Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2016

Na-agbasi Mgba Ike Ka Jehova Gọzie Gị

Na-agbasi Mgba Ike Ka Jehova Gọzie Gị

“Gị na Chineke na mmadụ agbawo mgba, i wee merie n’ikpeazụ.”—JEN. 32:28.

ABỤ: 60, 38

1, 2. Olee ihe ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-alụso ọgụ?

NDỊ niile fere Chineke n’oge gara aga malite n’Ebel ruo ná ndị nke taa agbaala mgba. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru na ha ‘tachiri obi n’oké ịgba mgba ka ha nọ na-ata ahụhụ’ iji mee ihe dị́ Jehova mma, ya agọziekwa ha. (Hib. 10:32-34) Pọl ji mgba Ndị Kraịst na-agba tụnyere ụdị mbọ ndị na-asọ mpi na-agba n’egwuregwu ndị Grik oge ochie, dị́ ka ịgba ọsọ, ịgba mgba, na ịkụ ọkpọ. (Hib. 12:1, 4) Taa, anyị na-agba ọsọ ndụ. E nwekwara ndị iro chọrọ imegharị anyị anya ka anyị ghara ịna-enwe obi ụtọ, gharakwa inweta ụgwọ ọrụ anyị n’ọdịnihu.

2 Anyị na Setan na ụwa ọjọọ ya na-agba “mgba.” (Efe. 6:12) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara ikwe ka “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’ụwa megharịa anyị anya. Ihe ndị ahụ bụ ozizi ụgha, amamihe ụwa, àgwà ọjọọ ndị dị́ ka ịkwa iko, ịṅụ sịga, ịṅụbiga mmanya ókè na ịṅụ ọgwụ ike. Anyị kwesịkwara ịna-agbalịsi ike ka anyị ghara ịda mbà n’obi ma ọ bụ mee ihe ọjọọ na-agụ anyị.—2 Kọr. 10:3-6; Kọl. 3:5-9.

3. Olee otú Chineke si akụziri anyị otú anyị ga-esi na-alụso ndị iro anyị ọgụ?

 3 Ànyị ga-emerili ndị iro ndị ahụ? Ee. Ma, ọ gaghị adị mfe. Pọl ji onwe ya tụnyere onye na-akụ ọkpọ n’oge ochie. Ọ sịrị: “Otú m si eti ọkpọ bụ ka m wee ghara ịdị na-eti ikuku.” (1 Kọr. 9:26) Anyị kwesịrị ịna-alụsi ọgụ ike ka anyị merie ndị iro anyị otú ahụ onye na-akụ ọkpọ na-agba mbọ ka o merie onye ọ bụ ya na ya. Jehova na-enyere anyị aka ma na-akụziri anyị otú anyị ga-esi eme ya. Ọ na-eji Baịbụl agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ihe ndị ọzọ o ji enyere anyị aka bụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, ọmụmụ ihe ọgbakọ, na mgbakọ dị́ iche iche. Ị̀ na-eme ihe ị na-amụta? Ọ bụrụ na ị naghị eme ya, ọ ga-adị ka ị̀ hapụrụ onye iro gị, kụwa ikuku ọkpọ.

4. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe ọjọọ merie anyị?

4 Ndị iro anyị nwere ike ịlụso anyị ọgụ mgbe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ mgbe ọ dị ka ike ọ̀ gwụwala anyị. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” (Rom 12:21) Otú a Baịbụl sịrị anyị ‘ekwela ka ihe ọjọọ merie anyị’ gosiri na anyị ga-emerili ihe ọjọọ. Otú anyị ga-esi emeri ya bụ ịna-alụso ya ọgụ. Ma, ọ bụrụ na anyị echefuo onwe anyị ma kwụsị ịgbasi mgba ike, Setan, ụwa ọjọọ ya, na anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè nwere ike imeri anyị. Ekwela ka Setan menye gị ụjọ, gị adaa mbà ma chịliere ya aka elu.—1 Pita 5:9.

5. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-agba mgba ka Chineke gọzie anyị? (b) Olee ndị Baịbụl kọrọ akụkọ ha anyị ga-amụ gbasara ha?

