Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) MEE 2016

Ndị Kraịst kwesịrị iji akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ kpebie ma hà kwesịrị inye ndị ọrụ gọọmenti ego mmiri oyi

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe ga-enyere Ndị Kraịst aka ịmata ma ọ̀ dị mma inye ndị ọrụ gọọmenti onyinye ma ọ bụ ego mmiri oyi?

E nwere ọtụtụ ihe e kwesịrị iburu n’obi. Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ. Ha kwesịrị ịna-erubere iwu obodo isi ma ọ bụrụ na o megideghị iwu Jehova. (Mat. 22:21; Rom 13:1, 2; Hib. 13:18) Ha na-agbalịsi ike ịna-akwanyere omenala obodo ha ùgwù ma ‘hụ ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha.’ (Mat. 22:39; Rom 12:17, 18; 1 Tesa. 4:11, 12) Ime ihe ndị a Baịbụl kwuru nwere ike ime ka Ndị Kraịst bí n’ebe dị́ iche iche n’ụwa mata otú ha ga-esi na-ele inye onyinye ma ọ bụ ego mmiri oyi anya.

N’ọtụtụ ebe, nwa amaala ekwesịghị inye ndị ọrụ gọọmenti ihe ọ bụla ka e meere ya ihe e kwesịrị imere ya. Ndị ọrụ gọọmenti na-arụ ọrụ gọọmenti na-akwụ ha ụgwọ maka ya. Ha anaghịkwa ekwu ma ọ bụ tụọ anya ka e nye ha ihe ọ bụla ma e wezụga ụgwọ ọnwa ha. N’ọtụtụ obodo, ọ bụrụ na ndị ọrụ gọọmenti achọọ ka e nye ha ihe maka ịrụ ọrụ ha ma ọ bụ nata ihe ọ bụla maka ya, ha adaala iwu ọ bụrụgodị na ihe ha rụrụ bụ ihe iwu kwadoro. A na-ewere ụdị onyinye ahụ ka aka azụ, ọ bụrụgodị na onyinye ahụ emeghị ka a gbanwee ihe e kwesịrị ịrụrụ mmadụ. N’ụdị obodo ahụ, e nweghị onye ga-ajụwadị ma Onye Kraịst ò kwesịrị inye ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ onyinye ma ọ bụkwanụ ego mmiri oyi. O doro anya na ụdị onyinye ahụ adịghị mma.

Ma, n’obodo ndị a na-enweghị ụdị iwu ndị ahụ ma ọ bụkwanụ n’ebe a na-ejichaghị ha kpọrọ ihe, ndị ọrụ gọọmenti anaghị eche na ịnata onyinye maka ihe ha rụrụ adịghị mma. N’obodo ụfọdụ, ndị ọrụ gọọmenti na-eji ọkwá ha anara ndị ha rụụrụ ọrụ ego ha ma ọ bụ na-enweta ihe ndị ọzọ n’aka ha, ha anaghịkwa ekwe emere ndị mmadụ ihe e kwesịrị imere ha ọ gwụla ma è nyere ha ihe. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ekwu ka e nye ha ego mmiri oyi, ma ndị na-edeba alụmdi na nwunye n’akwụkwọ ma ndị na-anakọta ụtụ isi ma ndị na-enye akwụkwọ ikike tupu a rụwa ụlọ ma ndị ọzọ. Ọ bụrụ na e nyeghị ha ya, ha na-akpachara anya mee ka o siere ndị mmadụ ike inweta ihe ruuru ha ma ọ bụdị mee ka ha ghara inweta ya. N’otu obodo, e kwudịrị na ndị na-agbanyụ ọkụ anaghị amalite ọrụ ma ha bịarute ebe ọkụ  na-agba ọ gwụla ma è bu ụzọ nye ha ego mmiri oyi gbagoterenụ.

Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mma inyetụ mmadụ obere ihe iji kelee ya maka ihe iwu kwadoro o meere anyị

N’ebe ndị a na-emekarị otú ahụ, ụfọdụ ndị na-eche na o nweghị otú mmadụ ga-esi ghara ịna-enye ego mmiri oyi. Ọ dị́ otú ahụ, Onye Kraịst nwere ike iwere na ego mmiri oyi so n’ụgwọ ọ ga-akwụ ka e nwee ike imere ya ihe e kwesịrị imere ya. Ma, n’obodo ebe ọtụtụ ndị na-arụrụ aka, Onye Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ịna-esiri ya ike ịmata ihe ga-adị Chineke mma na ihe na-agaghị adị ya mma. E nwere ihe dị́ iche na mmadụ inye ego mmiri oyi ka o nweta ihe ruuru ya na onye ahụ ịchọ ka e menyere ya otú iwu na-akwadoghị. N’ebe ọ na-enweghị ihe e ji nrụrụ aka kpọrọ, ụfọdụ ndị na-enye onye ọrụ gọọmenti ego mmiri oyi ka o meere ha ihe iwu na-akwadoghị ma ọ bụkwanụ nyetụ onye uwe ojii ma ọ bụ onyeisi n’ụlọ ọrụ gọọmenti ego ka ha ghara ịkwụ ihe ha kwesịrị ịkwụ. O doro anya na ọ gaghị adị mma ka anyị nye mmadụ onyinye iji mechie ya ọnụ. Ọ gaghịkwa adị mma ka ndị ọzọ nye anyị onyinye iji mechie anyị ọnụ. Nke ọ bụla n’ime ha ga-eme ka a ghara ikpe ikpe ziri ezi.—Ọpụ. 23:8; Diut. 16:19; Ilu 17:23.

Onye ọrụ gọọmenti kwuo ka e nye ya ego mmiri oyi, ọtụtụ Ndị Kraịst má nke a na-akọ anaghị ekwe enye n’ihi na e jirila Baịbụl zụọ akọnuche ha. Ha ma na inye ụdị ego ahụ pụtara na nrụrụ aka dị ha mma ma ọ bụ na ha na-akwado ya. N’ihi ya, a gwa ha nye ụdị onyinye ahụ, ha anaghị ekwe.

Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst má nke a na-akọ maara na inye onyinye ka e meere ha ihe iwu na-akwadoghị nwere ike ịbụ inye aka azụ, otú ihe si dị́ n’obodo nwere ike ime ka ụfọdụ nyetụ mmadụ onyinye iji kelee ya maka ihe ọ rụrụ ma ọ bụ ka e meere ya ihe ngwa ngwa otú iwu kwuru. N’oge ndị ọzọ, a gwọọ ụfọdụ Ndị Kraịst n’ụlọ ọgwụ gọọmenti n’anaghị ha ego, ha na-enye ndị dọkịta na ndị nọọsụ onyinye iji kelee ha maka otú ha si gwọọ ha. Ha na-enye ha onyinye ahụ ma a gwọchaa ha kama inye ya tupu a gwọwa ha, ka a ghara ichewe na ọ bụ aka azụ ma ọ bụ na ha nyere ya ka e menyere ha.

A gaghị ekwuchali ihe niile nwere ike ime n’obodo niile n’isiokwu a. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú e si eme n’obodo, Ndị Kraịst chọọ ikpebi ihe ha ga-eme, ha kwesịrị ime ihe ọ bụla ga-eme ka ha nwee akọnuche dị́ ọcha. (Rom 14:1-6) Ha ekwesịghị ịda iwu obodo. (Rom 13:1-7) Ha kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka a kọchaa aha Jehova ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. (Mat. 6:9; 1 Kọr. 10:32) Ihe ha kpebiri ime kwesịkwara igosi na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya.—Mak 12:31.

 Olee otú ọgbakọ ga-esi gosi na obi dị ha ụtọ mgbe a mara ọkwa na a nabatala onye a chụrụ n’ọgbakọ?

