Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) FEBỤWARỊ 2016

Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”

Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”

“Gị onwe gị, Izrel, bụ ohu m, gị onwe gị, Jekọb, bụ onye m họọrọ, mkpụrụ Ebreham bụ́ enyi m.”—AỊZAYA 41:8.

ABỤ: 91, 22

1, 2. (a) Olee otú anyị si mata na ụmụ mmadụ ga-abụli enyi Chineke? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

ỊHỤNANYA dị anyị niile mkpa malite mgbe a mụrụ anyị ruo mgbe anyị ga-anwụ. Ihe ndị mmadụ chọrọ abụghị naanị ịhụnanya nwoke na nwaanyị, ha chọkwara ezigbo ndị enyi ga-ahụ ha n’anya. Ma, ihe kacha anyị mkpa bụ ka Jehova hụ anyị n’anya. Ọtụtụ ndị ekwetaghị na Chineke ga-ahụli ndị mmadụ n’anya maka na ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile, a naghịkwa ahụ ya anya. Ma anyị ma nke bụ́ eziokwu.

2 Anyị mụtara na Baịbụl na e nweela ụmụ mmadụ ha na Chineke bụ enyi. Anyị kwesịrị ịmụta ihe n’aka ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mee bụ imeta Chineke enyi. N’ihi ya, ka anyị mụọ gbasara Ebreham. (Gụọ Jems 2:23.) Olee otú o si ghọọ enyi Chineke? Ọ bụ okwukwe Ebreham mere ka ya na Chineke bụrụ enyi. Baịbụl kpọrọ ya “nna nke ndị niile  nwere okwukwe.” (Ndị Rom 4:11) Ka ị na-echebara ihe Ebreham mere echiche, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-esi ṅomie okwukwe Ebreham, meekwa ka mụ na Jehova bụrụ ezigbo enyi?’

OLEE OTÚ EBREHAM SI GHỌỌ ENYI JEHOVA?

3, 4. (a) Kọwaa ọnwụnwa nwere ike ịbụ nke kacha sie ike bịaara Ebreham. (b) Gịnị mere Ebreham ji kweta iji Aịzik chụọ àjà?

3 Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ebreham ji nwayọọ nwayọọ na-arị otu ugwu mgbe ọ dị ihe dị ka otu narị afọ na iri abụọ na ise. [1] (Gụọ ihe e dere ná ngwụcha isiokwu a.) Nwa ya Aịzik bu nkụ, soro ya na-aga. Ọ dị ihe dị́ ka iri afọ abụọ na ise mgbe ahụ. Ebreham ji mma na ihe ọ ga-eji menwuo ọkụ. O nwere ike ịbụ na njem ahụ bụ njem kacha siere Ebreham ike ná ndụ ya niile. Ma, ọ bụghị n’ihi nká ọ kara. Ume ka juru ya n’obi. Ihe mere njem ahụ ji siere ya ike bụ na Jehova gwara ya ka o jiri nwa ya chụọrọ ya àjà.—Jenesis 22:1-8.

4 Ọ dị ka ọ̀ bụ ya bụ ọnwụnwa kacha sie ike bịaara Ebreham. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ maka na Chineke dị obi ọjọọ mere o ji gwa Ebreham ka o jiri nwa ya chụọrọ ya àjà. Ndị ọzọ na-ekwu na ihe mere Ebreham ji kweta iji nwa ya chụọrọ Chineke àjà bụ na ọ hụghị nwa ya n’anya. Ihe mere ha ji ekwu ihe a niile bụ na ha enweghị okwukwe, ha amaghịkwa ihe ezigbo okwukwe pụtara ma ọ bụ otú o si arụ ọrụ. (1 Ndị Kọrịnt 2:14-16) Ma Ebreham erubereghị Chineke isi n’echeghị echiche. Ihe mere o ji rubere ya isi bụ na o nwere ezigbo okwukwe. Ọ ma na Jehova agaghị agwa ya mee ihe ga-akpatara ya nsogbu ga-adịte aka. Ebreham ma na ọ bụrụ na ya erube isi, Jehova ga-agọzi ya na nwa ya ọ hụrụ n’anya. Gịnị mere Ebreham ji nwee okwukwe siri ike otú ahụ? Ọ bụ ihe ọ mụtara banyere Jehova na ihe Jehova meere ya.

