Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2016

Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?

Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?

“Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.”—1 KỌR. 10:31.

ABỤ: 34, 61

1, 2. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji eyi uwe dị́ mma n’anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

OTU akwụkwọ akụkọ n’obodo Nedalandz kwuru otú ndị isi chọọchị si jie ejiji n’otu nnọkọ ha nwere. O kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị yi uwe na-adịghị mma n’anya bịa nnọkọ ahụ, karịchaa mgbe okpomọkụ dị. Ma, Ndịàmà Jehova emeghị otú ahụ ná mgbakọ ha. . . . Ụmụ okorobịa na ndị dimkpa yi kootu, kpọọkwa taị, ụmụ agbọghọ na ndị nne eyiri sket gbadara agbada, . . . dị́ mma n’anya, nke a na-eyi n’oge a.” N’eziokwu, a na-etokarị Ndịàmà Jehova maka otú ha si ‘eji uwe dị mma n’anya achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, n’ụzọ kwesịrị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.’ (1 Tim. 2:9, 10) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụ nwaanyị ka Pọl onyeozi bu n’obi kwuo ihe a, ma ọ gbasara ụmụ nwoke bụ́ Ndị Kraịst.

2 Ebe anyị bụ ndị na-ejere Jehova ozi, anyị kwesịrị ịna-eyi uwe dị́ mma n’anya. Ọ bụkwa ihe Chineke anyị na-efe chọrọ. (Jen. 3:21) Ihe Baịbụl kwuru gbasara uwe na ejiji gosiri n’eziokwu na Ọkaakaa eluigwe na ụwa chọrọ ka ndị na-efe ya na-eyi uwe dị́ mma n’anya. N’ihi ya, uwe ndị anyị na-eyi ekwesịghị ịbụ ihe dị́ naanị anyịnwa mma, o kwesịkwara ịdị Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị mma.

3. Gịnị ka Iwu Chineke nyere ndị Izrel na-akụziri anyị gbasara ụdị uwe anyị kwesịrị ịna-eyi?

 3 N’Iwu Mozis, e nwere iwu ndị mere ka ụmụ Izrel ghara itinye aka n’omume rụrụ arụ mba ndị gbara ha gburugburu na-eme. Iwu ahụ gosiri na Jehova achọghị ka ndị mmadụ na-eyi ụdị uwe ga-eme ka a ghara ịma ma hà bụ nwoke ka hà bụ nwaanyị. (Gụọ Diuterọnọmi 22:5.) Iwu ahụ mere ka o doo anya na obi anaghị atọ Jehova ụtọ ma nwoke yiri efe ga-eme ka o yie nwaanyị ma ọ bụ nwaanyị iyi efe ga-eme ka o yie nwoke ma ọ bụkwanụ nke ga-eme ka o sie ike ịma ihe dị́ iche na nwoke na nwaanyị.

4. Gịnị ga-enyere Ndị Kraịst aka ikpebi uwe ha kwesịrị ịna-eyi?

4 Baịbụl kwuru ihe ndị ga-enyere Ndị Kraịst aka ikpebi uwe dị́ mma ha ga na-eyi. Ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru gbasara mmadụ niile n’agbanyeghị ebe anyị bi, otú omenala anyị dị ma ọ bụ otú ihu ígwé dị. Ọ dịghị mkpa ka e depụtara anyị ụdị uwe dị́ mma na ndị na-adịghị mma. Kama, ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka iji aka anyị na-ekpebi ụdị uwe anyị kwesịrị ịna-eyi. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịmata ihe bụ́ “uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè” mgbe anyị na-ekpebi uwe anyị ga-eyi.—Rom 12:1, 2.

“ANYỊ NA-EME KA A MATA ANYỊ DỊ KA NDỊ OZI CHINEKE”

5, 6. Olee uru ụdị uwe anyị na-eyi kwesịrị ịbara ndị ọzọ?

5 Pọl onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee ihe dị́ mkpa ná 2 Ndị Kọrịnt 6:4. (Gụọ ya.) Ejiji anyị na-egosi ọtụtụ ihe banyere anyị. Ọtụtụ ndị na-ekwu ihe ụfọdụ banyere anyị n’ihi ‘ihe anya ha hụrụ.’ (1 Sam. 16:7) Ebe anyị bụ ndị ozi Chineke, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị iyi uwe dị́ anyị mma. Ihe ndị anyị mụtara n’Okwu Chineke kwesịrị ime ka anyị ghara ịna-eyi uwe tapaara anyị n’ahụ́, uwe na-ahụ ụzọ, ma ọ bụ nke ga-eme ka mmadụ chewe gbasara omume rụrụ arụ. Ọ pụtara na anyị ekwesịghị ịna-eyi uwe ga-eme ka a na-ahụ ebe a na-ekwesịghị ịhụ n’ahụ́ anyị. Anyị ekwesịghị iji ejiji ọ ga-abụ mmadụ hụ, ahụ́ agaghị eru ya ala, ma ọ bụ ya elewe anya ebe ọzọ.

