Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

Na-erite Uru n’Ihe Niile Jehova Na-enye Anyị

Na-erite Uru n’Ihe Niile Jehova Na-enye Anyị

“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”AỊZA. 48:17.

ABỤ: 117, 114

1, 2. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova si were Baịbụl? (b) Olee ebe kacha amasị gị na Baịbụl?

NDỊÀMÀ JEHOVA ejighị Baịbụl egwu egwu. Ọ na-enye anyị ntụziaka anyị ga-atụkwasịli obi. Ọ na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị nwee olileanya. (Rom 15:4) Ihe e dere na Baịbụl abụghị echiche ụmụ mmadụ, kama n’eziokwu, ọ bụ “okwu Chineke.”—1 Tesa. 2:13.

2 O doro anya na anyị niile nwere amaokwu Baịbụl na-akacha amasị anyị. Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn na-akacha amasị ụfọdụ ndị n’ihi na ha kọwara otú Jizọs si gosi ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere. (Jọn 14:9) E nwekwara ndị ebe na-akacha atọ ha ụtọ bụ akwụkwọ Baịbụl ndị kwuru banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu. O nwere ike ịbụ akwụkwọ Mkpughe, n’ihi na ọ kọwara “ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:1) È nwere onye n’ime anyị akwụkwọ Abụ Ọma na-akasitụbeghị obi ma ọ bụ onye na-amụtatụbeghị ihe bara uru n’akwụkwọ Ilu? N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ e dere maka mmadụ niile.

3, 4. (a) Olee otú obi na-adị anyị maka akwụkwọ anyị dị́ iche iche? (b) Olee akwụkwọ ndị e bu ụfọdụ ndị n’obi bipụta?

3 Ebe ọ bụ na anyị ejighị Baịbụl egwu egwu, anyị jikwa akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, obi na-adị  anyị ụtọ maka ọtụtụ ihe a na-akụziri anyị n’akwụkwọ, broshọ, magazin, nakwa n’ihe ndị ọzọ. Anyị ma na ihe ndị a Jehova na-enye anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike, anyị na ya adịkwa ná mma.—Taị. 2:2.

4 E wezụga akwụkwọ e bipụtara maka anyị niile bụ́ Ndịàmà Jehova, anyị na-enwetakwa akwụkwọ ndị e bu ụfọdụ ndị n’obi bipụta. E nwere ndị e bipụtara iji nyere ndị na-eto eto aka, nweekwa ndị nke e biri iji nyere ndị nne na nna aka. E nwere ọtụtụ isiokwu na vidio ndị dị́ n’adres Ịntanet anyị e wepụtara maka ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ ihe e ji akụziri anyị Okwu Chineke na-echetara anyị na Jehova emezuola nkwa o kwere na ya “ga-emere ndị niile oké oriri.”—Aịza. 25:6.

5. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-eme Jehova obi ụtọ?

5 O nwere ike ịna-adị ọtụtụ n’ime anyị ka ya bụrụ na anyị nwekwuru oge anyị ga na-eji agụ Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Obi kwesịrị isi anyị ike na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị na-ewepụta oge na-agụchi Baịbụl anya, na-amụkwa ihe. (Efe. 5:15, 16) O nwere ike ịbụ na mgbe ụfọdụ, awa ole anyị wepụtara maka ịmụ otu akwụkwọ e bipụtaara anyị ga-adị iche n’oge anyị ji amụ akwụkwọ ọzọ. Ma, e nwere ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị zere. Gịnị ka ọ bụ?

6. Olee ihe nwere ike ime ka anyị ghara irite uru anyị kwesịrị irite n’ụfọdụ n’ime ihe Jehova na-enye anyị?

6 Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịna-eche na ebe ụfọdụ na Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị ụfọdụ agbasaghị anyị. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ dị́ anyị ka ebe anyị gụrụ na Baịbụl agbasaghị anyị? Ọ́ bụrụkwanụ na anyị esoghị ná ndị e bu n’obi dee otu akwụkwọ? Ànyị na-agụ ya elu elu ma ọ bụdị leghara ya anya? Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị amụta ihe bara ezigbo uru anyị gaara amụta. Gịnị ka anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị? Ihe kacha mkpa bụ na onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-echeta na ọ bụ Chineke na-enye anyị ihe ndị a e ji akụziri anyị ihe. O si n’ọnụ Aịzaya onye amụma sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.” (Aịza. 48:17) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’aro atọ ga-enyere anyị aka irite uru n’ebe ọ bụla anyị gụrụ na Baịbụl nakwa n’ihe niile Jehova ji akụziri anyị Okwu ya.

