Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2016

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Okwukwe Ha Sie Ike

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Okwukwe Ha Sie Ike

“Ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ . . . Ka ha too aha Jehova.”—ỌMA 148:12, 13.

ABỤ: 88, 115

1, 2. (a) Olee ihe nwere ike isiri ndị nne na nna ike, oleekwa otú ha ga-esi merie ya? (b) Olee ihe anọ anyị ga-elebara anya?

NNE na nna bí na Frans kwuru, sị: “Anyị kweere na Jehova, ma ọ pụtaghị na ụmụ anyị ga-ekwere. Okwukwe anaghị esi mmadụ n’ọbara. Ụmụ anyị na-eji nwayọọ nwayọọ enwe ya.” Otu nwoke bụ́ onye Ọstrelia dere, sị: “Ọ dị ka ihe ga-akacha siere mmadụ ike ọ̀ bụ inyere ụmụ ya aka ka ha nwee okwukwe. I kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime iji na-enyere ha aka. I nwere ike iche na otú i si zaa nwa gị ajụjụ ọ jụrụ ejula ya afọ. E mechaa, ya ajụọ gị ajụjụ ahụ ọzọ. Azịza juru nwa gị afọ taa nwere ike ọ gaghịzi eju ya afọ echi. N’ihi ya, i nwere ike ịna-akụziri ya ihe ndị ị kụziirila ya mbụ.”

2 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, è nwere mgbe ọ na-adị gị ka ị gaghị akụzirili ụmụ gị otú ha ga-esi nwee okwukwe ma ha too? E nweghị onye n’ime anyị ga-ejili naanị amamihe nke ya mee ya. (Jere. 10:23) Ma anyị ga-emeli ya ma anyị rịọ Chineke ka o nyere anyị aka. Ka anyị leba anya n’ihe anọ ga-enyere gị aka ịkụziri ụmụ gi otú ha ga-esi enwe okwukwe. Nke mbụ, mata ha nke ọma. Nke abụọ, jiri obi gị niile na-akụziri ha ihe. Nke atọ, jiri ezigbo ihe atụ na-akụziri ha ihe. Nke anọ, nwee ndidi, na-ekpesikwa ekpere ike.

 MATA ỤMỤ GỊ NKE ỌMA

3. Olee otú ndị nne na nna ga-esi na-eme ka Jizọs ma ha kụziwere ụmụ ha ihe?

3 Ụjọ atụghị Jizọs ịjụ ndị na-eso ụzọ ya ihe ha kweere. (Mat. 16:13-15) Na-eme ka Jizọs. Ọ na-akacha mma ịgwa ụmụ gị ka ha kwuo obi ha mgbe ahụ́ ruru ha ala. Ọ pụtara na ha ga-agwa gị ihe na-echu ha ụra ma ọ bụ ihe gbagwojuru ha anya. Otu nwanna nwoke dị́ afọ iri na ise bí n’Ọstrelia dere, sị: “Mụ na papa m na-ekwurịtakarị gbasara ihe m kweere. Ọ na-enyekwara m aka iche echiche. Ọ na-ajụkarị m: ‘Gịnị ka Baịbụl kwuru?’ ‘Ì kwetara ihe a Baịbụl kwuru?’ ‘Gịnị mere i ji kweta?’ Ọ chọrọ ka m zaa ihe dị́ m n’obi, ọ bụghị ikwughachi ihe yanwa ma ọ bụ mama m kwuru. Ka m na-etokwu, m na-amatakwu ihe m ga-aza.”

4. Gịnị mere i ji kwesị iji ajụjụ nwa gị jụrụ kpọrọ ihe? Nye ihe atụ.

4 E nwee ihe Baịbụl na-akụzi nke na-eme nwa gị obi abụọ, ekwela ka o wee gị iwe ma ọ bụ mee ka ị bawara ya mba. Wetuo obi nyere ya aka ka ọ mata azịza ajụjụ ndị ọ jụrụ. Otu nna kwuru, sị: “Jiri ajụjụ nwa gị jụrụ kpọrọ ihe. Ewerela ajụjụ ya ka ihe na-abaghị uru. Agbarala okwu ụfọdụ ọsọ maka na ha na-eme ka ahụ́ ghara iru gị ala.” N’eziokwu, ọ dị mma ka nwa gị jụọ ajụjụ n’ihi na ọ ga-egosi na ọ chọrọ ịmata ihe. Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ọ jụrụ ajụjụ ndị dị́ ezigbo mkpa. (Gụọ Luk 2:46.) Otu nwa okorobịa bí na Denmak kwuru, sị: “Mgbe m gwara papa m na mama m na m na-eche ma Ndịàmà Jehova hà na-akụzi eziokwu, ha abaghịrị m mba n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ha na-echegbu onwe ha banyere m. Ha ji Baịbụl zaa ajụjụ m niile.”