6 Ọ bụrụ na uwe anyị na-adị ọcha, dị́kwa mma n’anya, o nwere ike ime ka ndị mmadụ na-akwanyere anyị ùgwù n’ihi na anyị bụ ndị ozi Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova. Ha nwere ike ịbịa fewe Chineke. Ọ bụrụ na anyị na-eji ejiji dị́ mma, ọ ga-eme ka ndị ọzọ na-ele ọgbakọ Jehova anya ọma, meekwa ka ha na-egekwu ntị n’ozi na-azọ ndụ anyị na-ekwusa.

7, 8. Olee mgbe ọ kacha mkpa ka anyị jie ejiji dị́ mma?

7 Anyị kwesịrị ịna-eyi uwe dị́ mma n’anya n’ihi Chineke anyị dị́ nsọ, ụmụnna anyị, na ndị anyị na-ezi ozi ọma. Anyị kwesịrị ịna-eyi uwe ga-eme ka a na-akwanyere ozi ọma anyị ùgwù, meekwa ka e too Jehova. (Rom 13:8-10) Mgbe ọ kacha mkpa ka anyị yiri uwe dị́ mma bụ mgbe anyị na-eme ihe gbasara ofufe Chineke, dị́ ka ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị kwesịrị ịna-eji ejiji ga-egosi na anyị bụ ‘ndị na-ekwupụta na anyị na-asọpụrụ Chineke.’ (1 Tim. 2:10) O doro anya na ụfọdụ uwe dị́ mma n’otu obodo nwere ike ọ gaghị adị mma n’obodo ọzọ. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-echebara omenala obodo echiche ka ha ghara iyi uwe ga-akpasu ndị ọzọ iwe.

Ụdị ejiji ị na-eji ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ na-akwanyere Chineke ị na-anọchite anya ya ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)

 8 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:31. Anyị gaa mgbakọ, anyị kwesịrị iji ejiji dị́ mma n’anya kama iji ejiji ga-eme ka onye ọ bụla lewe anyị ka fim otú ahụ ndị ụwa na-eme. Ọ bụrụgodị mgbe anyị na-aga ebe e nyere anyị ụlọ, mgbe anyị na-ala ala, na mgbe anyị na-atụrụ ndụ tupu mgbakọ ebido nakwa mgbe a gbasara, anyị kwesịrị ịna-eji ejiji dị́ mma n’anya. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ ikwu na anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’eziokwu, ọnụ ga-aka anyị izi ndị ọzọ ozi ọma ma ohere ya dapụta.

9, 10. Gịnị mere Ndị Filipaị 2:4 ji kwesị ịgbasa uwe anyị na-eyi?

9 Gụọ Ndị Filipaị 2:4. Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-echeta otú ejiji ha ga-eme ka obi dị́ ụmụnna ha? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ndị Chineke na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ.” (Kọl. 3:2, 5) Anyị ekwesịghị ime ka o siere ụmụnna anyị ike ime ihe a Baịbụl kwuru. O nwere ike ịka na-esiri ụfọdụ ụmụnna na-emebu omume rụrụ arụ ike iwepụ ihe ọjọọ n’obi ha. (1 Kọr. 6:9, 10) Ọ̀ ga-adịnụ mma ka anyị mee ka o sikwuoro ha ike ime ihe ziri ezi?

10 Mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ, anyị kwesịrị ịna-eji ejiji ga-eme ka ọgbakọ bụrụ ebe a na-eme omume dị́ ọcha. Anyị kwesịrị ịna-eme otú ahụ ma n’ọmụmụ ihe ma mgbe anyị na-atụrụ ndụ. Ọ bụ anyị ga-ekpebi efe anyị ga-eyi. Ma, anyị niile kwesịrị ịna-eyi uwe ga-eme ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe  ịna-eme omume dị́ ọcha ma bụrụ ndị dị́ nsọ n’echiche, n’okwu, nakwa n’omume. (1 Pita 1:15, 16) Ezigbo ịhụnanya ‘adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghịkwa achọ ọdịmma nke ya.’—1 Kọr. 13:4, 5.

