Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2016

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Jehova

Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Jehova

“Ka Jehova bụrụ onye akaebe n’etiti mụ na gị nakwa n’etiti ụmụ m na ụmụ gị ruo mgbe a na-akaghị aka.”—1 SAMUEL 20:42.

ABỤ: 125, 62

1, 2. Olee otú Jọnatan na Devid si gosi na ha bụ ezigbo ndị enyi ji obi ha niile kwado ibe ha?

MGBE Devid ka na-eto eto, ọ ga-abụrịrị na obi ike o nwere tụrụ Jọnatan n’anya. Devid gburu Golayat, bụ́ dike ndị Filistia, ma ‘buru isi ya’ bunye nna Jọnatan, bụ́ Eze Sọl nke Izrel. (1 Samuel 17:57) Obi siri Jọnatan ike na Chineke nọnyeere Devid. Malite n’ụbọchị ahụ, Jọnatan na Devid ghọrọ ezigbo enyi. Ha kwere nkwa na ha ga na-akwado ibe ha mgbe niile. (1 Samuel 18:1-3) Ruo mgbe Jọnatan nwụrụ, o ji obi ya niile na-akwado Devid.

2 Jọnatan kwadoro Devid n’agbanyeghị na Jehova họọrọ Devid ịbụ eze ọzọ ga-achị Izrel kama ịhọrọ yanwa. Mgbe Sọl chọkwara igbu Devid, Jọnatan chegbuwara onwe ya maka Devid. Ọ ma na Devid nọ n’ala ịkpa dị́ na Horesh. N’ihi ya, Jọnatan gara ebe ahụ gbaa ya ume ka ọ tụkwasị Jehova obi. Jọnatan sịrị Devid: “Egwu atụla gị; n’ihi na aka Sọl nna m agaghị enweta gị, gị onwe gị ga-abụ eze  Izrel, mụ onwe m ga-abụkwa osote gị.”—1 Samuel 23:16, 17.

3. Olee ihe dị́ Jọnatan mkpa karịa ịkwado Devid, oleekwa otú anyị si mara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Ọ na-amasị anyị ma ndị mmadụ na-akwado anyị. Ma ihe mere anyị ji nwee mmasị n’ebe Jọnatan nọ ọ̀ bụ naanị na ọ kwadoro Devid? Mba, ihe kacha Jọnatan mkpa bụ iji obi ya niile na-akwado Chineke. Ọ bụ ya mere o ji kwado Devid, gharakwa imere ya anyaụfụ, n’agbanyeghị na Devid ga-abụ eze ọ gaara abụ. Jọnatan nyedịịrị Devid aka ịtụkwasị Jehova obi. Ha abụọ ji obi ha niile kwado Jehova, kwadokwa ibe ha. Ha mezuru nkwa ha kwere, nke bụ́: “Ka Jehova bụrụ onye akaebe n’etiti mụ na gị nakwa n’etiti ụmụ m na ụmụ gị ruo mgbe a na-akaghị aka.”—1 Samuel 20:42.

4. (a) Gịnị ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ na ọṅụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Anyịnwa kwesịkwara ịna-akwado ndị ezinụlọ anyị, ndị enyi anyị, na ụmụnna anyị. (1 Ndị Tesalonaịka 2:10, 11) Ma nke kacha mkpa bụ na anyị ga na-akwado Jehova. Ọ bụ ya kere anyị. (Mkpughe 4:11) Ọ bụrụ na anyị ana-akwado ya, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ na ọṅụ. Ma, anyị ma na anyị kwesịrị ịna-akwado Chineke, ma mgbe o siri ike ime otú ahụ. Anyị ga-ahụ ụzọ dị iche iche ihe Jọnatan mere ga-esi nyere anyị aka ịna-akwado ya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle anọ n’ime ha. Nke mbụ, ma anyị chee na anyị ekwesịghị ịkwanyere onye anyị nọ n’okpuru ya ùgwù n’ihi àgwà ya. Nke abụọ, ma o siere anyị ike ikpebi onye anyị ga-akwado. Nke atọ, ma okenye ọgbakọ ghọtahie anyị ma ọ bụ mee anyị ihe ọjọọ. Nke anọ, ma o siere anyị ike imezu nkwa anyị kwere.