5. Olee otú ndị nne na nna ga-esi gosi na ha ejighị okwukwe ụmụ ha egwu egwu?

5 Gbaa mbọ ka ị mata ụmụ gị nke ọma. Mata ihe ha na-eche, otú obi dị ha na ihe bụ́ mkpa ha. Echekwala na ha nwere okwukwe naanị n’ihi na ha na-eso unu aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Na-agwa ha gbasara Jehova mgbe ọ bụla gị na ha na-emekọ ihe. Na-etinye ụmụ gị n’ekpere ma mgbe gị na ha na-ekpekọ ekpere ma mgbe naanị gị na-ekpe ekpere. Gbalịa mata ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara ha, ma nyere ha aka imeri ha.

JIRI OBI GỊ NIILE NA-AKỤZIRI HA IHE

6. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ana-agba mbọ ka eziokwu Baịbụl ruo ha n’obi, olee otú ọ ga-esi nyere ha aka ịna-akụziri ụmụ ha ihe?

6 Ihe Jizọs kụziri ruru ndị mmadụ n’obi n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya, mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, hụkwa ndị mmadụ n’anya. (Luk 24:32; Jọn 7:46) Ịhụ Jehova n’anya otú ahụ ga-enyere ndị nne na nna aka ịna-akụziri ụmụ ha ihe ga-eru ha n’obi. (Gụọ Diuterọnọmi 6:5-8; Luk 6:45.) N’ihi ya, ndị nne na nna, na-amụsinụ Baịbụl na akwụkwọ anyị ike. Na-agbanụ mbọ ka unu matakwuo gbasara ihe Chineke kere, na-agụkwanụ isiokwu ndị kwuru banyere ya n’akwụkwọ anyị. (Mat. 6:26, 28) Ọ bụrụ na unu na-eme otú ahụ, unu ga-amatakwu Jehova, nwekwuo obi ụtọ maka ihe ndị o kere, nweekwa ike ịna-akụziri ụmụ unu ihe.—Luk 6:40.

7, 8. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna amata Baịbụl nke ọma, gịnị ka ọ ga-eme? Nye ihe atụ.

7 Ị mata eziokwu Baịbụl nke ọma, ị ga na-agwa ndị ezinụlọ gị banyere ya. Na-eme otú ahụ mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe unu na-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ. Ihe ọzọ bụ na unu kwesịrị ịna-ekwu banyere ụdị ihe ahụ mgbe unu na-akparịta ụka kwa ụbọchị. I kwesịghị ịmanyewe ha ikwu okwu. Ọ bụghịkwa ihe a ga-eyiri oge. Kama, o kwesịrị ịdị ka mkparịta ụka enyi na enyi. Otú ahụ ka otu nwanna na nwunye ya na-eme n’Amerịka.  Ha na-agwa ụmụ ha banyere Jehova ma ha hụ ihe mara mma Jehova kere ma ọ bụ ma ha riwe nri na-atọ ụtọ. Ha kwuru, sị: “Anyị na-echetara ụmụ anyị na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na o chere echiche nke ọma nye anyị ihe niile o nyere anyị.” Na Saụt Afrịka, otu nwanna na nwunye ya na-ekwu banyere ihe Chineke kere ma ha na ụmụ ha nwaanyị abụọ rụwa ọrụ n’ubi. Ha na-agwa ụmụ ha otú dị ịtụnanya ihe a kụrụ si epu ma mechaa too. Ha sịrị: “Anyị na-agba mbọ ka ụmụ anyị mụta iji ihe ndị dị́ ndụ na ụzọ dị́ ebube Chineke si kee ha kpọrọ ihe.”