IYI UWE DỊ́ MMA N’OGE KWESỊRỊ EKWESỊ NAKWA N’EBE KWESỊRỊ EKWESỊ

11, 12. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche mgbe anyị na-ekpebi ụdị uwe anyị ga-eyi?

11 Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eyi, anyị kwesịrị iburu n’obi na “ihe ọ bụla a na-eme eme na ọrụ ọ bụla a na-arụ arụ nwere oge.” (Ekli. 3:1, 17) O doro anya na anyị nwere ike iyi uwe anyị yi n’ihi oyi, okpomọkụ, ihu ígwé, ụdị ebe anyị bi, na otú ihe dị. Ma, ihu ígwé anaghị eme ka iwu Jehova gbanwee.—Mal. 3:6.

12 Ná mba ndị e nwere okpomọkụ, ọ naghị adịcha mfe iyi uwe dị́ mma n’anya, nke ga-egosi na anyị nwere uche. N’ihi ya, obi na-adị ụmụnna anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị eyighị uwe tapaara anyị n’ahụ́ ma ọ bụ nke na-ahụ ụzọ. (Job 31:1) Mgbe anyị gara ebe a na-egwu mmiri, uwe anyị yi egwu mmiri kwesịrị ịdị mma n’anya iji gosi na anyị dị umeala n’obi. (Ilu 11:2, 20) Ọ bụrụgodị na ọ na-abụ ọtụtụ ndị ụwa gaa igwu mmiri, ya afọ obere ka ha gbara ọtọ, ihe bụ́ mkpa anyị bụ ime ihe ga-eme ka e too Chineke anyị dị́ nsọ anyị hụrụ n’anya.

13. Gịnị mere ndụmọdụ ahụ dị́ ná 1 Ndị Kọrịnt 10:32, 33 ji kwesị ịgbasa uwe anyị kpebiri iyi?

13 E nwere ihe ọzọ dị́ mkpa Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịhọrọ uwe anyị kwesịrị ịna-eyi. Ọ bụ ichebara akọnuche ndị ọzọ echiche, ma hà bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ na ha abụghị. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:32, 33.) Anyị ekwesịghị iyi uwe ga-akpasu ndị ọzọ iwe. Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.” O kwuziri na ihe kpatara ya bụ na “Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Rom 15:2, 3) N’eziokwu, ime uche Chineke na inyere ndị ọzọ aka dị Jizọs mkpa karịa ime ihe dị́ ya mma. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-eyi uwe naanị maka na ọ dị anyị mma ma ya abụrụ na o nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ige ntị n’ozi ọma anyị na-ezi ha.

14. Olee otú ndị nne na nna ga-esi na-akụziri ụmụ ha iji ejiji ga-eme ka e too Chineke?

14 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ pụtara na ha na ụmụ ha ga na-agba mbọ iji ejiji dị́ mma nke ga-eme Chineke obi ụtọ. (Ilu 22:6; 27:11) Ha kwesịkwara ịkụziri ụmụ ha ịdị na-akwanyere Chineke dị́ nsọ ha na-efe ùgwù. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eji ejiji dị́ mma ụmụ ha ga-amụta, wetuokwa obi na-agwa ha ihe ha kwesịrị ime. Ọ ga-amagbu onwe ya ma ndị nne na nna gosi ụmụ ha otú ha ga-esi enweta uwe dị́ mma na ebe ha ga-enweta ya. Ọ pụtara na ụmụaka ekwesịghị ịna-eyi efe naanị maka na ọ dị ha mma, kama ọ ga-abụ efe ga-eme ka a sọpụrụ Jehova, bụ́ Chineke ha na-anọchite anya ya.

JIRI IKIKE E NYERE GỊ IKPEBI IHE Ị GA-EME MEE IHE BARA URU

15. Olee ihe kwesịrị inyere anyị aka ikpebi ụdị uwe anyị ga-eyi?

15 Baịbụl nyere anyị ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-eme ka e too Chineke. Ma, ọ bụ anyị ga-ekpebi ụdị uwe anyị ga na-eyi. Nke dị́ anyị mma na nke aka anyị ruru  nwere ike ịdị iche na nke ndị ọzọ. Ma, uwe anyị kwesịrị ịna-adị ọcha mgbe niile, dị́ mma n’anya, kwesịkwa ihe anyị gara. O kwesịrị ịbụ nke a na-anaghị ele anya ọjọọ n’ebe anyị bi.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agbasi mbọ ike iji ejiji dị́ mma?