5. Ònye ka o nwere ike ịbụ na Ebreham si n’aka ya mụta banyere Jehova? Olee otú obi dị ya n’ihi ihe ahụ ọ mụtara?

5 Ihe ọ mụtara banyere Jehova. Ebreham toro n’obodo Ọọ. Nna ya na ndị ọzọ bí n’obodo ahụ na-ekpere arụsị. (Jọshụa 24:2) Oleezi otú Ebreham si  mụta banyere Jehova? Ihe Baịbụl kwuru gosiri na nwa Noa bụ́ Shem so ná ndị nna ochie Ebreham. Ọ dị ndụ ruo mgbe Ebreham dị ihe dị́ ka otu narị afọ na iri ise. Shem nwere okwukwe siri ike. Anyị amaghị ma Ebreham ò si n’aka Shem mụta banyere Jehova. Ma o nwere ike ịbụ na Shem nọ na-agwa ndị ezinụlọ ya banyere Jehova. Ihe Ebreham mụtara mere ka ọ hụ Jehova n’anya, meekwa ka o nwee okwukwe.

6, 7. Olee otú ihe ndị Jehova meere Ebreham si mee ka okwukwe ya sikwuo ike?

6 Ihe Chineke meere ya. Olee otú Ebreham si mụta ihe mere ka okwukwe o nwere na Jehova sie ike? Ụfọdụ na-asị na ihe mmadụ na-eche n’obi ya ga-eme ka obi dị ya mma ma ọ bụ jọọ ya njọ nakwa na otú obi dị mmadụ ga-eme ka o mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ihe Ebreham mụtara banyere Chineke ruru ya n’obi, meekwa ka ọ na-akwanyere “Jehova Chineke bụ́ Onye Kasị Elu, Onye kere eluigwe na ụwa,” ùgwù. (Jenesis 14:22) Baịbụl kpọrọ ụdị nkwanye ùgwù ahụ “egwu Chineke.” (Ndị Hibru 5:7) Anyị ga na-atụ egwu Chineke ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi. (Abụ Ọma 25:14) Ọ bụ ịtụ egwu ya mere ka Ebreham rubere ya isi.

7 Chineke gwara Ebreham na Sera ka ha sí n’obodo ha bụ́ Ọọ kwapụ, gaa biri ná mba ọzọ. Ha akatala ahụ́ mgbe ahụ, ha ga-ebikwa n’ụlọikwuu ruo mgbe ha ga-anwụ. N’agbanyeghị na Ebreham ma na ha ga-enwe ọtụtụ nsogbu, o kpebisiri ike irubere Jehova isi. Otú ahụ o si rube isi mere ka Chineke gọzie ya ma chebe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Abimelek kpọọrọ ọmarịcha nwunye Ebreham bụ́ Sera, ụjọ atụọkwa Ebreham na a ga-egbu ya, Jehova rụrụ ọrụ ebube chebe ya na Sera ihe karịrị otu ugboro. (Jenesis 12:10-20; 20:2-7, 10-12, 17, 18) Ihe ndị ahụ merenụ mere ka okwukwe Ebreham sikwuo ike.