8 Otu nwanna bí n’Ọstrelia kpọ nwa ya nwoke dị́ afọ iri gaa ebe a na-edowe ihe ndị mgbe ochie, jiri ohere ahụ mee ka okwukwe nwa ya sie ike, meekwa ka ọ ghọta na ọ bụ Jehova kere ihe niile. Nwanna ahụ sịrị: “Anyị hụrụ ebe e gosichara obere ihe ụfọdụ na-ebi na mmiri n’oge ochie, ndị na-adịghịzi ugbu a. O juru anyị anya na ihe ndị ahụ mara ezigbo mma, dị́ mgbagwoju anya, nweekwa ihe niile ha kwesịrị inwe. Ha adịghị iche n’ihe ndị anyị na-ahụ taa. N’ihi ya, ọ bụrụ na ihe ndị dị́ ndụ si n’ihe na-enweghị ihe ọ bụ ghọzie ihe dị́ mgbagwoju anya, gịnịzi mere ihe ndị ahụ na-ebi na mmiri n’oge ochie ji dị́ mgbagwoju anya otú ahụ? Ihe a m mụtara mere m obi ụtọ, mụ akụziere ya nwa m nwoke.”

JIRI EZIGBO IHE ATỤ NA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ IHE

9. Gịnị mere o ji dị́ mma ka e jiri ihe atụ na-akụzi ihe, oleekwa otú otu nwanna nwaanyị si jiri ya kụziere ụmụ ya ihe?

9 Jizọs na-ejikarị ihe atụ akụzi ihe n’ihi na ọ na-eru ndị mmadụ n’obi, mee ka ha chee echiche ma ghara ichefu ihe a kụziiri ha. (Mat. 13:34, 35) Ụmụaka na-ejikarị uche ha ahụ ihe a na-akọrọ ha. N’ihi ya, ndị nne na nna, jirinụ ihe atụ na-akụziri ụmụ unu ihe. Ọ bụ ihe otu nwaanyị bí na Japan meere ụmụ ya ndị nwoke abụọ. Mgbe otu dị afọ iri, onye nke ọzọ adịrị afọ asatọ, ọ kụziiri ha na otú Jehova si kee ikuku dị́ n’ụwa gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. O nyere ha mmiri ara ehi, shuga, na kọfị, sị ha meere ya otu iko kọfị. O kwuru na ha kpachapụrụ anya mee kọfị ahụ. Mgbe ọ jụrụ ha ihe mere ha ji kpachapụ anya otú ahụ, ha gwara ya na ha chọrọ ime kọfị ga-adị ya mma. Ọ kọwaara ha na Chineke kpachapụrụ anya otú ahụ kee ikuku dị́ n’ụwa ka o nwee ike ịdị ndị mmadụ mma n’ahụ́. Ihe atụ ahụ dabara adaba n’ihi afọ ole ha dị. O mere ka ha chee echiche nke ọma ma mụta ihe a kụziiri ha, ha echefughịkwa ihe ha mụtara.

I nwere ike iji ihe nwa gị na-ahụkarị mee ka ọ ghọta na Chineke dị nakwa na ọ bụ ya kere ihe niile (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10, 11. (a) Olee ihe atụ i nwere ike iji nyere nwa gị aka ịghọta na Chineke dị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe atụ ndị i jirila nyere nwa gị aka?

10 Olee ihe atụ i nwere ike iji mee ka nwa gị mata na Chineke dị? I nwere ike ide otú e si esi maị maị, gị na ya ejiri ya sie maị maị. Kọwaa ihe mere o ji dị́ mkpa ka o soro ihe ahụ i dere otú ahụ i si dee ya. Unu sichaa ya, gị enye nwa gị ụdara ma ọ bụ mkpụrụ osisi ọzọ, jụọ ya, sị: “Ị̀ ma na ọ dị ka à ga-asị na e dere otú ụdara a si amị?”  Pịwaa ụdara ahụ, nye ya otu mkpụrụ dị́ n’ime ya. Kọwaara ya na ọ dị nnọọ ka è dere otú ụdara ahụ si amị n’ime mkpụrụ ya. Ma ọ dị mgbagwoju anya karịa ebe ahụ i dere otú e si esi maị maị. I nwere ike ịjụ ya, sị: “Ebe ọ bụ mmadụ dere otú e si esi maị maị, ònye dekwaranụ otú ụdara si amị?” Ọ bụrụ na nwa gị etoola, i nwere ike ịkọwara ya na ọ bụ n’ime mkpụrụ ụdara ka Chineke dere ma otú osisi ụdara si eto ma otú o si amị. I nwekwara ike igosi ya ma ụfọdụ ihe atụ ma ihe ụfọdụ e sere na peeji nke 10 ruo 20 na broshọ bụ́ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking.

