Ma Rut kpebiri na ọ gaghị alakwuru ndị ya na chi ụgha ha.

6. (a) Olee ihe dị́ mma Rut kpebiri ime? (b) Gịnị mere Boaz ji kwuo na Rut gbabara n’okpuru nku Jehova?

6 O nwere ike ịbụ na Rut si n’aka di ya ma ọ bụ Neomi mụta banyere Jehova. Ọ mụtara na Jehova adịghị ka chi ndị Moab. Ọ hụrụ Jehova n’anya, marakwa na ọ bụ ya ka e kwesịrị ịhụ n’anya ma fee. N’ihi ya, ihe Rut kpebiri ime dị mma. Ọ sịrị Neomi: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ọ na-emetụ anyị n’ahụ́ ma anyị chee otú Rut si hụ Neomi n’anya. Ma ihe kadị mkpa bụ otú Rut si hụ Jehova n’anya. Otú ahụ o si hụ Jehova n’anya mekwara Boaz obi ụtọ, ya etoo ya maka ‘ịgbaba n’okpuru nku Jehova.’ (Gụọ Rut 2:12.) Ihe ahụ Boaz kwuru nwere ike ime ka anyị cheta otú nwa ọkụkọ si agbaba n’okpuru nku nne ya. (Abụ Ọma 36:7; 91:1-4) Otú ahụ ka Jehova si chebe Rut ma gọzie ya maka okwukwe ya. O nweghị mgbe Rut kwara ụta maka ihe ahụ o mere.

7. Ọ bụrụ na mmadụ na-egbu oge inyefe Jehova onwe ya, gịnị nwere ike inyere ya aka?

7 Ọtụtụ ndị na-amụta banyere Jehova, ma ha anaghị agbaba na nku ya. Ha na-egbu oge inyefe Jehova onwe ha ka e mee ha baptizim. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, chegodị ihe mere i ji na-egbu oge. Onye ọ bụla nwere chi ọ na-efe. (Jọshụa 24:15) Ihe i kwesịrị ime bụ ife ezi Chineke. Inyefe Jehova onwe gị ga-egosi na i nwere okwukwe na ọ ga-abụrụ gị ebe mgbaba. Ọ ga na-enyere gị aka ka ị na-efe ya n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara gị. Ọ bụ ihe Chineke meere Rut.

‘Ọ RAPAARA JEHOVA N’AHỤ́’

8. Kọwaa ihe ndị mere mgbe Hezekaya dị obere.

8 Ebe Hezekaya toro dị ezigbo iche n’ebe Rut toro. A mụrụ Hezekaya ná mba na-efe Chineke. Ma, ọ bụghị ndị Izrel niile ji obi ha niile na-efe Chineke. Nna Hezekaya, bụ́ Eze Ehaz, bụ onye ọjọọ. O mere ihe gosiri na ọ naghị akwanyere ụlọ nsọ Chineke ùgwù, meekwa ka ndị Izrel fewe chi ọzọ. Ehaz  surere ụfọdụ n’ime ụmụnne Hezekaya n’ọkụ iji chụọrọ arụsị àjà. Ọtụtụ ihe ọjọọ nọ na-eme mgbe Hezekaya dị obere.—2 Ndị Eze 16:2-4, 10-17; 2 Ihe E Mere 28:1-3.

9, 10. (a) Olee ihe gaara eme ka Hezekaya wesawa Jehova iwe? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iwesawa Chineke iwe? (ch) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na otú e si zụọ anyị ga-eme ka anyị bụrụ ajọ mmadụ?

9 Ihe ọjọọ Ehaz nọ na-eme nwere ike ime ka nwa ya Hezekaya wesawa Jehova iwe. Taa, ụfọdụ ndị nsogbu ha na-erudịghị ka nke Hezekaya na-eche na ha kwesịrị ‘ịna-eweso Jehova oké iwe’ ma ọ bụ na-eburu nzukọ ya iwe n’obi. (Ilu 19:3) E nwere ndị na-eche na ihe ọjọọ ndị mere mgbe ha dị obere pụtara na ha ga na-ebi ndụ ọjọọ ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ ndị mụrụ ha mere. (Ezikiel 18:2, 3) Ma ihe a ha na-eche ọ̀ bụ eziokwu?