MGBE ANYỊ CHERE NA ANYỊ EKWESỊGHỊ ỊKWANYERE ONYE ANYỊ NỌ N’OKPURU YA ÙGWÙ N’IHI ÀGWÀ YA

5. Gịnị mere o ji siere ndị Izrel ike ịkwado Chineke mgbe Sọl bụ eze?

5 E nwere mgbe Jọnatan na ndị Izrel nọ ná nsogbu. Eze Sọl, bụ́ nna Jọnatan, nupụụrụ Jehova isi, Jehova ajụ ya. (1 Samuel 15:17-23) Ma Chineke hapụrụ Sọl ka ọ ka na-achị ruo ọtụtụ afọ. N’ihi ya, o siiri ndị Izrel ike ịkwado Chineke mgbe eze ọ họọrọ ka ọ nọkwasị “n’ocheeze Jehova” na-eme ihe jọgburu onwe ya.—1 Ihe E Mere 29:23.

6. Olee ihe gosiri na Jọnatan kwadoro Jehova?

6 Jọnatan ji obi ya niile kwado Jehova. Chegodị ihe Jọnatan mere obere oge Sọl malitechara inupụrụ Chineke isi. (1 Samuel 13:13, 14) N’oge ahụ, ìgwè ndị agha Filistia ji iri puku ụgbọ ịnyịnya atọ bịa ịlụso ndị Izrel agha. Ndị agha Sọl dị naanị narị isii. Ọ bụkwa naanị ya na Jọnatan ji ngwá agha. Ma Jọnatan atụghị ụjọ. O chetara ihe Samuel onye amụma kwuru, ya bụ: “Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.” (1 Samuel 12:22) Jọnatan sịrị onye agha ọzọ: “Ọ dịghị ihe na-egbochi Jehova isi n’aka ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ n’aka mmadụ ole na ole mee ka e nwee nzọpụta.” N’ihi ya, ya na onye agha ahụ lụsoro ụfọdụ ndị Filistia ọgụ ma gbuo ihe dị́ ka mmadụ iri abụọ. Jọnatan nwere okwukwe siri ike na Jehova, Jehova agọziekwa ya.  Jehova mere ka ala maa jijiji, nke mere ka ụjọ tụọ ndị Filistia. Ha malitere igburịta ibe ha, ndị Izrel emerie n’agha ahụ.—1 Samuel 13:5, 15, 22; 14:1, 2, 6, 14, 15, 20.

7. Olee otú Jọnatan si mesoo nna ya?

7 N’agbanyeghị na Sọl ka nọkwa na-enupụrụ Jehova isi, Jọnatan rubeere nna ya isi mgbe ọ bụla o kwere omume. Dị ka ihe atụ, o so nna ya lụọ agha iji chebe ndị Jehova.—1 Samuel 31:1, 2.

8, 9. Olee otú o si bụrụ na anyị na-akwado Chineke ma anyị na-akwanyere ndị anyị nọ n’okpuru ha ùgwù?

8 Ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị ọchịchị obodo anyị isi mgbe o kwere omume, ọ na-egosi na anyị na-akwado Jehova otú Jọnatan mere. Jehova kwere ka “ndị ọchịchị” ụwa a na-achị anyị. Ọ chọkwara ka anyị na-akwanyere ha ùgwù. (Gụọ Ndị Rom 13:1, 2.) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọchịchị na ndị na-anọchite anya ha ùgwù, ọ bụrụgodị na ha anaghị akwụwa aka ọtọ, anyị echeekwa na anyị ekwesịghị ịkwanyere ha ùgwù. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị niile Jehova kwere ka anyị nọrọ n’okpuru ha ùgwù.—1 Ndị Kọrịnt 11:3; Ndị Hibru 13:17.

Otu ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị na-akwado Jehova bụ ịna-akwanyere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ùgwù, ọ bụrụgodị na ọ naghị efe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9 Otu nwanna nwaanyị bí na Bolivia aha ya bụ Olga na-akwanyere di ya ùgwù n’agbanyeghị ihe ọjọọ di ya na-eme ya. O si otú a gosi na ọ na-akwado  Jehova. [1] (Tụlee ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Mgbe ụfọdụ, di ya na-agwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ ghara ịtụpụrụ ya ọnụ n’ihi na ọ bụ Onyeàmà Jehova. E nwedịrị mgbe ọ gwara ya na ọ ga-ahapụ ya ma kpọrọ ụmụ ha pụọ. Ma e nweghị mgbe Olga ji ‘ihe ọjọọ kwụọ ya ụgwọ ihe ọjọọ.’ Ọ gbasiri mbọ ike ka ọ bụrụ ezigbo nwaanyị. Ọ na-esiri di ya nri, na-asara ya ákwà, na-elekọtakwa ndị ezinụlọ ha nke ọma. (Ndị Rom 12:17) Mgbe o kwere ya omume, ọ na-eso di ya aga eleta ndị ikwu ya na ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, mgbe di ya chọrọ ịga obodo ọzọ mgbe a na-eli papa ya, ọ kwadebere ihe niile ha ga-eji aga. Mgbe ha gara n’ụlọ chọọchị tupu e lie ya, Olga nọ n’èzí chere di ya. Mgbe ọtụtụ afọ gara, di ya malitere ịkpaso ya àgwà ọma n’ihi ndidi ọ na-enwere ya na ùgwù ọ na-akwanyere ya. Ugbu a, ọ na-agwazi Olga ka ọ gaa ọmụmụ ihe, na-ebugakwa ya ọmụmụ ihe. Ọ na-esodị ya aga ọmụmụ ihe mgbe ụfọdụ.—1 Pita 3:1.