5 Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri na mgba a anyị na-agba, anyị ekwesịghị ichefu ihe mere anyị ji na-agba ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma, chọọkwa ka ọ gọzie anyị, anyị kwesịrị ịna-echeta ihe e kwuru ná Ndị Hibru 11:6. Ebe ahụ sịrị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Ịchọsi Jehova ike pụtara na anyị ga na-agba ezigbo mbọ. (Ọrụ 15:17) Na Baịbụl, a kọrọ gbasara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị gbasiri mbọ ike ka Jehova gọzie ha. E nwere mgbe nsogbu ndị tara akpụ bịaara Jekọb, Rechel, Josef, na Pọl, ha atachie obi. Ihe ha mere gosiri na Jehova ga-agọzi anyị ma anyị na-agbasi mbọ ike. Olee otú anyị ga-esi ṅomie mmadụ anọ a gbara mgba?

ỊTACHI OBI GA-EME KA CHINEKE GỌZIE ANYỊ

6. Olee ihe nyeere Jekọb aka ịtachi obi? Olee otú Jehova si gọzie ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Jekọb gbasiri mgba ike ma tachie obi n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya, jiri adịm ná mma ya na ya kpọrọ ihe, nweekwa okwukwe siri ike na ọ ga-agọzi nwa ya otú ahụ o kwere ya ná nkwa. (Jen. 28:3, 4) N’ihi ya, mgbe ọ fọrọ obere ka Jekọb gbaa otu narị afọ, o mere ihe niile o nwere ike ime ka Chineke gọzie ya; ya na mmụọ ozi gbadịrị mgba. (Gụọ Jenesis 32:24-28.) Jekọb ò ji ike nke aka ya tachie obi, ya na mmụọ ozi dị́ ike agbaa mgba? Mbanụ. Ma, o kpebisiri ike na ọ ga-enweta ihe ọ na-achọ. Ihe o mere gosiri na ọ bụghị onye ụjọ. O doro anya na Chineke gọziri ya maka otú o si tachie obi. A gụrụ ya aha dabara adaba, bụ́ Izrel, (nke pụtara “Onye Ya na Chineke Gbara Mgba” ma ọ bụ “Chineke Na-agba Mgba”). Jekọb nwetara ihe anyịnwa na-achụ taa, ya bụ, ka anyị mee ihe dị́ Jehova mma ka ọ gọzie anyị.

7. (a) Olee nsogbu bịaara Rechel? (b) Olee otú o si gbasie mgba ike, Chineke emechaa gọzie ya?

 7 Rechel bụ́ nwunye Jekọb hụrụ n’anya gbalịsikwara ike ka ọ hụ otú Jehova ga-esi mezuo nkwa o kwere di ya. Ma, nsogbu e nwere bụ na Rechel amụtabeghị nwa. Ụdị ihe ahụ na-agbawa ụmụ nwaanyị obi n’oge ochie. Gịnị nyeere Rechel aka idi nsogbu ahụ ma na-agbasi mgba ike n’agbanyeghị na e nweghị ihe ọ ga-emeli banyere ya? Ọ kwụsịghị inwe olileanya. Kama, ọ gbasiri mbọ ike ma na-ekpesikwu ekpere ike. Jehova nụrụ arịrịọ Rechel ji obi ya niile na-arịọ. O mechara mee ka ọ mụta ụmụ. Ọ bụ ya mere Rechel ji tie mkpu mmeri n’otu oge, sị: “Mụ na nwanne m nwaanyị agbawo mgba tara akpụ . . . Emeriwokwa m ya!”—Jen. 30:8, 20-24.

8. Olee nsogbu bịaara Josef? Olee otú ihe o mere kwesịrị isi baara anyị uru?

8 O doro anya na otú Jekọb na Rechel si tụkwasị Chineke obi baara nwa ha Josef ezigbo uru, mee ka ọ mara ihe ọ ga-eme mgbe ọnwụnwa bịaara ya. Mgbe ọ dị afọ iri na asaa, nsogbu siri ezigbo ike bịaara ya. Anyaụfụ mere ka ụmụnne ya ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. E mechara tụọ ya mkpọrọ n’Ijipt n’enweghị ihe o mere. (Jen. 37:23-28; 39:7-9, 20-21) Josef adaghị mbà. O bughịkwanụ iwe n’obi chọwa otú ọ ga-esi megwara ihe e mere ya. Kama ime otú ahụ, o mere ka obi ya dịrị n’adịm ná mma ya na Jehova. (Lev. 19:18; Rom 12:17-21) Ihe Josef mere kwesịrị ịbara anyị uru. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụgodị na anyị tara ahụhụ mgbe anyị bụ nwata ma ọ bụ na otú ihe si dịrị anyị ugbu a mere ka o yie ka olileanya adịghịzi, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ma ghara ịda mbà. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị ma anyị mee otú ahụ.—Gụọ Jenesis 39:21-23.

9. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-agbasi mbọ ike ka Jehova gọzie anyị otú ahụ Jekọb, Rechel, na Josef mere?

9 Chegodị banyere nsogbu bịaara gị, nke nwere ike ịbụrụ gị ọnwụnwa. O nwere ike ịbụ na a kpọrọ gị asị, na-emegbu gị, ma ọ bụ na-akwa gị emo. Ọnwụnwa bịaara gị nwere ike ịbụ na e boro gị ebubo ụgha, ikekwe n’ihi na a na-emere gị anyaụfụ. Kama ịda mbà, cheta ihe nyeere Jekọb, Rechel, na Josef aka iji obi ụtọ na-efe Jehova. Chineke mere ka ha dị́ ike ma gọzie ha n’ihi na ha akwụsịghị iji ihe gbasara ofufe ya kpọrọ ihe. Ha gbasiri mbọ ike ma na-eme ihe gosiri na ekpere ha si ha n’obi. Ụwa ochie a na-agbazi egwú ụla. N’ihi ya, anyị kwesịrị ijidesi olileanya ahụ Chineke nyere anyị ike. Ị̀ dị njikere ịna-agbasi mgba ike ka Jehova gọzie gị?

DỊ NJIKERE ỊGBA MGBA KA CHINEKE GỌZIE GỊ

10, 11. (a) Olee otú anyị ga-esi na-agbasi mgba ike ka Chineke gọzie anyị? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ihe dị́ mma ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya ma ọ bụ mee ka anyị daa mbà?

10 Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ọ dị mkpa na anyị ga-agba mgba ka Chineke gọzie anyị? Otu nsogbu ọtụtụ ndị nwere bụ na o siiri ha ike imeri àgwà ọjọọ riri ha ahụ́. E nwekwara ndị ọ na-esiri ike ile ikwusa ozi ọma anya otú kwesịrị ekwesị. Nsogbu nke gị nwere ike ịbụ ọrịa ma ọ bụ na owu na-ama gị. Ọ na-esikwara ụfọdụ ndị ike ịgbaghara ndị mejọrọ ha. N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị niile kwesịrị ịna-agba mbọ ka ihe ọ bụla ghara igbochi anyị ịna-efe ya. Ọ na-agọzi ndị jí obi ha niile na-efe ya.

Ị̀ na-agba mgba ka Chineke gọzie gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11)

 11 O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ihe dị́ mma na ịkpa àgwà ka Ndị Kraịst. Ọ na-akacha esi ike ma ọ bụrụ na obi anyị dị́ aghụghọ na-achọ ka anyị mee ihe ọjọọ na-agụ anyị. (Jere. 17:9) Ọ bụrụ na ị mata na e nweela otú ụdị ihe ahụ si mewe gị, rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya. Ekpere na mmụọ nsọ ga-eme ka obi sie gị ike ime ihe ị ma na o ziri ezi, nke ga-emekwa ka Jehova gọzie gị. Mee ihe ị na-ekpe n’ekpere. Gbalịsie ike ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Wepụtakwa oge ị ga-eji na-amụ ihe, na-enwechikwa Ofufe Ezinụlọ anya.—Gụọ Abụ Ọma 119:32.

12, 13. Olee ihe nyeere ụmụnna abụọ aka imeri ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ?

12 E nwere ọtụtụ ihe gosiri otú Okwu Chineke, mmụọ nsọ, na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl sirila nyere Ndị Kraịst aka ka ha ghara ime ihe ọjọọ na-agụ ha. Otu nwa okorobịa gụrụ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?” nke gbara na Teta! December 8, 2003. Gịnị ka o kwuru? Ọ sịrị: “M na-agbasi mbọ ike ka m kwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma. Mgbe m gụtara n’isiokwu ahụ na ọtụtụ ndị na-alụ ezigbo ọgụ iji merie ọchịchọ na-ezighị ezi, o mere ka m ghọta na otú ọ dị m ka ọ dịkwa ọtụtụ ụmụnna anyị. Ọ bụghị naanị m ka ọ na-esiri ike.” Ihe ọzọ nyeere nwa okorobịa a aka bụ isiokwu bụ́ “Ụzọ-Ndụ Megidere Okike—Chineke Ọ̀ Na-akwado Ya?” nke gbara na Teta! October 8, 2003. O kwukwara na isiokwu ahụ sịrị na ọgụ ahụ bụụrụ ụfọdụ ndị “ogwu n’anụ ahụ́.”  (2 Kọr. 12:7) Ka ha na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi, ha kwesịrị inwe olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. O kwuru, sị: “N’ihi ya, ama m na, ka ụbọchị nke ọ bụla na-agafe, m ga-emeli ihe Jehova chọrọ. M na-ekele Jehova maka na o ji nzukọ ya na-enyere anyị aka ịna-eme ihe dị́ ya mma kwa ụbọchị n’ụwa ọjọọ a.”

