Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

“Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

“Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”

“Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”MAT. 28:19, 20.

ABỤ: 141, 97

1, 2. Olee ajụjụ ndị e kwesịrị ịjụ n’ihi ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14?

MA NDỊ mmadụ hà kwetara ihe anyị na-ekwusa ma hà na-emegide anyị, ọtụtụ ndị kwetara na ihe e ji mara Ndịàmà Jehova bụ ozi ọma ha na-ekwusa. O nwere ike ịbụ na ị hụtụla ụfọdụ ndị n’ozi ọma, bụ́ ndị na-asị na ọ bụ eziokwu na ha ekwetaghị ihe ndị anyị kweere, ma ha na-akwanyere anyị ùgwù maka ozi ọma anyị na-ekwusa. Anyị ma na Jizọs buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mat. 24:14) Ma olee otú anyị si mara na ozi ọma anyị na-ekwusa na-emezu amụma ahụ Jizọs buru? Ikwu na ọ bụ anyị na-arụ ọrụ ahụ ọ̀ na-egosi na anyị na-etu ọnụ?

2 Ọtụtụ okpukpe na-ekwu na ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, naanị otú ha na-esikarị ekwusa ya bụ ịkọ ihe ọma meere ha, ịkụzi ihe na chọọchị, na tiivi, n’Ịntanet ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ a na-agbasa ozi. Ndị ọzọ chere na otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma bụ ịrụ ọrụ ebere ma ọ bụ ịbụ ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ndị nkụzi. Ma, ọ̀ bụ ime ihe ndị a bụ  ikwusa ozi ọma Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha kwusaa?

3. Na Matiu 28:19, 20, olee ihe anọ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ime?

3 Ndị na-eso ụzọ Jizọs hà kwesịrị ịnọ na-eche ka ndị mmadụ chọrọ ha bịa? Mbanụ. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ sịrị ọtụtụ narị ndị na-eso ụzọ ya: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20) N’ihi ya, e nwere ihe anọ anyị kwesịrị ime. Anyị kwesịrị ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, mee ha baptizim ma kụziere ha ihe. Ma nke mbụ anyị ga-ebugodị ụzọ mee bụ ịgakwuru ndị mmadụ. Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla kwere ekwe kwesịrị ‘ịga,’ ma ọ̀ bụ ịgafe okporo ámá ma ọ bụ ịgafe oké osimiri.”—Mat. 10:7; Luk 10:3.

4. Gịnị ka ịbụ “ndị na-akụta mmadụ” pụtara?

4 Gịnị ka Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mee? Ọ̀ chọrọ ka onye ọ bụla kwusara nke ya na-aga, ka ọ̀ chọrọ ka a hazie ha ahazie? Ebe ọ bụ na otu onye agaghị ekwusaliri “mba niile” ozi ọma, e kwesịrị ịhazi ndị na-eso ụzọ ya ahazi. Ọ bụ ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” (Gụọ Matiu 4:18-22.) Jizọs anaghị ekwu banyere otu onye iwere ihe e ji egbu azụ̀ gaa tụba ya ná mmiri, nọrọzie na-eche ka azụ̀ bịa ịtụrụ ya. Kama, ọrụ ịkụ azụ̀ Jizọs na-ekwu okwu ya bụ nke a na-eji ụgbụ arụ. Ụdị ịkụ azụ̀ ahụ pụtara na a ga na-arụsi ọrụ ike, hazie ya ahazie, ọtụtụ ndị agbakọọkwa aka.—Luk 5:1-11.

5. Olee ajụjụ anọ e kwesịrị ịza, n’ihi gịnị?

5 Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ Jizọs buru n’amụma bụ ịza ajụjụ anọ ndị a:

  • Olee ihe e kwesịrị ịna-ekwusa?

  • Gịnị ka anyị kwesịrị ibu n’obi na-ekwusa ya?

  • Olee otú e kwesịrị isi na-ekwusa ya?

  • Olee ebe a ga-ekwusaru ya na mgbe a ga-ekwusaru ya?

Ịza ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ịmata ndị na-arụ ọrụ a na-azọ ndị mmadụ ndụ, meekwa ka anyị kpebisie ike iji obi anyị niile na-arụ ya.—1 Tim. 4:16.

OLEE IHE E KWESỊRỊ IKWUSA?

6. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe Ndịàmà Jehova na-ekwusa bụ ihe ha kwesịrị ịna-ekwusa?

