Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ) SEPTEMBA 2016

Ịgbachitere Ozi Ọma n’Ihu Ndị Ọchịchị

Ịgbachitere Ozi Ọma n’Ihu Ndị Ọchịchị

“NWOKE a bụ arịa m họọrọ ka o buru aha m gakwuru ndị mba ọzọ, gakwurukwa ndị eze.” (Ọrụ 9:15) Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Jizọs gwara otu onye Juu ghọrọ Onye Kraịst ọhụrụ, bụ́ onye e mechara na-akpọ Pọl onyeozi.

Otu n’ime “ndị eze” Pọl nọ n’ihu ha kọwaa ihe o kweere bụ eze ukwu Rom aha ya bụ Niro. Olee otú ọ gaara adị gị ma a sị na ị nọ n’ihu ụdị onye ọchịchị ahụ na-akọwara ya ihe i kweere? A gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme ihe Pọl mere. (1 Kọr. 11:1) Otú anyị nwere ike isi mee ya bụ ịmata ihe Pọl mere gbasara iwu ndị e nwere n’oge ya.

Ọ bụ Iwu Mozis bụ iwu e nwere n’ala Izrel oge ochie, ọ bụkwa ya ka ndị Juu na-erubere isi n’ebe ọ bụla ha bi. Mgbe Pentikọst afọ 33 gachara, iwu ejighịzi ndị na-efe Chineke ịna-edewe Iwu Mozis. (Ọrụ 15:28, 29; Gal. 4:9-11) Ma, Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ akatọghị Iwu Mozis; ha kwusara ozi ọma n’ọtụtụ obodo ndị Juu n’enweghị onye na-enye ha nsogbu. (1 Kọr. 9:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na Pọl gara n’ụlọ nzukọ ndị Juu ọtụtụ mgbe, zie ndị ma Chineke Ebreham ozi ọma, nakwa ndị ya na ha nwere ike ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Ọrụ 9:19, 20; 13:5, 14-16; 14:1; 17:1, 2.

Ndịozi Jizọs ji Jeruselem mere ebe ha ga-esi na-elekọta ozi ọma ha na-ekwusa. Ha kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nsọ dị́ n’ebe ahụ. (Ọrụ 1:4; 2:46; 5:20) E nwere mgbe Pọl gara Jeruselem, e mechaa nwụchie ya n’ebe ahụ. A malitere ikpe ya ikpe nke mechara mee ka a kpọga ya Rom.

PỌL NA IWU NDỊ ROM

Olee otú ndị ọchịchị Rom si lee ihe Pọl na-ekwusa anya? Iji zaa ajụjụ a, ọ ga-adị mma ka anyị mata otú ndị Rom si ele ihe ọ bụla bụ́ okpukpe anya. Ha amanyeghị agbụrụ dị́ iche iche n’alaeze ukwu ha ka ha kwụsị ikpe okpukpe ha, ọ gwụkwala ma ọ̀ ga-akpatara ndị ọchịchị nsogbu ma ọ bụ kụziwere ndị mmadụ àgwà ọjọọ.

 Ndị Rom hapụrụ ndị Juu bí n’ebe ha na-achị ka ha na-eme ihe ụfọdụ. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere Ndị Kraịst oge mbụ kwuru na ndị ọchịchị Rom nyere ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu ihe ùgwù pụrụ iche. Ha hapụrụ ndị Juu ka ha kpewe okpukpe ha n’enweghị nsogbu. Ha anaghịkwa eso efe chi dị́ iche iche e nwere na Rom. Ọ bụ iwu ha na-agwa ha ihe ha ga-eme n’ebe ọ bụla ha bi. Ha anaghịkwa eso aga agha. * Pọl ji ikike iwu Rom nyere okpukpe ndị Juu gbachitere Ndị Kraịst n’ihu ndị ọchịchị Rom.