13 Chegodị banyere otu nwanna nwaanyị bí n’Amerịka. O dere, sị: “M na-ekele unu maka otú unu si eji ihe ndị unu na-ebipụta enyere anyị aka mgbe niile nakwa n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ na-adịkarị m ka ọ̀ bụ mụnwa ka e bu n’obi dee isiokwu ndị a unu na-ebipụta. Kemgbe ọtụtụ afọ, e nwere ihe na-adịghị Jehova mma na-agụsi m agụụ ike. Ọ na-adị m mgbe ụfọdụ ka ọ̀ bụ m chịlie aka elu, kwụsịzie ịgba mbọ ka m merie ya. Ama m na Jehova nwere obi ebere, na-agbagharakwa mmehie, ma ebe ọ bụ na ihe ọjọọ a na-agụkarị m agụụ, akpọghịkwa m omume ahụ asị n’ime obi m, ọ na-adị m ka erughị m eru ka o nyere m aka. Àgwà ọjọọ a mụ na ya na-alụ mgbe niile akpaala ndụ m aka ọjọọ. . . . Mgbe m gụchara isiokwu bụ́ ‘Ì Nwere “Obi Ị Ga-eji Mara” Jehova?’ nke gbara n’Ụlọ Nche Mach 15, 2013, m ghọtara na Jehova chọrọ inyere m aka.”

14. (a) Olee otú obi dị Pọl na mgba ọ na-agba ka ọ ghara ime ihe ọjọọ na-abata ya n’obi? (b) Olee otú anyị ga-esi merie na mgba anyị na-agba ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị?

14 Gụọ Ndị Rom 7:21-25. Pọl ma na ọ naghị adị mfe mmadụ ịgba mbọ ka ọ ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ ya na-ezughị okè. Ma, obi siri ya ike na ya ga-emeri n’ọgụ ahụ ma ọ bụrụ na ya atụkwasị Jehova obi, na-ekpe ekpere ka o nyere ya aka, nweekwa okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Anyịnwa kwanụ? Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị, anyị ga-emerili n’ọgụ ahụ. Olee otú anyị ga-esi emeri? Ọ bụ ịna-eme ihe Pọl mere ma tụkwasị Jehova obi anyị niile kama ịtụkwasị onwe anyị obi nakwa inwe okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ.

15. Olee otú ekpere ga-esi nyere anyị aka ịna-atụkwasị Jehova obi na ịna-edi nsogbu ndị na-abịara anyị?

15 Oge ụfọdụ, Chineke nwere ike ịhapụ anyị ka anyị gosi otú ihe mere anyị si echegbu anyị. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ezigbo ahụ́ adịghị anyị (ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị), ma ọ bụkwanụ na a na-emegbu anyị? Anyị ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi anyị niile ma ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nye anyị ike anyị ga-eji na-efe ya, na-enwe obi ụtọ ma jiri adịm ná mma anyị na ya kpọrọ ihe. (Fil. 4:13) Ihe ndị merela ọtụtụ ndị ma n’oge Pọl ma n’oge anyị a gosiri na ikpe ekpere ga-enye anyị ike ma mee ka anyị nwee obi ike ịna-edi nsogbu ndị na-abịara anyị.

NA-AGBASI MGBA IKE KA JEHOVA GỌZIE GỊ

16, 17. Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

16 Ekwensu chọrọ ka ị chịlie aka elu ma kwụsị ịna-agba mgba. Ma kpebisie ike ‘ijisi ihe dị mma aka ike.’ (1 Tesa. 5:21) Ka obi sie gị ike na ị ga-emeri n’ọgụ ị na-alụso Setan, ụwa ọjọọ ya, na ihe ọjọọ ọ bụla na-agụ gị agụụ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịtụkwasị Chineke obi gị niile na ọ ga-enye gị ike ma nyere gị aka.—2 Kọr. 4:7-9; Gal. 6:9.

17 N’ihi ya, na-alụsi ọgụ ike. Na-agbasi mgba ike. Adakwala mbà. Ka obi sie gị ezigbo ike na Jehova ‘ga-awụsa gị ngọzi ruo mgbe ọ na-adịghị ihe ga-akọ gị.’—Mal. 3:10.