16 Anyị ma na ọ naghị adị mfe mgbe niile inweta uwe dị́ mma n’anya, nke na-enweghị ọrụ. Ihe a na-ahụ n’ọtụtụ ebe a na-ere efe bụ naanị uwe na-ewu ewu. N’ihi ya, ịchọta uwe dị́ mma n’anya, nke na-agaghị atapara n’ahụ́ nwere ike iwe oge. Ọ dịghịkwa mfe. Ma, ụmụnna anyị nwere ike ịmata na anyị na-agba mbọ inweta efe mara mma ma kwesị ekwesị, obi ga-adịkwa ha ụtọ maka ya. Obi ụtọ anyị na-enwe maka ime ka e too Nna anyị nke eluigwe karịrị mbọ ọ bụla anyị na-agba iji ejiji ga-eme ka e too ya.

17. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka nwanna hapụ afụ ọnụ ya ma ọ bụ kpụọ ya?

17 Ụmụnna nwoke hà kwesịrị ịna-eruwe afụ ọnụ? N’Iwu Mozis, a gwara ụmụ nwoke ka ha ghara ịna-akpụ afụ ọnụ ha. Ma, a gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-edebe Iwu Mozis, ha anaghịkwa edebe ya. (Lev. 19:27; 21:5; Gal. 3:24, 25) N’obodo ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịhapụ afụ ọnụ ya, mezie ya ka ọ dị mma n’anya. Ọ gaghịkwa eme ka ndị mmadụ ghara ige ntị n’ozi ọma. N’eziokwu, n’obodo ndị ahụ, ụfọdụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere afụ ọnụ. Ma, ụfọdụ ụmụnna nwere ike ikpebi na ha ga na-akpụ nke ha. (1 Kọr. 8:9, 13; 10:32) E nwekwara obodo ndị ụmụ nwoke na-anaghị ahapụ afụ ọnụ ha. A naghịkwa ewere ya na ndị ozi Chineke kwesịrị ịhapụ afụ ọnụ ha ka o rujuo erujuo. N’eziokwu, nwanna hapụ nke ya, o nwere ike ime ka ‘a na-ekwujọ ya,’ meekwa ka a ghara ịna-eto Chineke n’ihi uwe ya na ejiji ya.—Rom 15:1-3; 1 Tim. 3:2, 7.

18, 19. Olee otú Maịka 6:8 si enyere anyị aka ná mbọ anyị na-agba iji ejiji ga-adị Chineke mma?

18 Obi dị anyị ụtọ na e nweghị ebe Jehova depụtaara anyị uwe dị́ mma na nke na-adịghị mma. Kama, ọ hapụrụ anyị ka anyị jiri uche anyị na ihe Baịbụl kwuru kpebie uwe anyị ga-eyi. N’ihi ya, ọ bụrụgodị mgbe anyị na-ekpebi ihe gbasara uwe na ejiji, anyị kwesịrị igosi na anyị ‘ji obi umeala soro Chineke anyị na-eje ije.’—Maị. 6:8.

19 Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghọta na Jehova dị ọcha, dịkwa nsọ nakwa na ihe ọ chọrọ ka anyị mee bụ ihe ga-akacha baara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị umeala n’obi, anyị ga na-eme ihe o kwuru. Ịdị umeala n’obi ga-enyekwara anyị aka ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma ghara iji ejiji ga-akpasu ha iwe.

20. Olee uru uwe anyị na ejiji anyị kwesịrị ịbara ndị ọzọ?

20 Uwe anyị na-eyi kwesịrị igosi n’eziokwu na anyị na-efe Jehova. O kwesịrị ime ka ụmụnna anyị na ọhaneze ghọta na anyị na-anọchite anya Chineke anyị bụ́ onye ezi omume. Ọ gwara anyị ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme. Obi dịkwa anyị ụtọ ịna-eme ha. E kwesịrị ịna-aja ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị mma maka otú ha si eji ejiji dị́ mma na otú ha si akpa àgwà ọma. Ha na-eme ka ndị nwere ezi obi na-enwe mmasị n’ozi ọma na-enye ndụ, nke sí na Baịbụl. Ha na-emekwa ka e too Jehova, obi adịkwa ya ụtọ. Ọ bụrụ na anyị na-eyi uwe dị́ mma, anyị ga-eme ka a na-eto Chineke anyị, bụ́ Onye ‘yi ebube na ịma mma dị ka uwe.’—Ọma 104:1, 2.