ARO NDỊ GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL BAARA ANYỊ URU

7. Anyị gụwa Baịbụl, gịnị mere anyị ji kwesị iburu n’obi na e nwere ihe anyị ga-amụta?

7 Buru n’obi na e nwere ihe ị ga-amụta. Baịbụl kwuru hoo haa na ‘Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.’ (2 Tim. 3:16) N’eziokwu, e nwere onye ma ọ bụ ndị e bu n’obi dee ebe ụfọdụ na Baịbụl. N’ihi ya, anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị mụta ihe n’ebe anyị na-agụ. Otu nwanna kwuru, sị: “M gụwa Baịbụl, m na-agbalị icheta na e nwere ike inwe ọtụtụ ihe e kwesịrị ịmụta n’ebe m na-agụ.” Ọ sịkwara: “Ihe a m na-echeta na-eme ka m mụta ihe mmadụ na-agaghị amụta ozugbo ọ gụrụ ya.” Tupu anyị agụwa Okwu Chineke, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị mata na e nwere ihe anyị ga-amụta nakwa ka o nye anyị amamihe ka anyị nwee ike ịghọta ihe ọ chọrọ ka anyị mụta.—Ezra 7:10; gụọ Jems 1:5.

Ị̀ na-amụta ihe niile i kwesịrị ịmụta n’ọgụgụ Baịbụl gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

8, 9. (a) Mgbe anyị na-agụ Baịbụl, olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị? (b) Gịnị ka àgwà ndị ahụ ndị okenye kwesịrị inwe na-akụziri anyị banyere Jehova?

8 Na-ajụ ajụjụ. Ị gụwa Baịbụl, kwụsịtụ jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m  banyere Jehova? Olee otú m ga-esi mee ya? Olee otú m ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’ Anyị chebara ụdị ajụjụ ndị a echiche, anyị ga-amụtakwu ihe n’ebe anyị gụrụ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere àgwà ndị Baịbụl kwuru ọ ga-abụ mmadụ na-akpa, ya eruo eruo ịbụ okenye. (Gụọ 1 Timoti 3:2-7.) Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị abụghị okenye, anyị nwere ike iche na ebe a agbasachaghị anyị. Ma, ka anyị jiri ajụjụ ndị ahụ a jụrụ na mbụ hụ otú àgwà ndị ahụ e kwuru okwu ha nwere ike isi nyere anyị niile aka.

9 Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Àgwà ndị ahụ Jehova mere ka e dee na-eme ka anyị mata na e nwere àgwà ndị magburu onwe ha ọ chọrọ ka ndị okenye ọgbakọ na-akpa. Ọ chọrọ ka ndị okenye bụrụ ndị ndị ọzọ ga na-eṅomi. Ọ ga-ajụkwa ha ajụjụ maka otú ha si emeso ọgbakọ ya, “nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Jehova chọrọ ka obi ruo anyị ala n’ihi otú ndị ọzụzụ atụrụ nọ́ n’okpuru ya si elekọta anyị. (Aịza. 32:1, 2) N’ihi ya, àgwà ndị ahụ ndị okenye kwesịrị inwe na-echetara anyị na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.

10, 11. (a) Anyị gụwa ebe e dere àgwà ndị okenye kwesịrị ịna-akpa, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe ahụ anyị na-agụ? (b) Olee otú anyị ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?

10 Olee otú m ga-esi mee ya? Okenye kwesịrị ịna-eme, ya nọtụ, ya ajụọ onwe ya ma ọ̀ ka nwere àgwà ndị ahụ Baịbụl kwuru okwu ha, iji mata ma è nwere ebe ndị o kwesịrị imekwu nke ọma. Nwanna nwoke nke “na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta” kwesịrị ịna-echebara àgwà ndị ahụ echiche n’ihi na o kwesịrị ịgba mbọ na-akpa ha otú ike ya hà. (1 Tim. 3:1) Nke bụ́ eziokwu bụ na Onye Kraịst ọ bụla nwere ike ịmụta ihe n’àgwà ndị ahụ e dere n’amaokwu ndị ahụ, ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime ha bụ ihe Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst niile na-eme. Dị ka ihe atụ, anyị niile kwesịrị inwe ezi uche na uche zuru okè. (Fil. 4:5; 1 Pita 4:7) Ka ndị okenye na-agbalị ka ha ghọọrọ “ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya,” anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ha ma ‘na-eṅomi okwukwe ha.’—1 Pita 5:3; Hib. 13:7.