Na Luk isi 15, Jizọs nyere ihe atụ magburu onwe ya banyere otu nwoke nwere otu narị atụrụ. Mgbe otu atụrụ furu, nwoke ahụ hapụrụ atụrụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa, gaa chọwa nke ahụ furu efu “ruo mgbe ọ chọtara ya.” Jizọs kwukwara na ‘mgbe ọ chọtara ya, o kukwasịrị ya n’ubu ya ma na-aṅụrị ọṅụ. Mgbe ọ laruru ụlọ, ọ kpọkọtara ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, “Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtawo m atụrụ m nke furu efu.”’ Ihe Jizọs ji mechie okwu ya bụ: “Ana m asị unu na otú ahụ ka a ga-enwe ọṅụ dị ukwuu n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrịnụ karịa n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu, ndị nchegharị na-adịghị mkpa.”—Luk 15:4-7.

Amaokwu ndị ọzọ gosiri na ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ bụ ka ọ gbazie echiche ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, bụ́ ndị na-akatọ ya maka na ya na ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-anọ. (Luk 15:1-3) Jizọs kwuru na ọṅụ na-adị n’eluigwe mgbe otu onye mmehie chegharịrị. Ajụjụ bụzi, ‘Ebe ọ bụ na ọṅụ na-adị n’eluigwe, ọ̀ bụ na ọṅụ ekwesịghị ịdị n’ụwa mgbe onye mmehie chegharịrị, chigharịa, ma na-emere onwe ya ụzọ kwụ ọtọ?’—Hib. 12:13.

A nabata onye a chụrụ n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ. Ọ bụ eziokwu na onye ahụ ka kwesịrị ịna-erubere Chineke isi, ma nnabata a nabatara ya gosiri na o chegharịala. Obi dịkwa anyị ụtọ na o chegharịrị. N’ihi ya, ndị okenye maa ọkwa na a nabatala mmadụ, ụmụnna nwere ike ịkụ aka otú kwesịrị ekwesị ma ha chọọ.

Olee ihe ọ ga-abụ ya na-eme ka ọdọ mmiri Betzeta dị́ na Jeruselem ‘na-eme ụṅara’?

Ụfọdụ ndị bí na Jeruselem n’oge Jizọs chere na ọdọ mmiri Betzeta nwere ike ịgwọ mmadụ ma mmiri ya ‘mee ụṅara.’ (Jọn 5:1-7) Ọ bụ ya mere ndị chọrọ ka a gwọọ ha ọrịa ji ezukọ n’ọdọ mmiri ahụ.

Ndị na-eme nchọpụta ekwuola na ọdọ mmiri ahụ bụ ebe ndị Juu na-asa ahụ́ iji mee ka mmadụ dị́ ọcha. Mmiri na-asọbata na ya na-esi n’ọdọ mmiri ọzọ dị́ n’akụkụ ya, n’otu ebe ahụ. Nchọpụta e mere n’ebe ahụ gosiri na e ji ihe e ji egbochi mmiri kewaa ọdọ mmiri abụọ ahụ. E nwere ike imeghe ọnụ ụzọ a rụnyere n’ihe ahụ e ji gbochie mmiri ahụ ka mmiri nwee ike isi n’ọdọ mmiri ahụ sọba n’ala ala ọdọ mmiri nke ọzọ, bụ́ ebe ndị Juu na-anọ eme ka mmadụ dị́ ọcha. Mgbe ọ bụla e meghere ọnụ ụzọ ahụ, otú mmiri sí na ya na-esi asọsi ike na-eme ka ọdọ mmiri ahụ na-eme ụṅara.

N’ụfọdụ Baịbụl, Jọn 5:4 kwuru na mmụọ ozi na-akpasu mmiri ahụ. Ma, amaokwu ahụ adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Grik ndị kacha ochie a na-akwanyere ùgwù, dị́ ka Codex Sinaiticus, nke e dere n’ihe dị́ ka narị afọ nke anọ n’Oge Ndị Kraịst. Ma, na Betzeta, Jizọs gwọrọ otu nwoke nọ́ n’ọrịa kemgbe iri afọ atọ na asatọ. Ọ gwọrọ nwoke ahụ ozugbo n’asịghị ya banye n’ọdọ mmiri ahụ.