10 Otú Hezekaya si bie ndụ gosiri na azịza ajụjụ ahụ bụ mba. E nweghị ihe kwesịrị ime ka mmadụ wesawa Jehova iwe. Ọ bụghị ya na-akpata ihe ọjọọ na-eme ndị mmadụ. (Job 34:10) N’eziokwu, ndị nne na nna nwere ike ịkụziri ụmụ ha ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Ilu 22:6; Ndị Kọlọsi 3:21) Ma ọ pụtaghị na ọ bụ otú e si zụọ anyị ga-eme ka anyị bụrụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ ajọ mmadụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere anyị ikike ikpebi ihe anyị ga-eme, ya bụ na anyị nwere ike ịhọrọ ma ànyị ga na-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. (Diuterọnọmi 30:19) Gịnị ka Hezekaya ji ikike ahụ Chineke nyere anyị mee?

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-amụta eziokwu Baịbụl n’agbanyeghị otú e si zụọ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)

11. Olee ihe mere Hezekaya ji soro ná ndị kacha bụrụ ezigbo ndị eze na Juda?

11 Hezekaya so ná ndị kacha bụrụ ezigbo ndị eze n’agbanyeghị na nna ya so ná ndị kacha bụrụ ndị eze ọjọọ na Juda. (Gụọ 2 Ndị Eze 18:5, 6.) O kpebiri na ya agaghị amụta àgwà ọjọọ nna ya. Kama ime otú ahụ, ọ họọrọ ige ndị amụma Jehova ntị nke ọma, ya bụ, ndị amụma dị́ ka Aịzaya, Maịka, na Hosia. O gere ntị na ndụmọdụ ha na ntụziaka ha. Ọ bụ ya mere o ji dozie ọtụtụ n’ime nsogbu nna ya kpatara. O mere ka ụlọ nsọ Chineke dị́ ọcha,  rịọ Chineke ka ọ gbaghara ndị Juda mmehie ha. O bibikwara arụsị ndị dị́ n’ala ha. (2 Ihe E Mere 29:1-11, 18-24; 31:1) Mgbe eze Asiria bụ́ Senakerib na-achọ ịbịa lụso Jeruselem ọgụ, Hezekaya gosiri na o nwere ezigbo obi ike na okwukwe. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-echebe ya. Ọ gbakwara ndị ọ na-achị ume. (2 Ihe E Mere 32:7, 8) Mgbe Hezekaya mechara dị́ mpako, Jehova gbaziri ya, ya eweda onwe ya ala. (2 Ihe E Mere 32:24-26) O doro anya na Hezekaya kpara àgwà ọma anyị kwesịrị iṅomi. O kweghị ka otú e si zụọ ya mee ka ọ bụrụ onye ọjọọ. Kama ime otú ahụ, o gosiri na ọ bụ enyi Jehova.

12. Olee otú ọtụtụ ndị taa sirila gosi na ha bụ ndị enyi Jehova otú Hezekaya gosiri?

12 N’ụwa taa, obi tara ọtụtụ ndị mmiri. Ha ahụghịkwa ibe ha n’anya. Ọtụtụ ụmụaka na-etokwa n’enweghị nne na nna hụrụ ha n’anya ma na-elekọta ha. (2 Timoti 3:1-5) N’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ Ndị Kraịst taa a na-azụghị nke ọma n’ezinụlọ ha, ha kpebiri na ha na Jehova ga-abụ enyi. Ha egosila na otú e si zụọ ha apụtaghị na ha ga-abụ ndị ọjọọ, otú Hezekaya gosiri. Chineke enyela anyị ikike ikpebi ihe anyị ga-eme. Anyị nwere ike ịhọrọ ife ya na ịsọpụrụ ya otú Hezekaya mere.

“LEE! ABỤ M NWA AGBỌGHỌ BỤ́ OHU JEHOVA!”

13, 14. Gịnị nwere ike ime ka ọrụ e nyere Meri yie ihe siri ezigbo ike, ma gịnị ka o kwuru mgbe Gebriel gwachara ya okwu?

13 Ọtụtụ afọ Hezekaya dịchara ndụ, otu nwa agbọghọ dị́ umeala n’obi aha ya bụ Meri ghọrọ enyi Jehova pụrụ iche, Jehova enye ya ọrụ na-enweghị atụ. Ọ ga-adị ime, mụọ Ọkpara Chineke ma zụọ ya. Ọ ga-abụrịrị na Jehova hụrụ Meri n’anya, tụkwasịkwa ya obi, nke mere o ji nye ya ụdị ọrụ ahụ. Ma, gịnị ka Meri mere mgbe ọ nụrụ banyere ọrụ ahụ e nyere ya?

“Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova!” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

14 Anyị na-ekwukarị banyere ihe ùgwù a e nyere Meri. Ma, olee ihe ụfọdụ nwere ike ịna-echegbu ya mgbe e nyere ya ọrụ ahụ? Dị ka ihe atụ, mmụọ ozi aha ya bụ Gebriel kwuru na ọ ga-atụrụ ime n’enweghị nwoke ya na ya nwere mmekọahụ. Ma, Gebriel ekwughị na ya ga-agwa ndị ezinụlọ Meri na ndị agbata obi ya otú Meri ga-esi atụrụ ime. Gịnị ka ha ga-eche? Olee otú ọ ga-esi eme ka Josef kweta na ya na nwoke ọzọ enweghị mmekọahụ? E nyekwara ya nnukwu ọrụ, nke bụ́ ịzụ Ọkpara Chineke ruo mgbe ọ ga-eto. Anyị amaghị ihe niile nọ na-echu Meri ụra. Ma, anyị ma ihe o kwuru mgbe Gebriel gwachara ya okwu. Ọ sịrị: “Lee!  Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.”—Luk 1:26-38.

15. Gịnị mere okwukwe Meri ji pụọ iche?

15 Meri nwere okwukwe pụrụ iche. O kwetara ime ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka o mee, otú ohu nwaanyị na-eme. Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-elekọta ya ma chebe ya. Olee otú Meri si nwee okwukwe siri ike otú ahụ? Anyị anaghị ebu okwukwe apụta ụwa. Ma, anyị nwere ike inwe okwukwe ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị nwee ya, na-arịọkwa Chineke ka ọ gọzie mbọ anyị na-agba. (Ndị Galeshia 5:22; Ndị Efesọs 2:8) Meri gbalịsiri ike mee ka okwukwe ya sie ike. Olee otú anyị si mara? Ka anyị leba anya n’otú o si gee ntị nakwa n’ihe ndị o kwuru.

16. Olee ihe gosiri na Meri na-ege ntị nke ọma?

16 Otú Meri si gee ntị. Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-anụ ihe ngwa ngwa,” gharakwa ‘ịna-ekwu okwu ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Meri gere ntị nke ọma. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o mere otú ahụ, nke ka nke, n’ihe ndị a gwara ya banyere Jehova. O wepụtara oge tụgharịa uche n’ihe ndị ahụ dị́ mkpa. Otu n’ime oge Meri mere otú ahụ bụ mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ agwa ya ihe mmụọ ozi gwara ha. Oge ọzọ bụ mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ. O kwuru ihe juru Meri anya. N’oge abụọ ahụ, Meri gere ntị, cheta ihe ndị a gwara ya ma chebara ha echiche nke ọma.—Gụọ Luk 2:16-19, 49, 51.

17. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta banyere Meri n’ihe ndị o kwuru?

17 Ihe ndị Meri kwuru. Baịbụl agwaghị anyị ọtụtụ n’ime ihe ndị Meri kwuru. Okwu kacha ogologo o kwuru dị na Luk 1:46-55. Ihe ndị ahụ Meri kwuru gosiri na ọ ma Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Olee otú anyị si mara? Ihe Meri kwuru yiri ihe Hana nne Samuel kwuru n’ekpere o kpere. (1 Samuel 2:1-10) Ọ dị ka Meri ò kwuru ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ihe dị́ ka ugboro iri abụọ n’ihe ahụ o kwuru. O doro anya na ọ na-amasị ya ikwu banyere eziokwu ọ mụtara n’aka Enyi ya kachanụ, bụ́ Jehova.

18. Olee ụzọ ndị anyị ga-esi ṅomie okwukwe Meri?

18 Jehova nwere ike inye anyị ọrụ mgbe ụfọdụ, ya adị anyị ka ànyị agaghị arụli ya otú ahụ ọ dị Meri. Ka anyị ṅomie Meri ma jiri obi umeala kweta ịrụ ọrụ e nyere anyị, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka. Anyị ga-eṅomikwa okwukwe Meri ma ọ bụrụ na anyị na-ege Jehova ntị nke ọma ma na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara banyere ya na nzube ya. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-eji ọṅụ agwa ndị ọzọ ihe ndị anyị mụtara.—Abụ Ọma 77:11, 12; Luk 8:18; Ndị Rom 10:15.

19. Olee obi ike anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na anyị na-eṅomi ndị Baịbụl kwuru na ha nwere okwukwe pụrụ iche?

19 O doro anya na Rut, Hezekaya, na Meri bụ ndị enyi Jehova otú ahụ Ebreham bụ. Ha so ‘n’oké ìgwè ndị àmà,’ ndị nwere ihe ùgwù ịbụ ndị enyi Chineke. Ka anyị na-eṅomi ndị ahụ nwere okwukwe pụrụ iche. (Ndị Hibru 6:11, 12) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị, mee ka anyị bụrụ enyi ya ruo mgbe ebighị ebi.