Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

Baịbụl Ọ̀ Ka Na-agbanwe Ndụ Gị?

Baịbụl Ọ̀ Ka Na-agbanwe Ndụ Gị?

“Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.”ROM 12:2.

ABỤ: 61, 52

1-3. (a) Olee ihe ndị nwere ike isiri anyị ike ịgbanwe ma anyị mechaa baptizim? (b) O siere anyị ike karịa otú anyị tụrụ anya ya ịgbanwe àgwà ụfọdụ anyị na-akpa, olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

MGBE otu nwoke aha ya bụ Kevin [1] mụtara banyere Jehova, ihe kacha ya mkpa bụ ka ya na Jehova na-adị ná mma. Ma, ruo ọtụtụ afọ, ọ nọ na-agba chaa chaa, na-aṅụ sịga na ọgwụ ike, bụrụkwa onye aṅụrụma. Ọ ga-akwụsịrịrị àgwà ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma. Jehova na Okwu ya nke na-akpa ike nyeere ya aka ịgbanwe.—Hib. 4:12.

2 Mgbe Kevin mechara baptizim, ọ̀ kwụsịrị ịgbanwe àgwà ụfọdụ ọ na-akpa? Mba. A ka nwere ihe ndị o kwesịrị ime iji na-amụtakwu àgwà Ndị Kraịst, na-emekwa ka àgwà ya ka mma. (Efe. 4:31, 32) Dị ka ihe atụ, ọ chọpụtara na o siiri ya ezigbo ike ịna-ejide onwe ya mgbe iwe na-ewe ya. O kwuru, sị: “Ịmata otú m ga-esi na-ejide onwe m siiri m ike karịa ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị m na-akpa n’oge gara aga.” Ihe nyeere ya aka ịgbanwe bụ ikpesi ekpere ike na ịmụsi Baịbụl ike.

 3 Tupu anyị emee baptizim, e nwere àgwà ọjọọ ndị ọtụtụ n’ime anyị kwụsịrị ịna-akpa ka anyị nwee ike ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ugbu a anyị mechara baptizim, anyị ghọtara na e nwere obere mgbanwe ndị anyị kwesịrị ime iji na-eṅomikwu Chineke na Kraịst. (Efe. 5:1, 2; 1 Pita 2:21) Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-akatọkarị ndị ọzọ, na-atụ egwu mmadụ, na-agba asịrị, ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ na-adịchaghị mma. Ịgbanwe ụdị àgwà ndị a ò siiri anyị ike karịa otú anyị tụrụ anya ya? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ebe ọ bụ na mụ agbanweela àgwà ndị ka njọ, gịnị mere o ji esiri m ike ịgbanwe obere ndị nke a? Olee otú m ga-esi mee ihe Baịbụl kwuru, nke ga-eme ka àgwà m na-aka mma?’

Ị GA-EMELI IHE DỊ́ JEHOVA MMA

4. Gịnị mere anyị agaghị emeli ihe dị́ Jehova mma mgbe niile?

4 Anyị hụrụ Jehova n’anya, jirikwa obi anyị niile chọọ ịna-eme ihe dị́ ya mma. Ma, ọ dị mwute na ezughị okè na-eme ka anyị ghara ịna-eme ihe dị́ ya mma mgbe niile. Ọ na-adị anyị otú ọ dị Pọl onyeozi mgbe o dere, sị: “Enwere m ike ịchọ ime ihe, ma enweghị m ike ịrụpụta ihe dị mma.”—Rom 7:18; Jems 3:2.

5. Olee ụdị àgwà ndị anyị gbanwere tupu anyị emee baptizim? Ma, olee àgwà ụfọdụ na-adịghị mma anyị na ha ka nwere ike ịna-alụ?