8. Olee otú anyị ga-esi mụta ihe ga-eme ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma?

8 Anyị na Jehova ànyị ga-abụli ezigbo enyi? Eheenụ! Anyị kwesịrị ịmụta banyere Jehova otú ahụ Ebreham mere. Anyị ga-amụtali banyere ya, e nwekwara ọtụtụ ihe ọ ga-emere anyị. Taa, ihe anyị ga-amụta karịrị ihe Ebreham mụtara. (Daniel 12:4; Ndị Rom 11:33) Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere “Onye kere eluigwe na ụwa.” Ihe anyị na-amụta na-eme ka anyị hụ Jehova n’anya, na-enyekwara anyị aka ịna-akwanyere ya ezigbo ùgwù. Ịhụ  Chineke n’anya na ịkwanyere ya ùgwù na-eme ka anyị na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-ahụ otú o si na-echebe anyị ma na-agọzi anyị, matakwa ihe ndị ọ na-emere anyị ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-efe ya, obi ga-adị anyị mma, ruo anyị ala, anyị enweekwa ọṅụ. (Abụ Ọma 34:8; Ilu 10:22) Ọ bụrụ na anyị ana-amụtakwu banyere Jehova, na-ahụkwa ihe ndị ọ na-emere anyị, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma.

OTÚ EBREHAM SI MEE KA YA NA CHINEKE NỌGIDE NA-ABỤ ENYI

9, 10. (a) Gịnị ga-eme ka ndị enyi na-adịkwu ná mma? (b) Olee ihe gosiri na Ebreham ji enyi ya na Jehova bụ kpọrọ ihe, gbaakwa mbọ ka ha na-adịkwu ná mma?

9 Inwe ezigbo enyi yiri inwe akụ̀ bara uru. (Gụọ Ilu 17:17.) Ọ dịghị ka inwe ihe dara oké ọnụ, nke e ji achọ ụlọ mma. Ọ dị ka ihe a kụrụ akụ, nke a ga na-agba mmiri, na-elekọtakwa ka o nwee ike ịna-eto. Ebreham ji enyi ya na Jehova bụ kpọrọ ezigbo ihe, na-agbakwa mbọ ka ya na ya nọgide na-abụ enyi. Olee otú o si mee ya?

Inwe enyi dị ka ihe a kụrụ akụ, nke a ga na-agba mmiri, na-elekọtakwa ka o nwee ike ịna-eto

10 Ebreham gbara mbọ ka ọ ghara ịkwụsị ịtụ egwu Chineke na irubere ya isi. Dị ka ihe atụ, mgbe ya na ezinụlọ ya na ndị ohu ya kwagara Kenan, ọ kwụsịghị ịrịọ Jehova ka o nyere ya aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma, ma n’obere ihe ma ná nnukwu ihe. Otu afọ tupu a mụọ Aịzik, mgbe Ebreham dị ihe dị́ ka afọ iri itoolu na itoolu, Jehova gwara ya ka o bie ụmụ nwoke niile nọ́ n’ezinụlọ ya úgwù. Ihe ahụ Jehova kwuru ò mewara Ebreham obi abụọ, ka ọ̀ chọwara ihe ọ ga-akụdo aka ka ọ ghara ime ya? Mba. Ọ tụkwasịrị Jehova obi, meekwa ihe ọ gwara ya ‘kpọmkwem n’ụbọchị ahụ.’—Jenesis 17:10-14, 23.

11. Gịnị mere Ebreham ji na-echegbu onwe ya banyere Sọdọm na Gọmọra, oleekwa otú Jehova si nyere ya aka?

11 Otú Ebreham si na-erubere Jehova isi, ma n’obere ihe, mere ka ha na-adịkwu ná mma. Obi siri ya ike na ya nwere ike ịgwa Jehova ihe ọ bụla. Ọ jụkwara Jehova ajụjụ banyere ihe ndị na-enye ya nsogbu n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kwuru na ọ ga-ebibi Sọdọm na Gọmọra, obi kooro Ebreham n’elu. N’ihi gịnị? O chere na a ga-ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume. Ọ ga-abụ na ọ nọ na-echegbu onwe ya banyere nwa nwanne ya bụ́ Lọt na ndị ezinụlọ ya, bụ́ ndị bí na Sọdọm. Ebreham tụkwasịrị Jehova, bụ́ “Onyeikpe nke ụwa dum,” obi. N’ihi ya, o ji obi umeala gwa Jehova ihe na-echegbu ya. Jehova nweere ya ndidi ma gosi ya na ya na-eme ebere. Jehova kọwaara ya na ọ bụrụgodị na ya ebibiwe ndị ajọ omume, ọ ga-achọ ndị ezi omume ma chebe ha.—Jenesis 18:22-33.