6 Gụọ Luk 4:43. Jizọs kwusara “ozi ọma alaeze Chineke,” ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya mee otú ahụ. Olee ndị na-ekwusa ozi ahụ ná “mba niile”? O doro anya na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ ndị na-emegide anyị kwetara na ọ bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, otu onye ụkọchukwu e zigara ná mba ọzọ gwara otu Onyeàmà Jehova na ya ebiela n’ọtụtụ mba nakwa na ya jụrụ Ndịàmà Jehova ná mba nke ọ bụla ihe ha na-ekwusa. Gịnị ka ha zara ya? Onye ụkọchukwu ahụ sịrị: “Otú ha niile si dị́ iberiibe mere ka ha zaa otu ihe, sị na ọ bụ ‘ozi ọma Alaeze Chineke.’” Ma, kama ‘ịdị iberiibe,’ Ndịàmà Jehova ahụ kwuru otu ihe, otú ahụ ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ikwu. (1 Kọr. 1:10) Ihe ahụ ha zara dabara adaba n’ihe na-adị n’Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. E nwere magazin a na narị asụsụ abụọ na iri ise na anọ. A na-ebikwa nke ọ bụla ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde iri ise na itoolu, nke mere ka ọ bụrụ magazin a kacha ebipụta n’ụwa niile.

7. Olee otú anyị si mara na ndị ụkọchukwu Krisendọm anaghị ekwusa ihe ha kwesịrị ịna-ekwusa?

 7 Ndị ụkọchukwu Krisendọm anaghị ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha kwuo banyere Alaeze Chineke, ọtụtụ n’ime ha na-asị na ọ bụ ihe dị́ n’obi Onye Kraịst. (Luk 17:21) Ha anaghị enyere ndị mmadụ aka ịghọta na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị́ n’eluigwe, na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze ya, na ọ bụ ọchịchị ahụ ga-ewepụ nsogbu ụmụ mmadụ niile, nakwa na ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile n’ụwa n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 19:11-21) Kama ime otú ahụ, ha na-ewere Jizọs ka nwa ọhụrụ n’oge Krismas, werekwa ya ka onye na-aga ịnwụ anwụ n’oge Ista. Ọ dị ka ha amaghị ihe Jizọs ga-arụ mgbe ọ ga na-achị ụwa. Ebe ọ bụ na ha amaghị ozi ha kwesịrị ịna-ekwusa, o kwesịghị iju anyị anya na ha amaghị ihe e kwesịrị ibu n’obi na-ekwusa ozi ọma a.

OLEE IHE ANYỊ KWESỊRỊ IBU N’OBI NA-EKWUSA OZI ỌMA?

8. Olee ihe a na-ekwesịghị ibu n’obi na-ekwusa ozi ọma?

8 Olee ihe anyị kwesịrị ibu n’obi na-ekwusa ozi ọma? O kwesịghị ịbụ ka anyị jiri ya kpatawa ego ma rụọ nnukwu ụlọ dị́ iche iche. Jizọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Mat. 10:8) E kwesịghị iji Okwu Chineke na-akpa ego. (2 Kọr. 2:17) Ndị na-ekwusa ozi ọma ekwesịghị ịna-achọ irite uru ego n’ozi ọma ha na-ekwusa. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:33-35.) N’agbanyeghị ihe a doro anya Baịbụl kwuru, ọtụtụ chọọchị na-ekwe ka ịnakọta ego ma ọ bụ ịgba mbọ ka e nweta ego na-emegharị ha anya. Ha nwere ndị ụkọchukwu na ọtụtụ ndị ọzọ na-arụrụ ha ọrụ ha na-akwụ ụgwọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị ndú Krisendọm abaala ọgaranya.—Mkpu. 17:4, 5.