5 Anyị akwụsịla ime mmehie ndị ga-eme ka anyị ghara iru eru ịnọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Kọr. 6:9, 10) Ma, anyị ka bụ ndị na-ezughị okè. (Kọl. 3:9, 10) N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na anyị mechaa baptizim, ma ọ bụkwanụ nọọ ọtụtụ afọ n’ọgbakọ, anyị agaghịzi na-emejọ ihe, na-enwe ihe ga-adọla anyị azụ, ma ọ bụ na-eche echiche na-ezighị ezi. Anyị na àgwà ụfọdụ nwere ike ịna-alụ ọgụ ruo ọtụtụ afọ.

6, 7. (a) Gịnị mere anyị ji nwee ike ịbụ enyi Jehova n’agbanyeghị na anyị ezughị okè? (b) Gịnị mere anyị ekwesịghị ịkwụsị ịrịọ Jehova mgbaghara?

6 Ezughị okè anyị anaghị eme ka anyị na Jehova ghara ịbụ enyi ma ọ bụ mee ka anyị ghara ịna-efe ya. Chegodị echiche. Mgbe Jehova dọtara anyị ka anyị bụrụ enyi ya, ọ ma na anyị ga na-emejọ mgbe ụfọdụ. (Jọn 6:44) Ebe Chineke ma àgwà anyị na ihe dị́ anyị n’obi, o doro anya na ọ ma ụdị àgwà ndị ga-akacha siere anyị ike ịgbanwe. Ọ makwa na anyị ga na-emehie mgbe ụfọdụ. Ma, ihe ndị a emeghị ka Jehova ghara ịchọ ka anyị na ya bụrụ enyi.

7 Otú Jehova si hụ anyị n’anya mere ka o nye anyị onyinye bara ezigbo uru. O zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị. (Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị emejọọ, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. N’ihi ihe mgbapụta ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-agbaghara anyị, anyị na ya aka bụrụkwa enyi. (Rom 7:24, 25; 1 Jọn 2:1, 2) Ànyị kwesịrị ịkwụsị ịrịọ Jehova mgbaghara n’ihi na anyị chere na anyị adịghị ọcha ma ọ bụ na anyị bụ ndị mmehie? Mbanụ. Ime otú ahụ ga-adị ka mmadụ ịjụ iji mmiri kwọọ aka mgbe aka ya ruru unyi. A sị ka e kwuwe, ihe mgbapụta ahụ bụ maka ndị mmehie chegharịrị echegharị. N’ihi ihe mgbapụta ahụ, anyị na Jehova ga-abụli enyi n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè.—Gụọ 1 Timoti 1:15.

8. Gịnị mere anyị ekwesịghị ileghara ihe ụfọdụ na-adịghị mma anyị na-eme anya?

8 O doro anya na anyị ekwesịghị ileghara ihe ndị anyị na-emejọ anya. Ịbụ enyi Jehova pụtara na anyị ga-agbalịsi ike ịna-eṅomikwu ya na Kraịst ma bụrụ ụdị ndị ha chọrọ ka anyị bụrụ. (Ọma 15:1-5) Ọ pụtakwara na anyị ga  na-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anyị. Anyị nwedịrị ike izere ya kpamkpam. Ma ànyị mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya ma ànyị anọọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ikwe ka “a na-agbazi” anyị mgbe niile.—2 Kọr. 13:11.

9. Olee otú anyị si mara na iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ abụghị ihe a na-eme otu mgbe?

9 Anyị ga na-agbasi mbọ ike mgbe niile ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka àgwà anyị na-aka mma, anyị ana-egosikwa na anyị eyirila “mmadụ ọhụrụ ahụ” Pọl kwuru okwu ya. Ọ gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, bụrụkwa nke a na-emerụ dị ka ọchịchọ aghụghọ ya si dị; kama nke ahụ, unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ, unu kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Efe. 4:22-24) Okwu Grik e si sụgharịta “ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ” na-egosi na iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ abụghị ihe a na-eme otu mgbe. Ọ na-eme anyị obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka obi sie anyị ike na n’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị ga na-amụtakwu banyere àgwà ya, na-agbalịkwa ka àgwà anyị na-akakwu mma. O doro anya na Baịbụl nwere ike ịna-agbanwe ndụ anyị.