11 Olee otú m ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka? Anyị nwere ike iji àgwà ndị ahụ ndị okenye kwesịrị ịna-akpa nyere ndị nwere mmasị ma ọ bụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl  aka ịghọta na ndị okenye nọ́ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị iche ná ndị ụkọchukwu Krisendọm. Ka anyị na-agụ ebe e dere àgwà ndị ahụ, anyị nwekwara ike icheta otú ndị okenye ọgbakọ anyị si agbara anyị mbọ. Iche banyere otú ha si agba mbọ ga-eme ka anyị ‘na-akwanyere ha ùgwù’ n’ihi na ‘ha na-arụsi ọrụ ike n’etiti anyị.’ (1 Tesa. 5:12) Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-akwanyere ha ùgwù, anyị ga-eme ka ha na-enwekwu ọṅụ.—Hib. 13:17.

12, 13. (a) Olee ụdị nchọnchọ anyị nwere ike iji akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ mee? (b) Nye ihe atụ na-egosi otú ịmata ihe ụfọdụ nwere ike isi mee ka anyị mụta ihe mmadụ na-agaghị amụta ozugbo ọ gụrụ ihe.

12 Na-eme nchọnchọ. Mgbe anyị na-amụ Baịbụl, anyị nwere ike iji akwụkwọ ndị e ji eme nchọnchọ lee ma ànyị ga-azali ajụjụ ndị a:

  • Ònye dere ebe a m na-agụ na Baịbụl?

  • Olee ebe a nọ dee ya na mgbe e dere ya?

  • Olee ihe ndị dị́ mkpa mere mgbe e dere akwụkwọ Baịbụl a?

Ịmata ụdị ihe ndị a nwere ike ime ka anyị mụta ihe mmadụ na-agaghị amụta ozugbo ọ gụrụ ya.

13 Dị ka ihe atụ, Ezikiel 14:13, 14 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ala emehie m site n’ime omume ekwesịghị ntụkwasị obi, m ga-esetị aka m mee ya ihe, gbajisịa mkpara o ji ekonye achịcha, m ga-emekwa ka o nwee ụnwụ, bipụkwa mmadụ na anụ ụlọ na ya. ‘Ọ bụrụgodị na ndị ikom atọ a, Noa, Daniel na Job, nọ n’ime ya, ha ga-anapụta mkpụrụ obi nke ha n’ihi ezi omume ha,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” Anyị mee nchọnchọ, anyị ga-amata na Ezikiel dere ihe a n’ihe dị́ ka afọ 612 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, Noa na Job anwụọla kemgbe ọtụtụ narị afọ, Chineke ana-echetakwa otú ha si kwesị ntụkwasị obi. Ma, Daniel ka nọ ndụ mgbe ahụ. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọ dị ihe dị́ ka afọ iri na asatọ ma ọ bụ iri afọ abụọ na atọ mgbe Jehova kwuru na ọ bụ onye ezi omume otú ahụ Noa na Job bụ. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Jehova na-ahụ ndị niile jí obi ha dum na-efe ya, o jikwa ha kpọrọ ihe, ma ndị ka na-eto eto.—Ọma 148:12-14.

GBALỊA KA Ị NA-ERITE URU N’AKWỤKWỌ DỊ́ ICHE ICHE A NA-EBIPỤTARA ANYỊ

14. Olee otú akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto si enyere ha aka, oleekwa otú ọ ga-esi baara ndị ọzọ uru? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

14 Akwụkwọ niile a na-ebipụtara anyị nwere ike ịbara anyị uru otú ahụ ịmụ ebe niile n’Okwu Chineke na-abara anyị uru. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha. Akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e bipụtala ọtụtụ akwụkwọ maka ndị na-eto eto. [1] E biri ụfọdụ n’ime ha iji nyere ha aka imeri nsogbu ndị ọgbọ ha na-enye ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị na-esiri ha ike mgbe ha na-eto. Olee otú ịgụ akwụkwọ ndị ahụ nwere ike isi baara anyị niile uru? Ịgụ ha ga-eme ka anyị cheta ihe ya na ndị na-eto eto nọ́ n’ọgbakọ na-alụ. Ọ ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enyere ha aka ma na-agba ha ume.

15. Gịnị mere Ndị Kraịst torola eto ji kwesị inwe mmasị n’akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto?

15 Ọ bụghị naanị ndị na-eto eto na-enwe ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-ekwu banyere ha n’akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto. Anyị niile kwesịrị ịna-agbachitere ihe anyị kweere, ịna-ejide onwe anyị, na ịna-ezere mkpakọrịta ọjọọ na ntụrụndụ na-adịghị mma. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ndị ọzọ mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma. A na-ekwu banyere ihe ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ n’akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto. Ndị Kraịst torola  eto hà kwesịrị iche na ha etofeela ịgụ akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto? Mbanụ. Ọ bụ eziokwu na a na-ede akwụkwọ ndị ahụ otú ga-amasị ndị na-eto eto, ihe ndị e kwuru na ha si n’Okwu Chineke na-anaghị agbanwe agbanwe. Anyị niile nwekwara ike irite uru n’ihe ndị ahụ Jehova ji akụziri anyị ihe.