11 Ọtụtụ ndị nne na nna na-eji isiokwu bụ́ “È Kere Ya Eke?” nke na-agbakarị na Teta! akụziri ụmụ ha ihe. Ọ bụrụ na ụmụ ha ka dị ezigbo obere, ha na-akọwara ha ihe dị́ n’isiokwu ahụ otú ọ ga-adịrị ha mfe nghọta. Dị ka ihe atụ, otu nwanna na nwunye ya bí na Denmak ji ụgbọelu tụnyere nnụnụ. Ha sịrị: “Ụgbọelu yiri nnụnụ. Ma, ụgbọelu ọ̀ na-eyi àkwá, kpuo ya iji mụta obere ụgbọelu? Nnụnụ chọọ ifedata, à ga-ebu ụzọ rụọrọ ya ebe ọ ga-efedata? Ị̀ ga-ejili ụzụ ụgbọelu na-eme tụnyere ubé nnụnụ? N’ihi ya, ònye ka mara ihe, ọ̀ bụ onye rụrụ ụgbọelu ka ọ̀ bụ Onye kere nnụnụ?” Ajụjụ ndị dị́ otú ahụ nwere ike ime ka nwatakịrị ‘chee echiche,’ meekwa ka o nwee okwukwe na Chineke.—Ilu 2:10-12.

12. Olee otú ihe atụ nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ịghọta na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru bụ eziokwu?

12 I nwekwara ike iji ihe atụ kụziere nwa gị na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, gị na ya gụọ Job 26:7. (Gụọ ya.) Olee otú ị ga-esi gosi na ọ bụ Jehova mere ka e dee amaokwu Baịbụl a? I nwere ike ikwu ya hoo haa. Kama ime otú ahụ, nyere nwa gị aka iche echiche. Gwa ya na n’oge Job, e chewebeghị echiche imepụta rọket ma ọ bụ onyokomita e ji ahụ ihe dị́ na mbara igwe. I nwere ike ịgwa nwa gị ka o gosi ihe mere ọ ga-eji siere ụfọdụ ndị ike ikweta na e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa n’elu ya n’agbanyeghị na o buru oké ibu. Nwa gị nwere ike iji bọl ma ọ bụ nkume gosi na a tụlie ihe ọ bụla dịtụ arọ elu, ọ ga-adarịrị n’ala. Ihe ahụ o mere ga-eme ka ọ ghọta na ihe ahụ Jehova kwuru na Baịbụl ọtụtụ afọ tupu ndị mmadụ achọpụta ya bụ eziokwu.—Nehe. 9:6.

KỤZIERE HA NA IME IHE BAỊBỤL KWURU BARA URU

13, 14. Olee otú ndị nne na nna ga-esi kụziere ụmụ ha na ime ihe Baịbụl kwuru na-aba uru?

13 Ọ dị ezigbo mkpa ka i mee ka ụmụ gị ghọta na ime ihe Baịbụl kwuru na-aba uru. (Guọ Abụ Ọma 1:1-3.) E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi eme ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ụmụ gị ka ha were ya na ha na-aga n’otu obere obodo dịpụrụ adịpụ, ọ bụkwa ha ga-ekpebi mmadụ ole ha na ha ga-ebi ebe ahụ. Jụzie ha, sị: “Olee ụdị àgwà onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na ha niile chọrọ ịna-ebi n’udo?” I nwere ike ịgụrụ ha Ndị Galeshia 5:19-23 ka ha hụ ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ.

14 E nwere ihe abụọ dị́ mkpa ụmụ gị ga-amụta n’ihe atụ ahụ. Nke mbụ bụ na iwu Chineke na-eme ka e nwee ezigbo udo na ịdị n’otu. Nke abụọ abụrụ na ihe Jehova na-akụziri anyị na-eme ka anyị jikere ibi n’ụwa ọhụrụ ya. (Aịza. 54:13; Jọn 17:3) I nwere ike iji ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ anyị mee ka ha ghọta ya nke ọma. O nwere ike ịbụ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba n’Ụlọ Nche. Ọ bụrụ na e nwere onye nọ́ n’ọgbakọ unu gbanwere àgwà ọjọọ ọ na-akpabu iji mee ihe dị́ Jehova mma, i nwere ike ịkpọ ya ka ọ bịa n’ụlọ unu kọọ otú o si mee ya. Ụdị ihe atụ ahụ ga-eme ka ihe Baịbụl kwuru doo ha anya.—Hib. 4:12.