MGBE O SIIRI ANYỊ IKE IKPEBI ONYE ANYỊ KWESỊRỊ ỊKWADO

10. Olee otú Jọnatan si mata onye o kwesịrị ịna-akwado?

10 Mgbe Sọl kwuru na ya ga-egbu Devid, ọ dịrịghị Jọnatan mfe ikpebi onye ọ ga-akwado. Ọ chọrọ ịna-akwado nna ya, chọọkwa ịna-akwado Devid. Jọnatan ma na ọ bụ Devid ka Chineke nọnyeere, ọ bụghị Sọl. N’ihi ya, o kpebiri na ya ga na-akwado Devid. Ọ gwara Devid ka ọ gaa zoo, gwazie Sọl ihe mere o ji kwesị ịhapụ igbu Devid.—Gụọ 1 Samuel 19:1-6.

11, 12. Olee otú ịhụ Chineke n’anya si enyere anyị aka ikpebi na anyị ga na-akwado ya?

11 O nwere otu nwanna nwaanyị onye Ọstrelia aha ya bụ Alice. Mgbe ọ na-amụ Baịbụl, ọ na-akọrọ ndị ezinụlọ ya ihe ndị ọ na-amụta. Ọ gwara ha na ya agaghịzi eso ha na-agba Krismas, gwakwa ha ihe kpatara ya. Ná mbido, obi adịchaghị ndị ezinụlọ ya ụtọ. Ma, ha mechara wesawa ya ezigbo iwe. Ha chere na ihe banyere ha anaghịzi emetụ Alice n’obi. Mama ya gwara ya na ya achọghịzi iji anya ahụ ya. Alice sịrị: “O nyeghị m ọnụ okwu. O wutere m nke ukwuu n’ihi na m hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya.” Alice kpebiri onye ọ ga-akwado. Ọ sịrị: “M kpebiri na Jehova na Ọkpara ya dị m mkpa karịa onye ọ bụla ọzọ. E mere m baptizim ná mgbakọ ọzọ anyị nweziri.”—Matiu 10:37.

12 Anyị ekwesịghị ikwe ka ịkwado ihe ọ bụla ọzọ, dị́ ka òtù egwuregwu, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ obodo anyị dị anyị mkpa karịa ịkwado Jehova. Dị ka ihe atụ, obi na-adị otu nwa okorobịa aha ya bụ Chidi ụtọ iso òtù egwuregwu e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha na-azụ okwe e ji asọ mpi. Ọ chọkwara ibutere ụlọ akwụkwọ ha iko n’otu asọmpi e ji ama onye bụ́ ọkaibe. Ma, ọ naghịzi enwe ohere ịga ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe n’ihi na ọ na-azụ okwe ahụ ná ngwụcha izu ọ bụla. Chidi kwuru na ịkwado ụlọ akwụkwọ ha dịzi ya mkpa mgbe ahụ karịa ịkwado Chineke. N’ihi ya, o kpebiri ịkwụsị okwe ahụ ọ na-azụrụ ụlọ akwụkwọ ha.—Matiu 6:33.