9. Olee otú Ndịàmà Jehova sirila gosi na ha bu ihe kwesịrị ekwesị n’obi na-ekwusa ozi ọma?

9 Olee otú Ndịàmà Jehova si enweta ego ha ji arụ ọrụ? Ọ bụ onyinye sí ndị mmadụ n’obi. (2 Kọr. 9:7) A naghị ana ụtụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ọ bụ ná mgbakọ ha. Ma, naanị n’afọ gara aga, Ndịàmà Jehova ji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ijeri awa abụọ kwusaa ozi ọma, mụọkwara ihe karịrị nde mmadụ itoolu Baịbụl n’efu kwa ọnwa. Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya na ọ bụghị naanị na a naghị akwụ anyị ụgwọ, kamakwa obi na-adị anyị ụtọ iji ego akpa anyị arụ ọrụ a. Mgbe otu onye na-eme nchọpụta na-ekwu banyere ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa, ọ sịrị: “Ihe bụ́ mkpa ha bụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe. . . . Ha enweghị ndị ụkọchukwu, nke na-eme ka ego ha na-emefu belata.” Gịnịzi ka anyị kwesịrị ibu n’obi na-ekwusa ozi ọma? Anyị ji aka anyị kpebie ịna-ekwusa ozi ọma n’ihi na anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya. Otú a anyị si wepụta onwe anyị ịrụ ọrụ a na-emezu amụma e buru n’Abụ Ọma 110:3. (Gụọ ya.)

OLEE OTÚ E KWESỊRỊ ISI NA-EKWUSA YA?

Anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si kwusaa ozi ọma?

10 Olee otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si kwusaa ozi ọma? Ha gakwuuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla e nwere ike ịhụ ha, ma n’ebe ọhaneze na-anọkarị ma n’ụlọ ndị mmadụ. Otu ụzọ ha si kwusaa ozi ọma bụ ịga n’ụlọ n’ụlọ na-achọ ndị kwesịrị ekwesị. (Mat. 10:11; Luk 8:1; Ọrụ 5:42; 20:20) Otú a ha si kwusaa ozi ọma gosiri na ha chọrọ ka mmadụ niile nụ ya.

11, 12. Olee otú mbọ Ndịàmà Jehova na-agba ikwusa ozi ọma si dị́ iche n’ihe chọọchị dị́ iche iche na-eme?

 11 Ọ̀ bụ otú ahụ ka chọọchị dị́ iche iche si na-ekwusa ozi ọma? Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ na-agwa ndị chọọchị ha okwu Chineke. Ma, kama ịbụ “ndị na-akụta mmadụ,” ọ dị ka ihe ka ndị ụkọchukwu Krisendọm mkpa ọ̀ bụ ilekọtawa ndị ha kụtarala ka azụ̀. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ịgwa ndị òtù ha ka ha kwusawa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi Poopu John Paul nke Abụọ dere ná mmalite afọ 2001, ọ sịrị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, ekwuola m ugboro ugboro ka e kwusasiwe ozi ọma ike. M na-ekwukwa ya ọzọ ugbu a . . . Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka ọ na-anụ anyị ọkụ n’obi ka Pọl, bụ́ onye sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.’” Poopu kwukwara na ozi ọma a abụghị ihe a ga-ahapụrụ naanị mmadụ ole na ole a zụrụ azụ, kama na ndị niile na-aga chọọchị kwesịrị ịna-ekwusa ya. Ma, mmadụ ole merela ihe a o kwuru?

12 Gịnịkwanụ ka Ndịàmà Jehova merela? Ọ bụ naanị ha na-ekwusa na Jizọs achịwala kemgbe afọ 1914. Ha weere ikwusa ozi ọma ka ihe kacha mkpa otú ahụ Jizọs kwuru ka e mee. (Mak 13:10) Otu akwụkwọ nke kwuru banyere chọọchị ndị dị́ n’Amerịka sịrị na Ndịàmà Jehova weere ikwusa ozi ọma ka ọrụ kacha mkpa. O kwukwara na ọ bụrụ na ha ahụ ndị agụụ na-agụ, ndị nọ́ naanị ha, na ndị ọrịa, ha na-agbalị inyere ha aka, ma ha anaghị echefu na ọrụ kacha mkpa ha na-arụ bụ ikwusa na a ga-ebibi ụwa a na ịkụziri ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka a zọpụta ha. Ndịàmà Jehova ka na-ekwusa ozi ahụ. Ha na-ekwusakwa ya otú ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si kwusaa ya.

OLEE EBE E KWESỊRỊ IKWUSARU OZI ỌMA AHỤ NA MGBE A GA-EKWUSARU YA?

13. Olee ebe e kwesịrị ikwusaru ozi ọma?

13 Jizọs kọwara ebe a ga-ekwusaru ozi ọma mgbe ọ sịrị na a ga-ekwusa ya “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) A ga-eme ka “ndị mba niile” bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20) Ọ pụtara na a ga-ekwusaru ozi ahụ n’ụwa niile.