Ndị iro Pọl gbalịrị isi ụzọ dị́ iche iche mee ka ndị nkịtị na ndị ọchịchị megidewe ya. (Ọrụ 13:50; 14:2, 19; 18:12, 13) Chegodị banyere ihe mere otu mgbe. Ndị okenye nọ́ na Jeruselem nụrụ asịrị a kọrọ banyere Pọl na ọ na-akụziri ndị Juu “ka ha hapụ iso Mozis.” Ụdị akụkọ ahụ nwere ike ime ka ụfọdụ ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ chee na Pọl anaghị akwanyere ndokwa Chineke ùgwù. O nwekwara ike ime ka ụlọikpe Sanhedrin kwuo na Ndị Kraịst si n’okpukpe ndị Juu dapụ. Ụdị ihe ahụ mee, o nwere ike ime ka a taa ndị Juu na-eso Ndị Kraịst ahụhụ. A gaghị ekwe ka ha na ha na-emekọ ihe. A gaghị ekwekwa ka ha na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nsọ ma ọ bụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ bụ ihe mere ndị okenye ji gwa Pọl ka ọ gaa n’ụlọ nsọ mee ihe Chineke na-agwaghị ya mee, nke na-abụghịkwa ihe ọjọọ, iji gosi na asịrị ahụ abụghị eziokwu.—Ọrụ 21:18-27.

Pọl mere otú ahụ, nke mere ka o nwee ohere dị́ iche iche “ịkwado ozi ọma na iji iwu mee ka o guzosie ike.” (Fil. 1:7) N’ụlọ nsọ, ezigbo iwe bịara ndị Juu, ha achọọ igbu Pọl. Ọchịagha ndị Rom nwụchiri Pọl. Mgbe a na-ejikere ịpịa Pọl ihe, o kwuru na ya bụ nwa amaala Rom. Ọ bụ ya mere e ji kpọrọ ya gaa Sesaria, bụ́ ebe ndị Rom si na-achị Judia. Ọ ga-enwe ohere pụrụ iche n’ebe ahụ izi ozi ọma n’ihu ndị ọchịchị. Ọ ga-abụ na e si otú ahụ mee ka ndị na-amachaghị banyere Iso Ụzọ Kraịst matakwuo banyere ya.

Ọrụ Ndịozi isi 24 kọrọ otú e si kpee Pọl ikpe n’ihu Filịks, bụ́ gọvanọ Rom chịrị Judia. N’oge ahụ, Filịks anụtụla ihe ụfọdụ banyere ihe Ndị Kraịst kweere. Ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ atọ ndị Juu kwuru Pọl si na-ada iwu ndị Rom. Ha kwuru na ọ na-eme ka ndị Juu bí n’ebe dị iche iche Rom na-achị na-enupụrụ ọchịchị Rom isi, kwuokwa na ọ bụ onyeisi òtù nzuzo nakwa na ọ na-anwa imerụ ụlọ nsọ Chineke, nke ndị Rom na-echebe n’oge ahụ. (Ọrụ 24:5, 6) Ebubo ndị ahụ nwere ike ime ka a maa Pọl ikpe ọnwụ.

Ndị Kraịst taa kwesịrị ichebara ihe Pọl mere gbasara ebubo ndị ahụ echiche. O jidere onwe ya ma kwanyere onwe ya ùgwù. Pọl kwuru banyere Iwu Mozis na Ndị Amụma, kwuokwa na ya nwere ikike ife ‘Chineke nna nna ya hà.’ Ọ bụ ikike iwu ndị Rom nyere ndị Juu ndị ọzọ. (Ọrụ 24:14) Ka oge na-aga, Pọl gbachiteere ihe o kweere n’ihu Pọshiọs Festọs, bụ́ gọvanọ nọchiri Filịks, nakwa n’ihu Eze Herọd Agrịpa.

Iji mee ka a ghara ikpe ya ikpe na-ezighị ezi, Pọl mechara kwuo, sị: “Ana m akpọku Siza!” Ọ bụ Siza bụ onye ọchịchị kacha ike n’oge ahụ.—Ọrụ 25:11.