12, 13. (a) Olee otú ihe Ebreham mụtara na ihe Jehova meere ya si mechaa baara ya uru? (b) Olee ihe gosiri na Ebreham tụkwasịrị Jehova obi?

 12 O doro anya na ihe ndị Ebreham mụtara na ihe ndị Jehova meere ya mere ka ya na Jehova nọgide na-abụ enyi. N’ihi ya, mgbe Jehova mechara gwa Ebreham ka o jiri nwa ya nwoke chụọ àjà, obi siri ya ike na Jehova na-enwe ndidi, na-eme ebere, na-echebe ndị ohu ya, na-emezukwa ihe o kwuru. Obi siri ya ike na ihe ahụ Jehova gwara ya mee apụtaghị na Jehova dịzi obi ọjọọ ma ọ bụ aka ike. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

13 Tupu Ebreham ahapụ ndị na-ejere ya ozi, ọ sịrị ha: “Nọrọnụ n’ebe a, unu na ịnyịnya ibu a, ma mụ na nwa okoro a ga-aga n’ebe ahụ fee ofufe ma lọghachikwute unu.” (Jenesis 22:5) Gịnị ka ihe a Ebreham kwuru pụtara? Ọ̀ ghaara ha ụgha na ya na Aịzik ga-alọghachikwute ha, ebe ọ ma na ya ga-eji Aịzik chụọ àjà? Mba. Baịbụl kwuru na Ebreham ma na Jehova ga-akpọliteli Aịzik n’ọnwụ. (Gụọ Ndị Hibru 11:19.) Ebreham ma na Jehova mere ka o nwee ike ịmụta nwa n’agbanyeghị na ya na Sera akaala ezigbo nká. (Ndị Hibru 11:11, 12, 18) N’ihi ya, ọ ghọtara na o nweghị ihe Jehova na-agaghị emeli. Ebreham amaghị ihe ga-eme n’ụbọchị ahụ. Ma, o nwere okwukwe na ọ́ dị mkpa, Jehova ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ ka nkwa niile Chineke kwere nwee ike imezu. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ Ebreham “nna nke ndị niile nwere okwukwe.”

Ebreham nwere okwukwe na ọ́ dị mkpa, Jehova ga-akpọlite nwa ya n’ọnwụ ka nkwa niile Chineke kwere nwee ike imezu

14. Olee ihe ndị na-esiri gị ike n’ozi ị na-ejere Jehova? Olee otú ihe Ebreham mere nwere ike isi nyere gị aka?

14 Taa, Jehova agwaghị anyị ka anyị jiri ụmụ anyị chụọrọ ya àjà, ma ọ gwara anyị ka anyị na-erubere iwu ya isi. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na anyị aghọtaghị ihe mere o ji nye iwu ndị a ma ọ bụkwanụ ya esiere anyị ike irubere ha isi. Ò nwere mgbe ọ na-adị gị otú ahụ? E nwere ndị ikwusa ozi ọma na-esiri ike. O nwere ike ịbụ na ha bụ ndị ihere, ya ana-esiri ha ike ịgwa ndị ha na-amaghị okwu. E nwekwara ndị ụjọ na-atụ ịgbapụ iche n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. (Ọpụpụ 23:2; 1 Ndị Tesalonaịka 2:2) Ọ bụrụ na a gwa gị mee ihe siri ike, cheta okwukwe na obi ike na-enweghị atụ Ebreham nwere. Anyị tụgharịa uche n’ihe ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi mere, ọ ga-eme ka anyị ṅomie ha, anyị na Jehova, bụ́ Enyi anyị, ana-adịkwu ná mma.—Ndị Hibru 12:1, 2.