15. Olee ihe kacha mkpa i kwesịrị iburu n’obi mgbe ị na-akụziri ụmụ gị ihe?

 15 Ihe dị́ mkpa a na-ekwu bụ: Gbaa mbọ ka otú i si akụziri ụmụ gị ihe na-atọ ha ụtọ. Gbalịa ka i chepụta ihe ị ga-eji kụziere ha ihe. Mee ka ha chee echiche. Echefula afọ ole ha dị. Mee ka otú i si akụziri ha ihe na-atọ ha ụtọ, na-emekwa ka okwukwe ha sie ike. Otu nwanna kwuru, sị: “Ike agwụla gị ichepụta ụzọ ọhụrụ ị ga-esi na-akụziri ha ihe ndị ị kụzibuuru ha.”

NWEE OKWUKWE NA NDIDI, NA-EKPESIKWA EKPERE IKE

16. Mgbe ị na-akụziri ụmụ gị ihe, gịnị mere o ji dị́ mkpa ka i nweere ha ndidi? Nye ihe atụ.

16 Mmụọ nsọ ga-enyere ụmụ gị aka ka okwukwe ha sie ike. (Gal. 5:22, 23) Mkpụrụ osisi na-ewe oge tupu ya etoo. Otú ahụ ka okwukwe dị. N’ihi ya, i kwesịrị inwe ndidi ma jisie ike na-akụziri ụmụ gị ihe. Otu nwanna bí na Japan, nke mụrụ ụmụ abụọ, sịrị: “Mụ na nwunye m wepụtaara ụmụ anyị ezigbo oge. Malite mgbe ha dị obere, m na-eji nkeji iri na ise amụrụ ha ihe kwa ụbọchị e wezụga ụbọchị ọmụmụ ihe. Nkeji iri na ise ebughị anyị na ha aka.” Otu onye nlekọta sekit dere, sị: “Mgbe m ka na-eto eto, enwere m ọtụtụ ajụjụ. Ma ọ bụghị ha niile ka m jụrụ. Ka oge na-aga, a zara ọtụtụ n’ime ha n’ọmụmụ ihe, n’ofufe ezinụlọ anyị ma ọ bụ n’ihe m gụrụ mgbe naanị m na-amụ ihe. Ọ bụ ihe mere o ji dị́ mkpa ka ndị nne na nna ghara ịkwụsị ịkụziri ụmụ ha ihe.”

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịna-akụziri nwa gị ihe nke ọma, ị ga-ebu ụzọ mee ka Okwu Chineke dịrị n’obi gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị mere o ji dị́ mkpa ka ndị nne na nna mee ka okwukwe ha sie ike? Olee otú otu nwanna na nwunye ya si nyere ụmụ ha aka inwe okwukwe na Jehova?

17 N’eziokwu, ihe dị́ ezigbo mkpa bụ igosi ụmụ gị na okwukwe gị siri ike. Ụmụ gị ga-ahụ ihe ị na-eme. Ọ ga-emekwa ka okwukwe ha sie ike. N’ihi ya, ndị nne na nna, na-emenụ ka okwukwe unu sie ike. Meenụ ka ụmụ unu hụ otú Jehova si akwado unu. Dị ka ihe atụ, ọ na-abụ e nwee ihe na-echu otu nwanna na nwunye ya bí na Bamuda ụra, ha arịọ Jehova ka o nyere ha aka, ha agwakwa ụmụ ha ka hanwa kpewe ekpere. Ha kwuru, sị: “Anyị na-asịkwa ada anyị, ‘Tụkwasị Jehova obi gị niile, na-arụsi ọrụ Chineke ike, echegbukwala onwe gị.’ Ọ hụ ihe mechara mee, ọ na-amata na Jehova na-enyere anyị aka. O meela ka o kwetasie ike na Chineke dị nakwa na Baịbụl bụ Okwu ya.”

18. Olee ihe dị́ mkpa ndị nne na nna na-ekwesịghị ichefu?

18 Nke bụ́ eziokwu bụ na mee elu mee ala, ị gaghị amanye ụmụ gị inwe okwukwe. Ihe ndị nne na nna na-eme bụ ịkụ mkpụrụ na ịgba ya mmiri. Ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka o too. (1 Kọr. 3:6) N’ihi ya, na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ nyere gị aka, na-agbasikwa mbọ ike ịkụziri ụmụ gị ihe. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba.—Efe. 6:4.