IKPE E KPERE PỌL N’IHU SIZA

Otu mmụọ ozi mechara gwa Pọl, sị: “Ị ghaghị iguzo n’ihu Siza.” (Ọrụ 27:24) Mgbe eze ukwu Rom bụ́ Niro malitere ịchị, o kwuru na ọ bụghị naanị ya ga na-ekpe ikpe niile. N’afọ asatọ mbụ ọ chịrị, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na o nyefere ndị ọzọ ikpe niile. Otu akwụkwọ nke kọrọ banyere ndụ Pọl onyeozi kwuru na ọ na-abụ e wetara Niro ikpe ọ ga-ekpe, ọ na-anọ n’obí ya ekpe ya, ndị ndụmọdụ ya má nke a na-akọ, ndị ọnụ na-eru n’okwu, ana-enyere ya aka.

 Baịbụl ekwughị ma Niro ò kpere Pọl ikpe n’onwe ya, ka ọ̀ gwara onye ọzọ ka o kpee ya ma gwa ya ihe e kpetara. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ ga-abụ na Pọl kọwara na ya na-efe Chineke ndị Juu nakwa na ya na-agwa mmadụ niile ka ha na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù ruuru ha. (Rom 13:1-7; Taị. 3:1, 2) Ọ dị ka otú Pọl si gbachitere ozi ọma n’ihu ndị ọchịchị ọ̀ gara nke ọma. Ụlọikpe Siza tọhapụrụ ya.—Fil. 2:24; Faị. 22.

ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-AGBACHITERE OZI ỌMA

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.” (Mat. 10:18) Ọ bụ ihe ùgwù isi otú ahụ nọchite anya Jizọs. Ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ na-agbachitere ozi ọma, o nwere ike ime ka anyị na-enweta mmeri n’ụlọikpe. O doro anya na ọ bụghị ihe ndị mmadụ na-ezughị okè kpebiri ga-eme ka ‘e jiri iwu mee ka ozi ọma guzosie ike’ n’ebe niile. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka mmegbu na ikpe na-ezighị ezi kwụsị.—Ekli. 8:9; Jere. 10:23.

Ma, Ndị Kraịst taa nwedịrị ike ime ka e too aha Jehova ma ọ bụrụ na ha ana-agbachitere ihe ha kweere. Anyị kwesịrị ime otú ahụ Pọl mere. Anyị kwesịrị iwetu obi, gwa ha eziokwu, kwuokwa okwu otú ga-eme ka ha kweta ihe anyị na-ekwu. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha ‘agaghị ebu ụzọ mụgharịa otú ha ga-esi na-azara ọnụ ha, n’ihi na ọ ga-eme ka ha nwee ọnụ na amamihe, nke ndị niile na-emegide ha na-agaghị enwe ike iguzogide ma ọ bụ ịgbagha.’—Luk 21:14, 15; 2 Tim. 3:12; 1 Pita 3:15.

Mgbe Ndị Kraịst nọ n’ihu ndị eze, ndị gọvanọ ma ọ bụ ndị ọchịchị ndị ọzọ gbachitewere ozi ọma, ha nwere ike isi otú ahụ zie ndị ọ na-esi ike inweta ozi ọma. Ụfọdụ ikpe ndị anyị meririla emeela ka a gbanwee iwu mba ụfọdụ, nke mere ka ndị mmadụ nwee ike ịna-ekwu otú obi dị ha na ịna-ekpe okpukpe masịrị ha. N’ihi ya, ma ànyị meriri ma ọ bụ na anyị emerighị, otú anyị si eji obi ike agbachitere ihe anyị kweere n’ụlọikpe na-eme Chineke obi ụtọ.

A na-eto aha Jehova mgbe anyị na-agbachitere ihe anyị kweere

^ para. 8 Otu nwoke na-ede akwụkwọ aha ya bụ James Parkes kwuru na ndị Rom nyere ndị Juu ikike ịna-eme omenala ha. O kwukwara na e nweghị oké ihe dị n’ikike a ha nyere ndị Juu n’ihi na ọ bụ ihe ndị Rom na-emere ndị dị́ iche iche ha na-achị. Ha na-ahapụ ha ka ha bụrụ obodo nọọrọ onwe ha, jirikwa aka ha na-ekpebi ihe ụfọdụ ha ga-eme.