GỊNỊ MERE O JI ESI EZIGBO IKE?

10. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Baịbụl na-eme ka àgwà anyị na-aka mma? Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ?

10 Anyị ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke na-agbanwe àgwà anyị. Ma, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbalịsi ike otú ahụ? Ọ bụrụ na Jehova na-agọzi mbọ anyị na-agba, ọ̀ bụ na ime uche ya ekwesịghị ịdịkwuru anyị mfe? Ọ̀ bụ na Jehova ekwesịghị ime ka ọ dịrị anyị mfe ịna-eme ihe ziri ezi?

11-13. Gịnị mere Chineke ji chọọ ka anyị na-agbalịsi ike ịkwụsị ihe ụfọdụ na-adịghị mma anyị na-eme?

11 Ọ bụrụ na anyị echee banyere eluigwe na ụwa, anyị ga-aghọta na ike Jehova dị egwu. Dị ka ihe atụ, Jehova kere anyanwụ, nke na-akpa ezigbo ike. Na tịnkọm tịnkọm ọ bụla, ìhè na okpomọkụ na-esi n’anyanwụ apụta na-akarị akarị. Ma, ọ bụ naanị obere okpomọkụ sí na ya na-erute n’ụwa, nke na-eme ka ihe ndị dị́ n’ụwa na-adị ndụ. (Ọma 74:16; Aịza. 40:26) Obi na-adịkwa Jehova ụtọ inye ndị ohu ya ike mgbe ha chọrọ ya. (Aịza. 40:29) O doro anya na a sị na Chineke chọrọ, ọ gaara eme ka ọ dịrị anyị mfe ịkwụsị àgwà ọ bụla na-adịghị mma anyị na-akpa, meekwa ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ anyị. Gịnịzi mere na o meghị otú ahụ?

12 Jehova hapụrụ anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ bụ onyinye na-enweghị atụ o nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ime uche Chineke, na-agbalịsikwa ike ime ya, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa ime ihe dị́ ya mma. Anyị na-egosikwa na anyị na-akwado ọchịchị ya. Setan kwuru na otú Jehova si achị adịghị mma. N’ihi ya, o doro anya na Nna anyị nke eluigwe na-eji mbọ anyị ji obi anyị niile na-agba ịkwado ọchịchị ya akpọrọ ihe nke ukwuu. (Job 2:3-5; Ilu 27:11) Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike imeri ezughị okè anyị n’agbanyeghị na ọ dịrịghị anyị mfe, anyị na-erubere Jehova isi, na-egosikwa na anyị chọrọ ka ọ bụrụ ya na-achị anyị.

13 Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa anyị ka anyị na-agbalịsi ike ịna-eṅomi àgwà ya niile. (Gụọ 2 Pita 1:5-7; Kọl. 3:12) Ọ chọrọ ka anyị na-agbasi mbọ ike ka  anyị ghara ịna-eche ihe na-adịghị mma. (Rom 8:5; 12:9) Mgbe ọ bụla anyị gbalịsiri ike gbanwee àgwà na-adịghị mma anyị na-akpa, obi na-adịkwu anyị ụtọ na Baịbụl ka na-agbanwe ndụ anyị.

KWE KA OKWU CHINEKE NA-AGBANWE NDỤ GỊ

14, 15. Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà ndị dị́ Jehova mma? (Kwuokwa ihe dị́ n’igbe bụ́ “ Baịbụl na Ekpere Gbanwere Ndụ Ha.”)

14 Olee otú anyị nwere ike isi na-akpa àgwà dị́ Jehova mma? Kama iji aka anyị kpebie àgwà ndị anyị chọrọ ịgbanwe, anyị kwesịrị ikwe ka Chineke na-eduzi anyị. Ndị Rom 12:2 kwuru, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” Jehova na-eji Okwu ya na mmụọ nsọ ya enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ uche ya, mee ya ma gbanwee ndụ anyị otú ga-adị ya mma. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya, na-arịọkwa Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ. (Luk 11:13; Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị ekwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị, anyị ana-elekwa ihe anya otú Baịbụl gwara anyị Jehova si ele ihe anya, echiche anyị, okwu anyị, na omume anyị ga na-aka mma. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịkpawakwa àgwà na-adịghị mma anyị na-agbalị ka anyị kwụsị.—Ilu 4:23.