CHINEKE NA-AGỌZI NDỊ ENYI YA

15. Gịnị mere obi nwere ike iji sie anyị ike na o nweghị mgbe Ebreham kwara ụta maka na o ji obi ya niile rubere Jehova isi?

15 Ò nwere mgbe Ebreham kwara ụta maka na o rubeere iwu Jehova isi?  Baịbụl kwuru na Ebreham ‘nwụrụ n’ezigbo agadi, kaa nká ma nwee afọ ojuju.’ (Jenesis 25:8) Mgbe Ebreham dị otu narị afọ na iri asaa na ise, obi na-adị ya ụtọ ma o cheta ọtụtụ afọ ọ dịrị ndụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe kacha ya mkpa bụ na ya na Jehova bụ enyi. Ma, mgbe Baịbụl kwuru na Ebreham ‘kara nká, nwee afọ ojuju,’ ọ pụtaghị na ọ chọghị ịdị ndụ n’ọdịnihu.

16. Olee ihe ndị ga-eme ka Ebreham nwee obi ụtọ na Paradaịs?

16 Baịbụl kwuru na Ebreham nọ “na-echere obodo ahụ nke nwere ezi ntọala, bụ́ obodo nke ọ bụ Chineke bụ onye wuru ma mee ya.” (Ndị Hibru 11:10) Ebreham nwere okwukwe na otu ụbọchị, ọ ga-ahụ ka obodo ahụ, ya bụ, Alaeze Chineke, na-achị ụwa. Ọ ga-emecha hụ ya. Chegodị ụdị obi ụtọ Ebreham ga-enwe mgbe ọ ga-ebi na paradaịs ga-adị n’ụwa, ya ana-agbakwa mbọ ka ya na Chineke dịkwuo ná mma. Obi ga-adị ya ụtọ ịma na otú o si nwee okwukwe baara ndị ohu Chineke uru ruo ọtụtụ puku afọ. Na Paradaịs, ọ ga-amata na e nwere ihe ka ukwuu àjà ahụ ọ chọrọ iji Aịzik chụọ n’Ugwu Moraya nọchiri anya ya. (Ndị Hibru 11:19) Ọ ga-amata na otú obi si gbawaa ya mgbe ahụ ọ chọrọ iji Aịzik achụ àjà mere ka ọtụtụ nde ndị kwesịrị ntụkwasị obi ghọta otú obi si gbawaa Jehova mgbe o ji Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Jọn 3:16) Ihe Ebreham mere enyerela anyị niile aka inwekwu obi ụtọ maka àjà Chineke ji Ọkpara ya chụọ, nke bụ́ ihe kacha gosi na Chineke hụrụ anyị n’anya.

17. Gịnị ka i kpebisiri ike ime? Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike ịna-eṅomi okwukwe Ebreham. Anyị kwesịrị ịmụta ọtụtụ ihe banyere Jehova, na-amatakwa ihe ọ na-emere anyị, otú ahụ Ebreham mere. Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova ma na-erubere ya isi, anyị ga-ahụ otú ọ ga-esi na-agọzi anyị, na-echebekwa anyị. (Gụọ Ndị Hibru 6:10-12.) Ka Jehova bụrụ Enyi anyị ruo mgbe ebighị ebi. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụ banyere mmadụ atọ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ghọrọ ezigbo enyi Chineke.

^ [1] (paragraf nke 3) Nwoke a na-azabu Ebram, nwunye ya ana-aza Seraị. Ma n’isiokwu a, anyị ga na-akpọ ha aha Jehova mechara gụọ ha, ya bụ, Ebreham na Sera.

Ebreham erubereghị Chineke isi n’echeghị echiche