16. Olee ihe ọzọ akwụkwọ anyị na-enyere ndị na-eto eto aka ime?

16 E wezụga inyere ndị na-eto eto aka ná nsogbu ndị ha na-enwe, akwụkwọ anyị na-enyekwara ha aka ka okwukwe ha sie ike, ha na Jehova adịkwuo ná mma. (Gụọ Ekliziastis 12:1, 13.) O nwekwara ike ịbara Ndị Kraịst torola eto uru. Dị ka ihe atụ, otu n’ime isiokwu ndị gbara na Teta! April 2009 bụ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị . . . Olee Ihe M Nwere Ike Ime Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọ M Ụtọ?” A tụrụ aro ụfọdụ n’isiokwu ahụ, nweekwa igbe e nwere ike ịchakapụta tinye na Baịbụl maka iji na-amụ ihe. Ndị torola eto hà so ná ndị isiokwu ahụ baara uru? Otu nwanna nwaanyị, nke lụrụla di ma mụta ụmụ, dere, sị: “Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị nọ na-esiri m ike. Ebuuru m aro ndị a tụrụ n’isiokwu ahụ n’obi, jirikwa ebe ahụ e kwuru ka a chakapụta na-agụ Baịbụl. Ugbu a, m na-atụzi anya oge m ji agụ Baịbụl. Ahụla m otú akwụkwọ Baịbụl dị́ iche iche si na-ekwu otu ihe ma yie ọmarịcha ákwà nwere àgwà dị́ iche iche. Ịgụ Baịbụl atọtụbeghị m ụtọ otú a.”

17, 18. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-agụ akwụkwọ anyị ndị e bipụtara maka ọhaneze? Nye ihe atụ.

17 Akwụkwọ e bipụtara maka ọhaneze. Kemgbe afọ 2008, obi dị anyị ụtọ na a na-ebipụta Ụlọ Nche nke a na-amụ amụ, nke bụ́ maka Ndịàmà Jehova. Ma anyị nwekwara Ụlọ Nche a na-ebipụta maka ọhaneze. Olee otú ịgụ ya ga-esi baara anyị uru? Chegodị banyere ihe atụ a. Ka e were ya na otu ụbọchị, tupu a malite ikwu okwu ihu ọha, ị chọpụtara na e nwere onye ị gwara ka ọ bịa ọmụmụ ihe, ya abịa. O doro anya na obi ga-atọ gị ụtọ. Mgbe a nọ na-ekwu okwu ihu ọha, gị ana-eche banyere onye ahụ. Ị na-eche otú ihe ọ na-anụ dị ya na otú ọ ga-esi baara ya uru. Ọ ga-eme ka ị mata uru okwu ahụ bara, meekwa ka obi dịkwuo gị ụtọ maka ya.

18 Ụdị ihe ahụ ga-emekwa mgbe anyị na-agụ akwụkwọ e bipụtara maka ọhaneze. Dị ka ihe atụ, a na-ede isiokwu ndị dị́ n’Ụlọ Nche ọhaneze otú ọ ga-adịrị onye na-abụghị Onyeàmà Jehova mfe ịghọta ya. A na-esikwa otú ahụ ede ọtụtụ isiokwu ndị dị́ n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig, dị́ ka isiokwu ndị dị́ ná nkebi bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara” na “Ajụjụ Ndị A Na-ajụkarị Banyere Ndịàmà Jehova.” Ịgụ isiokwu ndị ahụ ga-eme ka anyị jiri eziokwu Baịbụl ndị anyị mabu kpọrọkwuo ihe. O nwekwara ike ime ka anyị mụta ụzọ ndị ọhụrụ anyị ga-esi na-akọwara ndị ọzọ ihe anyị kweere ma anyị gaa ozi ọma. Otú ahụkwa ka Teta! na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ezi Chineke dị, na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-agbachitere ihe anyị kweere.—Gụọ 1 Pita 3:15.

19. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile ọ na-enye anyị?

19 O doro anya na Jehova enyela anyị ọtụtụ ndụmọdụ na ntụziaka ga-abara anyị uru. (Mat. 5:3) Ka anyị na-agụ akwụkwọ niile ọ na-enye anyị ma na-eme ihe anyị na-amụta. Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile ọ na-enye anyị.—Aịza. 48:17.

^ [1] (paragraf nke 14) Ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ bụ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1 na Nke 2, nakwa isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị,” nke na-adịzi naanị n’adres Ịntanet anyị.