13. Olee otú ịkwado Chineke ga-esi nyere anyị aka idi nsogbu n’ezinụlọ anyị?

13 N’ezinụlọ, ọ na-esi ike mgbe ụfọdụ ịma onye anyị ga-adụnyere úkwù. Dị ka  ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Ken sịrị: “M chọrọ ịna-aga ahụ mama m merela agadi mgbe niile, chọọkwa ka ọ na-abịa anọ n’ụlọ m mgbe ụfọdụ. Ma, ihe anaghị adabachara mama m na nwunye m.” O kwukwara, sị: “O nweghị otú m ga-esi mee ihe dị́ otu onye mma n’akpasughị onye nke ọzọ iwe.” Ken chebaara ihe Baịbụl kwuru echiche ma ghọta na ya kwesịrị ime ihe ga-adị nwunye ya mma ma na-akwado ya. N’ihi ya, ọ chọpụtara otú ọ ga-esi dozie nsogbu ahụ, nke mere ka obi dị nwunye ya mma. Ọ gwara nwunye ya ihe mere nwunye ya ga-eji na-emere mama ya ihe ọma, gwakwa mama ya ihe mere o ji kwesị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù.—Gụọ Jenesis 2:24; 1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

MGBE NWANNA GHỌTAHIERE ANYỊ MA Ọ BỤ MEE ANYỊ IHE ỌJỌỌ

14. Olee ihe ndị na-adịghị mma Sọl mere Jọnatan?

14 Anyị kwesịkwara igosi na anyị na-akwado Jehova ma okenye ọgbakọ mee anyị ihe na-adịghị anyị mma. Ọ bụ Chineke mere Sọl eze. Ma, ihe Sọl mere nwa ya adịghị mma. Ọ ghọtaghị ihe mere Jọnatan ji hụ Devid n’anya. N’ihi ya, mgbe Jọnatan gbalịrị inyere Devid aka, ezigbo iwe were Sọl, ya anọrọ n’ihu ndị mmadụ menye Jọnatan ihere. Ma, Jọnatan akwụsịghị ịna-akwanyere nna ya ùgwù. Ọ nọkwa na-akwado Jehova, na-akwadokwa Devid, bụ́ onye Chineke họọrọ ịbụ eze ọzọ ga-achị Izrel.—1 Samuel 20:30-41.

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma nwanna mee anyị ihe ọjọọ?

 15 Taa, n’ọgbakọ anyị dị́ iche iche, ndị okenye na-agbalịsi ike ime ka obi dị onye ọ bụla mma. Ma ha ezughị okè. N’ihi ya, ha nwere ike ịghọtahie ihe mere anyị ji mee ihe anyị mere. (1 Samuel 1:13-17) Ọ bụrụ na ha aghọtahie anyị, ka anyị gosi na anyị na-akwado Jehova.

MGBE O SIIRI ANYỊ EZIGBO IKE IMEZU NKWA ANYỊ KWERE

16. Olee mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwado Chineke nakwa na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị?

16 Sọl chọrọ ka ọ bụrụ Jọnatan ga-abụ eze ọzọ ga-achị Izrel, ọ bụghị Devid. (1 Samuel 20:31) Ma, Jọnatan hụrụ Jehova n’anya, na-akwadokwa ya. Ọ bụ ya mere Jọnatan achọghị naanị ọdịmma nke ya. Kama, o metara Devid enyi ma mezuo nkwa o kwere ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla hụrụ Jehova n’anya ma na-akwado ya agaghị agbanwe nkwa o kwere, ọ bụrụgodị na imezu ya nwere ike “iwetara ya nsogbu.” (Abụ Ọma 15:4) Ebe ọ bụ na anyị na-akwado Chineke, anyị ga na-emezu nkwa anyị kwere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na mmadụ ekwekọrịta ihe anyị ga-eme n’okwu achụmnta ego, anyị ga-eme ihe anyị kwetara ime, ọ bụrụgodị na o siere anyị ike. Anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwee nghọtahie, otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịna-akwado di anyị ma ọ bụ nwunye anyị.—Gụọ Malakaị 2:13-16.

Ọ bụrụ na anyị na mmadụ ekwekọrịta n’ihe gbasara achụmnta ego, anyị ga-eme ihe anyị kwetara ime n’ihi na anyị na-akwado Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Gịnị ka ị mụtara n’isiokwu a?

17 Anyị kwesịrị ịna-akwado Chineke, ma mgbe ihe siri ike, otú Jọnatan mere. N’ihi ya, ka anyị na-akwado ụmụnna anyị mgbe ha mejọrọ anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. Ọ bụ ihe ga-akacha eme anyị obi ụtọ. (Ilu 27:11) Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na-emere anyị ihe ga-akacha baara anyị uru, na-elekọtakwa anyị mgbe niile. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-amụta n’aka ụfọdụ n’ime ndị jí obi ha niile kwado Devid nakwa ndị na-akwadoghị ya.

^ [1] (paragraf nke 9) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.