O nwere ike ịbara gị uru ma ị na-edekọ ma na-agụ amaokwu Baịbụl na isiokwu ndị kwuru banyere àgwà ndị na-adịghị mma gị na ha na-alụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15 E wezụga ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, anyị kwesịkwara iji akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị na-amụ Okwu Chineke ka anyị nwee ike ịna-eṅomi àgwà ọma niile Jehova nwere. Ọtụtụ isiokwu ndị na-agba n’Ụlọ Nche na Teta! na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eṅomi àgwà Jehova, na-alụsokwa àgwà ọjọọ ndị na-agụ anyị agụụ ọgụ. Anyị nwere ike ịhụ isiokwu ma ọ bụ amaokwu ndị ga-enyere anyị ezigbo aka, na-edekọ ha niile ka anyị nwee ike ịna-eme, anyị nọtụ, anyị agụọ ha.

16. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na anyị agbanwelighị àgwà anyị ngwa ngwa?

16 Ịmụta iṅomi àgwà Jehova na-ewe oge. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị̀ gbanwebeghị àgwà niile ị chọrọ ịgbanwe, nwee ndidi. Ná mmalite, o nwere ike ịdị mkpa ka ị na-amanye onwe gị ime ihe Baịbụl kwuru. Ma, ka ị na-echekwu echiche banyere ihe Jehova chọrọ ka ị na-eme ma na-eme ya, ọ ga-adịkwuru gị mfe ịna-ele ihe anya otú o si ele ya ma na-eme ihe ziri ezi.—Ọma 37:31; Ilu 23:12; Gal. 5:16, 17.

 NA-ECHE BANYERE IHE ỌMA CHINEKE GA-EME N’ỌDỊNIHU

17. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi, olee ihe ọma anyị kwesịrị ịna-atụ anya ya?

17 Ndị ohu Jehova ga-emecha zuo okè ma na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, anyị na àgwà ọjọọ agaghịzi na-alụ ọgụ. Ịkpa àgwà ndị na-amasị Chineke ga-adịrị anyị mfe, na-atọkwa anyị ụtọ. Ka ọ dị ugbu a, ihe mgbapụta ahụ na-eme ka anyị nwee ike ịna-efe Chineke anyị hụrụ anyị n’anya. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike ka Okwu Chineke na-agbanwe ndụ anyị.

18, 19. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Baịbụl ga na-agbanweli ndụ anyị?

18 Nwanna ahụ aha ya bụ Kevin anyị kwuburu okwu ya gbalịsiri ike ịna-ejide onwe ya ma iwe wee ya. Ọ tụgharịrị uche n’ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya. Ụmụnna nyeere ya aka, nyekwa ya ndụmọdụ, ya anabata ya. Nwanna ahụ nwere ezigbo ọganihu ka oge na-aga ma mechaa ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi. Ọ bụkwa okenye ọgbakọ kemgbe iri afọ abụọ. Ma, ọ ma na ya ka kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ịkpawakwa àgwà na-adịghị mma ọ na-akpabu.

19 Ihe Kevin mere gosiri na Baịbụl na-enyere ndị Chineke aka ịna-eme ka àgwà ha na-aka mma. N’ihi ya, ka anyị ghara ịda mbà ná mbọ anyị na-agba ka Okwu Chineke na-agbanwe ndụ anyị, na-emekwa ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. (Ọma 25:14) Ka anyị na-ahụ otú Jehova si agọzi mgbalị anyị, ọ ga-edo anyị anya na Baịbụl nwere ike ịna-agbanwe ndụ anyị.—Ọma 34:8.

^ [1] (paragraf nke 1) Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.