14, 15. Olee ihe gosiri na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile otú ahụ Jizọs buru n’amụma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

14 Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova kwusarurula ozi ọma n’ụwa niile otú ahụ Jizọs buru n’amụma. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’Amerịka, e nwere ihe dị́ ka narị puku ndị ụkọchukwu isii na chọọchị dị́ iche iche. Ma, Ndịàmà Jehova nọ́ ná mba ahụ dị ihe dị́ ka otu nde na narị puku abụọ. N’ụwa niile, ndị ụkọchukwu e nwere na Chọọchị Katọlik ji obere karịa narị puku anọ. Chegodị banyere Ndịàmà Jehova ole na-ekwusa  ozi ọma Alaeze Chineke. N’ụwa niile, ihe dị́ ka nde mmadụ asatọ ewepụtala onwe ha ịna-ekwusa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ. O doro anya na Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile, nke na-eme ka a na-eto Jehova ma na-asọpụrụ ya.—Ọma 34:1; 51:15.

15 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, ọ na-agụsi anyị agụụ ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo. N’ihi ya, mbọ anyị na-agba ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na ibipụta ha enweghị atụ. Anyị ekesaala ọtụtụ nde akwụkwọ, magazin, traktị, na akwụkwọ ịkpọ òkù maka mgbakọ ukwu na Ncheta Ọnwụ Jizọs n’efu. Anyị ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. E biekwala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ ihe karịrị narị nde abụọ n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri atọ. Naanị n’afọ gara aga, akwụkwọ niile anyị biri e ji amụ Baịbụl dị ihe dị́ ka ijeri anọ na ọkara. Ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet dị n’ihe karịrị narị asụsụ asaa na iri ise. È nwere ndị ọzọ na-ekwusaru ozi ọma otú a?

16. Olee otú anyị si mara na Ndịàmà Jehova nwere mmụọ nsọ Chineke?

16 Olee mgbe a ga-ekwusaru ozi ọma? Jizọs kwuru na a ga na-ekwusa ya n’ụwa niile n’oge ikpeazụ ruo mgbe “ọgwụgwụ ga-abịa.” È nwere okpukpe ọzọ na-ekwusa ozi ọma n’oge ikpeazụ a siri ike? Ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ike ịsị anyị, “Anyịnwa nwere mmụọ nsọ, ma ununwa na-ekwusa ozi ọma.” Ma otú anyị sirila na-ekwusa ozi ọma n’akwụsịghị akwụsị ọ́ naghị egosi na anyị nwere mmụọ nsọ Chineke? (Ọrụ 1:8; 1 Pita 4:14) Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ okpukpe na-anwa ka ha kwusawa ozi ọma otú Ndịàmà Jehova si na-ekwusa ya. Ma, mbọ ha na-akụ afọ n’ala. Ndị ọzọ na-amalite ikwusa ya, ma obere oge, ha akwụsị. Ụfọdụ nwekwara ike ịna-aga n’ụlọ n’ụlọ, ma gịnị ka ha na-ekwusa? Ọ bụ ihe ha na-ekwusa na-eme ka o doo anya na ha anaghị arụ ọrụ ahụ Jizọs malitere.

OLE NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA TAA?

17, 18. (a) Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke taa? (b) Gịnị mere anyị ji nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma a?

17 Ole ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke taa? Obi siri anyị ike ikwu na ọ bụ Ndịàmà Jehova. Gịnị mere obi ji sie anyị ike otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, nke bụ́ ihe e kwesịrị ịna-ekwusa. Ịgakwuru ndị mmadụ gosiri na anyị na-ekwusa ya otú e kwesịrị isi na-ekwusa ya. Anyị bukwa ihe kwesịrị ekwesị n’obi na-ekwusa ya, ya bụ, ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na ndị agbata obi anyị, ọ bụghị ka anyị kpata ego. E nweghị ndị ọzọ na-ekwusaru ozi ọma ebe anyị na-ekwusaru ya n’ihi na anyị na-ekwusara ya ndị mba niile na asụsụ niile. Anyị ga na-ekwusa ozi ọma a n’akwụsịghị akwụsị, sí n’afọ ruo n’afọ, ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa.

18 Ihe ndị na-efe Chineke na-arụpụta n’oge ikpeazụ a dị egwu. Ma, gịnị mere anyị ji nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile? Pọl onyeozi zara ajụjụ a n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị. O dere, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Fil. 4:13) Ka anyị niile kwe ka Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-enye anyị ike ka anyị na-agbalịsi ike n’ozi anyị iji jezuo ya.—2 Tim. 4:5.